Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌGỌST 2016

Otú Di na Nwunye Bụ́ Ndị Kraịst Ga-esi Na-ebi n’Udo

Otú Di na Nwunye Bụ́ Ndị Kraịst Ga-esi Na-ebi n’Udo

“Ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya; . . . nwunye kwesịrị ịdị na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.”—EFE. 5:33.

ABỤ: 87, 3

1. N’agbanyeghị na nwoke na nwaanyị na-enwekarị obi ụtọ n’ụbọchị ha na-agba akwụkwọ, gịnị ka ha ga-atụ anya ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

N’ỤBỌCHỊ nwoke na nwaanyị na-agba akwụkwọ, obi na-abụ ha sọ aṅụrị. Mgbe ha na-akpa, otú ha si hụ ibe ha n’anya mere ka ha dị́ njikere ịlụ ma kwe nkwa na ha agaghị ahapụ ibe ha. Ha gbachaa akwụkwọ, malitezie ibi, ha kwesịrị ịgbanwe otú ha sibu eme ihe ka ha nwee ike inwe otu obi. Jehova bụ́ Onye malitere alụmdi na nwunye chọrọ ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ, na-ebikwa n’udo. Ọ bụ ihe mere o ji nye ha ezigbo ndụmọdụ n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. (Ilu 18:22) Ma, Baịbụl kwuru hoo haa na n’ihi ezughị okè, di na nwunye “ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.” (1 Kọr. 7:28) Olee otú di na nwunye ga-esi mee ka mkpagbu ahụ belata? Olee ihe ga-eme ka Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye na-ebi n’udo?

2. Olee ụdị ịhụnanya dị́ iche iche di na nwunye kwesịrị ịna-egosi ibe ha?

2 Baịbụl mere ka o doo anya na ịhụnanya dị mkpa. Ma, e nwere ụdị ịhụnanya dị́ iche iche di na nwunye kwesịrị  ịna-egosi ibe ha. Dị ka ihe atụ, ha kwesịrị ịna-enwere ibe ha obi ọmịiko, na-egosikwa ibe ha ịhụnanya nwoke na nwaanyị. Ha mụta ụmụ, ha na ụmụ ha kwesịrị inwe ịhụnanya ndị ezinụlọ na-enwe n’ebe ibe ha nọ. Ma, ọ bụ ịhụnanya Ndị Kraịst na-eme ka di na nwunye na-ebi n’udo. Pọl onyeozi dere banyere ụdị ịhụnanya a, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya; n’aka nke ọzọ, onye bụ́ nwunye kwesịrị ịdị na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.”—Efe. 5:33.

IHE DI NA NWUNYE KWESỊRỊ ỊNA-EME

3. Olee otú di na nwunye kwesịrị ịhụru ibe ha n’anya?

3 Pọl dere, sị: “Ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya.” (Efe. 5:25) Otú Ndị Kraịst si eṅomi Jizọs taa bụ ịhụ ibe ha n’anya otú ahụ ọ hụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Gụọ Jọn 13:34, 35; 15:12, 13.) Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye kwesịrị ịhụ ibe ha n’anya nke na ha ga-adị njikere ịnwụ maka ibe ha. Ma ha see ezigbo okwu, o nwere ike isiri ha ike ime otú ahụ. Ihe ga-enyere ha aka bụ ịhụnanya Ndị Kraịst, nke “na-edi ihe niile, na-ekwere ihe niile, na-enwe olileanya ihe niile, na-atachi obi n’ihe niile.” N’eziokwu, “ịhụnanya adịghị ada ada.” (1 Kọr. 13:7, 8) Di na nwunye kwesịrị ịna-echeta na ha kwere nkwa na ha ga-ahụ ibe ha n’anya nakwa na ha agaghị ahapụ ibe ha. Ọ bụrụ na ha ana-echeta ya, ha ga na-arịọ Jehova ka o nyere ha aka, ha ana-agbasikwa mbọ ike idozi ihe ọ bụla seere ha okwu.

4, 5. (a) Ebe di bụ onyeisi ezinụlọ, gịnị ka o kwesịrị ịna-eme? (b) Olee otú nwaanyị kwesịrị isi na-ele di ya anya? (ch) Olee ihe ụfọdụ otu nwanna na nwunye ya gbanwere mgbe ha lụrụ?

4 Mgbe Pọl na-akọwa ihe di na nwunye kwesịrị ịna-eme, o dere, sị: “Ka ndị bụ́ nwunye na-edo onwe ha n’okpuru ndị di ha dị ka n’okpuru Onyenwe anyị, n’ihi na di bụ isi nke nwunye ya dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ.” (Efe. 5:22, 23) Ma, ọ pụtaghị na di bara uru karịa nwunye ya. Jehova kwuru banyere ọrụ bara uru nwaanyị na-arụ. Ọ sịrị: “Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọgide naanị ya. M gaje imere ya onye inyeaka, ka ọ bụrụ onye ga-eme ka o zuo ezu.” (Jen. 2:18) Jizọs, bụ́ “isi nke ọgbakọ ahụ,” gosiri na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya. Otú ahụkwa ka Onye Kraịst bụ́ di kwesịrị ịbụ onyeisi ezinụlọ hụrụ nwunye ya n’anya. Ọ bụrụ na ọ na-eme otú ahụ, obi ga-eru nwunye ya ala, ya ejiri obi ụtọ na-akwanyere di ya ùgwù, na-akwado ya, na-erubekwara ya isi.

5 Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Chinwe [1] kwetara na nwoke na nwaanyị lụọ, ha kwesịrị ịgbanwe otú ha si eme ihe ụfọdụ. Ọ sịrị: “Mgbe m na-alụbeghị di, ọ bụ m na-ekpebi ihe m ga-eme, na-egbokwara onwe m mkpa. Ma, mgbe m lụrụ di, egwú dagharịrị. Ọ bụzi di m na-ekpebi ihe niile. Ọ naghị adị mfe mgbe niile. Ime ihe Jehova chọrọ emeela ka anyị dịkwuo ná mma.” Di ya bụ́ Okafọ sịrị: “Ikpebi ihe anaghị adịburu m mfe. Ugbu a anyị lụrụ, ikpebi nke mmadụ abụọ na-eme ka o sikwuo ike. Ma ihe na-eme ka ọ na-adịkwuru m mfe bụ ịrịọ Jehova ka o nyere m aka nakwa ige ntị n’aro nwunye m tụrụ. Obi siri m ike na anyị nwere otu obi.”

6. Di na nwunye see okwu, olee otú ịhụnanya ga-esi eme ka ha ‘dị n’otu’?

6 Di na nwunye ga na-ebi n’udo ma ha abụọ na-eleghara ihe ibe ha na-emejọ anya. Ha ga ‘na-ediri ibe ha ihe ma na-agbaghara ibe ha kpamkpam.’ Nke bụ́ eziokwu bụ na ha abụọ ga na-emejọ ihe. Ma, ha mejọọ, ha nwere ike ịmụta ihe n’ihe ha mejọrọ, gbaghara onye mejọrọnụ, hụkwa  ibe ha n’anya otú ahụ Baịbụl kwuru. Ọ bụ ụdị ịhụnanya a ga-eme ka ha ‘dị n’otu.’ (Kọl. 3:13, 14) Baịbụl kwukwara na ịhụnanya “nwere ogologo ntachi obi na obiọma. . . . Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ.” (1 Kọr. 13:4, 5) Di na nwunye see okwu, ha kwesịrị idozi ya ozugbo, tupu ụbọchị ahụ agafee. (Efe. 4:26, 27) Ịdị umeala n’obi na ịkata obi ga-eme ka mmadụ sị, “Ewela iwe. Gbaghara m.” Ma, ọ ga-eme ka di na nwunye na-edozi ihe seere ha, meekwa ka ha na-adịkwu ná mma.

HA KWESỊRỊ ỊNA-ENWERE IBE HA ỌMỊIKO

7, 8. (a) Olee ndụmọdụ Baịbụl nyere di na nwunye gbasara inwe mmekọahụ? (b) Gịnị mere di na nwunye ji kwesị ịna-enwere ibe ha ọmịiko?

7 Baịbụl nyere di na nwunye ezigbo ndụmọdụ ga-enyere ha aka ịna-enye ibe ha ihe ruuru ya. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:3-5.) Ha kwesịrị ịna-eche ihe ibe ha chọrọ na otú obi dị ibe ha. Mmekọahụ nwere ike ọ gaghị na-atọ nwaanyị ụtọ ma ọ bụrụ na di ya anaghị enwere ya ọmịiko. Baịbụl gwara ndị di ka ha na-emeso nwunye ha otú ga-egosi na ha ghọtara ha nke ọma. (1 Pita 3:7) Di na nwunye ekwesịghị ịna-amanye ibe ha inwe mmekọahụ ma ọ bụ na-agba ya ka ụgwọ, kama o kwesịrị ịbụ mgbe ha abụọ chọrọ ya. Ọtụtụ mgbe, o nwere ike ibu ụzọ gụọ nke nwoke. Ma, o kwesịrị ịbụ na ha abụọ chọrọ inwe ya.

8 Baịbụl enyeghị iwu banyere ụdị egwuregwu di na nwunye ga na-egwu nakwa otú ha ga-egwuru ya. Ma, o kwuru na ụdị ihe ahụ adịghị njọ. (Abụ Sọlọ. 1:2; 2:6) Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye kwesịrị ịna-enwere ibe ha ọmịiko.

9. Gịnị mere na inwe mmasị na-ekwesịghị ekwesị n’onye na-abụghị di anyị ma ọ bụ nwunye anyị adịghị mma?

9 Ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya n’eziokwu, anyị agaghị ekwe ka ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla mee ka anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị gbasaa. Ile ndị gba ọtọ emeela ka ụfọdụ di na nwunye see okwu ma ọ bụ gbasaa. Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị ghara ile ndị gba ọtọ ma ọ bụ tinye aka n’ihe ọ bụla ọzọ gbasara mmekọahụ rụrụ arụ. Anyị ekwesịghịdị ịna-eme ihe ọ bụla ga-eme ka o yie ka ànyị na-achụ nwaanyị na-abụghị nwunye anyị ma ọ bụ nwoke na-abụghị di anyị. Ime otú ahụ agaghị egosi na anyị hụrụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyị ana-echeta na Chineke ma ihe niile anyị na-eche na ihe anyị na-eme, anyị ga-ekpebisikwu ike ime ihe ga-adị ya mma ma ghara ịhapụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị.—Gụọ Matiu 5:27, 28; Ndị Hibru 4:13.

IHE DI NA NWUNYE GA-EME MA HA SEE OKWU

10, 11. (a) Olee otú ịgba alụkwaghịm si ju ebe niile? (b) Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara mmadụ ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya? (ch) Gịnị ga-enyere mmadụ aka ka ọ ghara ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya?

10 Ọ na-abụ ụfọdụ di na nwunye see ezigbo okwu, ha ekpebie ịgbasa ma ọ bụ ịgba alụkwaghịm. Ná mba ụfọdụ, ihe karịrị ọkara ndị lụrụ di na nwunye na-agba alụkwaghịm. Ọ bụ eziokwu na a naghị agbakarị alụkwaghịm n’ọgbakọ, ma ọ dị mwute na a na-enwekwu di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst na-ese ezigbo okwu.

11 Baịbụl dụrụ anyị ọdụ, sị: “Nwunye ekwesịghị ịhapụ di ya; ma ọ bụrụ na ọ hapụ ya n’ezie, ya nọrọ n’alụghị di, ma ọ́ bụghị otú ahụ, ka ya na di ya kpezie; di ekwesịghịkwa ịhapụ nwunye ya.” (1 Kọr. 7:10, 11) Mmadụ ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya abụghị ihe egwuregwu. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịdị ka ọ̀ ga-eme ka nsogbu kwụsị, ma ọ na-akpatakarị nsogbu ndị  ọzọ. Mgbe Jizọs kwughachiri ihe Chineke kwuru gbasara mmadụ ịhapụ nna ya na nne ya ma rapara n’ahụ́ nwunye ya, ọ sịrị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Mat. 19:3-6; Jen. 2:24) Ọ pụtakwara na di ma ọ bụ nwunye ekwesịghị ‘ịtọsa ihe Chineke kekọtara.’ Jehova chọrọ ka di na nwunye biri n’oge niile ha dị ndụ. (1 Kọr. 7:39) Ọ bụrụ na ha ana-echeta na onye ọ bụla ga-aza Jehova ajụjụ maka ihe o mere, ha ga na-agbalịsi ike idozi ihe ọ bụla seere ha tupu ihe aka njọ.

12. Olee ihe nwere ike ime ka mmadụ chewe echiche ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya?

12 Ọ bụrụ na di na nwunye na-arọ nrọ ihe na-agaghị ekwe omume, ha nwere ike ịna-ese ezigbo okwu. Ma ihe ha tụrụ anya ya emeghị, obi ụtọ ha nwere ike ịla ka naị, ọsụkọsụ ana-asụ ha mgbe ọ bụla. Ọtụtụ mgbe, otú e si zụọ ha na ihe nwere ike ịkpasu ha iwe na-adị iche iche. Ihe gbasara ndị ọgọ, otú e si emefu ego ma ọ bụ otú e si azụ ụmụ nwekwara ike ịkpata esemokwu. Ma, ọ dị mma na ọtụtụ Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye na-agba mbọ edozi ihe seere ha n’ihi na ha na-ekwe ka Chineke na-eduzi ha.

13. Olee ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ hapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya?

13 Mmadụ ịhapụ di ya nwere ike ikwesị ekwesị mgbe ụfọdụ. Ụfọdụ emeela otú ahụ n’ihi na di ha kpachaara anya jụ ilekọta ha, na-akụ ha isi aba okpu, ma ọ bụ ghara ikwe ha fee Jehova. Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye see ezigbo okwu, ha kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere ha aka. Ụmụnna ndị ahụ má nke a na-akọ ga-enyere di na nwunye aka ime ihe Baịbụl kwuru. Anyị kwesịkwara ịrịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya, nke ga-enyere anyị aka ime ihe Baịbụl kwuru nakwa ịna-akpa àgwà ndị só ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ.—Gal. 5:22, 23. [2]

14. Gịnị ka Baịbụl gwara Ndị Kraịst di ha ma ọ bụ nwunye ha na-anaghị efe Jehova?

14 E nwere Ndị Kraịst di ha ma ọ bụ nwunye ha na-anaghị efe Jehova. Ọ dị́ otú ahụ, Baịbụl kwuru ihe mere na ha abụọ ekwesịghị ịhapụ ibe ha. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:12-14.) Ma onye ahụ na-abụghị Onye Kraịst ọ̀ ghọtara ma ọ bụ na ọ ghọtaghị, ‘e doro ya nsọ’ n’ihi na ọ lụrụ onye na-efe Jehova. E weere ụmụ ọ bụla ha mụtara ka ndị “dị nsọ.” N’ihi ya, Chineke na-ele ha anya ọma. Pọl kwuru, sị: “Gị nwunye, olee otú i si mara na ị gaghị azọpụta di gị? Ma ọ bụ, gị di, olee otú i si mara na ị gaghị azọpụta nwunye gị?” (1 Kọr. 7:16) E nwere ọtụtụ Ndị Kraịst àgwà ọma ha mere ka di ha ma ọ bụ nwunye ha bịa fewe Jehova.

15, 16. (a) Olee ndụmọdụ Baịbụl nyere Ndị Kraịst bụ́ nwunye di ha na-anaghị efe Jehova? (b) Gịnị ka Onye Kraịst kwesịrị ime ma ọ bụrụ na di ya ma ọ bụ nwunye ya “na-ekweghị ekwe chọrọ ịpụ”?

15 Pita onyeozi dụrụ Ndị Kraịst bụ́ nwunye ọdụ ka ha na-erubere di ha isi, “ka e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nwunye ha, ma ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha adịghị erube isi n’okwu Chineke, ebe ha ji anya ha hụ omume unu nke dị ọcha, ya na nkwanye ùgwù dị ukwuu.” Kama ịna-agwa di ya mgbe niile gbasara Baịbụl n’ekweghị ya ṅụọ mmiri tọgbọ iko, nwaanyị nwere ike ime ka di ya bịa fewe Chineke ma ọ bụrụ na àgwà ya ana-egosi na o nwere “mmụọ dị jụụ, nke dịkwa nwayọọ, nke bara uru nke ukwuu n’anya Chineke.”—1 Pita 3:1-4.

16 Ọ bụrụkwanụ na onye nke ahụ na-abụghị Onye Kraịst ekpebie ịhapụ nwanna anyị? Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ahụ nke na-ekweghị ekwe chọrọ ịpụ, ya pụwa; nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị anọghị n’agbụ n’ọnọdụ dị otú ahụ, kama Chineke akpọwo unu  ka unu nwee udo.” (1 Kọr. 7:15) Ọ bụ eziokwu na onye ahụ na-anaghị efe Jehova pụọ, udo nwere ike ịdị, ma ọ pụtaghị na nwanna ahụ nwere ike ịlụ onye ọzọ. Ma o kwesịghị ịmanyewa ya ka ọ nọrọ. Onye ahụ na-abụghị Onye Kraịst nwere ike imecha lọghachite, chọọkwa ka ha kpezie. N’ọdịnihu, o nwedịrị ike iso ya fewe Jehova.

IHE KWESỊRỊ ỊKACHA DI NA NWUNYE MKPA

Di na nwunye ga na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha ewere ihe gbasara ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Olee ihe kwesịrị ịkacha Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye mkpa?

17 Ebe anyị bi “n’oge ikpeazụ,” anyị na “oge dị oké egwu, nke tara akpụ” na-alụ. (2 Tim. 3:1-5) Ma, ịgbasi mbọ ike ka anyị na Jehova na-adị ná mma ga-eme ka nsogbu ụwa a ghara ịkpa anyị aka ọjọọ. Pọl dere, sị: “Oge fọdụrụ dị ntakịrị. Site ugbu a gaa n’ihu, ka ndị nwere nwunye dịrị ka à ga-asị na ọ dịghị nke ha nwere, . . . ka ndị ji ụwa eme ihe dịrịkwa ka ndị na-adịghị eji ya eme ihe n’uju.” (1 Kọr. 7:29-31) Ihe a Pọl kwuru apụtaghị na mmadụ ga-eleghara di ya ma ọ bụ nwunye ya anya. Ma, ebe ọ bụ na oge agwụla agwụ, ha kwesịrị iwere ihe gbasara ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa.—Mat. 6:33.

18. Gịnị ga-eme ka anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị na-ebi n’udo, na-enwekwa obi ụtọ?

18 Ọ bụ eziokwu na anyị bi n’oge siri ezigbo ike, ọtụtụ ndị na-agbakwa alụkwaghịm, ma anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị nwere ike ịna-ebi n’udo, na-enwekwa obi ụtọ. N’eziokwu, anyị nọsie ike n’ọgbakọ Jehova, na-eme ihe Baịbụl kwuru, kwekwa ka mmụọ nsọ Jehova na-eduzi anyị, anyị agaghị ‘atọsa ihe Chineke kekọtara.’—Mak 10:9.

^ [1] (paragraf nke 5) Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ [2] (paragraf nke 13) Gụọ akwụkwọ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,” n’isiokwu ndị ọzọ bụ́ “Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ịgba Alụkwaghịm na Nkewa.”