Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌGỌST 2016

Ebe Johannes Rauthe na ụmụnna ndị ọzọ pụtara ozi ọma, ikekwe n’agbata afọ 1921 na 1929

 IHE SÍ N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

“Ihe M Na-arụpụta Na-eme Ka E Too Jehova”

“Ihe M Na-arụpụta Na-eme Ka E Too Jehova”

“AGHA niile a lụrụ n’oge gara aga enweghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere agha kpụ ọkụ n’ọnụ ugbu a na Yurop.” Otú a ka Ụlọ Nche September 1, 1915, si kọwaa Agha Ụwa Mbụ, nke ihe dị́ ka mba iri atọ mechara soro lụọ. Agha ahụ mere ka Ụlọ Nche ọzọ kwuo, sị: “E kponyerela anyị ájá na garị n’ozi ọma anyị na-ekwusa, karịchaa na Jamanị na Frans.”

N’oge ahụ Agha Ụwa Mbụ kpụ ọkụ n’ọnụ, Ndị Mmụta Baịbụl aghọtachaghị na Ndị Kraịst ekwesịghị iso gaa agha. Ma, ha kpebisiri ike ịna-ekwusa ozi ọma. Nwanna Wilhelm Hildebrandt tụrụ ọda traktị bụ́ The Bible Students Monthly n’asụsụ French maka na ọ chọrọ ịna-ekwusa ozi ọma otú o nwere ike. Ọ bụghị onye kọpọtụa na Frans, (ya bụ, onye ozi oge niile), kama ọ bụ onye agha ndị Jamanị. O juru ndị Frans na-agafe agafe anya na onye a yí uwe ndị agha e weere ka onye iro na-ezi ha ozi ọma gbasara udo.

Ihe e kwuru n’akwụkwọ ozi ndị e biri n’Ụlọ Nche gosiri na ọ gụsiri ọtụtụ ndị ọzọ bụ́ Ndị Mmụta Baịbụl na Jamanị ike ịna-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke mgbe ha bụ ndị agha. Nwanna Lemke, onye só ná ndị agha mmiri, kwuru na mmadụ ise n’ime ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ nwere mmasị. O dere, sị: “Ma n’ụgbọ mmiri a, ihe m na-arụpụta na-eme ka e too Jehova.”

Nwanna Georg Kayser bụ onye soja mgbe ọ gara n’ọgbọ agha, ma bụrụ onye na-efe Chineke lọta. Gịnị meziri? E nwere otú o si nweta otu n’ime akwụkwọ Ndị Mmụta Baịbụl, were obi ya niile nabata eziokwu Baịbụl ma kwụsị ịlụ agha, rụwaziere ndị agha ọrụ na-agbasaghị ịlụ agha. Mgbe agha ahụ biri, o ji ịnụ ọkụ n’obi sụọ ụzọ ọtụtụ afọ.

Ọ bụ eziokwu na Ndị Mmụta Baịbụl aghọtachaghị na Ndị Kraịst ekwesịghị iso gaa agha, echiche ha na omume ha eyitụdịghị nke ndị jí aka abụọ nabata agha ahụ. Ndị ọchịchị na ndị isi chọọchị kwadosiri agha ahụ ike, ma Ndị Mmụta Baịbụl dụnyeere “Onyeisi Udo” úkwù. (Aịza. 9:6) Ọ bụ  eziokwu na ụfọdụ n’ime ha so yiri uwe ndị agha, ha kwetasiri ike n’ihe Konrad Mörtter, só ná Ndị Mmụta Baịbụl, kwuru. Ọ sịrị: “O doro m anya na Baịbụl sịrị na Onye Kraịst ekwesịghị igbu ọchụ.”—Ọpụ. 20:13. *

Hans Hölterhoff ji obere trọk a na-akpọsa magazin bụ́ The Golden Age

Na Jamanị, e nweghị iwu sịrị na mmadụ nwere ike ịhapụ ịga agha n’ihi na akọnuche ya ekweghị ya. Ma, ihe karịrị iri Ndị Mmụta Baịbụl abụọ jụrụ ime ihe ọ bụla gbasara ịga agha. E weere ụfọdụ n’ime ha ka ndị isi mebiri. Dị ka ihe atụ, a kpọgara Nwanna Gustav Kujath n’ebe a na-agwọ ndị ara ma nye ya ọgwụ ụra. Nwanna Hans Hölterhoff ekweghị aga agha. Ha atụọ ya mkpọrọ, ya anọrọkwa ebe ahụ jụ ọrụ ọ bụla gbasara ịlụ agha. Ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ ji ụdị uwe e ji eke mmadụ agbụ kee ya ruo mgbe aka ya na ụkwụ ya dịzi ya ka hà akpọnwụọla. Ma, Nwanna Hans rubeere Jehova isi n’oge ahụ niile a lụrụ agha.

E nwere ụmụnna ndị ọzọ a kpụụrụ, ma ha ajụ ịga agha, rịọ ka e nye ha ọrụ na-agbasaghị ịlụ agha. * Otú ahụ ka Nwanna Johannes Rauthe mere, ha akpọrọ ya ka ọ gaa rụwa ọrụ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè. Ọrụ e nyere Nwanna Konrad Mortter bụ ka ọ na-enyere ndị nọọsụ na ndị dọkịta aka, Reinhold Weber abụrụ nọọsụ. Obi dị Nwanna August Krafzig ụtọ na ọrụ e nyere ya abụghị ụdị ọrụ ga-eme ka ọ gaa n’ọgbọ agha. Ndị Mmụta Baịbụl ndị a na ndị ọzọ dị́ ka ha kpebisiri ike ijere Jehova ozi n’ihi ihe ha ghọtara banyere ịhụ ndị ọzọ n’anya na irubere Chineke isi.

N’ihi otú Ndị Mmụta Baịbụl si kpaa àgwà n’oge ahụ a na-alụ agha, ndị ọchịchị malitere ịna-enyocha ha. Mgbe agha ahụ gachara, a kpọpụrụ Ndị Mmụta Baịbụl nọ́ na Jamanị ụlọikpe ọtụtụ ugboro maka ozi ọma ha na-ekwusa. Iji nyere ha aka, alaka ụlọ ọrụ anyị dị́ na Jamanị hiwere ngalaba na-ahụ maka okwu iwu na Betel dị́ na Magdebọg.

Ndịàmà Jehova ji nwayọọ nwayọọ ghọtakwuo na Ndị Kraịst ekwesịghị ịga agha. Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ malitere, ha ekweghị eme ihe ọ bụla gbasara ịlụ agha. Ọ bụ ya mere ndi ọchịchị Jamanị ji were ha ka ndị iro, meekwa ka ha jiri anya ha hụ ntị ha. Ma, anyị ga-akọ gbasara ya n’ihe a ga-ebipụta n’ọdịnihu n’isiokwu a bụ́ “Ihe Sí n’Ebe Anyị Na-edebe Ihe Ochie.”—Ihe sí n’ebe anyị na-edebe ihe ochie n’alaka ụlọ anyị dị́ na Jamanị.

^ para. 7 Gụọ ihe Ndị Mmụta Baịbụl na Briten n’oge a na-alụ Agha Ụwa Mbụ kọrọ n’isiokwu bụ́ “Ihe Sí n’Ebe Anyị Na-edebe Ihe Ochie—Ha Kwụsiri Ike ‘n’Oge Awa nke Ule,’” n’Ụlọ Nche Mee 15, 2013.

^ para. 9 A tụrụ aro ka e mee otú a ná Mpịakọta nke Isii nke akwụkwọ bụ́ Millennial Dawn (1904) nakwa n’Ụlọ Nche August 1906 nke asụsụ Jaman. Ụlọ Nche September 1915 mere ka anyị ghọtakwuo ihe gbasara ịga agha ma tụọrọ Ndị Mmụta Baịbụl aro ka ha ghara ịga agha. Ma, e bipụtaghị isiokwu ahụ n’Ụlọ Nche nke asụsụ Jaman.