Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌGỌST 2016

Ị̀ Ghọtara Ihe Mere I Ji Kwesị Ịna-azụ Ndị Ọzọ?

Ị̀ Ghọtara Ihe Mere I Ji Kwesị Ịna-azụ Ndị Ọzọ?

“M ga-enye unu ezi ntụziaka.”—ILU 4:2.

ABỤ: 93, 96

1, 2. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-azụ ndị ọzọ ka ha ruo eru ịrụ ọrụ ọgbakọ?

IKWUSA ozi ọma Alaeze Chineke bụ ọrụ kacha Jizọs mkpa. Ma, o wepụtara oge zụọ ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ na ndị nkụzi. (Mat. 10:5-7) Ọ bụ eziokwu na Filip kwusasiri ozi ọma ike, o doro anya na o nyeere ụmụ ya ndị nwaanyị anọ aka ịmụta otú e si akụziri ndị ọzọ eziokwu Baịbụl. (Ọrụ 21:8, 9) Taa, olee ihe mere o ji dị́ mkpa ka a na-azụ ndị ọzọ?

2 N’ụwa niile, ọtụtụ ndị na-anabatakwu ozi ọma anyị na-ekwusa. Ndị ọhụrụ a na-emebeghị baptizim kwesịrị ịmata ihe mere o ji dị́ mkpa ka ha na-amụ ihe. E kwesịkwara ịkụziri ha otú ha ga-esi na-ezi ndị ọzọ ozi ọma, na-akụzikwara ha eziokwu Baịbụl. N’ọgbakọ anyị dị́ iche iche, e kwesịrị ịna-agba ụmụnna nwoke ume ka ha na-agbasi mbọ ike iru eru ịbụ ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye. Ndị nọterela aka n’ọgbakọ kwesịrị ịna-enye ndị ọhụrụ “ezi ntụziaka,” nke ga-enyere ha aka ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ.—Ilu 4:2.

 NA-AKỤZIRI NDỊ ỌHỤRỤ OTÚ HA GA-ESI NA-AMỤ BAỊBỤL

3, 4. (a) Gịnị ka Pọl kwuru iji gosi na e nwere otú ịmụ Baịbụl si gbasa ikwusa ozi ọma otú ga-aba uru? (b) Tupu anyị agbawa ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ume ịna-amụ Baịbụl n’onwe ha, gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme?

3 Gịnị mere ịmụ Baịbụl ji dị́ ezigbo mkpa? Pọl onyeozi zara ajụjụ a n’ihe ọ gwara Ndị Kraịst ibe ya nọ́ na Kọlọsi. O dere, sị: “Anyị akwụsịbeghị ikpe ekpere maka unu malite n’ụbọchị anyị nụrụ ya nakwa ịrịọ arịrịọ ka unu jupụta n’ezi ihe ọmụma nke uche [Chineke] n’amamihe niile na nghọta ime mmụọ, ka unu wee na-eje ije n’ụzọ kwesịrị Jehova iji na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu, ka unu na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ ọ bụla ma na-enwekwu ezi ihe ọmụma nke Chineke.” (Kọl. 1:9, 10) Eziokwu ụmụnna ndị ahụ nọ́ na Kọlọsi mụtara ga-enyere ha aka ‘ịna-eje ije n’ụzọ kwesịrị Jehova iji na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu.’ Ọ ga-emekwa ka ha “na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ ọ bụla,” karịchaa n’ikwusa ozi ọma. Ihe ga-enyere mmadụ aka ịna-efe Jehova nke ọma bụ ịna-agụ Baịbụl, na-amụchikwa ya anya. Ọ bụ ihe anyị kwesịrị ime ka ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ghọta.

4 Tupu anyị enyewere ndị ọzọ aka irite uru n’ọmụmụ ihe nke ha, obi kwesịrị isi anyị ike na ịmụ ihe bara ezigbo uru. N’eziokwu, anyịnwa kwesịrị ịna-amụchi Baịbụl anya. N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Mmadụ kwuo ihe dị́ iche n’ihe Baịbụl kwuru ma ọ bụ jụọ ajụjụ ndị siri ike, m̀ ga-ejili Baịbụl zaa onye ahụ ajụjụ ya? M gụọ banyere otú Jizọs, Pọl, na ndị ọzọ si gbasie mbọ ike n’ozi ọma, m̀ na-atụgharị uche n’otú ihe ahụ ha mere kwesịrị isi baara m uru n’ozi m na-ejere Jehova?’ Ihe Baịbụl na-akụzi na ndụmọdụ dị́ na ya ga-abara anyị niile uru. Ọ bụrụ na anyị agwa ndị ọzọ ihe anyị mụtara mgbe anyị na-amụ Baịbụl na uru ọ baara anyị, anyị nwere ike ịgba ha ume ịmụsikwu Baịbụl ike ka hanwa ritekwa uru otú ahụ.

5. Olee otú i nwere ike isi nyere ndị ọhụrụ aka ịna-amụchi Baịbụl anya?

5 I nwere ike ịjụ, sị, ‘Olee otú m nwere ike isi kụziere onye m na-amụrụ ihe ka ọ na-amụchi Baịbụl anya?’ Ihe mbụ i nwere ike ime bụ igosi ya otú ọ ga-esi buru ụzọ mụọ ebe gị na ya ga-amụ. I nwere ike ịgwa ya ka ọ gụọ ihe e dere ná ngwụcha akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? ma gụọ amaokwu Baịbụl ndị e dere na ya. Nyere ya aka ịna-akwadebe maka ọmụmụ ihe ka o nwee ike ịna-aza ajụjụ. Gbaa ya ume ka ọ na-agụ Ụlọ Nche na Teta! ọ bụla e bipụtara. Ọ bụrụ na e nwere Watchtower Library ma ọ bụ Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET n’asụsụ ya, i nwere ike igosi ya otú e si eji ya aza ajụjụ ndị sí na Baịbụl. I sí otú  ahụ nyere ya aka, ịmụ Okwu Chineke nwere ike ịtọwa ya ụtọ n’oge na-adịghị anya.

6. (a) Olee otú i nwere ike isi nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ka ịmụ Baịbụl tọwa ya ụtọ? (b) Gịnị ka onye a na-amụrụ ihe nwere ike ime ma ịmụ Baịbụl tọwa ya ezigbo ụtọ?

6 N’eziokwu, anyị ekwesịghị inyewe mmadụ nsogbu ka ọ gụọ Baịbụl ma ọ bụ mụọ ya. Kama, ka anyị jiri ngwá ọrụ ndị nzukọ Jehova wepụtaara anyị na-egosi onye anyị na-amụrụ ihe otú ịmụ Baịbụl ga-esi na-atọ ya ụtọ. Ka oge na-aga, o nwere ike ịdị onye ahụ otú ọ dị otu ọbụ abụ, bụ́ onye sịrị: “Ịbịaru Chineke nso dị m mma. Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ka m ji mere ebe mgbaba.” (Ọma 73:28) Jehova ga-eji mmụọ nsọ ya nyere onye a na-amụrụ ihe chọrọ ịbịaru ya nso aka.

NA-AKỤZIRI NDỊ ỌHỤRỤ OTÚ E SI EZI OZI ỌMA NA OTÚ E SI AKỤZIRI MMADỤ IHE

7. Olee otú Jizọs si kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi kwusaa ozi ọma? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

7 Na Matiu isi iri, anyị na-ahụ ntụziaka Jizọs nyere ndịozi ya iri na abụọ. Kama ịkọrọ gaa n’elu kọrọ gaa n’ala, ọ kapịrị ndụmọdụ o nyere ha ọnụ. [1] Ndịozi ya gere ntị mgbe ọ na-akụziri ha otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma nke ọma. Ha gaziri kwusawa ozi ọma. Ebe ọ bụ na ha hụrụ otú Jizọs si na-ezi ozi ọma, ọ dịghị anya, ha aghọọ aka ochie n’ịkụzi eziokwu Baịbụl. (Mat. 11:1) Anyị nwere ike ịkụziri ndị anyị na-amụrụ ihe otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma nke ọma. Ka anyị leba anya n’ụzọ abụọ anyị nwere ike isi nyere ha aka.

8, 9. (a) Olee otú Jizọs si zie ndị mmadụ ozi ọma? (b) Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọhụrụ aka ịna-agwa ndị mmadụ okwu otú ahụ Jizọs mere?

8 Na-agwa ndị mmadụ okwu. Ọtụtụ mgbe, Jizọs gwara ndị mmadụ okwu n’otu n’otu banyere Alaeze Chineke. Dị ka ihe atụ, ya na otu nwaanyị kparịtara ụka n’akụkụ olulu mmiri Jekọb dị́ nso n’obodo Saịka. (Jọn 4:5-30) Onye ọzọ ọ gwara okwu bụ Matiu bụ́ ọnaụtụ, onye a kpọkwara Livaị. Baịbụl agwachaghị anyị ihe ha kwurịtara. Ma Jizọs gwara ya ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ ya, ya ekweta. Matiu mechara kpọọ Jizọs na ndị ọzọ ka ha bịa rie nri n’ụlọ ya. N’ebe ahụ, Jizọs gwara ọtụtụ ndị okwu.—Mat. 9:9; Luk 5:27-39.

9 N’oge ọzọ, Jizọs weturu obi gwa Nataniel okwu n’agbanyeghị na Nataniel kwuru ihe na-adịghị mma banyere ndị Nazaret. Ma, ihe Jizọs kwuru mere ka ọ gbanwee ihe o chere. O kpebiri ịmụtakwu ihe Jizọs, bụ́ onye sí Nazaret, na-akụzi. (Jọn 1:46-51) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-akụziri ndị ọhụrụ otú ha ga-esi wetuo obi ma jiri obiọma na-agwa ndị mmadụ okwu. [2] Anyị sí otú a na-enyere ndị ọhụrụ aka, obi ga-adị ha ụtọ ịhụ otú ndị nwere ezi obi si ege ha ntị n’ihi na ha ji obiọma gwa ha okwu ma gosi na ha nwere mmasị n’ebe ha nọ.

10-12. (a) Olee otú Jizọs si kụziere ndị nwere mmasị n’ozi ọma ihe? (b) Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị nkwusa ọhụrụ aka ịna-akụzikwu eziokwu Baịbụl nke ọma?

10 Na-akụziri ndị nwere mmasị ihe. Oge Jizọs nwere ije ozi ya ebughị ibu. Ma, o wepụtara oge na-akụziri ndị chọrọ ịmụtakwu ihe ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, otu ụbọchị, ìgwè mmadụ gbakọrọ n’akụkụ osimiri ka ha nụ okwu Jizọs. N’ihi ya, Jizọs na Pita banyere n’ụgbọ mmiri, Jizọs anọrọ ebe ahụ na-akụziri ha ihe. Ọ rụrụ ọrụ ebube, mee ka Pita gbute azụ̀ buru ibu. Ọ gwaziri Pita, sị: “Site ugbu a gaa n’ihu, ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.” Gịnị ka Pita na ndị só ya mere n’ihi ihe Jizọs kwuru na ihe o mere? ‘Ha kwọọrọ  ụgbọ ndị ahụ gaghachi n’elu ala, gbahapụkwa ihe niile ma soro Jizọs.’—Luk 5:1-11.

11 Ihe Jizọs na-akụzi masịrị Nikọdimọs, bụ́ onye só n’òtù Sanhedrin. Ọ chọrọ ịmụtakwu ihe, ma ọ nọ na-atụ ụjọ ihe ndị mmadụ ga-ekwu ma ha hụ ka ya na Jizọs na-akparịta ụka. Ọ bụ ya mere o ji bịakwute Jizọs n’abalị. Jizọs achụpụghị ya, kama o wepụtara oge kụziere ya ihe. (Jọn 3:1, 2) Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ndị a a kọrọ na Baịbụl? Ọkpara Chineke wepụtara oge kụziere ndị mmadụ ihe ga-eme ka ha nwee okwukwe. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-agba mbọ na-agara ndị nwere mmasị nletaghachi, na-amụkwara ha ihe?

12 Ndị nkwusa ọhụrụ nwere ike ịmụtakwu otú ha ga-esi na-akụzi Baịbụl ma ọ bụrụ na anyị na ha ana-arụ n’ozi ọma. Anyị nwere ike inyere ha aka ịna-eche banyere ndị gosidịrị obere mmasị. Anyị nwere ike ịgwa ha ka ha soro anyị ma anyị gawa nletaghachi nakwa ịmụrụ ndị ọzọ ihe. Anyị sí otú a na-azụ ha ma na-agba ha ume, ha ga-achọkwu ịna-akụziri ndị nwere mmasị ihe, na-amụkwara ha Baịbụl. Ha ga-amụtakwa na ọ bụghị obere ihe mee, ha adaa mbà, kama na ha kwesịrị ịna-enwe ndidi n’ozi ha.—Gal. 5:22; gụọ ihe dị́ n’igbe bụ́ “ Ọ Daghị Mbà.”

NA-AKỤZIRI NDỊ ỌZỌ KA HA NA-EJERE ỤMỤNNA HA OZI

13, 14. (a) Gịnị ka i chere banyere ndị Baịbụl gwara anyị na ha gbara ezigbo mbọ iji nyere ndị ọzọ aka? (b) Olee ụzọ ụfọdụ i nwere ike isi kụziere ndị ọhụrụ na ndị na-eto eto ka ha na-ahụ ụmụnna ha n’anya?

13 Ihe ndị a kọrọ na Baịbụl na-eme ka anyị mata na anyị kwesịrị ‘ịna-ahụ ụmụnna anyị n’anya,’ na-ejekwara ha ozi. (Gụọ 1 Pita 1:22; Luk 22:24-27.) Ọkpara Chineke ji ihe niile o nwere, ma ndụ ya, jeere ndị ọzọ ozi. (Mat. 20:28) Dọkas “jupụtara n’ezi ọrụ na onyinye ebere nke ọ na-enye.” (Ọrụ 9:36, 39) Meri, bụ́ otu nwanna nwaanyị bí na Rom, rụụrụ ndị ọgbakọ ha “ọrụ dị ukwuu.” (Rom 16:6) Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọhụrụ aka ịmata na ha kwesịrị ịna-enyere ụmụnna ha aka?

Na-akụziri ndị ọhụrụ otú ha ga-esi na-ahụ ụmụnna ha n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na 14)

14 Anyị nwere ike ịkpọ ha ka ha soro anyị gaa leta onye ọrịa ma ọ bụ onye agadi. Ndị nne na nna nwere ike ịkpọrọ ụmụ ha gaa leta ụdị ndị ahụ. Ndị okenye hazie otú a ga-esi na-enye ụmụnna merela agadi nri ma ọ bụ na-arụziri ha ụlọ ha, ha nwere ike ịgwa ndị na-eto eto ma ọ bụ ndị ọhụrụ ka ha nye aka. Ndị na-eto eto na ndị ọhụrụ hụ otú ụmụnna si emere ibe ha ihe ọma, ha ga-amụtakwa ime otú ahụ. Otu okenye kwusawa ozi ọma n’ókèala ha bụ́ ime obodo, ọ na-aga eleta ụmụnna bí n’ebe ahụ ka ọ mara otú ha mere. Ihe a ọ na-eme mere ka otu nwanna, bụ́ nwa okorobịa ya na ya na-esokarị aga, mụta ịna-eche otú ọ ga-esi na-enyere ụmụnna aka.—Rom 12:10.

15. Gịnị mere o ji dị́ mkpa ka ndị okenye na-enyere ụmụ nwoke nọ́ n’ọgbakọ aka?

15 Ebe ọ bụ na Jehova na-eji ndị nwoke akụziri ọgbakọ ya ihe, ọ dị mkpa ka ha mụta otú e si akụzi ihe nke ọma ma ha mewe ihe omume ha. Ọ bụrụ na ị bụ okenye, ì nwere ike ige ntị mgbe ohu na-eje ozi na-amụgharị okwu ọ ga-ekwu? I nyere ya aka, o nwere ike ịmụtakwu otú ọ ga-esi na-akụzi Okwu Chineke.—Nehe. 8:8. [3]

16, 17. (a) Olee otú Pọl si gosi na ọ chọrọ ka Timoti na-eme nke ọma? (b) Olee otú ndị okenye nwere ike isi na-azụ ndị ga na-elekọta ọgbakọ n’ọdịnihu?

16 A chọkwuru ndị ga-abụ ndị ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. E kwesịkwara ịna-azụ ndị ga-arụ ụdị ọrụ ahụ n’ọdịnihu. Pọl kọwara otú e nwere ike isi  na-azụ mmadụ. Ọ gwara Timoti, sị: “Gị onwe gị, nwa m, na-enweta ike n’obiọma na-erughịrị mmadụ nke dị n’ime Kraịst Jizọs. Ihe ị nụrụ n’ọnụ m, nke ọtụtụ ndị gbara àmà ya, nyefee ya n’aka ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị ga-erukwa eru nke ọma ịkụziri ya ndị ọzọ.” (2 Tim. 2:1, 2) Timoti mụtara ọtụtụ ihe n’aka Pọl, onye bụ́ ma okenye ma onyeozi. Ọ mụtara otú ọ ga-esi na-ekwusakwu ozi ọma nke ọma na otú ọ ga-esi na-enyere ndị ọzọ aka n’ọgbakọ.—2 Tim. 3:10-12.

17 Pọl ejighị ịzụ Timoti gwuo egwu. Ọ kpọọrọ ya ka o soro ya na-eje ozi. (Ọrụ 16:1-5) Ndị okenye nwere ike iṅomi Pọl. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịkpọrọ ndị ohu na-eje ozi ruru eru gaa nleta ọzụzụ atụrụ mgbe ọ dabara adaba. Ha mee otú ahụ, ha ga-enyere ndị ohu na-eje ozi aka ịmụta otú ndị okenye si akụzi ihe, okwukwe ha, ogologo ntachi obi ha, na ịhụnanya ha. Ha ga-amụtakwa otú ndị okenye si atụkwasị Jehova obi mgbe ha na-elekọta “ìgwè atụrụ Chineke.”—1 Pita 5:2.

IHE MERE ỊZỤ NDỊ ỌZỌ JI DỊ́ MKPA

18. Gịnị mere anyị ji kwesị iji ịzụ ndị ọzọ n’ozi Jehova kpọrọ ihe?

18 N’oge ikpeazụ a, e kwesịrị ịkụziri ọtụtụ ndị ọhụrụ otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma nke ọma. A chọkwukwara ụmụnna nwoke ga-amụta otú e si elekọta ọgbakọ. Jehova chọrọ ka a zụọ ndị ohu ya niile nke ọma. O nyekwara anyị ihe ùgwù inyere ndị ọhụrụ aka. Ọ bụ ihe mere o ji dị́ mkpa ka anyị na-agbasi mbọ ike ịzụ ndị ọzọ otú ahụ Jizọs na Pọl mere. Anyị kwesịrị ịna-azụkwu ọtụtụ ndị n’ihi na a ka nwere ọtụtụ ihe a ga-arụ n’ikwusa ozi ọma tupu ọgwụgwụ abịa.

19. Gịnị mere obi ji kwesị isi gị ike na mbọ ị na-agba ịzụ ndị ọzọ n’ozi Jehova ga-aga nke ọma?

19 O doro anya na ịzụ ndị ọzọ na-ewe oge, ọ dịghịkwa mfe. Ma, Jehova na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ga na-akwado anyị, na-enyekwa anyị amamihe anyị ga-eji na-azụ ha. Obi ga-adị anyị ụtọ ịhụ ka ndị anyị nyeere aka ‘na-arụsi ọrụ ike, na-adọgbukwa onwe ha n’ọrụ.’ (1 Tim. 4:10) Ka anyịnwa jisiekwa ike na-emekwu nke ọma n’ijere Jehova ozi dị́ nsọ.

^ [1] (paragraf nke 7) Dị ka ihe atụ, Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya (1) ịna-ekwusa gbasara Alaeze Chineke; (2) ịtụkwasị Chineke obi ka o nye ha nri na uwe; (3) ka ha na ndị mmadụ ghara ise okwu; (4) ịtụkwasị Chineke obi ma e megidewe ha; nakwa (5) ka ha ghara ịtụ ụjọ.

^ [2] (paragraf nke 9) A tụrụ aro ndị magburu onwe ha gbasara otú anyị ga-esi na-agwa ndị mmadụ okwu n’ozi ọma n’akwụkwọ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, peeji nke 62 ruo 64.

^ [3] (paragraf nke 15) Akwụkwọ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, peeji nke 52 ruo 61, kọwara otú ụmụnna ga-esi mụtakwuo ikwu okwu nke ọma n’ọgbakọ.