Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2016

Ha Si n’Okpukpe Ụgha Pụta

Ha Si n’Okpukpe Ụgha Pụta

“Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta.”—MKPU. 18:4.

ABỤ: 101, 93

1. Olee otú anyị si mara na a ga-anapụta ndị Chineke n’aka Babịlọn Ukwu ahụ? Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

N’ISIOKWU bu nke a ụzọ, anyị hụrụ otú Babịlọn Ukwu ahụ si dọrọ Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi n’agha. Ma, obi dị anyị ụtọ na ha agaghị anọ otú ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Chineke nyere iwu, sị, “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta.” Iwu a agaghị enwe isi na ọdụ ma ọ bụrụ na mmadụ agaghị esili n’okpukpe ụgha pụta. (Gụọ Mkpughe 18:4.) Anyị chọsiri ike ịma mgbe a napụtara ndị Chineke kpamkpam n’aka Babịlọn Ukwu ahụ. Ma, ajụjụ ndị anyị ga-ebugodị ụzọ zaa bụ: Gịnị ka Ndị Mmụta Baịbụl katara obi mee gbasara Babịlọn Ukwu ahụ tupu afọ 1914? Ụmụnna anyị hà nọ na-ekwusasi ozi ọma ike mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ? Babịlọn Ukwu ahụ ọ̀ dọọrọ ndị Chineke n’agha n’oge ahụ n’ihi na e kwesịrị ịgbazi ha, dọọkwa ha aka ná ntị?

“BABỊLỌN ADAALA”

2. Gịnị ka Ndị Mmụta Baịbụl kpebiri gbasara okpukpe ụgha tupu Agha Ụwa Mbụ?

2 Ọtụtụ afọ tupu Agha Ụwa Mbụ, Nwanna Charles Taze Russell na Ndị Mmụta Baịbụl ndị ọzọ ghọtara na Krisendọm anaghị akụzi eziokwu Baịbụl. Ọ bụ ihe mere ha ji kpebie na e nweghị ihe ga-ejikọ ha na okpukpe  ụgha. Ụlọ Nche Bekee nke Nọvemba 1879 kwuru hoo haa na chọọchị ọ bụla nke kwuru na ya bụ nwaanyị ahụ Kraịst na-alụ ọhụrụ, ma ya ana-akwado ndị ọchịchị n’eziokwu, so na Babịlọn Ukwu ahụ Baịbụl kpọrọ nwaanyị akwụna.—Gụọ Mkpughe 17:1, 2.

3. Gịnị ka Ndị Mmụta Baịbụl mere iji gosi na ha achọghị ka e nwee ihe ga-ejikọ ha na okpukpe ụgha? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 Ndị na-atụ egwu Chineke n’oge ahụ matara ihe ha kwesịrị ime. Ha ekwesịghị ịtụ anya ka Chineke gọzie ha ma ọ bụrụ na ha na-akwado okpukpe ụgha. N’ihi ya, ọtụtụ Ndị Mmụta Baịbụl degaara chọọchị ha akwụkwọ ozi, kwuo na ha abụghịzi ndị òtù ha. Mgbe ụfọdụ, ha na-agụ akwụkwọ ozi ahụ n’ihu mmadụ niile na chọọchị. Ọ bụrụ na e kweghị ka a gụọ ya na chọọchị, ụfọdụ na-ezigara onye ọ bụla nọ́ na chọọchị ha akwụkwọ ozi ahụ. Ha achọghịzi ka e nwee ihe ga-ejikọ ha na okpukpe ụgha. Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, ime ụdị ihe ahụ gaara ata isi ha. Ma n’ihe dị ka afọ 1870, ndị ọchịchị n’ọtụtụ obodo anaghịzi akwado ndị chọọchị otú ha sibu akwado ha. N’obodo ndị ahụ, ụjọ anaghịzi atụ ndị mmadụ ikwu gbasara okpukpe ma kwuo hoo haa na ha ekwetaghị ihe a na-akụzi na chọọchị.

4. Mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ, olee otú Ndị Mmụta Baịbụl si were Babịlọn Ukwu ahụ? Kọwaa.

4 Ndị Mmụta Baịbụl ghọtara na ihe ha kwesịrị ime abụghị naanị ịgwa ndị ikwu na ibe na ndị chọọchị ha na aka ha apụọla n’okpukpe ụgha. Ha kwesịrị ime ka ụwa niile mata na Babịlọn Ukwu ahụ bụ nwaanyị akwụna. N’ihi ya, n’agbata Disemba 1917 na mmalite afọ 1918, Ndị Mmụta Baịbụl dị́ puku ole na ole n’oge ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi kesaa nde traktị iri, nke isiokwu ya bụ “Babịlọn Adaala.” Traktị ahụ gbara ozizi ụgha Krisendọm n’anwụ. O kwesịghị iju anyị anya na ezigbo iwe were ndị ụkọchukwu. Ma, Ndị Mmụta Baịbụl akwụsịghị ịrụ ọrụ ahụ dị́ mkpa ha na-arụ. Ha kpebisiri ike ‘ịna-erubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.’ (Ọrụ 5:29) Gịnị ka ihe a na-egosi? Ọ na-egosi na Babịlọn Ukwu ahụ adọọrọghị Ndị Kraịst ndị ahụ n’agha mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ. Kama, ha si n’okpukpe ụgha na-apụta, na-enyekwara ndị ọzọ aka ime otú ahụ.

HA JI ỊNỤ ỌKỤ N’OBI NA-EKWUSA OZI ỌMA N’OGE AGHA ỤWA MBỤ

5. Gịnị mere anyị ji kwuo na ụmụnna anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ?

5 N’afọ ndị gara aga, anyị kwuru na Jehova wesara ndị ya iwe n’ihi na ha ejighị ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ. Ọ bụ ya mere anyị ji chee na Jehova kwere ka Babịlọn Ukwu ahụ dọrọ ha n’agha obere oge. Ma, ụmụnna ndị ji obi ha niile fee Chineke n’agbata afọ 1914 na 1918 mechara mee ka o doo anya na Ndị Mmụta Baịbụl gbalịsiri ike ịna-ekwusa ozi ọma. E nwere ezigbo ihe gosiri na ihe a ha kwuru bụ eziokwu. Otú anyị si ghọtakwuo ihe mere Ndị Mmụta Baịbụl n’oge ahụ emeela ka anyị ghọtakwuo ihe ụfọdụ a kọrọ na Baịbụl.

6, 7. (a) Olee nsogbu ndị bịaara Ndị Mmụta Baịbụl mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ? (b) Olee ihe ndị gosiri na Ndị Mmụta Baịbụl ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma?

 6 Nke bụ́ eziokwu bụ na Ndị Mmụta Baịbụl kwusasiri ozi ọma ike n’oge a na-alụ Agha Ụwa Mbụ. E nwere ọtụtụ ihe mere o ji bụrụ na ọ dịghịrị ha mfe. Anyị ga-eleba anya n’abụọ n’ime ha. Nke mbụ bụ na ihe ha kacha eme n’oge ahụ bụ ikesara ndị mmadụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Mgbe ndị ọchịchị machibidoro akwụkwọ a na-akpọ The Finished Mystery iwu ná mbido afọ 1918, ikwusa ozi ọma siiri ọtụtụ ụmụnna anyị ike. Ha amụtabeghị otú e si eji naanị Baịbụl ezi ozi ọma. Ọ bụ akwụkwọ ahụ na-ekwuchitere ha ọnụ ha. Nke abụọ bụ ọrịa inflenza malitere n’afọ 1918. Otú ọrịa ọjọọ ahụ si na-efe ọtụtụ ndị mere ka o siere ụmụnna anyị ike ịna-aga ebe dị iche iche ekwusa ozi ọma. N’agbanyeghị ihe ndị a nakwa nsogbu ndị ọzọ, Ndị Mmụta Baịbụl gbasiri mbọ ike ịna-ekwusa ozi ọma.

Ndị Mmụta Baịbụl ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 na nke 7)

7 N’afọ 1914, Ndị Mmụta Baịbụl adịghị ọtụtụ. Ma, ha gosiri ihe karịrị nde mmadụ itoolu fim a kpọrọ “Photo-Drama of Creation.” Ihe a na-egosi na ya bụ fim ebe ndị mmadụ na-emegharị ahụ́, ahụ́ ha na-emegharị ana-adabakwa n’ihe a na-ekwu. Ọ kọrọ gbasara ụmụ mmadụ malite n’oge Adam ruo mgbe Jizọs ga-achịcha otu puku afọ. Ndị mmadụ ahụtụbeghị ụdị ya n’oge ahụ. Chegodị echiche. Ndị lere fim ahụ naanị n’afọ 1914 karịrị ndị nkwusa niile e nwere n’ụwa taa. Ihe ndị ọzọ a kọrọ gosiri na n’afọ 1916, narị puku mmadụ asatọ na itoolu, na narị atọ, iri itoolu na atọ bịara gee okwu ihu ọha n’Amerịka. N’afọ 1918, ndị bịara ruru narị puku itoolu na iri puku anọ na itoolu, narị anọ na iri anọ na anọ. O doro anya na Ndị Mmụta Baịbụl ndị ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma.

8. Olee otú ụmụnna Jehova ji na-eduzi ọgbakọ ya si na-agba Ndị Mmụta Baịbụl ume mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ?

8 Mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ, ụmụnna Jehova ji na-eduzi ọgbakọ ya gbasiri mbọ ike ịna-ekesara Ndị Mmụta Baịbụl akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, na-agbakwa ha ume. Ihe ndị a mere ka ụmụnna nwee ike ịna-ekwusa  ozi ọma. Nwanna Richard H. Barber so ná ndị na-ekwusasi ozi ọma ike n’oge ahụ. O kwuru, sị: “Anyị mere ka ụfọdụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-arụ ọrụ ha, meekwa ka a na-ekesa Ụlọ Nche, na-ezigakwa ya Kanada, bụ́ ebe a machibidoro ya iwu. M zigakwaara ụmụnna ụfọdụ akwụkwọ The Finished Mystery nke obere n’ihi na ndị ọchịchị jichiri nke ha nwebu. Nwanna Rutherford gwara anyị ka anyị hazie mgbakọ ndị a ga-eme n’ebe dị iche iche n’ebe ọdịda anyanwụ Amerịka ma ziga ụmụnna ka ha gaa gbaa ụmụnna anyị ume otú o kwere ha.”

E KWESỊRỊ ỊGBAZI HA

9. (a) Gịnị mere e ji kwesị ịgbazi ndị Chineke ma dọọ ha aka ná ntị n’agbata afọ 1914 na 1919? (b) Gịnị ka aka ná ntị e kwesịrị ịdọ ha na-apụtaghị?

9 Ọ bụghị ihe niile Ndị Mmụta Baịbụl mere n’agbata afọ 1914 na 1919 dabara adaba n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ọ bụ eziokwu na obi ha dị ọcha, ọ bụghị mgbe niile ka ha lere ndị ọchịchị anya otú ha kwesịrị isi na-ele ha. (Rom 13:1) N’ihi ya, ha tinyere aka n’agha mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, mgbe onyeisi ala Amerịka nyere iwu n’abalị iri atọ n’ọnwa Mee afọ 1918 ka e wepụta otu ụbọchị a ga-eji kpee ekpere maka udo, Ụlọ Nche gbara Ndị Mmụta Baịbụl ume ka ha soro mee ihe ahụ e kwuru. Ụfọdụ ụmụnna nyere onyinye iji kwado agha ahụ. Ụfọdụ ndị ghọdịrị ndị agha ma gaa agha. Ma, e kwesịghị iche na Babịlọn Ukwu ahụ dọọrọ Ndị Mmụta Baịbụl n’agha n’ihi na e kwesịrị ịgbazi ha ma dọọ ha aka ná ntị. Kama, ha ghọtara na ha kwesịrị isepụ aka n’okpukpe ụgha. Mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ, ọ fọrọ obere ka ha sepụchaa aka n’okpukpe ụgha.—Gụọ Luk 12:47, 48.

10. Olee otú Ndị Mmụta Baịbụl si gosi na ha na-akwanyere ndụ mmadụ ùgwù?

10 Ọ bụ eziokwu na Ndị Mmụta Baịbụl aghọtachaghị na Onye Kraịst ekwesịghị itinye aka n’agha otú anyị si ghọta ya ugbu a, ihe doro ha anya bụ na Baịbụl sịrị anyị egbula mmadụ. N’ihi ya, ụfọdụ ụmụnna ndị ji ngwá ọgụ gaa agha n’Agha Ụwa Mbụ ekweghị eji ya egbu mmadụ. A kpọgara ụfọdụ n’ime ha n’ihu agha, ka e gbuo ha.

11. Gịnị ka ndị ọchịchị mere mgbe Ndị Mmụta Baịbụl na-ekweghị alụ agha?

11 O doro anya na ezigbo iwe were Ekwensu maka ihe ụmụnna anyị mere n’ihe gbasara agha n’agbanyeghị na ha aghọtachaghị ihe niile. N’ihi ya, o ji iwu ndị ọchịchị kpatara ha nsogbu. (Ọma 94:20) Ọchịagha mba Amerịka bụ́ James Franklin Bell gwara Nwanna Rutherford na Nwanna Van Amburgh na Ngalaba Na-ahụ Maka Ikpe n’Amerịka agbalịala ime iwu ọhụrụ ga-eme ka a na-ama ndị na-ekweghị aga agha ikpe ọnwụ. Ọ bụ Ndị Mmụta Baịbụl ka o bu n’obi kwuo ya. Nwoke ahụ ji iwe na ọnụma sị Nwanna Rutherford: “E meghị iwu ahụ n’ihi na Wilson [bụ́ onyeisi ala Amerịka] ekweghị; ma anyị ma otú anyị ga-esi enweta unu. Anyị ga-eme ya.”

12, 13. (a) Gịnị mere e ji tụọ ụmụnna asatọ mkpọrọ ka ha nọọ ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ? (b) Mkpọrọ ahụ a tụrụ ha ò mere ka ha ghara irubere Jehova isi? Kọwaa.

12 Ndị ọchịchị gosiri na ọ bụghị egwuregwu ka ha na-egwu. A nwụchiri ụmụnna na-anọchite anya Watch Tower Society. Ha bụ Nwanna Rutherford, Van Amburgh, na ụmụnna isii ndị ọzọ.  Mgbe ọkàikpe na-ama ha ikpe, ọ sịrị: “Ihe ndị a na-akụzi n’okpukpe ha ga-emebiri anyị ihe karịa ìgwè ndị agha Jamanị. . . . Ọ bụghị naanị na ha na-ada ma iwu ndị ọchịchị ma iwu ndị agha, kama ha na-akatọkwa ndị isi chọọchị niile. E kwesịrị ịta ha ezigbo ahụhụ.” (Akwụkwọ bụ́ Faith on the March, nke A. H. Macmillan dere, peeji nke 99) Ha mere otú ahụ. A tụrụ ụmụnna asatọ ndị ahụ mkpọrọ ka ha nọọ ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ dị́ n’Atlanta, Jọgia. Ma, mgbe agha ahụ biri, a kpọpụtara ha n’ụlọ mkpọrọ, kagbuokwa ikpe ahụ a mara ha.

13 Mgbe ụmụnna asatọ ndị ahụ nọ n’ụlọ mkpọrọ, ha kpebisiri ike ime ihe ha ghọtara Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ha degaara onyeisi ala Amerịka akwụkwọ ozi, rịọ ka a kpọpụta ha n’ụlọ mkpọrọ. Ha dere, sị: “Akwụkwọ Nsọ kwuru na uche Onyenwe anyị bụ, ‘Gị egbula mmadụ.’ N’ihi ya, onye ọ bụla bụ́ Onye Mmụta Baịbụl nke nyefere Onyenwe anyị onwe ya ma kpachara anya mebie ọgbụgba ndụ ya na ya, ya na Chineke agaghịzi adị ná mma. Chineke ga-ebibikwa ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ya mere na onye ahụ agaghị ekweta iso gaa gbuo mmadụ.” Ihe a ha kwuru gosiri na ha katara obi. O doro anya na ụmụnna ndị ahụ achọghị imebi iwu Chineke.

NDỊ CHINEKE MECHARA NWERE ONWE HA

14. Kọwaa ihe Baịbụl kwuru mere n’agbata afọ 1914 na 1919.

14 Malakaị 3:1-3 buru amụma ihe ga-eme n’agbata afọ 1914 na mbido 1919 mgbe a ga-eme ka “ụmụ Livaị,” bụ́ ndị e tere mmanụ, dị ọcha. (Gụọ ya.) N’oge ahụ, Jehova Chineke, bụ́ ‘ezi Onyenwe anyị,’ bịara inyocha ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ ihe atụ ya, ya na Jizọs Kraịst, bụ́ “onye ozi nke ọgbụgba ndụ ahụ.” Mgbe Jehova gbazichara ndị ya, meekwa ka ha dị ọcha, ha dịzi njikere ịrụ ọrụ ọ ga-enye ha. N’afọ 1919, Jizọs họpụtara “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ka ọ na-enyeju ezinụlọ ya afọ. (Mat. 24:45) Ndị Chineke emechaala si na Babịlọn Ukwu ahụ pụta. Kemgbe ahụ, Jehova egosila ndị ya obiọma na-erughịrị ha, mee ka ha na-amụta ihe bụ́ uche ya, hụkwa Nna ha nke eluigwe n’anya. Obi dị ha ezigbo ụtọ na ọ gọziela ha. [1]

15. Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ na anyị si na Babịlọn Ukwu ahụ pụta?

15 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Chineke emeela ka anyị si na Babịlọn Ukwu ahụ pụta. Mbọ Setan gbara ikpochapụ ezigbo Ndị Kraịst n’ụwa kụrụ afọ n’ala. Ma, anyị ekwesịghị ichefu ihe mere Jehova ji mee ka anyị nwere onwe anyị. (2 Kọr. 6:1) Ndị ji obi ha niile na-achọ Chineke ka juru n’okpukpe ụgha. E kwesịrị igosi ha otú ha ga-esi pụta. Anyị nwere ike inyere ha aka. N’ihi ya, ka anyị na-agbalịsi ike inyere ha aka ka ha pụta otú ahụ ụmụnna anyị mere n’oge gara aga.

^ [1] (paragraf nke 14) E nwere ọtụtụ ụzọ ihe mere mgbe ndị Babịlọn dọọrọ ndị Juu n’agha si yie ihe mere mgbe ọtụtụ Ndị Kraịst si n’ezi ofufe pụọ. Ma, anyị agaghị asị na ihe ahụ ndị Babịlọn mere ndị Juu nọchiri anya ihe mere Ndị Kraịst. Ndị Juu biri na Babịlọn afọ iri asaa, ma Ndị Kraịst nọfere afọ iri asaa mgbe Babịlọn Ukwu ahụ dọọrọ ha n’agha. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịgbawa mbọ ka anyị hụ otú ihe niile gbasara ndọrọ ahụ a dọọrọ ndị Juu n’agha laa Babịlọn si yie ihe e mere Ndị Kraịst e tere mmanụ tupu afọ 1919.