Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2016

Ndị A Kpọpụtara n’Ọchịchịrị

Ndị A Kpọpụtara n’Ọchịchịrị

“[Jehova] kpọpụtara unu n’ọchịchịrị wee kpọba unu n’ìhè ya dị ebube.”—1 PITA 2:9.

ABỤ: 116, 102

1. Kọọ ihe ndị mere mgbe a na-ebibi Jeruselem.

N’AFỌ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst, eze Babịlọn bụ́ Nebukadneza nke Abụọ na ìgwè ndị agha ya bịara lụsoo Jeruselem ọgụ. Baịbụl kwuru otú ha si sụọ ndị Juu akwụ. Ọ sịrị: “[Nebukadneza] wee jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha n’ime ụlọ nsọ ha, o nweghịkwara nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, okenye ma ọ bụ agadi ume na-adịkwaghị ọmịiko. . . . O wee gbaa ụlọ ezi Chineke ọkụ ma kwatuo mgbidi Jeruselem; ha gbakwara ụlọ elu ya niile ọkụ, gbaakwa arịa ya niile dị oké ọnụ ahịa ọkụ, iji bibie ihe niile.”—2 Ihe 36:17, 19.

2. Olee aka ná ntị Jehova dọrọ ndị Juu gbasara mbibi a ga-ebibi Jeruselem, gịnịkwa ga-eme ha?

2 Mbibi e bibiri Jeruselem ekwesịghị iju ndị bi na ya anya. Ndị amụma Chineke dọrọ ha aka ná ntị ọtụtụ afọ na ọ bụrụ na ha akwụsịghị inupụrụ Iwu Chineke isi, ndị Babịlọn ga-anyụ ha ịkpakwụ. A ga-eji mma agha gbuo ọtụtụ ndị Juu. Onye ọ bụla a na-egbughị, a ga-adọrọ ya n’agha laa Babịlọn. Ọ ga-ebigide ebe ahụ nwụọ. (Jere. 15:2) Olee otú e si mesoo ndị a dọọrọ n’agha? È nwere otú ụdị ihe a mere ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn si mee Ndị Kraịst? Ọ bụrụ otú ahụ, olee mgbe o mere?

 OTÚ E SI MESOO NDỊ JUU A DỌỌRỌ N’AGHA LAA BABỊLỌN

3. Olee ihe dị iche n’otú ihe dịịrị ndị Izrel mgbe a dọọrọ ha n’agha laa Babịlọn na mgbe ha na-agba ohu n’Ijipt?

3 Ihe ahụ ndị amụma kwuru mechara mezuo. Jehova si n’ọnụ Jeremaya gwa ndị a dọọrọ n’agha laa Babịlọn ka ha were ihe niile otú ha hụrụ ya ma mee ihe niile ha nwere ike ime. Ọ sịrị ha: “Wuonụ ụlọ, biri n’ime ha, kọọnụ ubi, rie mkpụrụ ha. Chọọkwanụ udo nke obodo ahụ m mere ka a dọrọ unu n’agha laa na ya, kpekuokwanụ Jehova ekpere maka ya, n’ihi na ọ bụrụ na udo adị na ya, udo ga-adịrị unu onwe unu.” (Jere. 29:5, 7) Ndị rubere isi n’ihe a Chineke kwuru enwechaghị nsogbu na Babịlọn. Ndị dọọrọ ha n’agha kwere ka ha jiri aka ha na-ekpebi ihe ụfọdụ ha na-eme. A hapụdịrị ha ka ha na-agagharị na Babịlọn. Babịlọn bụ ebe na-ewu ewu n’ihe gbasara azụmahịa n’oge ochie. Ihe ndị e dere n’oge ochie gosiri na ọtụtụ ndị Juu mụrụ azụmahịa, ụfọdụ amụta ime nkà. Ụfọdụ ndị Juu ghọdịrị aka ji akụ̀. Ihe esighịrị ndị Izrel ike na Babịlọn otú o siiri ha mgbe ha na-agba ohu n’Ijipt ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ.—Gụọ Ọpụpụ 2:23-25.

4. E wezụga ndị Izrel bụ́ ndị nnupụisi, olee ndị so ná ndị a dọọrọ n’agha laa Babịlọn, gịnịkwa mere na ha enweghị ike ịna-eme ihe niile Iwu Chineke kwuru?

4 Ọ bụ eziokwu na ndị Juu a dọọrọ n’agha na-enweta ihe ha ji egbo mkpa ha, è kwere ka ha na-efe Jehova? E bibiela ụlọ nsọ Jehova na ebe ịchụàjà ya. Ndị nchụàjà anaghịzi arụ ọrụ ha otú ha kwesịrị isi na-arụ ya. Ụfọdụ n’ime ndị a dọọrọ n’agha bụ ndị ji obi ha niile na-efe Chineke. E kwesịghị ịta ha ahụhụ, ma ha so ná ndị a dọọrọ n’agha laa Babịlọn. Ma, ha gbalịsiri ike ịna-erubere Chineke isi. Dị ka ihe atụ, na Babịlọn, Daniel na ndị enyi ya atọ bụ́ Shedrak, Mishak, na Abednego ekweghị eri nri ndị Juu na-asọ nsọ. Baịbụl kwukwara na Daniel na-ekpe ekpere mgbe niile. (Dan. 1:8; 6:10) Ma, ebe ọ bụ ndị na-ekpere arụsị ka na-achị ndị Juu, o nweghị otú ndị Juu na-atụ egwu Chineke ga-esi na-eme ihe niile Iwu ya kwuru.

5. Olee nkwa Jehova kwere ndị ya, gịnịkwa mere nkwa ahụ ji pụọ iche?

5 Ndị Izrel hà ga-emecha fewe Chineke otú ọ chọrọ? N’oge ahụ, o yiri ka ọ gaghị ekwe omume. Ndị Babịlọn anaghị ahapụ ndị ha dọọrọ n’agha. Ma, Jehova ga-eme ka nke ndị Izrel dị iche. O kwere ndị ya nkwa na ya ga-anapụta ha. O mere ihe ahụ o kwuru. Ihe ọ bụla Chineke kwuru ga-emezurịrị.—Aịza. 55:11.

È NWERE IHE YIRI YA N’OGE NDỊ KRAỊST?

6, 7. Gịnị mere e ji kwesị ịgbanwe ihe e kwuburu banyere Babịlọn Ukwu ahụ ịdọrọ ndị ohu Chineke n’agha n’oge anyị a?

6 È nwere ihe e mere Ndị Kraịst yiri otú ahụ e si dọrọ ndị Juu n’agha laa Babịlọn? Ruo ọtụtụ afọ, Ụlọ Nche kwuru na Babịlọn Ukwu ahụ dọọrọ ndị ohu Chineke n’oge anyị a n’agha n’afọ 1918 ma tọhapụ ha n’afọ 1919. Ma, n’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya, anyị ga-ahụ ihe mere e ji kwesị ịgbanwe ihe ahụ e kwuburu.

7 Chegodị echiche. Babịlọn Ukwu ahụ bụ okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa. N’ihi ya, ọ bụrụ na Babịlọn Ukwu ahụ dọọrọ ndị Chineke n’agha n’afọ 1918, ọ pụtara na e nwere otú ndị Chineke si na-agbara okpukpe ụgha ohu n’oge ahụ. Ma, ihe ndị mere eme gosiri na ọtụtụ afọ tupu Agha Ụwa Mbụ, ndị  Chineke e tere mmanụ ji nwayọọ nwayọọ na-ahapụ okpukpe ụgha, kama ịbụ ndị ohu ya. Ọ bụ eziokwu na e mesiri ndị e tere mmanụ ike n’oge Agha Ụwa Mbụ, ọ bụ ndị ọchịchị mere e ji mesie ha ike, ọ bụghị Babịlọn Ukwu. N’ihi ya, o yighị ka ọ̀ bụ n’afọ 1918 ka Babịlọn Ukwu ahụ dọọrọ ndị Jehova n’agha.

OLEE MGBE BABỊLỌN UKWU AHỤ DỌỌRỌ NDỊ OHU CHINEKE N’AGHA?

8. Kọwaa otú e si malite ịkụzi ozizi ụgha n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

8 Na Pentikọst afọ 33, e ji mmụọ nsọ tee ọtụtụ puku ndị Juu na ndị ha tọghatara atọghata mmanụ, ha aghọọ “agbụrụ a họọrọ, òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ, otu ndị pụrụ iche nke Chineke.” (Gụọ 1 Pita 2:9, 10.) N’oge niile ahụ ndịozi Jizọs dị ndụ, ha nọ na-elekọta ọgbakọ. Ma, mgbe ha nwụchara, ọtụtụ ndị malitere ikwu “ihe gbagọrọ agbagọ” ka ha “dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.” (Ọrụ 20:30; 2 Tesa. 2:6-8) Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị a ma ama na ndị nlekọta n’ọgbakọ dị iche iche. E mechara kpọwa ha “bishọp.” Otú ahụ ka e si nwewe òtù ndị ụkọchukwu n’agbanyeghị na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ha “niile bụ ụmụnna.” (Mat. 23:8) Ndị a ma ama nkụzi Arịstọtụl na Pleto na-atọ ụtọ malitere ịkụzi ozizi ụgha kama ịkụzi eziokwu dị n’Okwu Chineke.

9. Kọwaa otú Ọchịchị Rom na Ndị Kraịst sí n’ezi ofufe pụọ si ghọọ nnu na mmanụ. Gịnịkwa ka ọ kpatara?

9 N’afọ 313 Tupu Oge Ndị Kraịst, Kọnstantin, bụ́ eze ukwu Rom na-ekpere arụsị, mere ka iso ụzọ Kraịst adịgboroja ghọọ okpukpe ndị Rom na-ekpe. Sí mgbe ahụ gawa, Chọọchị Krisendọm na Ọchịchị Rom ghọziri nnu na mmanụ. Dị ka ihe atụ, mgbe Kọnstantin na ndị isi chọọchị nwechara nnọkọ na Naịsia, ọ chụgara otu ụkọchukwu aha ya bụ Ariọs ná mba ọzọ n’ihi na o kwetaghị na Jizọs bụ Chineke. Mgbe Eze Ukwu Tiodoshiọs nke Mbụ na-achị, Chọọchị Katọlik ghọziri okpukpe onye ọ bụla na-ekpe n’Alaeze Ukwu Rom. Ndị na-akọ ihe ndị mere n’oge ochie na-ekwu na e si otú ahụ mee ka obodo Rom, bụ́ ndị na-ekpere arụsị, ghọzie Ndị Kraịst. Nke bụ́ eziokwu bụ na n’oge ahụ, Ndị Kraịst sí n’ezi ofufe pụọ akụziwela ozizi ndị ọgọ mmụọ. N’ihi ya, ha adịla mbụ soro na Babịlọn Ukwu ahụ. Ma, a ka nwere ụfọdụ Ndị Kraịst e tere mmanụ jí obi ha niile na-efe Chineke. Ha yiri ọka ahụ Jizọs kwuru okwu ya. Ha nọ na-agbalịsi ike ife Chineke, ma e nweghị onye gere ntị n’ihe ha na-ekwu. (Gụọ Matiu 13:24, 25, 37-39.) Babịlọn ukwu ahụ dọọrọ ha n’agha n’eziokwu.

10. N’ime narị afọ ole na ole mbụ mgbe Kraịst nwụchara, gịnị mere ndị mmadụ ji malite ịjụ ihe chọọchị na-akụzi?

10 Ma, n’ime narị afọ ole na ole mbụ mgbe Kraịst nwụchara, ọtụtụ ndị nwere ike ịgụ Baịbụl n’asụsụ Grik ma ọ bụ Latịn. N’ihi ya, ha nwere ike ịmata ihe dị iche n’ihe Okwu Chineke na-akụzi na ihe chọọchị na-akụzi. Ụfọdụ ndị matara na ihe ndị chọọchị na-akụzi bụ ụgha ma jụ ya. Ma, ịgwa ndị ọzọ ihe ha kweere bụ ịkpa nkụ ahụhụ. O nwedịrị ike ịta isi ha.

11. Olee otú ndị ụkọchukwu si mee ka ọtụtụ ndị ghara inwe ike ịgụ Baịbụl?

11 Ka oge na-aga, ọtụtụ ndị anaghịzi asụ asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl. Chọọchị Katọlik ekweghị ka a sụgharịa Okwu Chineke n’asụsụ ndị mmadụ na-asụ n’oge ahụ. N’ihi ya, ọ bụ naanị  ndị ụkọchukwu na ụfọdụ ndị gụrụ akwụkwọ nwere ike ịgụ Baịbụl, ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ndị ụkọchukwu niile ma otú e si agụ ihe nke ọma na otú e si ede ihe nke ọma. Onye ọ bụla na-ekwetaghị ihe chọọchị kwuru ga-eji anya ya hụ ntị ya. Ndị e tere mmanụ jí obi ha niile na-efe Chineke na-eji akọ ezukọ, ma ọ bụrụdị na ha na-ezukọ. Otú ahụ ọ dị ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn ka ọ dịkwa ndị e tere mmanụ, bụ́ “òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze.” Ha enweghị ike ife Chineke otú ha kwesịrị. Babịlọn Ukwu ahụ kere ndị mmadụ agbụ n’oge ahụ.

OTÚ ÌHÈ SI MALITE INWU

12, 13. Olee ihe abụọ mere ka ike Babịlọn Ukwu ahụ na-akpa n’ahụ́ ndị mmadụ belatawa? Kọwaa.

12 Ezigbo Ndị Kraịst hà ga-emecha nwee ike ife Chineke otú ọ chọrọ n’enweghị onye na-egbochi ha? Eheenụ. E nwere ihe abụọ mere ka Okwu Chineke malite ịgba ka ọnwa n’ụwa gbara ọchịchịrị. Nke mbụ bụ na a chọpụtara ụzọ ọgbara ọhụrụ e si ebi akwụkwọ n’ihe dị ka afọ 1450. Tupu ndị ọcha arụpụta ígwè e ji ebi akwụkwọ, a na-eji aka edepụtaghachi Baịbụl nke ọma. N’oge ahụ, Baịbụl dị ụkọ, dịkwa oké ọnụ. O nwere ike iwe onye bụ́ aka ochie n’ide ihe ọnwa iri iji aka depụtaghachi naanị otu Baịbụl. Ihe ọzọ bụ na ihe ha ji mere akwụkwọ n’oge ahụ bụ akpụkpọ anụ. Ọ na-adịkwa oké ọnụ. Ma, mgbe akwụkwọ na ígwè e ji ebi akwụkwọ pụtara, onye bụ́ aka ochie n’ibi akwụkwọ nwere ike ibi otu puku peeji na narị atọ n’otu ụbọchị.

Ihe ndị e mepụtara e ji ebi akwụkwọ na ndị katara obi sụgharịa Baịbụl mere ka ike Babịlọn Ukwu ahụ na-akpa n’ahụ́ ndị mmadụ belatawa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)

13 Ihe nke abụọ merenụ bụ na n’ihe dị ka afọ 1516, mmadụ ole na ole obi kara kpebiri ịsụgharị Okwu Chineke  n’asụsụ ndị mmadụ na-asụ. Ọtụtụ ndị malitere ịsụgharị Baịbụl n’agbanyeghị na o nwere ike ịta isi ha. Ụjọ bịara Chọọchị Katọlik. Obi ha gwara ha na ha ga-anọ ná nsogbu ma ndị ji obi ha niile na-achọ Chineke nwee Baịbụl. Ka a na-ebipụta Baịbụl, ndị mmadụ nọ na-agụ ya. Ha na-agụ, ha ana-ajụ, sị: ‘Oleedị ebe Baịbụl kwuru gbasara pọgatrị, poopu na ndị kadinal, nakwa ka a na-akwụ ndị ụkọchukwu ụgwọ maka idoro ndị nwụrụ anwụ mas?’ Ajụjụ ndị ahụ were ndị isi Chọọchị Katọlik ezigbo iwe, ha eburu ọgụ bịa. Ha mara ndị na-ekwetaghị ihe Chọọchị Katọlik na-akụzi ikpe ọnwụ. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ ha na-akụzi si n’ozizi Arịstọtụl na Pleto, bụ́ ndị dịrị ndụ tupu Jizọs Kraịst abịa n’ụwa. Ndị ọchịchị Rom gburu onye ọ bụla ndị isi chọọchị mara ikpe ọnwụ. Ihe ha bu n’obi na-eme ya bụ ka ndị mmadụ ghara ịna-agụ Baịbụl, na-ajụ ndị isi chọọchị ajụjụ. Ọtụtụ ndị mere ihe a ha bu n’obi. Ma, ndị katara obi ekweghị ka Babịlọn Ukwu ahụ mechie ha ọnụ. Ebe ọ bụ na ha amụtala eziokwu dị́ n’Okwu Chineke, ha chọrọ ịmụtakwu ihe. N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-anapụta ha n’aka okpukpe ụgha.

14. (a) Olee ihe ndị mere ka ndị mmadụ ghọtakwuo Baịbụl n’ihe dị ka afọ 1870? (b) Kọwaa otú Nwanna Russell si gbaa mbọ ịmụta eziokwu Baịbụl.

14 Ọtụtụ ndị chọrọ ịmụta eziokwu gbagara obodo ndị ọzọ, bụ́ ebe Chọọchị Katọlik na-anaghị akpacha ike n’oge ahụ. Ha chọrọ ịna-agụ Baịbụl, na-amụ ya, na-agwakwa ndị ọzọ banyere ya n’enweghị onye ga-egbochi ha. Otu n’ime obodo ndị ahụ bụ Amerịka. N’ebe ahụ ka Nwanna Charles Taze Russell na mmadụ ole na ole só ya malitere ịmụsi Baịbụl ike n’ihe dị ka afọ 1870. Ná mmalite, ihe Nwanna Russell bu n’obi bụ ịmata nke na-akụzi eziokwu n’ime okpukpe ndị a ma ama n’oge ahụ. O leruru ozizi okpukpe dị iche iche anya, ma nke ndị na-abụghị Ndị Kraịst, ka ọ chọpụta ma hà na-akụzi ihe Baịbụl kwuru. N’oge na-adịghị anya, ọ chọpụtara na o nweghị nke na-akụzi ihe Baịbụl kwuru. N’otu oge, ọ gara hụ ụfọdụ ndị ụkọchukwu nọ́ n’Amerịka, buru n’obi na ha ga-ekweta eziokwu ya na ndị só ya mụtara na Baịbụl ma kụziwere ya ndị chọọchị ha. Ndị ụkọchukwu ndị ahụ achọghị ịma. Ndị Mmụta Baịbụl matara ihe ha kwesịrị ime. E kwesịghị inwe ihe ọ bụla ga-ejikọ ha na ndị ahụ kpebisiri ike ịna-akụzi ozizi ụgha.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 6:14.

15. (a) Olee mgbe Babịlọn Ukwu ahụ dọọrọ Ndị Kraịst n’agha? (b) Olee ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

15 Anyị ahụla otú Babịlọn Ukwu ahụ si dọrọ ezigbo Ndị Kraịst n’agha obere oge ndịozi Jizọs nwụchara. Ma, ajụjụ ndị e kwesịrị ịza bụ: Olee ihe ndị ọzọ gosiri na ọtụtụ afọ tupu 1914, ndị e tere mmanụ ji nwayọọ nwayọọ na-ahapụ Babịlọn Ukwu ahụ, nke gosiri na ha abụghịzi ohu ya? Ọ̀ bụ eziokwu na Jehova wesara ndị ohu ya iwe n’ihi na ha ejighịzi ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma n’oge Agha Ụwa Mbụ? Ụfọdụ ụmụnna hà tinyere aka n’agha ahụ, sí otú ahụ kpasuo Jehova iwe? Nke ikpeazụ bụ, ọ bụrụ na okpukpe ụgha dọọrọ Ndị Kraịst n’agha obere oge ndịozi Jizọs nwụchara, olee mgbe Chineke napụtara ha? Ihe ndị a bụ ezigbo ajụjụ. A ga-aza ha n’isiokwu na-esonụ.