Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) NỌVEMBA 2016

Ì Ji Okwu Chineke Bụ́ Baịbụl Kpọrọ Ihe?

Ì Ji Okwu Chineke Bụ́ Baịbụl Kpọrọ Ihe?

“Mgbe unu natara okwu Chineke, . . . unu nabatara ya . . . dị nnọọ ka ọ bụ n’eziokwu, dị ka okwu Chineke.”—1 TESA. 2:13.

ABỤ: 114, 113

1-3. Olee ihe nwere ike ịkpata okwu ahụ Yuodia na Sintiki sere, oleekwa otú e nwere ike isi gbaara ụdị nsogbu ahụ ọsọ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

NDỊ ohu Jehova ji Okwu ya bụ́ Baịbụl kpọrọ ihe. Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, a na-eji Akwụkwọ Nsọ enye anyị ndụmọdụ mgbe ụfọdụ. Gịnị ka anyị ga-eme ma e nye anyị ndụmọdụ? Chegodị banyere Yuodia na Sintiki, bụ́ ụmụnna nwaanyị e tere mmanụ n’oge ndịozi Jizọs. Ha abụọ sere ezigbo okwu. Gịnị kpatara ya? Baịbụl agwaghị anyị. Ma ka anyị jiri ihe atụ kọwaa ihe nwere ike ịkpata ya.

2 Ka e were ya na Yuodia kpọrọ ụfọdụ ụmụnna oriri n’ụlọ ya, ma ọ kpọghị Sintiki. Sintiki emechaa nụ ka ndị ọzọ na-akọ otú ha si kporie ndụ. Sintiki nwere ike ịna-eche, sị: ‘A gwa m na Yuodia ga-akpọ oriri, ọ gaghị akpọ m, agaghị m ekweta. Echere m na anyị bụ ezigbo enyi.’ Sintiki weere ya na enyi ya Yuodia emeela ya ihe ọjọọ, ya elewezie ya anya ọjọọ. N’ihi ya, Sintiki kpọrọ oriri nke ya, kpọọ ụmụnna ndị ahụ Yuodia kpọrọ, ma ọ kpọghị Yuodia. O nwedịrị ike ịbụ na okwu ahụ Yuodia na Sintiki  sere were ndị ọzọ nọ́ n’ọgbakọ iwe. Baịbụl agwaghị anyị ihe mechara mee. Ma, ọ ga-abụ na ha abụọ gere ntị na ndụmọdụ Pọl nyere ha.—Fil. 4:2, 3.

3 Ụdị ihe a na-akpata nsogbu mgbe ụfọdụ n’ọgbakọ ndị Jehova taa. Ma, e nwere ike idozi ụdị nsogbu a ma ọ bụdị gbaara ya ọsọ ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe Okwu Chineke bụ́ Baịbụl kwuru. Ọ bụrụ na anyị ji Akwụkwọ Nsọ kpọrọ ihe, anyị ga na-eme ihe o kwuru.—Ọma 27:11.

BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-EJIDE ONWE ANYỊ

4, 5. Olee ndụmọdụ Okwu Chineke nyere anyị gbasara ịna-ejide onwe anyị?

4 Ọ naghị adị mfe ijide onwe anyị ma anyị chee na e mejọrọ anyị ma ọ bụ megbuo anyị. Ọ na-agbawa obi ma ọ bụrụ na a na-emegbu anyị n’ihi agbụrụ anyị, otú akpụkpọ ahụ́ anyị na-acha ma ọ bụ otú anyị dị. O nwere ike ịkacha fụọ anyị ka ose ma ọ bụrụ nwanna mere ya. È nwere ndụmọdụ dị́ n’Okwu Chineke ga-enyere anyị aka ma ezughị okè kpata ụdị nsogbu ahụ?

5 Jehova na-ahụ otú ụmụ mmadụ si emekọ ihe kemgbe o kere ha. Ọ ma otú obi na-adị anyị na ihe anyị na-eme. Iwe nwere ike ime ka anyị kwuo ma ọ bụ mee ihe anyị ga-emecha kwaa mmakwaara. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịna-ejide onwe anyị ma ghara ịna-ewe iwe ọsọ ọsọ otú ahụ Baịbụl kwuru. (Gụọ Ilu 16:32; Ekliziastis 7:9.) O doro anya na anyị niile kwesịrị ịgbakwu mbọ ka anyị na-agbaghara ndị ọzọ ma ghara ịna-ewe iwe ngwa ngwa. Jizọs kwuru na ọ bụrụ na anyị agbagharaghị ndị ọzọ, Jehova agaghị agbaghara anyị. (Mat. 6:14, 15) Ì kwesịrị ịgbakwu mbọ ka ị na-agbaghara ndị ọzọ ma na-ejide onwe gị?

6. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya ka anyị ghara ịna-ebu iwe n’obi?

6 Ọsụkọsụ na-asụkarị ndị na-anaghị ejide onwe ha. O nwere ike ime ka ndị mmadụ na-agbara ha ọsọ. Onye iwe nwere ike ime ka ụfọdụ ndị kpọwa ibe ha asị n’ọgbakọ. O nwere ike ịna-eme ka obi ọ̀ dị ya mma, ma ọ bụ na-eme ka e nweghị onye ọ kpọrọ asị, ma ndị ọzọ ga-emecha mata ihe ọjọọ o bu n’obi. (Ilu 26:24-26) Ndị okenye nwere ike inyere ụdị onye ahụ aka ịghọta na ụfụ obi, ịkpọ asị, na ibu iwe n’obi ekwesịghị ịdị n’ọgbakọ Chineke. Okwu Chineke bụ́ Baịbụl mere ka o doo ezigbo anya. (Lev. 19:17, 18; Rom 3:11-18) Ì kwetara ihe Baịbụl kwuru?

CHETA NA Ọ BỤ JEHOVA NA-EDU ANYỊ

7, 8. (a) Olee otú Jehova si eduzi nzukọ ya taa? (b) Olee ihe ụfọdụ Baịbụl gwara anyị ka anyị na-eme, gịnịkwa mere anyị ga-eji na-eme ha?

7 Jehova na-eduzi nzukọ ya taa. Ọ họpụtara Kraịst ka ọ bụrụ ‘onyeisi ọgbakọ ya,’ Kraịst ahọpụta “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” ka ọ na-akụziri ndị Chineke ihe ma na-eduzi ha. (Mat. 24:45-47; Efe. 5:23) Ohu ahụ kweere na Baịbụl bụ Okwu Chineke, jirikwa ya kpọrọ ihe otú ahụ òtù na-achị isi mere n’oge ndịozi Jizọs. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:13.) Olee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-abara anyị uru?

8 Baịbụl gwara anyị ka anyị na-agachi ọmụmụ ihe anya. (Hib. 10:24, 25) Ọ gwara anyị ka anyị na-akụzi otu ihe. (1 Kọr. 1:10) Akwụkwọ Nsọ gwara anyị ka anyị buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. (Mat. 6:33) O kwukwara na  anyị kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, nakwa mgbe anyị na-anọghị n’ozi. (Mat. 28:19, 20; Ọrụ 5:42; 17:17; 20:20) Ọ gwara ndị okenye ka ha na-eme ka ọgbakọ dị ọcha. (1 Kọr. 5:1-5, 13; 1 Tim. 5:19-21) Jehova nyekwara ndị niile nọ́ ná nzukọ ya iwu ka ha na-eme ka ahụ́ ha, echiche ha, na omume ha na-adị ọcha.—2 Kọr. 7:1.

9. Olee ndị Jizọs si n’aka ha na-enyere anyị aka ịghọta Okwu Chineke?

9 Ụfọdụ nwere ike iche na ha ga-ejili aka ha na-akọwa Baịbụl. Ma, ọ bụ naanị “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi” ka Jizọs họpụtara ịna-enyeju ndị na-eso ụzọ ya afọ. Kemgbe afọ 1919, Jizọs họpụtara ohu ahụ ka ọ na-enyere ha aka ịghọta Okwu Chineke ma na-eme ihe o kwuru. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Baịbụl kwuru, anyị ga-eme ka ọgbakọ na-adị ọcha, na-adị n’udo, na-adịkwa n’otu. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-erubere ndị Jizọs ji eduzi ndị na-eso ụzọ ya taa isi?’

NZUKỌ JEHOVA NA-AGA N’IHU N’IKE N’IKE

10. Olee otú akwụkwọ Ezikiel si kọwaa nzukọ Jehova dị́ n’eluigwe?

10 Okwu Chineke bụ́ Baịbụl gwara anyị na Jehova hazikwara ndị na-efe ya n’eluigwe ahazi. Dị ka ihe atụ, n’ọhụụ e gosiri Ezikiel onye amụma, ọ hụrụ ụgbọ ịnyịnya nọchiri anya nzukọ Chineke n’eluigwe. (Ezik. 1:4-28) Ọ bụ Jehova na-anya ụgbọ ịnyịnya ahụ. Ọ na-agakwa n’ebe ọ bụla mmụọ Jehova chọrọ ka ọ gaa. Ụgbọ ịnyịnya ahụ dị́ n’eluigwe na-eduzi nzukọ Jehova n’ụwa. Chegodị banyere ọtụtụ ihe a gbanwerela ná nzukọ Chineke kemgbe afọ iri gara aga. Cheta na ọ bụ Jehova mere ka a gbanwee ihe ndị ahụ. Ebe ọ bụ na ọ fọrọ obere ka Jizọs na ndị mmụọ ozi ya dị́ nsọ bibie ụwa ochie a, nzukọ Jehova na-aga n’ihu n’ike n’ike iji mee ka o doo anya na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị, meekwa ka e doo aha ya nsọ.

Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ọtụtụ ụmụnna wepụtara onwe ha na-agbasi mbọ ike n’ịrụ ụlọ ndị a na-arụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11, 12. Olee ihe ụfọdụ nzukọ Jehova rụrụla n’oge ikpeazụ a?

11 Chegodị banyere ihe nzukọ Chineke rụrụla n’oge ikpeazụ a. Ụlọ ndị a na-arụ. Ọtụtụ narị ụmụnna na-arụsi ọrụ ike iji hụ na a rụchara isi ụlọ ọrụ ọhụrụ Ndịàmà Jehova na Wọwik, dị́ na Niu Yọk, n’Amerịka. Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile na-eduzi ọtụtụ puku ụmụnna sí ebe dị iche iche n’ụwa, ha ana-agba mbọ ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ na ịrụkwu ụlọ n’alaka ụlọ ọrụ. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na ọtụtụ ụmụnna na-ewepụta onwe ha, na-agbasi mbọ ike n’ọrụ ahụ. Ndị ohu Jehova n’ụwa niile na-agbalịsi ike inye onyinye iji na-akwado ọrụ a niile. Jehova na-agọzi ha maka otú ha si dị obi umeala ma jiri obi ha niile na-akwado ọrụ ya.—Luk 21:1-4.

 12 Ihe a na-akụziri anyị. Chegodị banyere ụlọ akwụkwọ dị iche iche Jehova ji akụziri anyị ihe. (Aịza. 2:2, 3) E nwere Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ, Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze, Ụlọ Akwụkwọ Gilied, Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Bịara Betel Ọhụrụ, Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Nlekọta Sekit na Nwunye Ha, Ụlọ Akwụkwọ Ndị Okenye Ọgbakọ, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze, na Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Kọmitii Alaka na Nwunye Ha. O doro anya na Jehova chọrọ ka a na-akụziri ndị ya ihe. Ihe ọzọ e ji akụziri ndị mmadụ Okwu Chineke bụ ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, bụ́ jw.org. Ị gaa ebe ahụ, ị ga-ahụ ọtụtụ akwụkwọ anyị n’ọtụtụ narị asụsụ. E nwekwara ebe bụ́ maka ụmụaka, ezinụlọ, nakwa akụkọ. Ị̀ na-eji jw.org ezi ozi ọma, jirikwa ya na-enwe ofufe ezinụlọ?

NA-ERUBERE JEHOVA ISI MA NA-AKWADO NZUKỌ YA

13. Gịnị ka ndị na-efe Jehova kwesịrị ịna-eme?

13 Jehova meere anyị ihe ọma kpọbata anyị ná nzukọ ya. Ebe ọ bụ na Chineke akụzierela anyị ihe ọ chọrọ ka anyị na-eme, anyị kwesịrị ịna-erubere ya isi ma na-eme ihe ziri ezi. Ka ọtụtụ ndị na-aṅụkwu omume ọjọọ ka mmiri, anyị kwesịrị ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị’ otú ahụ Jehova kpọrọ ya. (Ọma 97:10) Anyị anaghị eso ndị na-amaghị Chineke na-asị na “ihe ọma bụ ihe ọjọọ, na ihe ọjọọ bụ ihe ọma.” (Aịza. 5:20) Ebe anyị chọrọ ime ihe dị Chineke mma, anyị na-agbalịsi ike ka ahụ́ anyị, omume anyị, na echiche anyị na-adị ọcha. (1 Kọr. 6:9-11) Anyị hụrụ Jehova n’anya, tụkwasịkwa ya obi. Ọ bụ ya mere anyị ji eme ihe Okwu ya bụ́ Baịbụl gwara anyị iji gosi na anyị na-erubere ya isi. Anyị na-agbalịsikwa ike irubere iwu ya isi n’ebe ọ bụla, ma n’ezinụlọ anyị ma n’ọgbakọ ma n’ebe anyị na-arụ ọrụ. (Ilu 15:3) Ka anyị leba anya n’ụzọ ndị ọzọ anyị ga-esi gosi na anyị na-erubere Chineke isi.

14. Olee otú ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst si egosi na ha na-erubere Chineke isi?

14 Ịzụ ụmụ anyị. Ndị Kraịst bụ́ nne na nna na-azụ ụmụ ha otú Baịbụl kwuru iji gosi na ha na-erubere Jehova isi. Ha anaghị ekwe ka otú ndị obodo ha si ele ịzụ ụmụ anya megharịa ha anya. Mmụọ nke ụwa ekwesịghị ịbata n’ezinụlọ Ndị Kraịst. (Efe. 2:2) Nna bụ́ Onye Kraịst e mere baptizim ekwesịghị ịna-eche, sị, ‘N’obodo anyị, ịkụziri ụmụaka ihe bụ ọrụ ụmụ nwaanyị.’ Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Unu ndị bụ́ nna, . . . na-azụlitenụ [ụmụ unu] n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Efe. 6:4) Nne na nna ndị na-atụ egwu Chineke chọrọ ka ụmụ ha mee ka Samuel. Baịbụl kwuru na Jehova nọnyeere ya mgbe ọ na-etolite.—1 Sam. 3:19.

15. Anyị kpebiwe ihe dị mkpa anyị ga-eme, olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-erubere Jehova isi?

15 Ikpebi ihe anyị ga-eme. Anyị kpebiwe ihe dị mkpa anyị ga-eme, anyị kwesịrị ibu ụzọ mata ihe Jehova chere ka anyị nwee ike irubere ya isi. Baịbụl na nzukọ ya ga-enyere anyị aka ime otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị nne na nna bí n’obodo ọzọ na-eme ha mụọ nwa ọhụrụ, ha akpọlaara ya ndị ikwu ha ka ọ ghara igbochi ha ịna-arụ ọrụ na ịna-akpata ego n’ebe ahụ ha bi. Ọ bụ eziokwu na ụdị ihe a bụ ihe onye ọ bụla ga-eji aka ya kpebie, ma anyị kwesịrị icheta na anyị ga-aza Chineke  ajụjụ maka ihe ndị anyị mere. (Gụọ Ndị Rom 14:12.) Ànyị kwesịrị ikpebi ihe dị mkpa gbasara ezinụlọ anyị na ndụ anyị n’ebughị ụzọ mata ihe Baịbụl kwuru gbasara ya? Mbanụ. Anyị chọrọ ka Nna anyị nke eluigwe nyere anyị aka n’ihi na anyị agaghị eduzili nzọụkwụ anyị.—Jere. 10:23.

16. Mgbe otu nwaanyị mụrụ nwa, gịnị ka o kwesịrị ikpebi? Olee ihe nyeere ya aka ime ihe o kwesịrị ime?

16 Mgbe otu nwaanyị bi ná mba ọzọ, ọ mụrụ nwa nwoke, chọọ ịkpọla ya ka nna nna ya na nne nna ya zụọ ya. Onyeàmà Jehova malitere ịmụrụ ya Baịbụl n’oge ọ mụrụ nwa ahụ. O mewere nke ọma, mụta na ọ bụ ya ka Chineke nyere ọrụ ịzụ nwa ya ka o fee Jehova. (Ọma 127:3; Ilu 22:6) Nwaanyị ahụ kpere ekpere gwa Jehova otú ọ dị ya n’obi otú ahụ Baịbụl gwara anyị mee. (Ọma 62:7, 8) Ọ kọkwaara ya onye na-amụrụ ya ihe na ndị ọzọ nọ́ n’ọgbakọ. N’agbanyeghị nsogbu ndị ikwu na ibe nọ na-enye ya, o kpebiri na ya ekwesịghị ime ya. Di ya hụrụ otú ụmụnna si na-enyere nwunye ya na nwa ha aka. Otú obi si dị ya ụtọ mere ka ọ mụwa Baịbụl, sorokwa nwunye ya bịawa ọmụmụ ihe. Chegodị ụdị obi ụtọ nwanna nwaanyị ahụ nwere mgbe ọ matara na Jehova zara ekpere o ji obi ya niile kpee.

17. Olee ihe nzukọ Jehova kwuru ka anyị na-emere ndị anyị na-amụrụ ihe?

17 Ime ihe nzukọ Chineke kwuru. Otu n’ime ụzọ dị mkpa anyị ga-esi gosi na anyị na-erubere Chineke isi bụ ịna-eme ihe nzukọ ya gwara anyị mee. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere aro ndị a tụụrụ anyị gbasara ndị anyị na-amụrụ ihe. A gwara anyị na ozugbo anyị bidoro ịmụrụ mmadụ akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? anyị kwesịrị iji nkeji ole na ole nyere onye ahụ aka ịmatakwu banyere nzukọ Jehova mgbe ọ bụla anyị na ya mụchara ihe. Anyị nwere ike iji vidio bụ́ Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? na broshọ bụ́ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa? A gwara anyị na anyị mụchaara mmadụ akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị, anyị kwesịrị ịmụrụ ya akwụkwọ Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,” ọ bụrụgodị na o meela baptizim. Ihe mere nzukọ Jehova ji gwa anyị mee ya bụ ka onye ahụ ‘gbasie ike n’okwukwe.’ (Kọl. 2:7) Ị̀ na-eme ihe ndị a nzukọ Jehova gwara anyị na-eme?

18, 19. Olee ihe ụfọdụ mere anyị ji kwesị ịna-ekele Jehova?

18 E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji kwesị ịna-ekele Jehova. Ọ bụ ya nyere anyị ndụ n’ihi na e wepụ ya, anyị agaghị na-agagharị, ma ọ bụ dịrị ndụ. (Ọrụ 17:27, 28) Otu n’ime onyinye bara ezigbo uru o nyere anyị bụ Okwu ya bụ́ Baịbụl. Anyị ji obi anyị niile kweta na ọ bụ Okwu Chineke, otú ahụ Ndị Kraịst bí na Tesalonaịka kwetara.—1 Tesa. 2:13.

19 Baịbụl bụ́ Okwu Chineke enyerela anyị aka ịbịaru Jehova nso, ya abịaruokwa anyị nso. (Jems 4:8) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Nna anyị nke eluigwe meere anyị ihe ọma na-enweghị atụ kpọbata anyị ná nzukọ ya. Obi dị anyị otú ọ dị otu ọbụ abụ, bụ́ onye dere, sị: “Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma: n’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi.” (Ọma 136:1) N’Abụ Ọma 136, e kwuru okwu ahụ bụ́ “obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi” ugboro iri abụọ na isii. Ọ bụrụ na anyị ana-erubere Jehova na nzukọ ya isi, ọ ga-enye anyị ndụ ebighị ebi, hụkwa anyị n’anya ruo mgbe ebighị ebi.