Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2016

Gbaa mbọ ka ị ghọta otú ị ga-esi nyere ụmụnna gị aka, kasie ha obi, ma ọ bụ jiri Baịbụl gbaa ha ume

Ì Nwere Ike Inye Aka n’Ọgbakọ Unu?

Ì Nwere Ike Inye Aka n’Ọgbakọ Unu?

TUPU Jizọs alaghachi n’eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Unu ga-abụ ndị àmà m ruo n’ebe kasị anya n’ụwa.’ (Ọrụ Ndịozi 1:8) Olee otú ha ga-esi ekwusa ozi ọma n’ebe niile n’ụwa?

Otu prọfesọ aha ya bụ Martin Goodman kwuru na otú Ndị Kraịst si jiri ọrụ ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe mere ka ha dị iche ná ndị okpukpe ndị ọzọ n’oge Rom na-achị. Jizọs gara ebe dị iche iche kwusaa ozi ọma. Ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị iṅomi ya, kwusaakwa “ozi ọma alaeze Chineke” n’ebe niile. Ha kwesịrị ịna-achọ ndị chọrọ ịmụta eziokwu. (Luk 4:43) Ọ bụ ya mere e ji nwee “ndịozi” n’oge Jizọs. Okwu ahụ bụ́ “ndịozi” pụtara ndị e zipụrụ ka ha gaa rụọ ọrụ. (Mak 3:14) Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—Matiu 28:18-20.

Ndịozi iri na abụọ Jizọs anọghịzi n’ụwa, ma ọtụtụ ndị ohu Jehova na-eṅomi otú ha si kwusaa ozi ọma. Mgbe ọ bụla a kpọrọ ha ka ha gaa n’ebe a chọkwuru ndị ga-ekwusa ozi ọma, ha na-aza, sị: “Lee m! Ziga m.” (Aịzaya 6:8) Ụfọdụ akwagala ná mba ndị dị anya iji kwusaa ozi ọma. Ụfọdụ n’ime ha bụ ọtụtụ puku ụmụnna ndị gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ndị ọzọ akwagala n’ebe ọzọ ná mba ha. Ọtụtụ amụtala asụsụ ọzọ ka ha jiri ya nyere ọgbakọ ma ọ bụ ìgwè na-eji asụsụ ahụ amụ ihe aka. Ọ dịcharaghị ụmụnna ndị a niile mfe, ma ha ji obi ha hapụ ihe ụfọdụ iji gosi na ha hụrụ Jehova na ndị ya n’anya. Ha haziri ihe nke ọma, jirikwa oge ha, ike ha, na ego ha na-ekwusa ozi ọma n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. (Luk 14:28-30) Ihe a ụmụnna ndị a na-eme bara ezigbo uru.

 Ọ bụghị anyị niile ga-agali n’ebe a chọkwuru ndị ga-ekwusa ozi ọma ma ọ bụ mụọ asụsụ ọzọ. Ma, anyị niile nwere ike ịna-eme ka ndị ozi ala ọzọ n’ọgbakọ anyị.

BỤRỤ ONYE OZI ALA ỌZỌ N’ỌGBAKỌ GỊ

Na-enyere ụmụnna gị aka, dị ka

N’oge ndịozi Jizọs, Ndị Kraịst ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma n’agbanyeghị na ọtụtụ n’ime ha bi n’obodo nke ha, ha abụghịkwa ndị ozi ala ọzọ. Pọl gwara Timoti, sị: “Rụọ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma, jezuo ozi gị.” (2 Timoti 4:5) Ọ bụ Ndị Kraịst oge ochie ka okwu ahụ gbasara, ma ọ gbasakwara anyịnwa. Ndị Kraịst niile kwesịrị irube isi n’iwu ahụ e nyere ka anyị kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke ma mee ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. E nwekwara ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi na-eme ka ndị ozi ala ọzọ n’ọgbakọ anyị.

Dị ka ihe atụ, ndị ozi ala ọzọ kwaga mba ọzọ, ihe niile na-adịcha iche n’otú ọ dị n’ebe ha si bịa. Ha na-agbakwa mbọ ka ha mụta otú ha ga-esi ebi n’ebe ọhụrụ ha kwagara. A sịgodị na anyị agaghị akwagali n’ebe a chọkwuru ndị ga-ekwusa ozi ọma, ànyị nwere ike ịchọpụta ụzọ ọhụrụ anyị nwere ike isi na-ekwusa ozi ọma? Dị ka ihe atụ, n’afọ 1940, a gwara ụmụnna anyị ka ha malite ikwusa ozi ọma okporo ámá otu ugbo n’izu. Ì kwusatụla ozi ọma okporo ámá mbụ? Ì jitụla ihe e ji akwagharị akwụkwọ anyị kwusaa ozi ọma n’ebe na-ekwo ekwo? Ihe anyị na-ekwu bụ na anyị kwesịrị ịgba mbọ na-eme ihe ọhụrụ a na-atụrụ anyị n’aro banyere otú anyị ga-esi na-ekwusa ozi ọma.

Ịgba ha ume ka ha na-ekwusa ozi ọma

Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị a tụụrụ anyị aro, ị ga-eji ịnụ ọkụ n‘obi na-ekwusa ozi ọma. Ndị na-akwaga n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa ma ọ bụ ndị na-amụ asụsụ ọzọ na-abụkarị ndị nkwusa ma nke a na-akọ n’ọgbakọ, ndị nwekwara ike inyere ọgbakọ ezigbo aka. Dị ka ihe atụ, ha na-ebute ụzọ n’ikwusa ozi ọma. N’ebe e nwere ndị ozi ala ọzọ, ọ bụ ha na-ahụ na ihe na-aga aga n’ọgbakọ tupu ụmụnna ndị obodo ahụ eruo eru ịrụwa ọrụ ọgbakọ. Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke e merela baptizim, ị̀ na-agbalị ka i ruo eru ịbụ ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye ka i nwee ike ijere ụmụnna gị ozi?—1 Timoti 3:1.

 NA-EME KA ỤMỤNNA DỊ IKE

Inyere ha aka ime ihe ụfọdụ

E nwere ihe ndị ọzọ anyị nwere ike ịna-eme iji nye aka n’ọgbakọ anyị. Anyị niile, ma okenye ma nwata, ma nwoke ma nwaanyị, nwere ike inyere ụmụnna anyị ndị nọ́ ná mkpa aka, ma mee ka ha dị ike.—Ndị Kọlọsi 4:11.

Ọ bụrụ na anyị chọrọ inyere ụmụnna anyị aka, anyị kwesịrị ịmata ha nke ọma. Baịbụl gbara anyị ume ka ‘anyị na-echebara ibe anyị echiche,’ ya bụ, ka anyị na-eche banyere ihe na-akpa ụmụnna anyị ma anyị na ha zukọọ. (Ndị Hibru 10:24) Ọ pụtaghị na anyị ga-achọ ịmatacha ihe niile ha na-eme. Kama, ọ pụtara na anyị ga na-agbalị ka anyị na-aghọta ụmụnna anyị na ihe ndị na-akpa ha. O nwere ike ịbụ na ihe ha chọrọ bụ ka anyị nyere ha aka mee ihe ụfọdụ, kasie ha obi, ma ọ bụ jiri Baịbụl gbaa ha ume. Ọ bụ eziokwu na n’ihe ụfọdụ, ọ bụ naanị ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nwere ike inyere ha aka. (Ndị Galeshia 6:1) Ma, anyị niile nwere ike inyere ụmụnna ndị merela agadi aka ma ọ bụkwanụ nyere ezinụlọ ihe na-esiri ike aka.

Ịkasi ndị ihe na-esiri ike obi

E nyeere otu nwanna a na-akpọ Salvatore ụdị aka a. E nwere mgbe ihe siiri ya ezigbo ike, ya eree ụlọ ahịa ya, ụlọ ya, na ngwongwo ha ndị ọzọ. Ọ nọkwa na-echegbu onwe ya banyere ezinụlọ ya. Otu ezinụlọ ọzọ nọ́ n’ọgbakọ ha chọpụtara na ihe siiri ha ike. Ha chọọrọ Salvatore ego, nyekwara ya na nwunye ya aka ịchọta ọrụ. Ha na-eji ụfọdụ mgbede anọnyere ezinụlọ Salvatore, na-ege ha ntị ma na-agba ha ume. Ezinụlọ abụọ a bịaziri dị n’ezigbo mma. Ugbu a, obi na-adị ezinụlọ abụọ a ụtọ mgbe ọ bụla ha chetara otú ha si nọrịa mgbe ahụ ihe na-esiri ezinụlọ Salvatore ike.

Ezigbo Ndị Kraịst anaghị ezo ihe ha kweere ezo. Anyị kwesịrị iṅomi Jizọs ma mee ka onye ọ bụla mata ọmarịcha nkwa ndị Chineke kwere ụmụ mmadụ. Ma ànyị ga-akwagali n’ebe ọzọ ma ọ bụ na anyị agaghị akwagali, anyị niile nwere ike ime ike anyị niile iji nyere ụmụnna ndị nọ́ n’ọgbakọ anyị aka. (Ndị Galeshia 6:10) Ọ bụrụ na anyị na-enyere ndị ọzọ aka, obi ga na-adị anyị ụtọ, anyị ‘ana-amịkwa mkpụrụ n’ezi ọrụ ọ bụla.’—Ndị Kọlọsi 1:10; Ọrụ Ndịozi 20:35.