Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2016

Ndị Na-eto Eto—Olee Otú Unu Ga-esi Akwadebe Maka Ime Baptizim?

Ndị Na-eto Eto—Olee Otú Unu Ga-esi Akwadebe Maka Ime Baptizim?

“Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ.”—ABỤ ỌMA 40:8.

ABỤ: 51, 58

1, 2. (a) Kọwaa ihe mere baptizim ji bụrụ ihe dị ezigbo mkpa. (b) Gịnị kwesịrị ido mmadụ anya tupu o mee baptizim?

Ị̀ BỤ onye na-eto eto ga-achọ ime baptizim? Ọ bụrụ na ị chọrọ ime baptizim, e nweghị ihe ùgwù ị ga-eji tụnyere ya. Dị ka anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, baptizim abụghị ihe e ji egwu egwu. Ọ bụ ihe na-egosi ndị ọzọ na i nyefeela Jehova onwe gị. Ọ pụtara na i kwere ya nkwa na ị ga-efe ya ruo mgbe ebighị ebi nakwa na ime uche ya ga-abụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị. Ebe ọ bụ na nkwa a abụghị ihe e ji egwu egwu, i kwesịrị ime baptizim naanị mgbe i toruru ime ya, mgbe i ji aka gị kpebie ya, nakwa mgbe ị ghọtara ihe mmadụ inyefe Chineke onwe ya pụtara.

2 Ma, i nwere ike ịna-eche na i rubeghị ime baptizim. Ma ọ bụkwanụ gị echee na i ruola, ma nne na nna gị asị gị chere ka afọ ndụ gị gbagotekwuo ma ọ bụkwanụ ka ị matakwuo ihe. Gịnị ka i kwesịrị ime? Ike agwụla gị. Kama, jiri oge ahụ na-agbakwu mbọ ka i wee ruo eru ime baptizim n’oge  na-adịghị anya. Ugbu a, ka anyị tụlee ebe atọ i nwere ike ikpebi imekwu nke ọma na ha iji nyere gị aka iru eru ime baptizim. Ha bụ: (1) ihe i kweere, (2) àgwà gị, na (3) igosi Chineke na obi dị gị ụtọ.

IHE I KWEERE

3, 4. Gịnị ka ndị na-eto eto ga-amụta n’aka Timoti?

3 Chegodị otú ị ga-esi aza ajụjụ ndị a: Gịnị mere m ji kwere na Chineke dị? Gịnị mere obi ji sie m ike na Baịbụl si n’aka Chineke? Gịnị mere m ji erubere iwu Chineke isi kama ịna-ebi ndụ otú ndị ụwa si ebi? Ajụjụ ndị a ga-enyere gị aka ime ihe Pọl onyeozi kwuru. Ọ sịrị: “Chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.” (Ndị Rom 12:2) Gịnị ka i ji kwesị ime otú ahụ?

Timoti nabatara eziokwu n’ihi na o chebaara ihe ọ mụtara echiche, obi esiekwa ya ike na ọ bụ eziokwu

4 Ihe Timoti mere nwere ike inyere gị aka. Ọ ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma n’ihi na nne ya na nne nne ya kụziiri ya ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ. Ma, Pọl gwara Timoti, sị: “Nọgide n’ihe ndị ị mụtara, ndị e mekwara ka i kwere.” (2 Timoti 3:14, 15) Ihe ‘e mere ka i kwere’ pụtara obi isi mmadụ ike na ihe a gwara ya bụ eziokwu. N’ihi ya, obi siri Timoti ike na ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ bụ eziokwu. Ihe mere o ji kwere abụghị n’ihi na nne ya na nne nne ya gwara ya kweta, kama ọ bụ n’ihi na o chebaara ihe ọ mụtara echiche, obi esie ya ike na ọ bụ eziokwu.—Gụọ Ndị Rom 12:1.

5, 6. Olee ihe mere i ji kwesị ịna-eji ‘ike iche echiche’ gị ekpebi ihe ị na-eme mgbe ị ka na-eto eto?

5 Gịnwa kwanụ? O nwere ike ịbụ na o teela ị mụtara eziokwu Baịbụl. Ọ bụrụ otú ahụ, kpebie na ị ga-echebara ihe mere iji kwere ihe ndị ahụ echiche. Ọ ga-enyere gị aka ime ka okwukwe gị sikwuo ike. Ọ ga-emekwa ka ị ghara ịna-eme mkpebi ndị na-adịghị mma n’ihi ndị ọgbọ gị, n’ihi ihe i chere n’obi gị, ma ọ bụ n’ihi otú ndị ụwa si eche echiche.

6 Ọ bụrụ na ị na-eji ‘ike iche echiche’ gị ekpebi ihe ndị ị na-eme mgbe ị ka na-eto eto, ị ga-enwe ike ịza ajụjụ ndị ọgbọ gị ga-ajụ gị, dị ka: ‘Olee otú i si mara na Chineke dị? Ọ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya, gịnị mere o ji ekwe ka ihe ọjọọ na-eme? Olee otú o si bụrụ na Chineke enweghị mmalite?’ Ọ bụrụ na i ruola ime baptizim, ajụjụ ndị ahụ agaghị eme ka i nwewe obi abụọ, kama ha ga-eme ka ị mụkwuo Baịbụl.

7-9. Kọwaa otú ihe e ji amụ Baịbụl dị na jw.org/ig isiokwu ya bụ “Gịnị Ka Baịbụl Na-akụzi?” ga-esi nyere gị aka ka obi sie gị ike na ihe i kweere bụ eziokwu.

7 Ịmụchi Baịbụl anya ga-enyere gị aka ịza ajụjụ ndị mmadụ nwere ike ịjụ gị. Ọ ga-emekwa ka ị ghara ịna-enwe obi abụọ ma mee ka obi sie gị ike n’ihe ndị i kweere. (Ọrụ Ndịozi 17:11) Anyị nwere ọtụtụ akwụkwọ ndị ga-enyere gị aka. Ọtụtụ ndị achọpụtala na ọ bara uru  ịmụ akwụkwọ anyị ndị kọwara ihe ndị Chineke kere na otú o si kee ha. Isiokwu bụ́ “Gịnị Ka Baịbụl Na-akụzi?” na-agba na jw.org/ig na-abara ọtụtụ ndị na-eto eto uru. Ị ga-ahụ ya ma ị pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịa NDỊ NA-ETO ETO. E dere nke ọ bụla n’ime ha otú ọ ga-esi nyere gị aka ka obi sikwuo gị ike banyere ihe ndị i kweere.

8 Ebe ị na-amụ Baịbụl, o nwere ike ịbụ na ị matala azịza ajụjụ ụfọdụ ndị a tụlere n’ebe ahụ. Ma, obi ò siri gị ike na azịza ndị ahụ bụ eziokwu? Ihe ndị ahụ e ji amụ ihe ga-enyere gị aka ichebara amaokwu Baịbụl dị iche iche echiche, nyekwara gị aka ide ihe mere i ji kwere ihe ndị i kweere. Ọ ga-enyeziri gị aka ịmata otú ị ga-esi akọwara ya ndị ọzọ. Ọ bụrụ na i nwere ike ịna-aga n’ebe ihe ahụ e ji amụ Baịbụl bụ́ “Gịnị Ka Baịbụl Na-akụzi?” dị na jw.org/ig, jiri ya na-amụ ihe ka o nyere gị aka ka okwukwe gị sikwuo ike.

9 O kwesịrị ido gị anya na ihe Baịbụl na-akụzi bụ eziokwu. Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ịkwadebe maka baptizim. Otu nwanna nwaanyị na-erubeghị afọ iri abụọ kwuru, sị: “Tupu m kpebie ime baptizim, m mụrụ Baịbụl, chọpụta na Ndịàmà Jehova na-akụzi ihe dị́ na Baịbụl. Obi na-esikwu m ike kwa ụbọchị na ihe a m kweere bụ eziokwu.”

ÀGWÀ GỊ

10. Gịnị mere a ga-eji tụọ anya na Onye Kraịst mere baptizim ga na-akpa àgwà gosiri na o nwere okwukwe?

10 Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na okwukwe enweghị ọrụ, ọ nwụrụ anwụ.” (Jems 2:17) Ọ bụrụ na obi siri gị ike na ihe i kweere bụ eziokwu, otú ị ga-esi na-akpa àgwà ga-egosi ya. Ị ga-egosi na i nwere ihe Baịbụl kpọrọ “àgwà dị nsọ na omume ịsọpụrụ Chineke.”—Gụọ 2 Pita 3:11.

11. Kọwaa ihe “àgwà dị nsọ” pụtara.

11 Gịnị bụ “àgwà dị nsọ”? Ọ bụrụ na àgwà mmadụ dị nsọ, ọ pụtara na onye  ahụ anaghị eme omume rụrụ arụ. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere ihe ndị mere n’ọnwa isii gara aga. Mgbe ọnwụnwa bịaara gị ka i mee ihe na-adịghị mma, ì chere echiche nke ọma banyere ihe dị mma na ihe na-adịghị mma? (Ndị Hibru 5:14) Ì nwere ike icheta oge ndị i meriri ọnwụnwa bịaara gị ma ọ bụ ghara ime ihe na-adịghị mma ndị ọgbọ gị chọrọ ka i mee? È ji gị ama atụ n’ụlọ akwụkwọ unu? Ị̀ na-eme ihe Jehova chọrọ ka ị̀ na-achọ ime ka ụmụ akwụkwọ ibe gị ka ha wee ghara ịchị gị ọchị? (1 Pita 4:3, 4) N’eziokwu, e nweghị onye zuru okè. Mgbe ụfọdụ, izi ndị ọzọ ozi ọma nwedịrị ike ịna-esiri ndị ferela Jehova ọtụtụ afọ ike ma ọ bụ na-eme ha ihere. Ma, onye nyeferela Jehova onwe ya agaghị na-eme ihere na ya bụ Onyeàmà Jehova. Ọ ga na-akpakwa àgwà ọma.

12. Olee ihe ụfọdụ bụ́ “omume ịsọpụrụ Chineke”? Oleekwa otú anyị kwesịrị isi na-ele ha anya?

12 Gịnị bụ “omume ịsọpụrụ Chineke”? Ọ bụ ihe dị́ iche iche anyị na-eme n’ọgbakọ, dị ka ịga ọmụmụ ihe na ịga ozi ọma. Ma, ihe ụfọdụ anyị na-eme ndị ọzọ na-anaghị ahụ, dị ka ikpe ekpere na ịmụ Baịbụl n’onwe anyị sokwa n’omume ịsọpụrụ Chineke. Onye nyeferela Jehova onwe ya agaghị na-eche na ihe ndị a bụ ibu arọ. Kama, ọ ga-adị onye ahụ otú ahụ ọ dị Eze Devid. Ọ sịrị: “Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ, iwu gị dịkwa n’ime obi m.”—Abụ Ọma 40:8.

Ị̀ na-akpọ okwu aha mgbe ị na-ekpe ekpere? Gịnị ka ekpere gị na-egosi banyere ịhụnanya ị hụrụ Jehova?

13, 14. Olee ihe ga-enyere gị aka ịna-eme “omume ịsọpụrụ Chineke”? Oleekwa otú o sirila baara ụfọdụ ndị na-eto eto uru?

13 Ihe dị na peeji nke 308 na 309 n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, ga-enyere gị aka ikpebi ihe ndị i nwere ike ime. N’ebe ahụ, e nwere ohere ebe ị ga-aza ajụjụ ụfọdụ ndị dị ka: “Ị̀ na-akpọ okwu aha mgbe ị na-ekpe ekpere? Gịnị ka ekpere gị na-egosi banyere ịhụnanya ị hụrụ Jehova?” “Gịnị ka ị na-amụ mgbe ị na-amụ ihe?” “Ị̀ na-aga ozi ọma ọ bụrụgodị na papa gị na mama gị agaghị?” E nwekwara ohere ebe ị ga-ede ebe ị ga-emekwu nke ọma gbasara ekpere, ịmụ ihe na ịga ozi ọma.

14 Ọtụtụ ndị na-eto eto chọrọ ime baptizim achọpụtala na ihe a dị́ n’akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ bara ezigbo uru. Otu nwatakịrị nwaanyị aha ya bụ Tilda sịrị: “O nyeere m aka ikpebi ihe ndị m chọrọ ime. Ozugbo m mechara ha niile, o rughị otu afọ, e mee m baptizim.” Ihe gakwaara nwanna nwoke aha ya bụ Patrick otú ahụ. Ọ sịrị, “Ekpebibuola m ihe ndị m chọrọ ime, ma ide ha ede nyeere m aka ịrụsikwu ọrụ ike iji mee ha.”

Ị̀ ka ga na-efe Jehova a sịgodị na nne na nna gị akwụsị ife ya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. Kọwaa ihe mere mmadụ inyefe Jehova onwe ya ji kwesị ịbụ ihe onye ahụ ga-eji aka ya eme.

15 Otu n’ime ajụjụ ndị dị́ n’akwụkwọ  ahụ bụ: “Ị̀ ga na-efe Jehova ọ bụrụgodị na papa gị na mama gị nakwa ndị enyi gị akwụsị ife ya?” Ọ bụrụ na mmadụ enyefee Jehova onwe ya, e meekwa ya baptizim, ọ ga-eji aka ya na-eme ka ya na Chineke na-adịkwu ná mma. N’ihi ya, o kwesịghị ịbụ nne na nna gị ma ọ bụ onye ọzọ ga na-echetara gị ime ihe ndị gbasara ofufe Jehova. Àgwà dị nsọ ị na-akpa na omume ịsọpụrụ Chineke ị na-eme ga-egosi na obi siri gị ike na ị mụtala eziokwu, chọọkwa ịna-eme ihe Chineke chọrọ. N’oge na-adịghị anya, ị ga-eru eru ka e mee gị baptizim.

GOSI NA OBI DỊ GỊ ỤTỌ

16, 17. (a) Gịnị kwesịrị ime ka mmadụ kpebie na ya ga-abụ Onye Kraịst? (b) Olee ihe atụ ị ga-eji kọwaa otú obi kwesịrị ịdị anyị banyere ihe mgbapụta ahụ?

16 Otu nwoke ma Iwu Mozis nke ọma jụrụ Jizọs otu ụbọchị, sị: “Olee iwu kasị ukwuu?” Jizọs zara ya, sị: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:35-37) Ihe Jizọs kwuru gosiri na ihe kwesịrị ime ka mmadụ mee baptizim ma bụrụ onye na-eso ụzọ ya bụ ịhụ Jehova n’anya. Otú n’ime ihe ndị kacha mma ga-enyere anyị aka  ịhụkwu Jehova n’anya bụ iche echiche nke ọma gbasara onyinye na-enweghị atụ o nyere anyị, nke bụ́, ihe mgbapụta. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15; 1 Jọn 4:9, 19.) Iche echiche banyere ihe mgbapụta ahụ na uru ọ ga-abara gị ga-eme ka i gosi na obi dị gị ụtọ maka onyinye ahụ pụrụ iche o nyere anyị.

17 Iji nyere anyị aka ịghọta otú obi kwesịrị ịdị anyị maka ihe mgbapụta ahụ, ka anyị chebagodịrị ihe atụ a echiche. Were ya na mmiri chọrọ iri gị, mmadụ abịa nyere gị aka, gụpụta gị. Ihe ị ga-eme ọ̀ bụ ịlawa chefuo ihe onye ahụ meere gị? Mbanụ. Ị gaghị echefu otú onye ahụ si zọọ gị ndụ. Otú ahụ ka anyị na-ekwesịghị ichefu ihe ọma Jehova na Jizọs meere anyị wee gbapụta anyị. E wezụga ihe a Jehova na Jizọs mere, ndụ anyị agaraghị enwe isi. Ha napụtara anyị n’aka mmehie na ọnwụ. Ọ bụ n’ihi na ha hụrụ anyị n’anya mere anyị ji nwee olileanya inweta ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs.

18, 19. (a) Gịnị mere na ụjọ ekwesịghị ịtụ gị inyefe Jehova onwe gị? (b) Olee otú ife Jehova si eme ka ndụ gị ka mma?

18 Obi ọ̀ dị gị ụtọ maka ihe Jehova meere gị? Ọ bụrụ na obi dị gị ụtọ, i kwesịrị inyefe ya onwe gị, e meekwa gị baptizim. Inyefe Chineke onwe gị bụ ikwe ya nkwa na ị ga na-eme uche ya ruo mgbe ebighị ebi. Ikwe ya nkwa a, ò kwesịrị ịna-amapụ gị obi? Mba. Jehova chọrọ ka ihe gaziere gị. Ọ ga-akwụkwa ndị niile na-erubere ya isi ụgwọ. (Ndị Hibru 11:6) Ọ bụrụ na i nyefee Jehova onwe gị ma mee baptizim, ndụ gị agaghị aka njọ kama ọ ga-aka mma. E nwere otu nwanna nwoke dị afọ iri abụọ na anọ e mere baptizim mgbe ọ na-erubeghị afọ iri na atọ. O kwuru, sị: “M gaara aghọtakwu Baịbụl nke ọma ma a sị na m tokwuru tupu e mee m baptizim, ma mkpebi m mere nyefee Jehova onwe m mgbe m dị obere mere ka m ghara ịna-achụ ihe ndị ụwa na-achụ.”

Setan na-achọ ọdịmma onwe ya naanị

19 Jehova chọrọ ka ihe gaziere gị. Ma, Setan na-achọ ọdịmma onwe ya naanị. Ọ chọghịdị ịma banyere gị. E nweghị ihe bara uru ọ ga-emere gị ma ị na-eme ihe ọ na-achọ. Olee otú ọ ga-esi enye gị ihe ọ na-enweghị? O nweghị ozi ọma, o nweghịkwa olileanya. Ọ ga-eme ka ihe ghara ịgaziri gị n’ihi na ihe na-echere yanwa bụ mbibi.—Mkpughe 20:10.

20. Gịnị ka onye na-eto eto kwesịrị ime ka o ruo eru inyefe Jehova onwe ya na ime baptizim? (Kwuo ihe dị n’igbe bụ́ “Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịna-emekwu Nke Ọma.”)

20 Inyefe Jehova onwe gị bụ mkpebi kacha mma ị ga-eme. Ị̀ dịla njikere ime ya? Ọ bụrụ na ị dịla njikere, ụjọ atụla gị ikwe Jehova nkwa a. Ma, ọ bụrụ na ọ dị gị ka i rubeghị eru, mee ihe e kwuru n’isiokwu a ka i nwee ike ịna-emekwu nke ọma. Pọl gwara ụmụnna nọ́ na Filipaị ka ha nọgide na-enwe ọganihu. (Ndị Filipaị 3:16) Ọ bụrụ na i mee ihe ndị ahụ, n’oge na-adịghị anya, ị ga-enyefe Jehova onwe gị, e meekwa gị baptizim.