Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2016

Ndị Na-eto Eto—Ùnu Chọrọ Ime Baptizim?

Ndị Na-eto Eto—Ùnu Chọrọ Ime Baptizim?

“Ọ̀ dị onye n’ime unu nke chọrọ iwu ụlọ elu, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu, ka o wee hụ ma ò nwere ihe ga-ezu iji wuchaa ya?”—LUK 14:28.

ABỤ: 120, 64

Gịnị ka mmadụ inyefe Chineke onwe ya pụtara? Olee otú o si gbasa baptizim?

1, 2. (a) Gịnị na-eme ndị Chineke obi ụtọ? (b) Olee otú ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na ndị okenye ọgbakọ ga-esi nyere ndị na-eto eto aka ịghọta ihe ime baptizim pụtara?

OTU okenye gwara nwatakịrị dị afọ iri na abụọ aha ya bụ Christopher, sị: “Ama m gị kemgbe ị bụ nwata. Obi dịkwa m ụtọ ịnụ na ị chọrọ ime baptizim. Ihe m chọrọ ịjụ gị bụ, ‘Gịnị mere i ji chọọ ime baptizim?’” E nwere ezigbo ihe mere okenye a ji jụọ ajụjụ ahụ. Obi na-atọ anyị ụtọ na ọtụtụ puku ndị na-eto eto na-eme baptizim kwa afọ. (Ekliziastis 12:1) Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na ndị okenye ọgbakọ na-agba mbọ ịhụ na ọ bụ ndị na-eto eto ji aka ha kpebie ime baptizim nakwa na ha ghọtara ihe ime baptizim pụtara.

2 Baịbụl na-akụziri anyị na mmadụ nyefee Chineke onwe ya, meekwa baptizim, ọ malitela ibi ndụ ọhụrụ otú Onye Kraịst kwesịrị ịna-ebi. Ndụ ọhụrụ onye ahụ  na-ebi ga-eme ka Jehova gọzie ya. Ma, ọ ga-eme ka Setan na-emegide ya. (Ilu 10:22; 1 Pita 5:8) Ọ bụ ya mere ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ji kwesị ịna-akụziri ụmụ ha ihe ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst pụtara. Ọ bụrụ na nne na nna onye na-eto eto abụghị Ndị Kraịst, ndị okenye ọgbakọ ga-eji obiọma nyere ya aka ka ọ ghọta ihe mmadụ inyefe Jehova onwe ya na ime baptizim pụtara. (Gụọ Luk 14:27-30.) Onye chọrọ ịrụ ụlọ na-ebu ụzọ kwadebe nke ọma ka o nwee ike ịrụcha ya. Otú ahụ ka ndị na-eto eto kwesịrị ibu ụzọ kwadebe tupu ha emee baptizim, ka ha nwee ike iji obi ha niile fee Jehova “ruo ọgwụgwụ.” (Matiu 24:13) Gịnị ga-enyere ndị na-eto eto aka ikpebi na ha ga-efe Jehova ruo mgbe ebighị ebi? Ka anyị chọpụta ihe ndị ga-enyere ha aka.

3. (a) Gịnị ka ihe Jizọs na Pita kwuru na-akụziri anyị gbasara otú ime baptizim dịruru ná mkpa? (Matiu 28:19, 20; 1 Pita 3:21) (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle? N’ihi gịnị ka anyị ga-eji atụle ha?

3 Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto chọrọ ime baptizim, ihe a ị chọrọ ime magburu onwe ya. O nweghị ihe dị ka mmadụ ịbụ Onyeàmà Jehova e mere baptizim. Ọ bụ ihe Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ime. O sokwa n’ihe mmadụ ga-eme ka a zọpụta ya n’oké mkpagbu ahụ. (Matiu 28:19, 20; 1 Pita 3:21) I mee baptizim, ị na-egosi na i kwela Jehova nkwa ijere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụrụ na ị chọrọ imezu nkwa ahụ, ịza ajụjụ ndị a ga-enyere gị aka ịma ma ì toruola ime baptizim: (1) M̀ toruola ime mkpebi a? (2) Ọ̀ bụ ihe m ji aka m kpebie ime? (3) M̀ ghọtala ihe mmadụ inyefe Jehova onwe ya pụtara? Ka anyị tụlee ajụjụ ndị ahụ.

MGBE I TORURU IME BAPTIZIM

4, 5. (a) Gịnị mere na ọ bụghị naanị ndị katarala ahụ́ kwesịrị ime baptizim? (b) Gịnị ka mmadụ itoru etoru pụtara?

4 Baịbụl ekwughị na ọ bụ naanị ndị katarala ahụ́ kwesịrị ime baptizim, o kwughịkwa afọ ole mmadụ ga-adị tupu ya eruo ime baptizim. Ilu 20:11 kwuru, sị: “Nwatakịrị na-esi n’omume ya eme ka a mata onye ọ bụ, ma ihe ọ na-eme ọ̀ dị ọcha, ziekwa ezi.” Nwatakịrị nwedịrị ike ịma ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, marakwa ihe mmadụ inyefe Chineke onwe ya pụtara. N’ihi ya, baptizim bụ ihe dị́ mkpa onye na-eto eto ma ihe nke nyeferela Jehova onwe ya kwesịrị ime.—Ilu 20:7.

5 Gịnị ka ọ pụtara ma a sị na mmadụ etoruola ime baptizim? Cheta na ogologo abụghị na nwa m etoola. Baịbụl kwuru na ndị tozuru okè bụ ndị zụrụla “ikike nghọta ha azụ” ịmata ihe dị́ iche n’ihe dị́ mma na ihe na-adịghị  mma. (Ndị Hibru 5:14) N’ihi ya, onye toruru etoru ma ihe dị́ mma, kpebiekwa n’obi ya na ya ga-eme ya. Ọ naghị adị mfe mmadụ ịrafu ya ka o mee ihe na-adịghị mma. Ọ naghịkwa eche ka ndị ọzọ na-agwa ya ihe o kwesịrị ime. N’eziokwu, e kwesịrị ịna-atụ anya na onye na-eto eto mere baptizim kwesịrị ịna-eme ihe dị́ mma a sịgodị na nne ya ma ọ bụ nna ya ma ọ bụkwanụ onye ọzọ katarala ahụ́ anọghị ya.—Tụlee Ndị Filipaị 2:12.

6, 7. (a) Kọwaa nsogbu ndị bịaara Daniel mgbe ọ nọ na Babịlọn. (b) Olee otú Daniel si gosi na ya etoruola ikpebi ime ihe dị́ mma?

6 Onye na-eto eto ò nwere ike ịna-akpa àgwà ndị a na-egosi na mmadụ etoruola ime baptizim? Chegodị banyere Daniel. Ọ ga-abụ na o rubeghị afọ iri abụọ mgbe a kpọpụrụ ya n’aka nne na nna ya kpụga Babịlọn. O meziri ka ya na ndị na-anaghị erubere iwu Chineke isi biri. Ma, ka anyị lebakwuo anya n’ọnọdụ Daniel n’oge ahụ. A na-elekọta ya nke ọma na Babịlọn. O so n’ụmụaka ole na ole a họpụtara ka ha na-ejere eze ozi. (Daniel 1:3-5, 13) Ọ dị ka ọkwá Daniel nọ na ya na Babịlọn karịrị ọkwá ọ bụla o nwere ike inweta n’Izrel.

7 Gịnịzi ka Daniel mere? Ò kwere ka ndị Babịlọn megharịa ya anya ma ọ bụ mee ka okwukwe ya gharazie isi ike? Mba. Baịbụl kwuru na mgbe Daniel nọ na Babịlọn, o kpebisiri ike ‘n’obi ya na ya agaghị emerụ onwe ya,’ ya bụ, na ọ gaghị eme ihe ọ bụla ga-eme ka o kpeere arụsị. (Daniel 1:8) Ihe a  Daniel mere gosiri na o toruola ikpebi ime ihe dị́ mma.

Onye na-eto eto torurula ime baptizim agaghị na-eme o ruo n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ya abụrụ enyi Chineke, o ruo n’ụlọ akwụkwọ, ya abụrụ enyi ụwa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)

8. Gịnị ka akụkọ Daniel na-akụziri gị?

8 Gịnị ka akụkọ Daniel na-akụziri gị? Obi ga-esi onye na-eto eto torurula ime baptizim ike banyere ihe ndị o kweere, ọ sọkwa ya ya bụrụ na ndị ọzọ ekwetaghị ihe ahụ. Ọ gaghị adị ka ogwumagala na-adị na-agbanwe ụcha ahụ́ ya ebe ọ bụla ọ nọ. Ọ gaghị na-eme o ruo n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ya abụrụ enyi Chineke, o ruo n’ụlọ akwụkwọ, ya abụrụ enyi ụwa. Kama, ọ ga na-eme ihe dị́ Chineke mma a sịgodị na ọnwụnwa abịara ya.—Gụọ Ndị Efesọs 4:14, 15.

Obi ga-esi onye na-eto eto torurula ime baptizim ike banyere ihe ndị o kweere, ọ sọkwa ya ya bụrụ na ndị ọzọ ekwetaghị ihe ahụ

9, 10. (a) Olee uru o nwere ike ịbara onye na-eto eto ma o chee echiche banyere ihe o mere mgbe ọnwụnwa bịara ya n’oge na-adịbeghị anya? (b) Gịnị ka ime baptizim pụtara?

9 O doro anya na e nweghị onye zuru okè. E nweghịkwa onye na-anaghị emehie ihe, ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto. (Ekliziastis 7:20) Ma, ọ bụrụ na ị chọrọ ime baptizim, ọ ga-adị mma ka ị chọpụta otú ime ihe Chineke chọrọ na-agụru gị agụụ. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ malitela irubere Jehova isi?’ Chegodị ihe i mere n’oge na-adịbeghị anya ọnwụnwa bịaara gị. Ị̀ matara ihe i kwesịrị ime? È nwetụla onye gbara gị ume ka i jiri onyinye Chineke nyere gị ghọọ onye a ma ama n’ụwa Setan otú ahụ e mere Daniel? Ọ bụrụ na ụdị ọnwụnwa a abịara gị, ị̀ ma ihe Jehova ga-achọ ka i mee?—Ndị Efesọs 5:17.

10 Gịnị mere i ji kwesị ịmata azịza ajụjụ ndị ahụ? Ọ bụ n’ihi na ha ga-enyere gị aka ịghọta na ime baptizim abụghị ihe e ji egwu egwu. Ọ bụrụ na i mee baptizim, i gosila ndị ọzọ na i kwela Jehova nkwa dị́ ezigbo mkpa. I kwela ya nkwa na ị ga-ahụ ya n’anya, jirikwa obi gị niile na-efe ya ruo mgbe ebighị ebi. (Mak 12:30) Onye ọ bụla mere baptizim kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka o mezuo nkwa ahụ o kwere Jehova.—Gụọ Ekliziastis 5:4, 5.

Ì JI AKA GỊ KPEBIE NA Ị GA-EME BAPTIZIM?

11, 12. (a) Gịnị kwesịrị ido onye chọrọ ime baptizim anya? (b) Gịnị ga-enyere gị aka ka ị na-ele baptizim anya otú Jehova si ele ya?

11 Baịbụl kwuru na ndị ohu Jehova niile “ga-eji obi ha wepụta onwe ha” ife ya, ma ndị na-eto eto. (Abụ Ọma 110:3) N’ihi ya, o kwesịrị ido onye chọrọ ime baptizim anya na ọ bụ ya kpebiri n’onwe ya ime baptizim. Ọ pụtara na ị ga-elerukwu mkpebi gị anya nke ọma, karịchaa ma ọ bụrụ na nne na nna gị nọ n’ọgbakọ.

12 Ọ ga-abụ na ị na-ahụ ka ọtụtụ ndị na-eme baptizim, ma ndị enyi gị ma ụmụnne gị. Ma, lezie anya ka ị ghara  iche na i kwesịrị ime baptizim n’ihi afọ ole ị dị ma ọ bụ n’ihi na ndị ọzọ na-eme. Olee otú ị ga-esi mata ma ị̀ na-ele baptizim anya otú Jehova si ele ya? Wepụta oge chee echiche ihe mere baptizim ji dị́ ezigbo mkpa. Ihe dị n’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya ga-enyere gị aka.

13. Olee otu ị ga-esi amata ma mkpebi imere ime baptizim ò si gị n’obi?

13 Otu ihe ga-enyere gị aka ịma ma mkpebi i mere ime baptizim ò si gị n’obi bụ ilebara otú i si ekpe ekpere anya. Ị̀ na-ekpechi ekpere anya? Ị̀ na-adị akpọ okwu aha n’ekpere? Ihe ị zara n’ajụjụ ndị a ga-egosi otú gị na Jehova dịruru ná mma. (Abụ Ọma 25:4) Ọtụtụ mgbe, Jehova na-esi na Baịbụl aza ekpere anyị. N’ihi ya, otú ọzọ ị ga-esi mata ma ị̀ chọrọ ịbịarukwu Jehova nso ma jiri obi gị niile na-efe ya bụ ilerukwu otú i si amụ ihe anya. (Jọshụa 1:8) Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-amụchi Baịbụl anya? À na-amanye m amanye iso n’ofufe ezinụlọ anyị?’ Ihe ị zara n‘ajụjụ ndị a ga-enyere gị aka ịma ma ọ̀ bụ gịnwa ji aka gị kpebie ime baptizim.

IHE MMADỤ INYEFE CHINEKE ONWE YA PỤTARA

14. Kọwaa ihe dị iche na mmadụ inyefe Chineke onwe ya na ime baptizim.

14 Ụfọdụ ndị na-eto eto amaghị ihe dị iche na mmadụ inyefe Chineke onwe ya na ime baptizim. Ụfọdụ nwere ike ikwu na ha enyefeela Jehova onwe ha ma na ha adịbeghị njikere ime baptizim. Ma, ọ̀ bụ eziokwu? Otú mmadụ si enyefe Jehova onwe ya bụ ikpe ekpere, kwe ya nkwa na ya ga-efe ya ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe mmadụ mere baptizim, o gosiri ndị ọzọ na o nyefeelarị Jehova onwe ya. N’ihi ya, tupu i mee baptizim, i kwesịrị ịghọta ihe mmadụ inyefe Chineke onwe ya pụtara.

15. Gịnị ka mmadụ inyefe Chineke onwe ya pụtara?

15 Mmadụ nyefee Jehova onwe ya, ọ gwala ya na ya bụzi nke ya. O kwela nkwa na ife ya ga-abụ ihe kacha mkpa ná ndụ ya. (Gụọ Matiu 16:24.) Ụdị nkwa a mmadụ kwere Chineke abụghị ihe e ji egwu egwu. (Matiu 5:33) N’ihi ya, olee otú i si egosi na ị ma na ọ bụghị gị nwezi onwe gị, kama na ị bụzi nke Jehova?—Ndị Rom 14:8.

16, 17. (a) Jiri ihe atụ kọwaa ihe mmadụ ịjụ onwe ya pụtara. (b) Ọ bụrụ na mmadụ enyefee Chineke onwe ya, gịnị ka onye ahụ na-agwa ya?

16 Ka anyị tụlee otu ihe atụ. Weregodị ya na enyi gị bunyere gị ụgbọala, nye gị akwụkwọ ya, gwa gị na ụgbọala ahụ bụ nke gị. Ma, ka o kwuchara, ya asị gị: “M ga-ejide mkpịsị ugodi ya. Ọ bụkwa m ga na-anya ya, ọ bụghị gịnwa.” Olee otú obi ga-adị gị gbasara onyinye ahụ? Oleekwa otú ị ga-esi ele enyi gị ahụ anya?

17 Mmadụ nyefee Jehova onwe ya, ihe onye ahụ mere bụ ịgwa Chineke, sị: “M nyefela gị ndụ m. Ọ bụzi gị nwe m.” Jehova ga na-atụ anya na onye ahụ ga-eme ihe o kwuru. Ma, gịnị ga-eme ma onye ahụ bido inupụrụ Jehova isi, ya na onye na-anaghị efe Chineke ana-akpa na nzuzo? Gịnị ga-emekwa  ma onye ahụ rụwa ọrụ na-agaghị na-enye ya ohere ịna-agachi ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma anya? Ọ pụtara na onye ahụ anaghị emezu ihe ahụ o kwere Jehova ná nkwa. Ọ ga-adị ka ebe a na-enyeghị gị mkpịsị ugodi ụgbọala e bunyere gị. Mgbe mmadụ nyefere Jehova onwe ya, ọ gwara ya, sị: “Ọ bụ gị nwe m, ọ bụghị mụnwa.” N’ihi ya, anyị ga na-eme ihe Jehova chọrọ mgbe niile a sịgodị na ọ bụghị ihe anyị chọrọ ime. Anyị kwesịrị iṅomi Jizọs. Ọ sịrị: “Esi m n’eluigwe bịa ime, ọ bụghị uche m, kama uche onye zitere m.”—Jọn 6:38.

Baptizim abụghị ihe e ji egwu egwu. E nweghị ihe a ga-eji tụnyere ya

18, 19. (a) Olee otú ihe Rose na Christopher kwuru si gosi na ime baptizim bụ ihe ọma na-eweta ngọzi? (b) Olee otú obi dị gị banyere ime baptizim?

18 O doro anya na baptizim abụghị ihe e ji egwu egwu. O nweghị ihe a ga-eji tụnyere mmadụ inyefe Jehova onwe ya na ime baptizim. Ndị na-eto eto bụ́ ndị hụrụ Jehova n’anya ma ghọta ihe mmadụ inyefe Jehova onwe ya pụtara anaghị egbu oge inyefe Chineke onwe ha nakwa ime baptizim. Ha anaghịkwa akwa ụta maka mkpebi ha mere. Otu nwata aha ya bụ Rose sịrị: “Ahụrụ m Jehova n’anya, e nweghịkwa ihe gaara eme m obi ụtọ karịa ife ya. E nwebeghị ihe m mere ná ndụ karịrị baptizim m mere.”

19 Ì chetara Christopher anyị kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a? Olee otú obi dị ya banyere mkpebi o mere ime baptizim mgbe ọ dị afọ iri na abụọ? Ọ sịrị na obi dị ya ezigbo ụtọ. Ọ malitere ịsụ ụzọ oge niile mgbe ọ dị afọ iri na asaa, bụrụ ohu na-eje ozi mgbe ọ dị afọ iri na asatọ. Ugbu a, ọ na-eje ozi na Betel. Ọ sịrị: “Ọ dị mma na m kpebiri ime baptizim. Iji ndụ m arụrụ Jehova na ọgbakọ ya ọrụ na-eme m obi ụtọ.” Ọ bụrụ na ị chọrọ ime baptizim, olee otú ị ga-esi akwadebe? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-esonụ.