Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2016

Jehova Na-edu Ndị Ya n’Ụzọ nke Ndụ

Jehova Na-edu Ndị Ya n’Ụzọ nke Ndụ

“Lekwa ụzọ. Jeenụ ije na ya.”—AỊZAYA 30:21.

ABỤ: 65, 48

1, 2. (a) Olee ihe zọrọla ọtụtụ ndị ndụ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ihe na-edu ndị Chineke nke nwere ike ịzọ ha ndụ?

E NWERE ihe e dere na saịn bọọdụ dị n’ụzọ ndị gafere n’ụzọ ụgbọ okporo ígwè dị iche iche dị n’Amerịka. Ihe ahụ e dere bụ “KWỤSỊ, LERUO ANYA, GEE NTỊ.” Okwu ndị ahụ nọrọ ebe ahụ ihe karịrị otu narị afọ. Gịnị mere e ji dee ha? Ọ bụ ka ụgbọala ọ bụla chọrọ ịgafe ghara isu ụgbọ okporo ígwè na-agbafe. Ihe ahụ e dere n’ụzọ ndị ahụ azọọla ọtụtụ ndị ndụ n’ihi na ha rubere isi na ya.

2 Ọ bụghị naanị iwu ka Jehova na-enye anyị. Ọ na-edu ndị ya ka ha nwee ike inweta ndụ ebighị ebi ma ghara ịbanye ná nsogbu. Jehova dị ka onye na-azụ atụrụ nke hụrụ atụrụ ndị ọ na-azụ n’anya, na-edu ha ka ha ghara ịbanye n’ebe ha ga-emerụ ahụ́.—Gụọ Aịzaya 30:20, 21.

JEHOVA NA-EDU NDỊ OHU YA MGBE NIILE

3. Olee otú ụmụ mmadụ si banye ná nsogbu, na-anwụkwa anwụ?

3 Kemgbe ụwa, Jehova na-edu ndị ya ma na-enye ha ntụziaka doro anya. Dị ka ihe atụ, ọ gwara Adam na Iv ihe doro anya ga-eme ka ụmụ mmadụ dịrị ndụ ebighị ebi,  na-enwekwa obi ụtọ. (Jenesis 2:15-17) Ma, Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi. Iv gere ntị na ndụmọdụ o yiri ka ọ̀ bụ agwọ na-enye ya, Adam mechakwara gee nwunye ya ntị. Gịnị si na ya pụta? Ha abụọ tara ahụhụ, nwụọkwa n’enweghị olileanya ịdị ndụ. Isi ha nupụrụ tinyekwara ụmụ mmadụ ná nsogbu, meekwa ka ha na-anwụ anwụ.

4. (a) Gịnị mere Chineke ji nye ụmụ mmadụ iwu ọhụrụ mgbe Iju Mmiri gachara? (b) Olee otú ihe gbanwere si gosi otú Chineke si ele ndụ anya?

4 Chineke nyere Noa ntụziaka zọrọ ndụ ndị mmadụ n’oge Iju Mmiri. Mgbe Iju Mmiri gachara, Jehova gwara ụmụ mmadụ ka ha ghara ịna-aṅụ ọbara ma ọ bụ na-eri ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe gbanwere mgbe ahụ. Jehova gwara ụmụ mmadụ ka ha riwe anụ. N’ihi ya, o nyere ha ntụziaka ọhụrụ. Ọ gwara ha, sị: “Unu erikọtala anụ na mkpụrụ obi ya—ọbara ya.” (Jenesis 9:1-4) Iwu a nyeere anyị aka ịghọta otú Chineke si ele ndụ anya. Ọ bụ ya kere ihe niile, nyekwa anyị ndụ. N’ihi ya, o ruru eru ịna-agwa anyị otú anyị ga-esi na-ebi ndụ. Dị ka ihe atụ, o nyere iwu ka ụmụ mmadụ ghara igbu ibe ha. Chineke weere ndụ na ọbara ka ihe dị nsọ, ọ ga-atakwa onye ọ bụla ji ha egwu egwu ahụhụ.—Jenesis 9:5, 6.

5. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a? Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

5 Chineke akwụsịghị idu ndị ya mgbe oge Noa gachara. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ụzọ ole na ole o si duo ha. Ịtụle ihe a ga-enyere anyị aka ịna-erube isi na ndụmọdụ na nduzi Jehova na-enye anyị iji banye n’ụwa ọhụrụ.

MBA ỌHỤRỤ, NTỤZIAKA ỌHỤRỤ

6. Gịnị mere ndị Izrel ji kwesị irube isi n’iwu Chineke si n’aka Mozis nye ha? Oleekwa otú ha kwesịrị isi na-ele iwu ahụ anya?

6 N’oge Mozis, Jehova gwara ndị ya ihe doro anya gbasara otú ha ga-esi na-akpa àgwà na otú ha ga-esi na-efe ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe gbanwere. Ndị Izrel biri ihe karịrị narị afọ abụọ n’Ijipt na-agba ohu. Ndị obodo ahụ na-ekpere arụsị, na-efe ndị nwụrụ anwụ, na-emekwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jehova kpọrọ asị. Mgbe ndị Izrel si n’Ijipt pụta, e kwesịrị inye ha ntụziaka ọhụrụ. Ha ga-abụzi mba ga na-eme naanị ihe Jehova chọrọ. Ụfọdụ akwụkwọ kwuru na okwu Hibru e si sụgharịta “iwu” yiri okwu nwere ike ịpụta “nduzi, ntụziaka, na ndụmọdụ.” Iwu ahụ chebere ụmụ Izrel ka ha ghara itinye aka n’omume rụrụ arụ nakwa ka ha ghara ikpere arụsi otú mba ndị gbara ha gburugburu si eme. Mgbe ndị Izrel gere Chineke ntị, ọ gọziri ha. Mgbe ha leghaara iwu ya anya, ha tara ezigbo ahụhụ.—Gụọ Diuterọnọmi 28:1, 2, 15.

7. (a) Kọwaa ihe mere Jehova ji nye ụmụ Izrel iwu. (b) Olee otú Iwu ahụ si duo ndị Izrel?

7 E nwere ihe ọzọ mere e ji kwesị inye ndị Izrel iwu ọhụrụ. Iwu ahụ Chineke nyere ụmụ Izrel nyeere ha aka ịkwadebe maka ọbịbịa Jizọs Kraịst bụ́ Mesaya ahụ, onye Jehova ga-eji emezu nzube ya. Iwu ahụ chetaara ndị Izrel na ha ezughị okè. O mekwara ka ha ghọta na ihe mgbapụta dị ha mkpa, ya bụ na e kwesịrị iji ihe zuru okè chụọ àjà iji gbapụta ha ná mmehie. (Ndị Galeshia 3:19; Ndị Hibru 10:1-10) Ihe ọzọ bụ na Iwu ahụ chebere ezinụlọ Mesaya  ga-esi bịa, nyekwara ndị Izrel aka ịmata onye ọ bụ mgbe ọ bịara. N’eziokwu, Iwu ahụ bụ “onye nduzi” duuru ndị Izrel gakwuru Kraịst.—Ndị Galeshia 3:23, 24.

8. Gịnị mere ụkpụrụ ndị dị n’Iwu Mozis ji kwesị ịna-edu anyị?

8 Anyị bụ́ Ndị Kraịst nwere ike irite uru ná ntụziaka ndị dị n’Iwu ahụ Jehova nyere ụmụ Izrel. Olee otú ọ ga-esi baara anyị uru? Anyị nwere ike ịkwụsị, leruo anya n’ihe mere e ji nye Iwu ahụ. N’agbanyeghị na anyị anọghị n’okpuru Iwu ahụ, anyị ka nwere ike ịna-eji ntụziaka ndị dị na ya na-ekpebi ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị nakwa otú anyị ga-esi na-efe Jehova. E dere Iwu ahụ na Baịbụl ka anyị nwee ike ịmụta ihe na ya, ka o duo anyị, nakwa ka anyị nwee ike ịghọta na Jizọs kụziiri anyị ihe karịrị Iwu ahụ. Gee ntị n’ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Unu nụrụ na a sịrị, ‘Akwala iko.’ Ma ana m asị unu na onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.” N’ihi ya, ọ bụghị naanị na anyị kwesịrị izere ịkwa iko, anyị kwesịkwara izere echiche ma ọ bụ ọchịchọ rụrụ arụ.—Matiu 5:27, 28.

9. Gịnị mere Chineke ji nye ndị ya ntụziaka ọhụrụ?

9 Mgbe Jizọs ghọrọ Mesaya, Jehova nyere ntụziaka ọhụrụ, meekwa ka a matakwuo ihe ụfọdụ banyere nzube ya. Gịnị mere o ji nye iwu ọhụrụ? Ọ bụ n’ihi na ihe gbanweere ndị Chineke n’oge ahụ. N’afọ 33, Jehova jụrụ mba Izrel ma họrọ ọgbakọ Ndị Kraịst ka ha bụrụ ndị ya.

NTỤZIAKA E NYERE NDỊ KRAỊST E TERE MMANỤ

10. Gịnị mere e ji nye ọgbakọ Ndị Kraịst iwu ọhụrụ? Gịnịkwa mere o ji dị iche n’iwu e nyere ụmụ Izrel?

10 Jehova nyere ụmụ Izrel Iwu Mozis iji kụziere ha otú ha ga-esi na-ebi ndụ na otú ha ga-esi na-efe ya. Malite n’oge ndịozi Jizọs, ọ bụghịzi naanị n’otu mba ka Chineke si họrọ ndị ya, kama ha si ná mba dị iche iche. A na-akpọkwa ha Ndị Kraịst e tere mmanụ. Ha malitere ọgbakọ Ndị Kraịst, nọrọkwa n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ. Jehova nyere ha iwu ọhụrụ gbasara otú ha ga-esi na-ebi ndụ nakwa otú ha ga-esi na-efe ya. N’eziokwu, “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ Ndịozi 10:34, 35) Ha na-edebe “iwu nke Kraịst,” nke e dere n’obi ha, ọ bụghị n’okwute. Iwu ahụ ga-edu Ndị Kraịst, baakwara ha uru n’ebe ọ bụla ha bi.—Ndị Galeshia 6:2.

11. Olee ihe abụọ gbasara ndụ Ndị Kraịst nke “iwu nke Kraịst” kwuru banyere ha?

11 Ntụziaka Jehova si n’aka Jizọs nye Ndị Kraịst e tere mmanụ na-abara ha ezigbo uru. Obere oge tupu a malite ọgbụgba ndụ ọhụrụ, Jizọs nyere iwu abụọ dị ezigbo mkpa. Nke mbụ bụ gbasara ọrụ ikwusa ozi ọma. Nke abụọ abụrụ gbasara otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-akpa àgwà na otú ha ga-esi na-emeso ibe ha. Ọ bụ Ndị Kraịst niile ka e nyere ntụziaka ndị ahụ, n’ihi ya, ọ gbasakwara anyị, ma ànyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa.

12. Gịnị bụ ihe ọhụrụ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya banyere ikwusa ozi ọma?

 12 N’oge ochie, ndị mba ọzọ na-aga n’Izrel ife Jehova. (1 Ndị Eze 8:41-43) Ma Jizọs mechara nye iwu dị na Matiu 28:19, 20. (Gụọ ya.) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gakwuru mmadụ niile. Na Pentikọst afọ 33, Jehova gosiri na ọ chọrọ ka e kwusaa ozi ọma n’ebe niile n’ụwa. N’ụbọchị ahụ, ihe dị ka otu narị mmadụ na iri abụọ ndị nọ́ n’ọgbakọ a malitere ọhụrụ jupụtara na mmụọ nsọ ma malite iji asụsụ dị́ iche iche na-ezi ma ndị Juu ma ndị a tọghatara atọghata ozi ọma. (Ọrụ Ndịozi 2:4-11) Ndị Sameria mechara soro ná ndị ha na-ezi ozi ọma. N’afọ 36, ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù sonyekwara ná ndị ha na-ezi ozi ọma. Ọ pụtara na Ndị Kraịst ga-aga na-ekwusara ndị niile bi n’ụwa ozi ọma.

13, 14. (a) Olee otú anyị ga-esi na-edebe “iwu ọhụrụ” ahụ Jizọs nyere? (b) Gịnị ka anyị mụtara n’aka Jizọs?

13 Jizọs nyekwara “iwu ọhụrụ” banyere otú anyị ga-esi na-emeso ụmụnna anyị. (Gụọ Jọn 13:34, 35.) Anyị kwesịrị ịna-egosi kwa ụbọchị na anyị hụrụ ha n’anya, ma anyị kwesịkwara ịdị njikere ịnwụ maka ha. Iwu Mozis ekwughị ụdị ihe ahụ.—Matiu 22:39; 1 Jọn 3:16.

14 Ọ bụ Jizọs kacha nwee ụdị ịhụnanya a. Ọ hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya nke ukwuu nke na ọ nwụrụ n’ihi ha. Ọ na-atụkwa anya na ndị na-eso ụzọ ya ga-emekwa otú ahụ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịdị njikere idi nsogbu nakwa ịnwụ n’ihi ụmụnna anyị.—1 Ndị Tesalonaịka 2:8.

NTỤZIAKA GA-ABARA ANYỊ URU UGBU A NAKWA N’ỌDỊNIHU

15, 16. Olee ihe ndị gbanwere n’oge anyị a? Oleekwa otú Chineke si edu anyị?

15 Jizọs họpụtara “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ka ọ na-enye ndị na-eso ụzọ ya ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị.’ (Matiu 24:45-47) Ihe ndị so ná nri ahụ bụ ntụziaka ndị dị mkpa na-enyere ndị Chineke aka mgbe ihe gbanwere. Olee otú ihe si gbanwee n’oge anyị a?

16 Anyị bi “n’oge ikpeazụ.” N’oge na-adịghịkwa anya, a ga-enwe mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa. (2 Timoti 3:1; Mak 13:19) Ihe ọzọ bụ na e sila n’eluigwe chụdata Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. Ha na-akpatara ụmụ mmadụ ezigbo nsogbu. (Mkpughe 12:9, 12) Anyị na-erubekwa isi n’iwu Jizọs nyere anyị ka e kwusaara mmadụ niile ozi ọma n’ọtụtụ asụsụ na n’ebe niile n’ụwa.

17, 18. Gịnị ka anyị kwesịrị ime banyere ntụziaka ọgbakọ Chineke na-enye anyị?

17 Nzukọ Chineke na-enye anyị ihe ndị na-enyere anyị aka ikwusa ozi ọma. Ị̀ na-eji ihe ndị ahụ ekwusa ozi ọma? N’ọmụmụ ihe anyị, a na-akụziri anyị otú kacha mma anyị ga-esi jiri ihe ndị ahụ na-ekwusa ozi ọma. Ị̀ na-ele ntụziaka ndị ahụ anya ka ihe si n’aka Chineke?

18 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-agọzi anyị, anyị kwesịrị ige ntị ná ntụziaka niile o si n’ọgbakọ ya na-enye anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-erube isi ugbu a, ọ ga-adịrị anyị mfe irube isi n’oge “oké mkpagbu” na-abịanụ, bụ́ mgbe a ga-ebibi ụwa Setan niile. (Matiu 24:21)  E bibichaa ya, a ga-enwe ntụziaka ọhụrụ ga-enyere anyị aka ibi n’ụwa ọhụrụ mgbe Setan na-agaghị adịkwa.

N’ụwa ọhụrụ, a ga-enye anyị akwụkwọ mpịakọta ndị a ga-eji nye anyị ntụziaka otú anyị ga-esi ebi na Paradaịs (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19 na nke 20)

19, 20. Gịnị bụ akwụkwọ mpịakọta a ga-emepe? Oleekwa uru ọ ga-abara anyị?

19 N’oge Mozis, mgbe ihe gbanweere ụmụ Izrel, Chineke nyere ha Iwu. Mgbe e mechara, e nyere ọgbakọ Ndị Kraịst “iwu nke Kraịst” nke ha kwesịrị ịna-erubere isi. Baịbụl gwakwara anyị na n’ụwa ọhụrụ, a ga-enye anyị akwụkwọ mpịakọta ndị a ga-eji nye anyị ntụziaka ọhụrụ. (Gụọ Mkpughe 20:12.) O nwere ike ịbụ na akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ ga-akọwara anyị ihe Jehova ga-achọ ka ụmụ mmadụ na-eme n’oge ahụ. Ịmụ akwụkwọ ndị ahụ ga-eme ka mmadụ niile, ma ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ, mata ihe Chineke chọrọ ka ha na-eme. Akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ ga-enyere anyị aka ịmụtakwu banyere otú Jehova si ele ihe anya. Anyị ga-aghọtakwu Baịbụl nke ọma, n’ihi ya, na Paradaịs, anyị ga-ahụ ibe anyị n’anya, na-akwanyere ibe anyị ùgwù, na-asọpụkwara ibe anyị. (Aịzaya 26:9) Chegodị banyere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta, kụziekwaara ndị ọzọ mgbe Eze anyị, bụ́ Jizọs Kraịst, ga na-edu anyị.

20 Chineke ga-ede aha anyị ‘n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ’ ma ọ bụrụ na anyị emee ihe “e dere n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ,” jirikwa obi anyị niile na-efe Chineke n’oge ule ikpeazụ. Anyị nwere ike inweta ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ỊKWỤSỊ ka anyị nwee ike gụọ ihe Baịbụl na-ekwu, LERUO ANYA ka anyị nwee ike ghọta ihe ọ na-akụziri anyị. Otú anyị si EGE NTỊ bụ ịna-erube isi ná ntụziaka Chineke na-enye anyị ugbu a. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị a, a ga-echebe anyị n’oké mkpagbu ahụ, obi ga-adịkwa anyị ụtọ ịmụtakwu gbasara Jehova, bụ́ Chineke maara ihe nke hụkwara anyị n’anya, ruo mgbe ebighị ebi.—Ekliziastis 3:11; Ndị Rom 11:33.