Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2016

Olee Otú Ị Ga-esi Mee Ka Ọgbakọ Na-adị n’Otu?

Olee Otú Ị Ga-esi Mee Ka Ọgbakọ Na-adị n’Otu?

‘Ọ bụ site n’aka ya ka ahụ́ dum si jikọọ ọnụ n’otu, meekwa ka o kwenyekọọ.’—NDỊ EFESỌS 4:16.

ABỤ: 53, 107

1. Olee ihe e ji mara ọrụ Chineke kemgbe ọ malitere ike ihe?

JEHOVA na Jizọs dị n’otu kemgbe Chineke malitere ike ihe. Jehova kere Jizọs tupu o kee ihe ndị ọzọ niile. E mechaa, ya na Jizọs amalite ịrụkọ ọrụ ọnụ, Jizọs anọrọ “n’akụkụ ya dị ka onye ọkà ọrụ.” (Ilu 8:30) Ndị ohu Jehova na-arụkọkwa ọrụ ọ bụla e nyere ha ọnụ. Dị ka ihe atụ, Noa na ndị ezinụlọ ya gbakọrọ aka rụọ ụgbọ. Mgbe e mechara, ndị Izrel gbakọrọ aka rụọ ụlọikwuu. Ha na-agbakọkwa aka tọtuo ya, burukwa ya gaa n’ebe ọzọ. N’ụlọ nsọ, ha na-abụkọ abụ ọnụ, na-akpọkọkwa ngwá egwú ha ji efe Jehova ọnụ. Ihe mere ndị ohu Jehova ji nwee ike ime ihe ndị a niile bụ n’ihi na ha dị n’otu.—Jenesis 6:14-16, 22; Ọnụ Ọgụgụ 4:4-32; 1 Ihe E Mere 25:1-8.

2. (a) Gịnị ka e ji mara ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

2 Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs rụkọkwara ọrụ ọnụ.  Pọl onyeozi kọwara na n’agbanyeghị na ọrụ ha na-arụ dị iche iche, ha niile dị n’otu. Ha niile na-eṅomi onye ndú ha bụ́ Jizọs Kraịst. Pọl ji ha tụnyere ahụ́ nke nwere akụkụ dị iche iche, ma ha niile na-arụkọ ọrụ ọnụ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 12:4-6, 12.) Anyịnwa kwanụ? Olee otú anyị na ndị ọzọ ga-esi na-adị n’otu ma n’ozi ọma ma n’ọgbakọ ma n’ezinụlọ anyị?

NA-EMEKỌ IHE ỌNỤ N’OZI ỌMA

3. Gịnị ka Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ?

3 N’oge ndịozi, Jọn onyeozi hụrụ ọhụụ ebe ndị mmụọ ozi asaa na-afụ opi. Mgbe mmụọ ozi nke ise fụrụ opi ya, Jọn hụrụ “otu kpakpando nke si n’eluigwe daa n’ụwa.” “Kpakpando” ahụ ji mkpịsị ugodi meghee nnukwu olulu gbara ọchịchịrị. Anwụrụ ọkụ si n’olulu ahụ pụta, e mechaa, igurube esi n’anwụrụ ọkụ ahụ pụta. Kama ibibi osisi na ihe ndị a kụrụ akụ, igurube ndị ahụ mekpara ndị “na-enweghị akara nke Chineke n’egedege ihu ha” ahụ́. (Mkpughe 9:1-4) Jọn ma otú igurube si ebibi ihe. Ha bibiri ihe nke ukwuu n’Ijipt n’oge Mozis. (Ọpụpụ 10:12-15) Igurube ndị ahụ Jọn hụrụ nọchiri anya Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị na-ekwusa ozi siri ike megide okpukpe ụgha. Ọtụtụ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa sokwa ha ekwusa ozi a. Ha niile ji otu obi na-arụ ọrụ ikwusa ozi ọma. Ọrụ a ha na-arụ enyerela ọtụtụ ndị aka isi n’okpukpe ụgha pụta, kwụsịkwa ịnọ n’okpuru Setan.

Ihe mere anyị ji nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile bụ na anyị dị n’otu

4. Olee ọrụ dịịrị ndị ohu Chineke? Gịnịkwa ga-enyere ha aka ịrụ ya?

4 Anyị nwere ọrụ ikwusara ndị niile bi n’ụwa “ozi ọma” tupu ọgwụgwụ eruo. Ọrụ a abụghịkwa obere ọrụ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Anyị kwesịrị ịkpọ ndị niile “akpịrị na-akpọ nkụ” ka ha bịa nụọ “mmiri nke ndụ.” Ihe ọ pụtara bụ na anyị kwesịrị inyere ndị niile chọrọ ịghọta eziokwu Baịbụl aka ka ha ghọta ya. (Mkpughe 22:17) Ma, naanị ihe ga-enyere anyị aka ime ihe a bụ anyị na ndị ọgbakọ anyị ịdị n’otu ma na-emekọ ihe ọnụ.—Ndị Efesọs 4:16.

5, 6. Olee otú ozi ọma anyị na-ekwusa si egosi na anyị dị n’otu?

5 E kwesịrị ịhazi ọrụ ikwusa ozi ọma nke ọma ka anyị nwee ike izi ọtụtụ ndị ozi ọma. Ntụziaka a na-enye anyị n’ọgbakọ na-enyere anyị aka. Anyị nwechaa nzukọ ozi ubi, anyị agawa ikwusara ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke. Anyị na-enyekwa ha akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị na-enye nde kwuru nde mmadụ akwụkwọ ndị ahụ n’ụwa niile. Oge ụfọdụ, a na-agwa anyị ka anyị soro mee mkpọsa  pụrụ iche. Ọ bụrụ na i soro mee ya, ọ pụtara na gị na nde kwuru nde ụmụnna n’ụwa niile na-arụkọ ọrụ na-akpọsa ozi ahụ. Gị na ndị mmụọ ozi na-arụkọkwa ọrụ ọnụ n’ihi na ha na-enyere ndị ohu Chineke aka ikwusa ozi ọma.—Mkpughe 14:6.

6 Ọ na-atọ anyị ezigbo ụtọ ma anyị gụọ Akwụkwọ Mgbaafọ banyere ihe si n’ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa niile apụta. Chegodị otú anyị niile si adị n’otu mgbe anyị na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa mgbakọ anyị. N’ebe ahụ, ọ bụ otu ihe ka a na-agwa anyị niile. Ma okwu ndị a na-ekwu ma ihe nkiri ma ihe ngosi ndị a na-eme na-agba anyị ume iji obi anyị niile na-efe Jehova. Anyị na ụmụnna anyị n’ụwa niile na-adịkwa n’otu ma anyị gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ. (1 Ndị Kọrịnt 11:23-26) Anyị niile na-agbakọ n’otu ụbọchị mgbe anwụ dachara, ya bụ, na Naịsan 14, igosi na obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ihe Jehova meere anyị nakwa ka anyị rube isi n’iwu Jizọs nyere. Izu ole na ole tupu ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị na-agbakọkwa aka kpọọ ndị mmadụ ka ha soro anyị bịa nnọkọ a dị́ mkpa.

7. Ka anyị na-arụkọ ọrụ ọnụ, gịnị ka anyị na-arụpụta?

7 Naanị otu igurube agaghị emebili ọtụtụ ihe. Naanị anyị agaghịkwa ezili mmadụ niile nọ n’ụwa ozi ọma. Ma, n’ihi na anyị na-arụkọ ọrụ ọnụ, anyị na-agwa nde kwuru nde mmadụ banyere Jehova, na-enyekwara ụfọdụ aka ito ya na ịsọpụrụ ya.

NA-EMEKỌ IHE ỌNỤ N’ỌGBAKỌ

8, 9. (a) Olee ihe atụ Pọl ji kụziere Ndị Kraịst na ha kwesịrị ịdị n’otu? (b) Olee otú anyị ga-esi na-emekọ ihe ọnụ n’ọgbakọ?

8 Pọl kọwaara ndị Efesọs otú e si hazie ọgbakọ, gwakwa ha na ndị niile nọ n’ọgbakọ kwesịrị ‘itolite n’ihe niile.’ (Gụọ Ndị Efesọs 4:15, 16.) Pọl ji ahụ́ mmadụ mee ihe atụ iji kọwaa na Onye Kraịst ọ bụla nwere ike inye aka mee ka ọgbakọ diri n’otu ma na-eso nduzi Jizọs, bụ́ onye ndú ọgbakọ. Ọ sịrị na ọ bụ “nkwonkwo ọ bụla nke na-enye ihe dị mkpa” na-eme ka akụkụ ahụ́ niile na-arụkọ ọrụ ọnụ. N’ihi ya, ma ànyị akatala ahụ́ ma ọ bụ na anyị akatabeghị, ma ahụ́ ọ̀ dị anyị ma ànyị na-arịa ọrịa, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

Olee otú ị ga-esi na-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu?

9 Jizọs họpụtara ndị okenye ka ha na-edu ndú n’ọgbakọ. Ọ chọkwara ka anyị na-akwanyere ha ùgwù ma na-eso ntụziaka ha na-enye anyị. (Ndị Hibru 13:7, 17) Ọ naghị adịcha mfe ime ihe a, ma anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka. Mmụọ nsọ ya ga-enyere anyị aka ịna-erube isi ná nduzi ndị okenye na-enye anyị. Chetakwa na ọgbakọ anyị ga-erite uru ma anyị dị umeala n’obi ma  na-eme ihe ndị okenye na-agwa anyị. Ọgbakọ anyị ga-adị n’otu, anyị ga-ahụkwu ibe anyị n’anya.

10. Olee otú ndị ohu na-eje ozi si eme ka ọgbakọ dị n’otu? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

10 Ndị ohu na-eje ozi na-enyekwa aka eme ka ọgbakọ dịrị n’otu. Ha na-agbasi mbọ ike inyere ndị okenye aka. Obi dịkwa anyị ụtọ maka ihe niile ha na-arụ. Dị ka ihe atụ, ndị ohu na-eje ozi na-ahụ na anyị nwere akwụkwọ anyị ga-eji na-aga ozi ọma, ha na-anabatakwa ndị na-abịa ọmụmụ ihe anyị. Ha na-agbasi mbọ ike imezi ihe ndị mebiri emebi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-edebekwa ya ọcha. Ọ bụrụ na anyị na ụmụnna ndị a ana-emekọ ihe, anyị ga-adị n’otu ma na-efekọ Jehova ọnụ.—Tụlee Ọrụ Ndịozi 6:3-6.

11. Olee ihe ndị na-akatabeghị ahụ́ nwere ike ime ka ọgbakọ wee dị n’otu?

11 Ụfọdụ ndị okenye arụsiela ọrụ ike n’ọgbakọ ruo ọtụtụ afọ. Ma, ebe ọ bụ na ha akatala ahụ́, ha anaghịzi emeli ihe ndị ahụ niile. Ụmụnna nwoke ndị ka na-eto eto nwere ike ịna-enyere ha aka. Ọ bụrụ na a zụọ ụmụ okorobịa ndị ahụ, ha ga-enwe ike ịrụwa ọrụ ndị ahụ n’ọgbakọ. Ndị ohu na-eje ozi jiri obi ha niile na-arụ ọrụ e nyere ha, ha nwere ike iru eru ịbụ ndị okenye. (1 Timoti 3:1, 10) Ụfọdụ ndị okenye na-akatabeghị ahụ́ eruola eru ịbụ ndị nlekọta sekit. Ha na-aga n’ọtụtụ ọgbakọ enyere ụmụnna aka. Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma anyị hụ ka ụmụnna ndị na-akatabeghị ahụ́ na-ewepụta onwe ha na-ejere ụmụnna ozi.—Gụọ Abụ Ọma 110:3; Ekliziastis 12:1.

NA-EMEKỌ IHE ỌNỤ N’EZINỤLỌ

12, 13. Gịnị ga-enyere ndị niile nọ n’ezinụlọ aka ịna-emekọ ihe ọnụ?

12 Olee otú anyị ga-esi nyere ndị ezinụlọ anyị aka ịna-emekọ ihe ọnụ? Ịna-enwe ofufe ezinụlọ kwa izu ga-enyere anyị aka. Ọ bụrụ na nne na nna na ụmụ ha ana-amụkọ okwu Chineke ọnụ, ha ga na-ahụkwu ibe ha n’anya. N’oge ahụ, ha nwere ike ịmụ ihe ha ga-ekwu n’ozi ọma nke ga-enyere ha aka ịna-ezi ozi ọma nke ọma. Ha ga-adịkwu n’otu ka ha na-ahụ na onye ọ bụla n’ime ha hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa ịna-eme ihe dị ya mma.

Ọ bụrụ na di na nwunye ahụ Jehova n’anya, na-efekọkwa ya ọnụ, ha ga na-enwe obi ụtọ, dịrịkwa n’otu

13 Olee otú di na nwunye ga-esi na-emekọ ihe ọnụ? (Matiu 19:6) Ọ bụrụ na ha abụọ ahụ Jehova n’anya, na-efekọkwa ya ọnụ, ha ga na-enwe obi ụtọ, dịrịkwa n’otu. Ha kwesịkwara ịna-egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya otú ahụ Ebreham na Sera, Aịzik na Ribeka, nakwa Elkena na Hana mere.  (Jenesis 26:8; 1 Samuel 1:5, 8; 1 Pita 3:5, 6) Ọ bụrụ na di na nwunye ana-eme otú ahụ, ha ga-adị n’otu, ha na Jehova ga-adịkwa ná mma.—Gụọ Ekliziastis 4:12.

Ofufe ezinụlọ na-enyere ma ndị katarala ahụ́ ma ndị na-akatabeghị ahụ́ aka ịdị n’otu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 15)

14. Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị anaghị efe Jehova, gịnị ka ị ga-eme ka unu ghara itisa?

14 Baịbụl kwuru hoo haa na anyị ekwesịghị ịlụ onye na-anaghị efe Jehova. (2 Ndị Kọrịnt 6:14) Ma, e nweela ụmụnna lụrụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova. Ụfọdụ ụmụnna anyị alụọla di ma ọ bụ nwunye tupu ha abụrụ Ndịàmà Jehova. Ndị nke ọzọ lụrụ ndị na-efe Jehova ma di ha ma ọ bụ nwunye ha emecha dapụ n’ọgbakọ. Ụmụnna ndị a niile na-agbasi mbọ ike na-erube isi na ndụmọdụ Baịbụl ka ezinụlọ ha ghara itisa. Ma, ọ naghị adịcha mfe. Dị ka ihe atụ, Mary na di ya bụ́ David, nọ na-efekọ Jehova ọnụ. Ma, David mechara kwụsị ịga ọmụmụ ihe. Mary nọ na-agba mbọ ịbụ ezigbo nwunye, na-akpakwa àgwà ọma. Ọ kụzikwaara ụmụ ya isii banyere Jehova. Ha na-agakwa ọmụmụ ihe na mgbakọ. Ka ọtụtụ afọ gachara, mgbe ụmụ ha toro, hapụ ụlọ, Mary ka nọkwa na-efe Jehova n’agbanyeghị na ihe sikwuuru ya ezigbo ike. David mechara malite ịgụ Ụlọ Nche na Teta! Mary na-edewere ya. Ka oge na-aga, ọ malitere ịga ọmụmụ ihe ụfọdụ, nwa nwa ya dị afọ isii na-edewekwara ya oche. Mgbe ọ bụla ọ na-abịaghị ọmụmụ ihe, nwata ahụ na-asị ya, “Papa nnukwu, obi adịghị m mma na ị bịaghị ọmụmụ ihe taa.” Ka afọ iri abụọ na ise gara, David laghachiri n’ọgbakọ, obi dịkwa ya na nwunye ya ụtọ na ha abụọ na-efekọ Jehova ọnụ ugbu a.

15. Olee otú ndị lụrụ di na nwunye kemgbe ga-esi na-enyere ndị lụrụ ọhụrụ aka?

15 Setan na-agbasi mbọ ike itisa ezinụlọ. Ọ bụ otu n’ime ihe ndị kwesịrị ime ka di na nwunye ndị na-efe  Jehova na-emekọ ihe ọnụ. N’agbanyeghị afọ ole ị lụrụla di ma ọ bụ nwunye, chee echiche ihe ị ga-ekwu ma ọ bụ ihe ị ga-eme ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-adịkwu ná mma. Ọ bụrụ na o teela unu lụrụ, unu nwekwara ike inyere ndị ka lụrụ ọhụrụ aka. Unu nwere ike ịkpọ ha ka ha bịa soro unu n’ofufe ezinụlọ unu. Ha ga-ahụ na n’agbanyeghị afọ ole mmadụ lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ha kwesịrị ịna-ahụ ibe ha n’anya ma na-emekọ ihe ọnụ.—Taịtọs 2:3-7.

“KA ANYỊ GBAGOO N’UGWU JEHOVA”

16, 17. Olee ihe ọma ndị ohu Chineke na-ele anya ya?

16 Mgbe ndị Izrel na-aga ememme dị iche iche na Jeruselem, ha na ibe ha na-emekọ ihe ọnụ. Ha na-akwado ihe niile ha ji aga. Ha niile esorozie gawa, ha na-enyekwara ibe ha aka n’ụzọ. Ha ruo n’ụlọ nsọ, ha na-abụkọ abụ ọnụ, fekọọkwa Jehova ọnụ. (Luk 2:41-44) Taa, ka anyị na-akwado ịbanye n’ụwa ọhụrụ, anyị kwesịrị ịdị n’otu, na-emekọkwa ihe ọnụ. Ì nwere ike icheta ihe ndị ị ga na-eme ka ọgbakọ na-adịkwu n’otu?

17 Ndị ụwa anaghị emekọ ihe ọnụ, o nweghịkwa ihe na-anaghị esere ha okwu. Ma, obi dị anyị ụtọ na Jehova enyerela anyị aka ịdị n’udo ma ghọtakwa eziokwu Baịbụl. Ndị ohu ya n’ụwa niile na-efe ya otú ọ chọrọ. N’oge ikpeazụ a, ndị Jehova dị n’otu karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Dị ka Aịzaya na Maịka buru n’amụma, anyị na-agakọ “n’ugwu Jehova” ọnụ. (Aịzaya 2:2-4; gụọ Maịka 4:2-4.) Obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ n’ọdịnihu mgbe mmadụ niile nọ n’ụwa ga na-emekọ ihe ọnụ, jirikwa otu obi na-efe Jehova.