Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2016

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee mgbe Babịlọn Ukwu ahụ dọọrọ ndị Chineke n’agha?

Ọ malitere mgbe afọ 100 Oge Ndị Kraịst gachara, kwụsị n’afọ 1919. Ọ bụzi otú anyị si ghọta ya ugbu a. Ma, gịnị mere anyị ji gbanwee ihe anyị ghọtaburu?

Ihe ndị mere eme gosiri na ọ bụ n’afọ 1919 ka e si na Babịlọn Ukwu ahụ tọhapụ Ndị Kraịst e tere mmanụ, ma chịbata ha n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Chegodị echiche: Ozugbo Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914, e lere ndị Chineke ule, ma jiri nwayọọ nwayọọ mee ka ha wepụ aka n’ihe ọ bụla gbasara okpukpe ụgha. * (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.) (Malakaị 3:1-4) N’afọ 1919, Jizọs họpụtara “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ka ọ na-enye ndị ohu Chineke ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị.’ (Matiu 24:45-47) Ọ bụkwa n’afọ ahụ ka e si na Babịlọn Ukwu ahụ tọpụ ndị Chineke. (Mkpughe 18:4) Ma, ole mgbe a dọọrọ ndị Chineke n’agha?

N’oge gara aga, anyị kwuru na Babịlọn Ukwu ahụ dọọrọ ndị Chineke n’agha malite n’afọ 1918 nakwa na ha nọrọ na ya obere oge. Ụlọ Nche March 15, 1992, sịrị na ọ bụ otú ahụ e si dọrọ ndị Izrel n’agha laa Babịlọn ka e sikwa dọrọ ndị ohu Jehova n’agha laa Babịlọn Ukwu ahụ n’afọ 1918. Ma, nchọnchọ ndị e mekwuru na-egosi na ndị Chineke nọrọ n’agbụ ahụ ọtụtụ afọ tupu afọ 1918.

Amụma e buru n’Ezikiel 37:1-14 kwuru na a ga-adọrọ ndị Chineke n’agha, na e mechaakwa a ga-atọhapụ ha. N’ọhụụ, Ezikiel hụrụ ndagwurugwu ọkpụkpụ juru. Jehova sịrị: “Ọkpụkpụ ndị a bụ ụlọ Izrel dum.” (Amaokwu nke 11) Ọ nọchiri anya ma mba Izrel ma “Izrel nke Chineke,” ya bụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ. (Ndị Galeshia 6:16; Ọrụ Ndịozi 3:21) N’ọhụụ ahụ, ọkpụkpụ ndị ahụ malitere ịdị ndụ ma bụrụ ụsụụ ndị agha dị ukwuu. Ihe a na-akọwa otú e si sí na Babịlọn Ukwu ahụ tọhapụ ndị Chineke n’afọ 1919. Ma, olee otú amụma a si gosi na ha nọrọ ogologo oge n’agbụ ahụ?

Nke mbụ bụ na Ezikiel hụrụ na ọkpụkpụ ndị ahụ nwụrụ anwụ “kpọrọ nkụ nke ukwuu.” (Ezikiel 37:2, 11) Ọ pụtara na o teela ezigbo aka  ndị ahụ nwụrụ. Nke abụọ abụrụ na Ezikiel hụrụ na ndị ahụ nwụrụ anwụ ji nwayọọ nwayọọ dịrị ndụ. O kwuru, sị, “M malitere ịnụ ụda, lee, mkpọtụ mere, ọkpụkpụ ndị ahụ wee na-abịaru ibe ha nso, ọkpụkpụ ana-agakwuru ọkpụkpụ nke ya.” Ọ hụkwara ka “akwara na anụ ahụ́ dịkwasịrị ha,” akpụkpọ ahụ́ ekpuchiekwa ha. E mechaa, ‘ume ndụ amalite ịbanye n’ime ha, ha wee dịrị ndụ.’ N’ikpeazụ, ka ndị ahụ dịchara ndụ, Jehova nyere ha ala ebe ha ga-ebi. Ihe a niile kwesịrịnụ iwe oge.—Ezikiel 37:7-10, 14.

Dị ka e buru n’amụma a, ndị Izrel nọtere aka na Babịlọn mgbe a dọọrọ ha n’agha. Mgbe mbụ a dọọrọ ha n’agha bụ n’afọ 740 tupu Kraịst abịa mgbe a chụpụrụ ebo iri nke ụmụ Izrel, ya bụ, alaeze ebe ugwu, n’ala ha. Mgbe e mechara, n’afọ 607 tupu Kraịst abịa, ndị Babịlọn bibiri Jeruselem, chụpụkwa ebo abụọ nke ụmụ Izrel, ya bụ, alaeze ebe ndịda. E mechazie, n’afọ 537 tupu Kraịst abịa, a tọhapụrụ ha mgbe ndị Juu ole na ole lọtara ka ha rụghachi ụlọ nsọ ma malite ife Jehova na Jeruselem.

Ihe a niile mere ka o doo anya na Ndị Kraịst e tere mmanụ nọtere aka n’agbụ Babịlọn Ukwu ahụ, na ọ bụghị naanị malite n’afọ 1918 ruo afọ 1919. Jizọs kwukwara banyere oge a tere aka mgbe o kwuru na Ndị Kraịst adịgboroja, ya bụ, ata ahụ, na ọka wit, ya bụ, “ụmụ nke alaeze” ga-etokọ. (Matiu 13:36-43) N’oge ahụ, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole bụ ezigbo Ndị Kraịst. Ọtụtụ n’ime ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst nabatara ozizi ụgha, si n’ezi ofufe dapụ. Ọ bụ ya mere anyị nwere ike iji kwuo na Babịlọn Ukwu ahụ dọọrọ ọgbakọ Ndị Kraịst n’agha. Ọ malitere mgbe afọ 100 Oge Ndị Kraịst gachara nọruokwa mgbe e mere ka ụlọ nsọ ihe atụ dị ọcha n’oge ikpeazụ a.—Ọrụ Ndịozi 20:29, 30; 2 Ndị Tesalonaịka 2:3, 6; 1 Jọn 2:18, 19.

N’ọtụtụ narị afọ ndị ahụ ndị Chineke nọ n’agbụ, ndị isi ụka na ndị ọchịchị chọrọ ka onye ọ bụla na-eme ihe ha kwuru. Dị ka ihe atụ, ha ekweghị ka ndị mmadụ nwee Baịbụl ma ọ bụkwanụ gụọ ya n’asụsụ ha ga-aghọta. A kpọdịrị ụfọdụ ndị na-agụ Baịbụl ọkụ n’elu osisi, mesiekwa ndị kwuru na ihe ndị isi ụka na-eme adịghị mma ike. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na e nweghị onye ga-enwe ike ịmụta eziokwu Baịbụl ma ọ bụ kụziere ya ndị ọzọ.

 Ihe ọzọ anyị mụtara n’ọhụụ Ezikiel ahụ bụ na ndị Chineke mechara dịrị ndụ, e jirikwa nwayọọ nwayọọ si n’okpukpe ụgha tọhapụ ha. Oleekwanụ mgbe nke a mere, oleekwa otú o si mee? N’ọhụụ ahụ, Ezikiel kwuru na “mkpọtụ mere.” Nke a malitere ime narị afọ ikpeazụ ole na ole tupu oge ikpeazụ amalite. N’afọ ndị ahụ, e nwere ụfọdụ ndị ji obi ha niile na-achọ eziokwu Baịbụl, chọọkwa ife Chineke n’agbanyeghị na ozizi ụgha juru ebe niile. Ha mụrụ Baịbụl ma mee ihe niile ha nwere ike iji gwa ndị ọzọ ihe ha na-amụta. Ndị ọzọ gbasiri mbọ ike ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ ndị mmadụ ga-aghọta.

N’ihe dị ka n’afọ 1875, ahụ́ na akpụkpọ ahụ́ malitere ikpuchi ọkpụkpụ ndị ahụ. Charles Taze Russell na ndị enyi ya gbasiri mbọ ike ịchọta eziokwu Baịbụl ma fewe Jehova. Ha jikwa Zion’s Watch Tower na akwụkwọ ndị ọzọ nyere ndị mmadụ aka ịghọta eziokwu. E mechara, wepụta “Photo-Drama of Creation” (Foto Ihe Nkiri nke Okike) n’afọ 1914, wepụtakwa akwụkwọ bụ́ The Finished Mystery n’afọ 1917. Fim ahụ na akwụkwọ ahụ nyeere ndị Jehova aka ime ka okwukwe ha sie ike. N’ikpeazụ, n’afọ 1919, ọ bịaziri dị ka à ga-asị na ndị Chineke malitere ịdị ndụ, e nyekwa ha ala ọhụrụ. Kemgbe ahụ, ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa na ndị e tere mmanụ na-arụkọzi ọrụ. Ha niile na-efekọ Jehova ọnụ, ha abụrụkwala “ụsụụ ndị agha dị nnọọ ukwuu.”—Ezikiel 37:10; Zekaraya 8:20-23. *—Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.

Ihe ndị a anyị tụlere emeela ka o doo anya na ndị Chineke malitere ịnọ n’agbụ Babịlọn Ukwu ahụ mgbe afọ 100 Oge Ndị Kraịst gachara. Ọ bụ n’oge ahụ ka ọtụtụ ndị si n’ezi ofufe dapụ mgbe ha nabatara ozizi ụgha ma jụ eziokwu Baịbụl. Ruo ọtụtụ afọ, o siiri ndị mmadụ ezigbo ike ife Jehova, otú ahụ o siiri ndị Izrel ike mgbe a dọọrọ ha n’agha. Ma, a na-ekwusara mmadụ niile eziokwu ahụ taa. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị bi n’oge a mgbe “ndị nwere nghọta ga na-enwu dị ka ìhè.” Ọtụtụ ndị nweziri ike ‘ịsacha onwe ha,’ “dị ọcha,” fewekwa ezi Chineke.—Daniel 12:3, 10.

Mgbe Setan nwara Jizọs ọnwụnwa, ọ̀ kpọọrọ ya gaa n’ụlọ nsọ ka ọ̀ bụ n’ọhụụ ka o gosiri ya ụlọ nsọ ahụ?

Anyị amaghị kpọmkwem otú Setan si gosi Jizọs ụlọ nsọ ahụ.

Matiu na Luk bụ́ ndị so dee Baịbụl dere ihe merenụ. Matiu kwuru na “Ekwensu kpọọrọ” Jizọs gaa na Jeruselem, “mee ka o guzoro n’elu ihe a rụbichiri na mgbidi ụlọ nsọ,” ya bụ, n’ebe kacha elu n’ụlọ nsọ ahụ. (Matiu 4:5) Luk kwuru na Ekwensu ‘duuru ya banye Jeruselem ma mee ka o guzoro n’elu ihe a rụbichiri na mgbidi ụlọ nsọ.’—Luk 4:9.

Akwụkwọ anyị kwuburu na ọ ga-abụ na Setan akpọrọghị Jizọs gaa n’ụlọ nsọ ahụ mgbe ọ chọrọ ịnwa ya ọnwụnwa. Ụlọ Nche March 1, 1961, ji ya tụnyere mgbe ahụ Setan nwara Jizọs ọnwụnwa, kpọrọ ya gaa n’ugwu dị oké elu ma gosi ya alaeze niile nke ụwa. Ụlọ Nche ahụ kwuru na e nweghị ugwu dị oké elu nke mmadụ nwere ike ịnọ hụ alaeze niile nke ụwa. O kwuziri na ọ ga-abụ na Setan akpọghị Jizọs gaa n’ụlọ nsọ ahụ dị́ na Jeruselem. Ma, Ụlọ Nche ndị ọzọ  mechara kwuo na ọ bụrụ na Jizọs si n’ụlọ nsọ ahụ wụda, o nwere ike ịnwụ.

Ụfọdụ ndị sịrị na ebe ọ bụ na Jizọs abụghị onye Livaị, a garaghị ekwe ka ọ gaa guzoro n’elu ebe nsọ nke ụlọ nsọ ahụ. N’ihi ya, ha kwuru na ọ ga-abụ na ọ bụ n’ọhụụ ka Setan nwara Jizọs. Ọ bụ ụdị ihe mere Ezikiel ọtụtụ narị afọ gara aga mgbe a kpọ ya gaa n’ụlọ nsọ n’ọhụụ.—Ezikiel 8:3, 7-10; 11:1, 24; 37:1, 2.

Ma ọ bụrụ na ọ bụ n’ọhụụ ka a kpọ Jizọs gaa n’ụlọ nsọ ahụ, ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche, sị:

  • Jizọs ọ̀ gaara ewere na isi n’elu ụlọ nsọ ahụ wụda bụ ọnwụnwa?

  • N’oge ndị ọzọ Setan nwara Jizọs, ọ bụ ezigbo okwute ka ọ gwara ya ka o mee ka ọ ghọọ ezigbo achịcha, ọ bụkwa ezigbo isiala ka ọ chọrọ ka ọ kpọọrọ ya. N’ihi ya, ọ̀ ga-abụ na Setan chọkwara ka Jizọs sí n’elu ezigbo ụlọ nsọ wụtuo?

Ma, ọ bụrụ na ọ bụghị n’ọhụụ ka Setan kpọgara Jizọs n’ụlọ nsọ, ụfọdụ nwere ike ịna-eche, sị:

  • Ọ̀ pụtara na Jizọs dara Iwu, gaa guzoro n’elu ebe nsọ nke ụlọ nsọ ahụ?

  • Olee otú Jizọs si sí n’ala ịkpa banye n’ụlọ nsọ dị́ na Jeruselem?

Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ abụọ ikpeazụ a.

Otu prọfesọ aha ya bụ D. A. Carson dere na ọ dị ka okwu Grik e si sụgharịta “ụlọ nsọ” n’akwụkwọ Matiu na Luk pụtara ebe ọ bụla n’ụlọ nsọ ahụ, ọ bụghị naanị ebe nsọ, bụ́ ebe naanị ndị Livaị na-abanye. E nwere ebe a rụrụ n’ebe ndịda n’elu ụlọ nsọ ahụ mmadụ nwere ike ịnọ hụ ihe na-eme n’ebe ọ bụla n’ụlọ nsọ ahụ. Ọ bụ ebe ahụ kacha elu n’ụlọ nsọ ahụ. O nwere ike ịbụ ebe ahụ ka Jizọs guzo. Isi ebe ahụ gbadaa na Ndagwurugwu Kidrọn dị otu narị mita na iri anọ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Josifọs kwuru na ebe ahụ dị ezigbote elu nke na mmadụ kwụrụ ebe ahụ lee anya n’ala, ajụ nwere ike ibu ya. N’agbanyeghị na Jizọs abụghị onye Livaị, ọ kwụrụ ebe ahụ, e nweghị onye ga-enye ya nsogbu.

Ma, olee otú Jizọs si sí n’ala ịkpa banye n’ụlọ nsọ ahụ dị́ na Jeruselem? Anyị amaghị. Naanị ihe Baịbụl kwuru bụ na e duuru Jizọs banye Jeruselem. O kwughị ma ebe ahụ ọ̀ dị anya ma e si ya gawa Jeruselem, o kwughịkwa awa ole Setan ji nwaa ya. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na Jizọs ji ukwu gaa Jeruselem n’agbanyeghị na o nwere ike iwe ya oge.

Mgbe Setan gosiri Jizọs “alaeze niile nke ụwa,” ọ dị ka ọ̀ bụ n’ọhụụ ka o gosiri ya ha n’ihi na e nweghị ugwu ọ bụla dị́ n’ụwa a ga-anọ hụ alaeze niile nke ụwa. E nwere ike iji otú Setan si nwaa Jizọs tụnyere ebe mmadụ ji televishọn gosi onye ọzọ foto ebe dị́ iche iche n’ụwa. N’agbanyeghị na ọ bụ n’ọhụụ ka Setan gosiri Jizọs alaeze ndị ahụ, ọ bụ ezigbote isiala ka ọ chọrọ ka ọ kpọọrọ ya. (Matiu 4:8, 9) N’ihi ya, mgbe Setan kpọ Jizọs gaa n’ụlọ nsọ, ọ ga-abụ na ọ chọrọ ka o mee ihe nwere ike ịta isi ya mgbe ọ gwara ya ka o si ebe ahụ wụtuo. Ma Jizọs ekweghị ka Ekwensu nwata ya. Ihe a agaraghị abụ ọnwụnwa ma ọ bụrụ naanị n’ọhụụ ka Setan bịakwutere ya.

N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na Jizọs gara Jeruselem, guzoro n’ebe kacha elu n’ụlọ nsọ ahụ. Ma, dị ka anyị kwurula ná mbido isiokwu a, anyị amaghị kpọmkwem otú Setan si gosi Jizọs ụlọ nsọ ahụ. Ma, anyị ma na Setan nọ na-agbalị ka o mee ka Jizọs mee ihe na-adịghị mma. Ma n’oge ọ bụla ọ nwara Jizọs, ọ nwataghị ya.

^ para. 2 Ezikiel 37:1-14 na Mkpughe 11:7-12 kwuru banyere ihe mere n’afọ 1919. Amụma dị n’Ezikiel 37:1-14 na-ekwu banyere otú ndị ohu Chineke niile si malitekwa ife Chineke n’afọ 1919 mgbe ha nọchara ogologo oge n’agbụ. Ma, Mkpughe 11:7-12 na-ekwu banyere ihe mere n’afọ 1919, bụ́ mgbe e mere ka ụmụnna ole na ole n’ime ndị e tere mmanụ malite iduzi ndị Chineke. Tupu oge ahụ, e nweghị ihe e kwere ka ụmụnna ndị ahụ na-eme.