Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JUN 2016

“Jehova Bụ́ Chineke Anyị Bụ Otu Jehova”

“Jehova Bụ́ Chineke Anyị Bụ Otu Jehova”

“Nụrụ, Izrel: Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova.”—DIUT. 6:4.

ABỤ: 138, 112

1, 2. (a) Gịnị mere ọtụtụ ndị ji mara ihe Mozis kwuru na Diuterọnọmi 6:4? (b) Gịnị mere Mozis ji kwuo ihe ahụ?

KEMGBE ọtụtụ narị afọ, ndị Juu na-ekwughachi ihe e dere na Diuterọnọmi 6:4 ma ha kpewe otu ekpere pụrụ iche. Ha na-ekpe ya kwa ụbọchị, ma n’ụtụtụ ma n’abalị. Ha na-akpọ ya Shema, nke bụ́ okwu mbụ dị́ n’amaokwu ahụ n’asụsụ Hibru. Ọtụtụ ndị Juu na-ekpe ekpere ahụ iji gosi na ha na-efe naanị Chineke.

2 Ihe e kwuru n’amaokwu ahụ so n’ihe Mozis kwuru n’okwu ikpeazụ ọ gwara ndị Izrel tupu ya anwụọ. Ọ bụ n’afọ 1473 Tupu Oge Ndị Kraịst, mgbe ndị Izrel nọ n’ala Moab, na-achọ ịgafe osimiri Jọdan ka ha gaa nweta Ala Nkwa ahụ. (Diut. 6:1) N’oge ahụ, Mozis eduola ha afọ iri anọ. Ọ chọkwara ka obi sie ha ike ka ha nwee ike idi nsogbu ndị ga-abịara ha. Ha kwesịrị ịtụkwasị Chineke ha bụ́ Jehova obi ma na-erubere ya isi. O doro anya na okwu ikpeazụ ahụ Mozis gwara ha mere ka ha ghọta na ha kwesịrị ime otú ahụ. Mgbe o kwuchara banyere Iwu Iri na iwu ndị  ọzọ Jehova nyere ndị Izrel, o kwuru okwu ahụ na-emetụ n’ahụ́, nke e dere na Diuterọnọmi 6:4, 5. (Gụọ ya.)

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

3 Ọ̀ pụtara na ndị Izrel ndị ahụ amaghị na Jehova bụ́ Chineke bụ “otu Jehova”? O doro anya na ha ma. Ndị Izrel kwesịrị ntụkwasị obi ma naanị otu Chineke, na-efekwa ya, ya bụ, Chineke Ebreham, Aịzik, na Jekọb, bụ́ ndị nna nna ha. Gịnịzi mere Mozis ji chetara ha na Jehova bụ́ Chineke ha bụ “otu Jehova”? Ò nwere otú ihe ahụ ọ gwara ha si gbasa iji obi anyị niile na mkpụrụ obi anyị niile na ike anyị niile hụ Jehova n’anya dị́ ka e kwuru n’amaokwu nke ise? Olee otú ihe ahụ e kwuru na Diuterọnọmi 6:4, 5 si gbasa anyị taa?

CHINEKE ANYỊ BỤ “OTU JEHOVA”

4, 5. (a) Olee otu n’ime ihe okwu ahụ bụ́ “otu Jehova” pụtara? (b) Olee otú Jehova si dị́ iche na chi dị́ iche iche mba ndị ọzọ na-efe?

4 Ọ Pụrụ Iche. N’asụsụ Hibru nakwa n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ, okwu ahụ bụ́ “otu” apụtaghị naanị ihe a na-ekwu ma a gụwa ole ihe dị. O nwere ike ịpụta ihe bụ́ ọpụrụiche, ihe e nwere naanị ya. O yighị ka ihe mere Mozis ji kwuo ihe ahụ bụ ka o gosi na Chineke abụghị atọ n’ime otu. Ọ bụ Jehova kere eluigwe na ụwa, bụrụkwa Ọkaakaa nke eluigwe na ụwa. E nweghị onye ọzọ bụ́ ezi Chineke ma e wepụ ya; e nweghị chi dị ka ya. (2 Sam. 7:22) N’ihi ya, Mozis chọrọ ichetara ndị Izrel na ọ bụ naanị Jehova ka ha kwesịrị ịna-efe. Ha ekwesịghị ịna-eme ka mba ndị gbara ha gburugburu, bụ́ ndị na-efe chi ụgha dị́ iche iche. Mba ndị ahụ kweere na ụfọdụ n’ime chi ụgha ha na-achị ihe ụfọdụ e kere eke.

5 Dị ka ihe atụ, ndị Ijipt na-efe chi anyanwụ a na-akpọ Ra, chi nwaanyị mbara igwe a na-akpọ Nọt, chi ụwa a na-akpọ Geb, chi Naịl a na-akpọ Hapi, na ọtụtụ anụmanụ. Jehova gosiri na ya ka chi ndị a niile mgbe o tiri ndị Ijipt Ihe Otiti Iri. Chi ndị Kenan kacha efe bụ Bel. Ha kweere na ọ bụ ya mere ka ndụ dịrị nakwa na ọ bụ ya bụ chi mbara igwe, mmiri ozuzo, na oké ifufe. N’ọtụtụ ebe, ndị mmadụ tụkwasịrị Bel obi na ọ ga-echebe ha. (Ọnụ Ọgụ. 25:3) Ndị Izrel kwesịrị ịna-echeta na Chineke ha, bụ́ “ezi Chineke,” bụ “otu Jehova.”—Diut. 4:35, 39.

6, 7. Olee ihe ọzọ okwu ahụ bụ́ “otu” pụtara, oleekwa otú Jehova si gosi na ya bụ “otu”?

6 Ọ Naghị Agbanwe Agbanwe, Ọ Naghịkwa Ahapụ Ndị Na-efe Ya. Okwu ahụ bụ́ “otu” pụtakwara ịdị n’otu na inwe otu obi. E kewaghị Jehova Chineke ekewa. Kama, o kwesịrị ntụkwasị obi, ọ naghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ahapụ ndị na-efe ya, ọ na-ekwukwa eziokwu. Dị ka ihe atụ, o kwere Ebreham nkwa na ụmụ ya ga-enweta Ala Nkwa ahụ, ọ rụkwara ọtụtụ ọrụ ebube iji mezuo nkwa ahụ. Mgbe narị afọ anọ na iri atọ gachara, Jehova ka kpebisiri ike imezu ya.—Jen. 12:1, 2, 7; Ọpụ. 12:40, 41.

7 Mgbe ọtụtụ narị afọ gara, Jehova kpọrọ ndị Izrel ndị àmà ya ma gwa ha, sị: “Abụ m otu Onye ahụ. Ọ dịghị Chi a kpụrụ tupu mụ onwe m, ọ dịghịkwa nke sochiri m.” Iji mee ka o doo anya na nzube ya anaghị agbanwe agbanwe, ọ sịkwara: ‘Abụ m otu Onye ahụ mgbe niile.’ (Aịza. 43:10, 13; 44:6; 48:12) Ọ bụụrụ ndị Izrel ihe ùgwù pụrụ iche na ha bụ ndị ohu Jehova, bụ́ Chineke na-anaghị agbanwe agbanwe, onye na-anaghịkwa ahapụ ndị ohu ya mgbe ọ bụla. Anyị nwekwara otu ihe ùgwù ahụ taa.—Mal. 3:6; Jems 1:17.

8, 9. (a) Gịnị ka Jehova chọrọ ka ndị ohu ya na-eme? (b) Olee otú Jizọs si mee ka ihe Mozis kwuru dokwuo anya?

 8 N’eziokwu, Mozis chetaara ndị Izrel na Jehova agaghị akwụsị ịhụ ha n’anya na ilekọta ha. N’ihi ya, Jehova chọrọ ka ha na-efe naanị ya, jirikwa obi ha niile, mkpụrụ obi ha niile, na ike ha niile hụ ya n’anya. Jehova chọkwara ka ndị nne na nna jiri ohere ọ bụla na-akụziri ụmụ ha banyere ya, nke ga-eme ka ha na-efekwa naanị ya.—Diut. 6:6-9.

9 Ebe ọ bụ na Jehova anaghị agbanwe nzube ya, ọ pụtara na ihe ọ chọrọ ka ndị ohu ya na-eme agbanwebeghị. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova nabata ofufe anyị na-efe ya, anyị kwesịrị ịna-efe naanị ya, jirikwa obi anyị dum, uche anyị dum, na ike anyị dum hụ ya n’anya. N’eziokwu, ọ bụ ihe a ka Jizọs zara otu nwoke jụrụ ya ajụjụ. (Gụọ Mak 12:28-31.) N’ihi ya, ka anyị leba anya n’otú anyị ga-esi jiri omume anyị gosi na anyị ghọtara na “Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova.”

NA-EFE NAANỊ JEHOVA

10, 11. (a) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-efe naanị Jehova? (b) Olee otú ndị Hibru anọ nọ́ na Babịlọn si gosi na ọ bụ naanị Jehova ka ha na-efe?

10 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ọ bụrụ naanị Jehova bụ Chineke anyị, anyị kwesịrị ịna-efe naanị ya. Anyị agaghị na-efe ya, na-efekwa chi ndị ọzọ ma ọ bụ kwere n’ihe ọ bụla na-abụghị eziokwu ma ọ bụkwanụ na-eme ihe ndị na-efe chi ọzọ na-eme. Anyị kwesịrị icheta na ọ bụghị naanị na Jehova karịrị chi ndị ọzọ niile ma ọ bụ na ọ dị ike karịa chi ndị ọzọ, ọ bụ naanị ya ka anyị kwesịrị ịna-efe.—Gụọ Mkpughe 4:11.

11 Akwụkwọ Daniel gwara anyị banyere ụmụ okorobịa Hibru anọ bụ́ Daniel, Hananaya, Mishel, na Azaraya. Ha gosiri na ọ bụ naanị Jehova ka ha na-efe. Ọ bụghị naanị na ha ekweghị eri ihe na-adịghị ọcha, kamakwa ha ekweghị akpọrọ ihe oyiyi ọlaedo Nebukadneza kpụrụ isiala. Ha mere ka o doo anya na ihe kacha ha mkpa bụ ife Jehova nakwa na ha agaghị efe ihe ọ bụla ọzọ.—Dan. 1:1–3:30.

12. Olee ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime iji gosi na anyị na-efe naanị Jehova?

12 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-efe naanị Jehova, anyị ga-akpachara anya ka ihe ọ bụla ọzọ ghara ịdị anyị mkpa karịa ife Jehova. Olee ụdị ihe o nwere ike ịbụ? N’Iwu Iri, Jehova mere ka o doo anya na ndị na-efe ya ekwesịghị ife chi ọzọ ma ọ bụ kpeere arụsị ọ bụla. (Diut. 5:6-10) Taa, e nwere ọtụtụ ihe bụ́ ikpere arụsị. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike isi ike ịchọpụta. Ma, Jehova ka bụkwa “otu Jehova.” Iwu ya agbanwebeghịkwa. Ka anyị leba anya n’otú anyị ga-esi zere ikpere arụsị taa.

13. Olee ihe anyị nwere ike ịmalite ịhụ n’anya karịa Jehova?

13 Ndị Kọlọsi 3:5 (gụọ ya), a gwara Ndị Kraịst ihe ndị nwere ike ime ka ha ghara ịna-efe naanị Jehova. Echefula na anyaukwu na ikpere arụsị bụ nwanne. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na akụnụba, ibi ndụ okomoko ma ọ bụ ihe ọzọ na-agụ mmadụ nwere ike ịna-atụrụ ya ụka nke na ọ ga-adịzi ka ọ̀ bụ chi ya. Ma anyị lee anya n’ihe ndị ọzọ e kwuru n’amaokwu ahụ, anyị ga-achọpụta na e nwere ihe jikọrọ anyaukwu na mmehie ndị ọzọ niile e kwuru okwu ha. N’ihi ya, e nwere ihe jikọrọ ha na ikpere arụsị. Ọ bụrụ na ihe ndị ahụ agụsie anyị agụụ ike, anyị nwere ike malite ịhụ ha n’anya karịa Chineke. Ànyị ga-ekwe ka ihe ndị a gụsiwe anyị ike nke na  Jehova agaghịzi abụrụ anyị “otu Jehova”? Mbanụ.

14. Gịnị ka Jọn onyeozi kwuru gbasara ịhụ Chineke n’anya?

14 Jọn onyeozi kwukwara ụdị ihe ahụ. Ọ sịrị na ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ihe ndị dị́ n’ụwa n’anya, ya bụ, “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ,” “ịhụnanya maka Nna anyị adịghị n’ime ya.” (1 Jọn 2:15, 16) Ọ pụtara na anyị kwesịrị ịna-enyocha obi anyị mgbe niile ka anyị mata ma ntụrụndụ ndị ụwa, mkpakọrịta ha, ma ọ bụ ejiji ha ọ̀ gụwala anyị agụụ. Ịhụ ụwa n’anya nwekwara ike ime ka anyị mewe ihe ga-egosi na anyị ‘na-achọrọ onwe anyị ihe ukwu,’ dị́ ka ịchọsiwa ike ịga mahadum. (Jere. 45:4, 5) Ọ fọrọ obere ka anyị banye n’ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere anyị ná nkwa. Ọ bụ ya mere o ji dị́ ezigbo mkpa ka anyị na-echeta okwu ahụ na-emetụ n’ahụ́ Mozis kwuru. Ọ bụrụ na anyị aghọta nke ọma na “Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova,” obi esiekwa anyị ezigbo ike, anyị ga-eme ike anyị niile iji na-efe naanị ya, na-efekwa ya otú ọ chọrọ.—Hib. 12:28, 29.

NA-AGBA MBỌ KA ỌGBAKỌ DỊRỊ N’OTU

15. Gịnị mere Pọl ji chetara Ndị Kraịst na Chineke bụ “otu Jehova”?

15 Okwu ahụ bụ́ “otu Jehova” na-enyere anyị aka ịghọta na Jehova chọrọ ka ndị ohu ya dịrị n’otu, na-achụkwa otu ihe. Ndị nọ́ n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ bụ ma ndị Juu ma ndị Grik ma ndị Rom ma ndị mba ndị ọzọ. Ha sicha n’okpukpe dị́ iche iche, nwee omenala dị́ iche iche, ihe na-amasị ha dịkwa iche iche. N’ihi ya, o siiri ụfọdụ n’ime ha ike ịnabata ụzọ ọhụrụ e sizi na-efe Jehova ma ọ bụ ịkwụsị ihe ụfọdụ ha na-emebu.  Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji chetara ha na Ndị Kraịst nwere otu Chineke bụ́ Jehova.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 8:5, 6.

16, 17. (a) Olee amụma na-emezu n’oge anyị a, oleekwa ihe sí na ya pụta? (b) Olee ihe nwere ike ime ka anyị ghara ịdị n’otu?

16 Oleekwanụ maka ọgbakọ Ndị Kraịst taa? Aịzaya onye amụma kwuru na “n’oge ikpeazụ,” ndị sí ná mba dị́ iche iche ga-enuba n’ugwu Jehova ka ha fee ya. Ha ga-asị: “Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya, anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.” (Aịza. 2:2, 3) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị na-ahụ otú amụma a si na-emezu n’oge anyị a. Ụmụnna anyị si ebe dị́ iche iche, na-asụ ọtụtụ asụsụ, nwee omenala dị́ iche iche, jirikwa otu obi na-efe Jehova. Ma, otú a anyị si ebe dị́ iche iche nwere ike ime ka e nwee nsogbu mgbe ụfọdụ.

Ị̀ na-agba mbọ ka ọgbakọ Ndị Kraịst dịrị n’otu? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 ruo na nke 19)

17 Dị ka ihe atụ, olee otú i si ele ụmụnna ndị omenala ha dị iche na nke unu anya? Asụsụ ha, ejiji ha, omume ha, na nri ha nwere ike ịdị iche na nke unu. Ị̀ na-agbara ha ọsọ ma na-agakwuru naanị ndị gị na ha si n’otu ebe? Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị a họpụtara ka ha bụrụ ndị nlekọta n’ọgbakọ unu, na sekit unu ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ dị́ n’ebe i bi bụ ndị ị tọrọ ma ọ bụ ndị sí mba ọzọ ma ọ bụkwanụ n’agbụrụ ọzọ? Ị̀ na-ekwe ka ụdị ihe a mee ka i mewe ihe ga-eme ka ndị Jehova ghara ịdị n’otu ma ọ bụ inwe otu obi?

18, 19. (a) Olee ndụmọdụ e nyere anyị ná Ndị Efesọs 4:1-3? (b) Olee ihe anyị nwere ike ime iji mee ka ọgbakọ dịrị n’otu?

18 Gịnị ka anyị ga-eme ka ụdị ihe ahụ ghara ime? Pọl nyere Ndị Kraist bí n’Efesọs ndụmọdụ bara ezigbo uru. Efesọs bụ obodo bara ọgaranya, ọtụtụ ndị sí ebe dị́ iche iche bikwa na ya. (Gụọ Ndị Efesọs 4:1-3.) Cheta na Pọl bu ụzọ kwuo banyere àgwà ndị dị́ ka ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi, na ịhụnanya. E nwere ike iji àgwà ndị a tụnyere idé jí ụlọ. Ma, ọ bụghị naanị idé siri ike na-eme ka ụlọ ghara ịdakasị. E kwesịkwara ịna-elekọta ụlọ mgbe niile. Pọl gwara Ndị Kraist bí n’Efesọs ka ha gbasie mbọ ike “nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ.”

19 Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike ka ọgbakọ dịrị n’otu. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Nke mbụ bụ na anyị kwesịrị ịna-akpa àgwà ndị ahụ Pọl kwuru okwu ha, ya bụ, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi, na ịhụnanya. Nke abụọ bụ na anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike ka e nwee “ihe nkekọ nke bụ́ udo.” E nwere ike iji nghọtahie tụnyere ebe gbawara agbawa n’ahụ́ ụlọ. E kwesịrị imezi ya ka ụlọ ahụ ghara ịda. Otú ahụ ka anyị kwesịrị ịgbalị dozie nghọtahie anyị na nwanna nwere, ka ọgbakọ dịrị n’udo, dịrịkwa n’otu.

20. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ghọtara na “Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova”?

20 “Jehova Chineke anyị bụ otu Jehova.” Ihe a Baịbụl kwuru na-emetụ n’ahụ́. O mere ka ndị Izrel nwee ike idi nsogbu ndị bịaara ha ka ha na-aga inweta Ala Nkwa ahụ. Ọ bụrụ na anyị eburu okwu ahụ n’uche, ọ ga-enyere anyị aka ịlanahụ oké mkpagbu na-abịanụ ma nye aka mee ka udo dịrị na Paradaịs. Ka anyị na-efe naanị Jehova, jiri obi anyị niile hụ ya n’anya ma na-ejere ya ozi, na-agbakwa mbọ ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, obi ga-esi anyị ike na Jizọs ga-akpọ anyị atụrụ mgbe ọ ga-abịa ikpe ndị mmadụ ikpe. Anyị ga-eso ná ndị ọ ga-asị: “Bịanụ, unu ndị Nna m gọziri agọzi, ketanụ alaeze ahụ a kwadebeere unu malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.”—Mat. 25:34.