Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JUN 2016

Otú Ị Ga-esi Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ na Jehova Na-akpụzi Anyị

Otú Ị Ga-esi Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ na Jehova Na-akpụzi Anyị

“Jehova, . . . ọ bụ gị kpụrụ anyị; anyị niile bụkwa ọrụ aka gị.”—AỊZA. 64:8.

ABỤ: 89, 26

1. Gịnị mere Jehova ji bụrụ Onye kacha akpụ ihe?

E NWERE otu ite ájá ndị Chaịna kpụrụ ọtụtụ afọ gara aga. Na Nọvemba afọ 2010, otu onye kwetara ịzụ ya ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ nde dọla iri asaa na Lọndọn dị́ n’Ịngland. O doro anya na ọkpụite nwere ike iji ụrọ na-enweghị ihe e ji ya kpọrọ, nke na-adịghịkwa oké ọnụ, kpụọ ihe mara ezigbo mma, nke dịkwa oké ọnụ. Ma, o nweghị onye a ga-eji tụnyere Jehova n’ịkpụ ihe. Mgbe Jehova na-eke ihe, ná ngwụcha ụbọchị nke isii, Baịbụl kwuru na ‘o ji ájá si n’ala [ya bụ, ụrọ] kpụọ’ nwoke zuru okè ma mee ka o nwee ike iṅomi àgwà ndị o nwere. (Jen. 2:7) Ọ dabara adaba na a kpọrọ Adam, bụ́ nwoke ahụ zuru okè e ji ájá kpụọ, “nwa Chineke.”—Luk 3:38.

2, 3. Olee otú anyị ga-esi ṅomie ihe ndị Izrel chegharịrị echegharị mere?

2 Ma mgbe Adam nupụụrụ Onye kere ya isi, ọ bụghịzi nwa Chineke. Ma, kemgbe ọtụtụ afọ, e nweela “oké ìgwè ndị àmà,” bụ́ ụmụ Adam, ndị kpebiri ịna-erubere ọchịchị Chineke isi. (Hib. 12:1) Otú ha si na-erubere Chineke isi gosiri na ọ bụ ya  ka ha chọrọ ka ọ bụrụ Nna ha na Onye na-akpụzi ha, ọ bụghị Setan. (Jọn 8:44) Isi ha na-erubere Chineke na-echetara anyị ihe ndị Izrel chegharịrị echegharị kwuru n’oge Aịzaya. Ha sịrị: “Jehova, ị bụ Nna anyị. Anyị bụ ụrọ, ọ bụ gị kpụrụ anyị; anyị niile bụkwa ọrụ aka gị.”—Aịza. 64:8.

3 Taa, ndị niile na-efe Jehova n’ime mmụọ na eziokwu na-agbalịsi ike ịdị umeala n’obi, na-erubekwara Chineke isi otú ahụ. Ha ghọtara na ọ bụ ihe ùgwù ịna-akpọ Jehova Nna ha. Ha chọkwara ka ọ bụrụ ya na-akpụzi ha. Ị̀ na-ekwe ka Chineke na-akpụzi gị ka i nwee ike ịbụ arịa bara ezigbo uru? Ị̀ ghọtara na nwanna nke ọ bụla bụ arịa Chineke ka na-akpụzi? Iji nyere anyị aka ile ụmụnna anyị anya otú ahụ, ka anyị tụlee ihe atọ Jehova na-eme iji kpụzie anyị. Nke mbụ bụ otú o si ahọrọ ndị ọ ga-akpụzi. Nke abụọ abụrụ ihe mere o ji akpụzi ha. Nke atọ abụrụ otú o si akpụzi ha.

JEHOVA NA-AHỌRỌ NDỊ Ọ NA-AKPỤZI

4. Olee otú Jehova si ahọrọ ndị ọ ga-adọta n’ebe ọ nọ? Nye ihe atụ.

4 Jehova lewe ụmụ mmadụ, ihe ọ na-elekwasị anya abụghị otú anyị dị n’elu ahụ́. Ọ na-enyocha obi, ya bụ, ụdị ndị anyị bụ. (Gụọ 1 Samuel 16:7b.) Ọ bụ ihe Chineke mere mgbe ọ malitere ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọtụtụ ndị ọ dọtara n’ebe ya na Ọkpara ya nọ bụ ndị ụfọdụ ndị nwere ike iwere ka ndị na-abaghị uru. (Jọn 6:44) Otu n’ime ha bụ onye Farisii aha ya bụ Sọl. Ọ bụ “onye nkwulu,” “onye na-akparị mmadụ,” na onye na-emegide Ndị Kraịst. (1 Tim. 1:13) Ma, Jehova, bụ́ Onye ‘na-enyocha obi,’ echeghị na Sọl abaghị uru. (Ilu 17:3) Kama, ọ ghọtara na e nwere ike ịkpụzi ya ka ọ bụrụ arịa bara ezigbo uru. Nke bụ́ eziokwu bụ na o mechara bụrụ ‘arịa Chineke họọrọ’ ka ọ “gakwuru ndị mba ọzọ, gakwurukwa ndị eze na ụmụ Izrel” gbaara ha àmà. (Ọrụ 9:15) E nwekwara ndị ọzọ Chineke họọrọ ‘ka o jiri ha mee ihe kwesịrị nsọpụrụ.’ Ụfọdụ n’ime ha bụbu ndị aṅụrụma, ndị na-eme omume rụrụ arụ, na ndị ohi. (Rom 9:21; 1 Kọr. 6:9-11) Ka ha na-amụta ihe Okwu Chineke na-akụzi, ha mere ka okwukwe ha nwere na Jehova sikwuo ike ma kwe ka ọ kpụzie ha.

5, 6. Ọ bụrụ na obi siri anyị ike na ọ bụ Jehova na-akpụzi anyị, olee otú anyị kwesịrị isi were (a) ndị anyị na-ezi ozi ọma? (b) ụmụnna anyị?

5 Olee otú ihe a e kwuru ga-esi nyere anyị aka? Obi siri anyị ike na Jehova na-enyocha obi, na-adọtakwa ndị ọ họọrọ ka ha fee ya. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịna-ekpe ndị ọzọ ikpe, ma n’ozi ọma ma n’ọgbakọ. Chegodị banyere otu nwoke aha ya bụ Michael. Ọ sịrị: “Ndịàmà Jehova bịa izi m ozi ọma, m na-eleghara ha anya, mee ka à ga-asị na o nweghị ndị m hụrụ. O nweghị ihe m ji ha kpọrọ. Ma, m mechara hụ otu ezinụlọ ihe ha masịrị m n’ihi àgwà ọma ha. Otu ụbọchị, anụrụ m na ha bụ Ndịàmà Jehova. O riri m ọnụ. Àgwà ha mere ka m jụọ onwe m ihe medịrị m ji kpọọ Ndịàmà Jehova asị. M mechara chọpụta na ọ bụ n’ihi na amaghị m ndị ha bụ nakwa n’ihi ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ha, nke na-abụghịkwanụ eziokwu.” Iji mata nke bụ́ eziokwu, Michael kwere ka a mụwara ya Baịbụl. N’oge na-adịghị anya, o mere baptizim, mechaa bido ozi oge niile.

6 Ọ bụrụ na anyị aghọta na ọ bụ Jehova na-akpụzi anyị, anyị ga na-ele ụmụnna anyị anya otú kwesịrị ekwesị. Ị̀ na-ele ụmụnna gị anya otú Chineke si ele ha, ya bụ na ha ezubeghị okè, kama na Chineke ka na-akpụzi ha? Ọ na-ahụ ihe dị́ mmadụ n’obi nakwa ụdị onye mmadụ ga-abụ ma ọ kpụzichaa ya. N’ihi ya, ọ na-ele ndị mmadụ anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ naghị elekwasị anya n’ezughị okè n’ihi na ọ ma  na ọ gaghị adịte aka. (Ọma 130:3) Anyị ga na-eṅomi Jehova ma ọ bụrụ na anyị ana-ele ụmụnna anyị anya otú kwesịrị ekwesị. N’eziokwu, anyị na Jehova ga na-arụkọ ọrụ ma ọ bụrụ na anyị ana-akwado ụmụnna anyị ná mbọ ha na-agba ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ. (1 Tesa. 5:14, 15) Ebe ndị okenye bụ “onyinye n’ụdị mmadụ,” ha kwesịrị ịna-eme otú ahụ ka ndị ọzọ nwee ike iṅomi ha.—Efe. 4:8, 11-13.

GỊNỊ MERE JEHOVA JI AKPỤZI ANYỊ?

7. Gịnị mere i ji ghọta uru aka ná ntị Jehova na-adọ anyị bara?

7 O nwere ike ịbụ na ị nụtụla ka mmadụ sịrị: ‘Ọ bụ mgbe m mụrụ ụmụ ka m ghọtara uru aka ná ntị nne m na nna m dọrọ m baara m.’ Ka anyị na-etokwu, anyị nwere ike ịghọta uru ịdọ aka ná ntị bara, lewezie ya anya otú Jehova si ele ya, ya bụ na ọ na-egosi na a hụrụ anyị n’anya. (Gụọ Ndị Hibru 12:5, 6, 11.) N’eziokwu, Jehova hụrụ ụmụ ya n’anya. Ọ bụ ya mere o ji ewetu obi na-adọ anyị aka ná ntị ma ọ bụ na-akpụzi anyị. Ọ chọrọ ka anyị mara ihe, na-enwe obi ụtọ, hụkwa ya n’anya. (Ilu 23:15) Ọ chọghị ka anyị tawa ahụhụ. Ọ chọghịkwa ka anyị bụrụ ndị mmehie na-ekweghị echegharị, bụ́ ndị a ga-emecha bibie.—Efe. 2:2, 3.

8, 9. Olee otú Jehova si akụziri anyị ihe taa, oleekwa otú ọ ga-esi na-akụziri anyị ihe n’ọdịnihu?

8 Tupu anyị amụta eziokwu banyere Jehova, anyị na-akpa ọtụtụ àgwà na-adịghị ya mma. Ụfọdụ n’ime àgwà ndị ahụ nwedịrị ike ịdị ka nke anụ ọhịa. Ma n’ihi otú Jehova si na-akpụzi anyị, anyị gbanwere ma yizie ụmụ atụrụ. (Aịza. 11:6-8; Kọl. 3:9, 10) Anyị nọzi na paradaịs ime mmụọ, nke bụ́ ndokwa pụrụ iche Jehova mere n’oge anyị a iji na-akpụzi anyị. Obi ruru anyị ala n’agbanyeghị na anyị bi n’ụwa jọgburu onwe ya. Ihe ọzọ bụ na ụfọdụ n’ime anyị toro n’ezinụlọ ebe a na-enweghị ịhụnanya. Ma ugbu a, ụmụnna anyị hụziri anyị n’anya. (Jọn 13:35) Anyị amụtakwala ịhụ ndị ọzọ n’anya. Nke kacha mkpa bụ na anyị amatala onye Jehova bụ, ya ahụkwa anyị n’anya otú nna si ahụ ụmụ ya.—Jems 4:8.

9 N’ụwa ọhụrụ, e nwere ọtụtụ uru ndị ọzọ ga-esi na paradaịs ime mmụọ ruo anyị aka. Anyị ga-ebizi na paradaịs a na-ahụ anya, nke Alaeze Chineke ga na-achị. N’oge ahụ, Jehova ka ga na-akpụzi ndị bí n’ụwa, na-akụzikwara ha ihe karịa otú anyị nwere ike ichetụdị n’echiche. (Aịza. 11:9) Chineke ga-emekwa ka uche anyị na ahụ́ anyị zuo okè, ka anyị nwee ike ịna-amụta ihe ọ na-akụziri anyị ma na-eme uche ya n’emejọghị ihe ọ bụla. N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ịna-erubere Jehova isi, sí otú ahụ na-egosi ya na anyị ghọtara na otú o si akpụzi anyị na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya.—Ilu 3:11, 12.

OTÚ JEHOVA SI AKPỤZI ANYỊ

10. Olee otú Jizọs si ṅomie ndidi na nkà Jehova nwere?

10 Onye bụ́ aka ochie n’ịkpụ ihe na-ama ụdị ụrọ ọ chọrọ iji akpụ ihe na otú ọ dị, na-akpụkwa ya otú o kwesịrị ịdị. Otú ahụ ka Jehova ma ihe niile banyere anyị. (Gụọ Abụ Ọma 103:10-14.) N’eziokwu, otú o si emeso onye ọ bụla ihe na-adị iche. Ọ ma ihe anyị na-anaghị emeta, ihe anyị na-agaghị emeli, na otú anyị nwerurula ọganihu. Jizọs ṅomiri otú Nna ya si ele ụmụ mmadụ na-ezughị okè anya. Chegodị banyere ihe Jizọs mere mgbe ndịozi ya mejọrọ, nke ka nke, mgbe ha na-arụ ụka banyere onye kacha ukwuu. A sị na ị hụrụ ha, ị̀ gaara eche na ha adịghị umeala n’obi nakwa na ha dị ka ụrọ na-ekweghị ọkpụkpụ? Ma, Jizọs echeghị otú ahụ. Ọ ma na ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi ga-agbanwe ma o wetuo obi  na-enye ha ndụmọdụ, ha ana-ahụkwa otú o si dị́ umeala n’obi. (Mak 9:33-37; 10:37, 41-45; Luk 22:24-27) Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, wụkwasịkwa ndịozi ya mmụọ nsọ, ha lekwasịrị anya n’ọrụ ahụ o nyere ha, ọ bụghị n’ọkwá ma ọ bụ n’ịbụ ndị a ma ama.—Ọrụ 5:42.

11. Olee ụzọ ndị Devid si gosi na ya chọrọ ka Jehova kpụzie ya, oleekwa otú anyị ga-esi ṅomie ya?

11 Ihe ndị Jehova kacha eji akpụzi ndị ohu ya taa bụ ọgbakọ Ndị Kraịst, Okwu ya bụ́ Baịbụl, na mmụọ nsọ ya. Okwu Chineke nwere ike ịkpụzi anyị ma anyị na-amụ ya, na-atụgharị uche na ya ma na-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka ime ihe anyị mụtara. Devid dere, sị: “Mgbe m chetara gị n’elu ihe ndina m, n’oge nche abalị, m na-atụgharị uche banyere gị.” (Ọma 63:6) O dekwara, sị: “M ga-agọzi Jehova, bụ́ onye nyeworo m ndụmọdụ. N’ezie, akụrụ m agbaziwo m n’abalị.” (Ọma 16:7) N’eziokwu, Devid kwere ka ndụmọdụ Chineke ruo ya n’ala ala obi, kpụzie ihe ọ na-eche n’obi ya nakwa otú obi dị ya. (2 Sam. 12:1-13) Devid kụziiri anyị ịdị obi umeala na irubere Chineke isi. Ị̀ na-atụgharị uche n’Okwu Chineke, na-ekwe ka o ruo gị n’ala ala obi? Ì kwesịrị imekwu nke ọma?—Ọma 1:2, 3.

12, 13. Olee otú Jehova si eji mmụọ nsọ ya na ọgbakọ Ndị Kraịst akpụzi anyị?

12 E nwere ọtụtụ ụzọ mmụọ nsọ nwere ike isi na-akpụzi anyị. Dị ka ihe atụ, o nwere ike inyere anyị aka ịna-eṅomi àgwà Jizọs. Ihe e ji mara àgwà Jizọs bụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22, 23) Àgwà só ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya. Anyị hụrụ Chineke n’anya, chọọ ịna-erubere ya isi, chọọkwa ka ọ na-akpụzi anyị n’ihi na anyị ma na iwu ya abụghị ibu arọ. Mmụọ nsọ nwekwara ike inyere anyị aka ka anyị ghara ikwe ka ụwa Setan mee ka anyị mụta àgwà ọjọọ ya. (Efe. 2:2) Mgbe Pọl onyeozi bụ nwa okorobịa, ọ malitere ile ihe anya otú ndị ndú okpukpe ndị Juu dị́ mpako si ele ihe anya. Ma mmụọ nsọ mechara nyere ya aka ịgbanwe. O dere, sị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ  nke na-enye m ike.” (Fil. 4:13) N’ihi ya, ka anyị na-arịọ Jehova maka mmụọ nsọ ya otú ahụ Pọl mere. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile rịọ Jehova ka o nyere anyị aka, ọ gaghị eleghara arịrịọ anyị anya.—Ọma 10:17.

Jehova na-eji ndị okenye ọgbakọ akpụzi anyị, ma e nwere ihe anyịnwa kwesịrị ime (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)

13 Jehova na-eji ọgbakọ Ndị Kraịst na ndị okenye akpụzi onye ọ bụla n’ime anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ndị okenye achọpụta na anyị azọhiela ụkwụ, ha na-agbalị inyere anyị aka, ma ha anaghị eji amamihe mmadụ eme ya. (Gal. 6:1) Kama, ha na-eji obi umeala arịọ Chineke ka o nye ha amamihe na nghọta. Ha na-ebu nsogbu anyị n’obi mee nchọnchọ n’Okwu Chineke nakwa n’akwụkwọ anyị ka ha chọta ihe ndị ga-enyere anyị aka. Ọ bụrụ na ha abịa ka ha jiri obiọma dụọ gị ọdụ, ikekwe, gbasara ụdị uwe ị na-eyi, ị̀ ga-anabata ndụmọdụ ha, ghọtakwa na ọ na-egosi na Chineke hụrụ gị n’anya? I mee otú ahụ, ị na-egosi na ị chọrọ ka Jehova kpụzie gị otú ga-abara gị uru.

14. N’agbanyeghị na Jehova nwere ikike ịkpụzi anyị otú ọ bụla ọ chọrọ, olee otú o si akwanyere anyị ùgwù?

14 Ịghọta otú Jehova si akpụzi anyị ga-enyere anyị aka ka anyị na ụmụnna anyị na-adị ná mma, meekwa ka anyị na-ele ndị bí n’ókèala anyị na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl anya otú kwesịrị ekwesị. Ihe onye na-akpụ ite na-eme abụghị igwute ụrọ ma were ya kpụwa ihe ozugbo. Ọ na-ebu ụzọ kwadebe ya, wepụsịa okwute na ihe ndị ọzọ na-ekwesịghị ịdị na ya. Otú ahụ ka Chineke na-eme ndị chọrọ ka ọ kpụzie ha. Ọ naghị amanye ha ka ha gbanwee, kama ọ na-eme ka ha mata iwu ya ka ha jiri aka ha kpebie ịgbanwe omume ha.

15, 16. Olee otú ndị a na-amụrụ Baịbụl ga-esi gosi na ha chọrọ ka Jehova kpụzie ha? Nye ihe atụ.

15 Chegodị banyere otu nwanna nwaanyị bí n’Ọstrelia aha ya bụ Tessie. Nwanna nwaanyị mụụrụ ya ihe sịrị: “O siirighị Tessie ike ịmụta eziokwu Baịbụl. Ma, o nweghị ezigbo ọganihu. O kweghịdị abịa ọmụmụ ihe. N’ihi ya, mgbe m kpechara ekpere banyere ya, m kpebiri ịkwụsị ịmụrụ ya ihe. Ihe mezirinụ juru m anya. Mgbe m gara ka m mụọrọ ya ihe nke ikpeazụ, ọ kọọrọ m ihe bụ́ nsogbu ya. Ọ sịrị na ọ na-adị ya ka ọ̀ bụ onye ihu abụọ n’ihi na ịgba chaa chaa na-atọ ya ezigbo ụtọ. Ma ugbu a, o kpebiela ịkwụsị àgwà ahụ.”

16 Obere oge ihe ahụ mechara, Tessie malitere ịga ọmụmụ ihe, malitekwa ịkpa àgwà ka Onye Kraịst n’agbanyeghị na ndị enyi ya nọ na-akwa ya emo. Nwanna nwaanyị ahụ kwukwara, sị: “Ka oge na-aga, Tessie mere baptizim ma mechaa bụrụ ọsụ ụzọ oge niile n’agbanyeghị na ụmụ ya ka dị obere.” N’eziokwu, ọ bụrụ na ndị a na-amụrụ Baịbụl amalite ịgbanwe omume ọjọọ ha iji mee Jehova obi ụtọ, ọ na-abịaru ha nso ma na-akpụzi ha ka ha bụrụ arịa bara uru.

17. (a) Gịnị mere obi ji atọ gị ụtọ na ọ bụ Jehova na-akpụzi gị? (b) Olee ihe ndị anyị ga-amụ n’isiokwu ọzọ gbasara otú Jehova si akpụzi anyị?

17 Taa, ụfọdụ ndị na-akpụ ihe ka na-eji aka akpụ ụrọ ka ọ bụrụ arịa mara mma. Otú ahụ ka Jehova na-eme. Ọ na-ewetu obi na-enye anyị ndụmọdụ iji kpụzie anyị, na-elekwa ka ọ hụ ihe anyị ga-eme. (Gụọ Abụ Ọma 32:8.) Ị̀ na-aghọta na Jehova hụrụ gị n’anya? Ị̀ na-ahụ ka o ji nwayọọ na-akpụzi gị? Ọ bụrụ otú ahụ, olee àgwà ndị ọzọ ga-enyere gị aka ịdị ka ụrọ na-ekwe ọkpụkpụ, nke Jehova ga-eji kpụọ ihe bara uru? Olee àgwà ndị i kwesịrị izere ka ị ghara ịdị ka ụrọ na-ekweghị ọkpụkpụ? Oleekwa otú ndị nne na nna ga-esi na-erubere Jehova isi ma ha kpụziwa ụmụ ha? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.