Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2016

Mmụọ Nsọ Na-agbara Mmụọ Anyị Àmà

Mmụọ Nsọ Na-agbara Mmụọ Anyị Àmà

“Mmụọ nsọ n’onwe ya so mmụọ anyị na-agba àmà na anyị bụ ụmụ Chineke.”—NDỊ ROM 8:16.

ABỤ: 109, 108

1-3. Olee ihe ndị mere ka ụbọchị Pentikọst pụọ iche, oleekwa otú ihe ndị ahụ si mezuo amụma e buru n’Akwụkwọ Nsọ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

N’ỤTỤTỤ otu ụbọchị Sọnde na Jeruselem, ndị mmadụ nọ na-eme Ememme Pentikọst, nke bụ́ ememme dị́ nsọ a na-eme ma a malite ịghọ ọka wit. Ọ bụ ụbọchị pụrụ iche. Obi dịkwa onye ọ bụla ụtọ. N’ụtụtụ ụbọchị ahụ, nnukwu onye nchụàjà chụrụ àjà ndị o kwesịrị ịchụ. N’ihe dị́ ka n’elekere itoolu nke ụtụtụ, o ji achịcha abụọ koro eko chụọ àjà. Ihe e ji mee ha bụ ọka wit mbụ a ghọtara. Nnukwu onye nchụàjà fegharịrị achịcha ndị ahụ ka ha bụrụ àjà a chụụrụ Jehova. Ihe a niile mere na Pentikọst nke afọ 33.—Levitikọs 23:15-20.

2 Ruo ọtụtụ narị afọ, nnukwu onye nchụàjà chụrụ àjà ahụ a na-efegharị efegharị kwa afọ. Àjà ahụ yiri ihe dị́ ezigbo mkpa mere otu narị ndị na-eso ụzọ Jizọs na iri abụọ n’ụbọchị Pentikọst afọ 33. Ha niile nọ na-ekpe ekpere n’otu ọnụ ụlọ dị́ n’elu na Jeruselem. (Ọrụ Ndịozi  1:13-15) Joel onye amụma dere banyere ihe ahụ merenụ narị afọ asatọ tupu ya emee. (Joel 2:28-32; Ọrụ Ndịozi 2:16-21) Olee ihe merenụ nke dị́ ezigbo mkpa?

3 Gụọ Ọrụ Ndịozi 2:2-4. N’ụbọchị Pentikọst afọ 33, Chineke nyere Ndị Kraịst ahụ mmụọ nsọ, ha abụrụ ndị e tere mmanụ. (Ọrụ Ndịozi 1:8) Ìgwè mmadụ gbakọrọ ebe ha nọ. Ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs amalitezie ịgwa ha banyere ihe ndị dị́ ebube ha hụrụ ma nụ. Pita onyeozi kọwara ihe ahụ merenụ na ihe mere o ji dị́ ezigbo mkpa. Ọ gwaziri ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Chegharịanụ, ka e meekwa onye ọ bụla n’ime unu baptizim n’aha Jizọs Kraịst ka e wee gbaghara unu mmehie unu, unu ga-anatakwa mmụọ nsọ ahụ a na-enye n’efu.” E mere ihe dị́ ka puku mmadụ atọ baptizim n’ụbọchị ahụ, ha anatakwa mmụọ nsọ.—Ọrụ Ndịozi 2:37, 38, 41.

4. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị inwe mmasị n’ihe mere n’ụbọchị Pentikọst? (b) Ma eleghị anya, olee ihe ọzọ dị́ mkpa mere n’ụbọchị Pentikọst ọtụtụ afọ tupu nke afọ 33? (Kwuo ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.)

4 Gịnị ka nnukwu onye nchụàjà na àjà ahụ ọ na-achụ n’ụbọchị Pentikọst nọchiri anya ya? Nnukwu onye nchụàjà nọchiri anya Jizọs. Achịcha ahụ nọchiri anya ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ́ ndị e tere mmanụ. E si n’etiti ụmụ mmadụ na-ezughị okè họrọ ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs. Baịbụl kpọrọ ha “mkpụrụ mbụ.” (Jems 1:18) Chineke nabatara ha ka ha bụrụ ụmụ ya, họrọkwa ha ka ha soro Jizọs bụrụ ndị eze n’eluigwe. (1 Pita 2:9) Jehova ga-eji Alaeze ya gọzie mmadụ niile na-erubere ya isi. N’ihi ya, ma ànyị nwere olileanya iso Jizọs biri n’eluigwe ma ọ bụ ibi na paradaịs ga-adị n’ụwa, ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 baara anyị ezigbo uru. [1] —Gụọ ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.

GỊNỊ NA-EME MA E TEE MMADỤ MMANỤ?

5. Olee otú anyị si mara na ọ bụghị otu ụzọ ka e si ete ndị niile e tere mmanụ mmanụ?

5 Ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs nọ́ n’ọnụ ụlọ ahụ dị́ n’elu agaghị echefu ihe mere n’ụbọchị ahụ. Ihe dị́ ka ire ọkụ dị n’isi onye ọ bụla n’ime ha. Jehova nyere ha ike ịsụ asụsụ ndị obodo ọzọ. O meghị ha obi abụọ ma è jikwa mmụọ nsọ tee ha mmanụ. (Ọrụ Ndịozi 2:6-12) Ma, ihe ndị a pụrụ iche anaghị eme Ndị Kraịst niile ma e tee ha mmanụ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl ekwughị na ihe yiri ire ọkụ dị n’isi ọtụtụ puku ndị e mechara tee mmanụ n’otu ụbọchị ahụ na Jeruselem. E tere ha mmanụ mgbe e mere ha baptizim. (Ọrụ Ndịozi 2:38) Ọ bụghịkwa Ndị Kraịst niile ka a na-ete mmanụ mgbe e mere ha baptizim. E tere ndị Sameria mmanụ obere oge e mechara ha baptizim. (Ọrụ Ndịozi 8:14-17) Ma, nke dị́ ezigbo iche bụ nke Kọnịliọs, onye e tere ya na ndị ezinụlọ ya mmanụ tupu e mee ha baptizim.—Ọrụ Ndịozi 10:44-48.

6. Gịnị ka a na-enye ndị niile e tere mmanụ? Oleekwa uru ọ na-abara ha?

6 O doro anya na mgbe Ndị Kraịst na-amata na e teela ha mmanụ na-adị iche iche. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ na-amata ozugbo na Jehova eteela ha mmanụ. E nwekwara ndị na-amata ka  oge na-aga. Ma, Pọl onyeozi kọwara ihe na-eme onye ọ bụla n’ime ha. Ọ sịrị: “Mgbe unu kweresịịrị, e sikwa n’aka ya jiri mmụọ nsọ ahụ e kwere ná nkwa kaa unu akara, bụ́ ihe àmà e bu ụzọ nye anyị tupu anyị enweta ihe nketa anyị.” (Ndị Efesọs 1:13, 14) N’ihi ya, Jehova na-eji mmụọ nsọ ya eme ka o doo Ndị Kraịst ndị ahụ anya na ọ họrọla ha ka ha gaa eluigwe. Ọ bụ otú ahụ ka mmụọ nsọ si bụrụ ‘ihe àmà e bu ụzọ nye ha,’ ya bụ, ihe na-eme ka ha mata na ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’eluigwe, ọ bụghị n’ụwa.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:21, 22; 5:5.

Onye ọ bụla e tere mmanụ ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla mee ka ọ kwụsị ife Jehova

7. Gịnị ka onye ọ bụla e tere mmanụ kwesịrị ime iji nweta ụgwọ ọrụ ya n’eluigwe?

7 Onye Kraịst ghọọ onye e tere mmanụ, ọ̀ pụtara na e nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara ịga eluigwe? Mba. Ọ ga-edo ya anya na a họrọla ya ka ọ gaa eluigwe. Ma, naanị ihe ga-eme ka o nweta ụgwọ ọrụ ahụ bụ ma o jiri obi ya niile na-efe Jehova. Pita kwuru, sị: “N’ihi ya, ụmụnna m, gbalịsienụ ike ọbụna karị ka unu mee ka òkù a kpọrọ unu na nhọrọ a họọrọ unu bụrụ ihe unu onwe unu ji n’aka; n’ihi na ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị a, unu agaghị ada mgbe ọ bụla. N’eziokwu, a ga-esi otú a mee ka unu banye n’ụzọ dị ebube n’alaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst.” (2 Pita 1:10, 11) N’ihi ya, onye ọ bụla e tere mmanụ ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla mee ka ọ kwụsị ife Jehova. N’agbanyeghị na a họrọla ya ka ọ gaa eluigwe, ọ gaghị enweta ụgwọ ọrụ ya ma ọ kwụsị ife Jehova.—Ndị Hibru 3:1; Mkpughe 2:10.

OLEE OTÚ MMADỤ SI AMATA?

8, 9. (a) Gịnị mere o ji esiri ọtụtụ ndị ike ịghọta ihe na-eme mmadụ ma Chineke tee ya mmanụ? (b) Olee otú mmadụ si amata na a họrọla ya ka ọ gaa eluigwe?

8 O kwesịghị iju anyị anya na o nwere ike isiri ọtụtụ n’ime ndị ohu Chineke ike taa ịghọta ihe na-eme mmadụ ma Chineke tee ya mmanụ. A sị ka e kwuwe, hanwa abụghị ndị e tere mmanụ. Chineke kere ụmụ mmadụ ka ha dị́ ndụ ebighị ebi n’ụwa, ọ bụghị n’eluigwe. (Jenesis 1:28; Abụ Ọma 37:29) Ma, Jehova ahọrọla ụfọdụ ndị ka ha bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. N’ihi ya, Chineke tee ha mmanụ, olileanya ha na otú ha si eche echiche na-agbanwe. Ọ bụ ya mere ha ga-eji na-atụzi anya ịdị ndụ n’eluigwe.—Gụọ Ndị Efesọs 1:18.

9 Oleekwanụ otú mmadụ si amata na Chineke ahọrọla ya ka ọ gaa eluigwe? Chee banyere ihe Pọl gwara ụmụnna e tere mmanụ nọ́ na Rom, bụ́ “ndị a kpọrọ ịbụ ndị nsọ.” Ọ sịrị ha: “Unu anataghị mmụọ nke ịnọ n’ohu, nke na-akpata egwu ọzọ, kama unu natara mmụọ nke ịbụ ndị e doro dị ka ụmụ, bụ́ mmụọ nke anyị sitere na ya na-eti mkpu, sị: ‘Aba, Nna!’ Mmụọ  nsọ n’onwe ya so mmụọ anyị na-agba àmà na anyị bụ ụmụ Chineke.” (Ndị Rom 1:7; 8:15, 16) Chineke na-eji mmụọ nsọ ya eme ka o doo mmadụ anya na a họrọla ya ka o soro Jizọs bụrụ eze n’eluigwe.—1 Ndị Tesalonaịka 2:12.

10. Jọn nke Mbụ 2:27 kwuru na ọ dịghị onye e tere mmanụ mkpa ka onye ọzọ kụziere ya ihe. Gịnị ka ọ pụtara?

10 Chineke họrọ mmadụ ka o soro ná ndị ga-aga eluigwe, ọ bụghị onye ọzọ ga-agwa ya na e teela ya mmanụ. Jehova ga-eme ka o doo ya anya. Jọn onyeozi gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ, sị: “Onye nsọ ahụ tekwara unu mmanụ; unu niile nwere ihe ọmụma.” O kwukwara, sị: “Ma mmanụ ahụ o tere unu onwe unu dị n’ime unu, ọ dịghịkwa unu mkpa ka onye ọ bụla na-akụziri unu ihe; ma mmanụ ahụ o tere unu bụ eziokwu, ọ bụghị okwu ụgha, ọ na-akụzikwara unu ihe niile. Dị ka ọ kụziiri unu, unu na ya dịrị n’otu.” (1 Jọn 2:20, 27) Jehova kwesịrị ịkụziri ndị e tere mmanụ ihe otú ahụ ọ na-akụziri onye ọ bụla ọzọ. Ma ọ bụghị onye ọzọ ga-agwa ha na e teela ha mmanụ. Jehova ejirila mmụọ nsọ ya, bụ́ ike kacha ike niile, mee ka o doo ha anya nke ọma na ha bụ ndị e tere mmanụ.

‘A MỤRỤ HA ỌZỌ’

11, 12. Gịnị ka Onye Kraịst e tere mmanụ nwere ike ịna-eche? Ma olee ihe na-agaghị eme ya obi abụọ?

11 Ọ bụrụ na e jiri mmụọ nsọ tee Onye Kraịst mmanụ, ọ ga-agbanwe nke ukwuu. Jizọs kpọrọ mgbanwe ahụ ‘ịmụ mmadụ ọzọ.’ (Jọn 3:3, 5) O kwuziri, sị: “Ya ejula gị anya na m sịrị gị, A ghaghị ịmụ unu ọzọ. Ifufe na-efega n’ebe ọ chọrọ, ị na-anụkwa ụda ya, ma ị dịghị ama ebe o si abịa na ebe ọ na-eje. Otú a ka ọ dị onye ọ bụla a mụrụ site na mmụọ nsọ.” (Jọn 3:7, 8) O doro anya na e tee mmadụ mmanụ, o nweghị otú ọ ga-esi akọwara ya onye ọzọ ka onye ahụ ghọta otú ọ dị ya. [2]—Tụlee ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.

Ọ naghị eme onye e tere mmanụ obi abụọ ma Jehova ọ̀ họrọla ya

12 Onye e tere mmanụ nwere ike ịna-eche, sị, ‘Gịnị mere Jehova ji họrọ m kama ịhọrọ onye ọzọ?’ O nwedịrị ike ịna-eche ma ò rukwara eru ịrụ ọrụ ahụ. Ma ọ gaghị emewe ya obi abụọ ma Jehova ọ̀ họrọla ya. Kama, obi ga-adị ya ezigbo ụtọ maka onyinye ahụ Chineke nyere ya. Obi na-adị ndị e tere mmanụ otú obi dị Pita mgbe o dere, sị: “Ka Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst bụrụ onye a gọziri agọzi, n’ihi na dị ka ebere ya si dị ukwuu, ọ mụrụ anyị ọzọ ka anyị wee nwee olileanya dị ndụ site n’ime ka Jizọs Kraịst si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, ka anyị wee nweta ihe nketa a na-apụghị ibibi ebibi, nke a na-emerụghị emerụ, nke na-adịghịkwa emebi emebi. E debeere ya unu n’eluigwe.” (1 Pita 1:3, 4) Ndị e tere mmanụ gụọ ihe a Pita kwuru, ọ na-edo ha anya na ọ bụ ha ka Nna ha nke eluigwe na-agwa.

13. Olee otú ihe mmadụ na-eche si agbanwe ma é jiri mmụọ nsọ tee ya mmanụ? Gịnị na-akpata mgbanwe ahụ?

 13 Tupu Jehova ahọrọ Ndị Kraịst ka ha gaa eluigwe, ha nweburu olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ha na-atụbu anya ịhụ mgbe Jehova ga-eme ka ụwa bụrụ paradaịs ma wepụ ihe ọjọọ niile. Ha nọkwa na-eche otú ọ ga-adị ha mgbe ha ga-ahụ onye ezinụlọ ha ma ọ bụ enyi ha nwụrụ anwụ a kpọlitere n’ọnwụ. Ha tụkwara anya mgbe ha ga-arụ ụlọ, biri na ya ma ọ bụ mgbe ha ga-akụ osisi, riekwa mkpụrụ ya. (Aịzaya 65:21-23) Gịnịzi mere ihe ha na-eche ji gbanwee? Ọ̀ bụ n’ihi na ike ụwa a agwụla ha ma ọ bụ na ha atagbuola onwe ha n’ahụhụ? Hà nọkatara kpebie na ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ga na-agwụ ike nakwa na obi agaghị adị ha ụtọ n’ụwa? Ka ọ̀ bụ n’ihi na ha chọrọ ịma otú ibi n’eluigwe ga-adị? Mba. Kama, ọ bụ Chineke kpebiri ịhọrọ ha. Mgbe ọ kpọrọ ha òkù ahụ, o ji mmụọ nsọ ya gbanwee otú ha si eche echiche na ụgwọ ọrụ ha na-atụ anya ya.

14. Olee otú ndị e tere mmanụ si ele ndụ ha dị n’ụwa a anya?

14 Ma ọ̀ pụtara na ndị e tere mmanụ chọrọ ịnwụ? Pọl kwuru otú obi na-adị ndị e tere mmanụ. O ji ahụ́ ha tụnyere “ụlọikwuu” ma kwuo, sị: “N’eziokwu, anyị ndị nọ n’ụlọikwuu a na-asụ ude, ebe ọ na-anyịgbu anyị; n’ihi na anyị chọrọ, ọ bụghị iyipụ ya, kama iyiri nke ọzọ, ka ndụ wee loda ihe ahụ nke pụrụ ịnwụ anwụ.” (2 Ndị Kọrịnt 5:4) Ndị e tere mmanụ achọghị ịnwụ. Ndụ na-atọ ha ụtọ. Ha chọkwara ka ha na ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha na-ejere Jehova ozi kwa ụbọchị. Ma, n’agbanyeghị ihe ha na-eme, ha na-echeta ihe Chineke kwere nkwa imere ha n’ọdịnihu.—1 Ndị Kọrịnt 15:53; 2 Pita 1:4; 1 Jọn 3:2, 3; Mkpughe 20:6.

JEHOVA Ọ̀ HỌRỌLA GỊ?

15. Olee ihe ndị na-anaghị egosi na Chineke ejirila mmụọ nsọ tee mmadụ mmanụ?

15 I nwere ike ịna-eche ma Jehova ọ̀ họrọla gị ka i soro ná ndị ga-aga eluigwe. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, chebara ajụjụ ndị a dị́ mkpa echiche: Obi gị ọ̀ na-agwa gị na ị na-anụ ọkụ n’obi n’ikwusa ozi ọma? Ịmụ Baịbụl na ịmụta “ihe ndị miri emi nke Chineke” ọ̀ na-atọ gị ezigbo ụtọ? (1 Ndị Kọrịnt 2:10) Ị̀ hụla ihe dị́ iche iche gosiri na Jehova na-agọzi ozi ọma ị na-ekwusa? Ime ihe Jehova chọrọ ọ̀ na-enu gị enu karịa ihe ọ bụla ọzọ? Ị̀ hụrụ ndị ọzọ n’anya nke ukwuu, na-agbalịsikwa ike inyere ha aka ịna-ejere Jehova ozi? Ị̀ hụla ihe gosiri na Jehova esila n’ụzọ dị́ iche iche nyere gị aka? Ọ bụrụ na ị zara ee n’ajụjụ a niile, ọ̀ pụtara na Chineke ahọrọla gị ka ị gaa eluigwe? Mba. Ọ bụghị ihe ọ pụtara. N’ihi gịnị? N’ihi na o nwere ike ịdị onye ọ bụla na-efe Chineke otú ahụ, ma ọ̀ bụ onye e tere mmanụ ma ọ bụ na ọ bụghị. Jehova nwekwara ike iji mmụọ nsọ ya mee ka onye ọ bụla bụ́ ohu ya mee ihe ndị a n’agbanyeghị ihe ụgwọ ọrụ onye ahụ ga-abụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ọ na-eme gị obi abụọ ma ị̀ ga-aga eluigwe, ọ pụtara na i soghị ná ndị Chineke họọrọ. Ọ naghị eme ndị ọ họọrọ obi abụọ. O doro ha anya na ọ họrọla ha.

16. Olee otú anyị si mara na ọ bụghị ndị niile Chineke nyere mmụọ nsọ ka ọ họọrọ ka ha gaa eluigwe?

 16 Baịbụl gwara anyị banyere ọtụtụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi Jehova nyere mmụọ nsọ ya, ma ha agaghị eluigwe. Otu n’ime ha bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim. Jizọs kwuru na e nwebeghị onye ka Jọn ukwuu, ma o kwuru na Jọn esoghị ná ndị ga-aga bụrụ eze n’eluigwe. (Matiu 11:10, 11) Mmụọ nsọ duzikwara Devid. (1 Samuel 16:13) Mmụọ nsọ nyeere ya aka ịghọta ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ banyere Jehova nakwa iso dee Baịbụl. (Mak 12:36) N’agbanyeghị ihe ndị ahụ, Pita onyeozi kwuru na “Devid arịgoghị n’eluigwe.” (Ọrụ Ndịozi 2:34) Jehova nyere ha ike mmụọ nsọ ime ihe ndị dị́ ịtụnanya, ma o jighị ya họrọ ha ịga eluigwe. Ọ̀ pụtara na ha ekwesịghị ntụkwasị obi ma ọ bụ na ha erughị eru ịchị n’eluigwe? Mba. Ọ pụtara na Jehova ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha biri na Paradaịs ga-adị n’ụwa.—Jọn 5:28, 29; Ọrụ Ndịozi 24:15.

17, 18. (a) Olee olileanya ọtụtụ n’ime ndị ohu Chineke nwere taa? (b) Olee ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

17 Ọtụtụ ndị ohu Chineke taa agaghị aga eluigwe. Ha nwere olileanya ahụ Ebreham, Devid, na Jọn Onye Na-eme Baptizim nwere, ya bụ, ibi n’ụwa mgbe ọchịchị Chineke ga na-achị ha. (Ndị Hibru 11:10) Ndị ha na Jizọs ga-anọ n’eluigwe na-achị dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. Ma Baịbụl kwuru banyere “ndị fọdụrụ n’ime” ndị e tere mmanụ ka nọ́ n’ụwa n’oge ikpeazụ a. (Mkpughe 12:17) N’ihi ya, ọtụtụ n’ime otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ anwụọla. Ha nọkwa n’eluigwe ugbu a.

18 Ma, ọ bụrụ na mmadụ asị na ya bụ onye e tere mmanụ, olee otú ndị nwere olileanya ibi n’ụwa kwesịrị isi na-ele ya anya? Onye ọgbakọ unu malite ịta achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs, gịnị ka i kwesịrị ime? Ọ bụrụ na mmadụ ole sịrị na ha bụ ndị e tere mmanụ na-ebukwu ibu, ò kwesịrị ịna-echu gị ụra? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

^ [1] (paragraf nke 4) O nwere ike ịbụ na ụbọchị a na-eme Ememme Pentikọst bụ otu ụbọchị ahụ Chineke nyere Mozis Iwu ya na Saịnaị. (Ọpụpụ 19:1) N’ihi ya, ọ ga-abụ na ụbọchị Jehova si n’aka Mozis mee ka ya na mba Izrel gbaa ọgbụgba ndụ Iwu dabara n’otu ụbọchị ahụ Jehova si n’aka Jizọs mee ka ya na ndị e tere mmanụ gbaa ọgbụgba ndụ ọhụrụ.

^ [2] (paragraf nke 11) Ị chọọ ịhụ ebe a kọwakwuru ihe ịmụ mmadụ ọzọ pụtara, gụọ Ụlọ Nche April 1, 2009, peeji nke 3-11.