Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2016

Kpebisienụ Ike na ‘Ịhụnanya Ụmụnna Unu Ga-adịgide’

Kpebisienụ Ike na ‘Ịhụnanya Ụmụnna Unu Ga-adịgide’

“Ka ịhụnanya ụmụnna unu dịgide.”—NDỊ HIBRU 13:1.

ABỤ: 72, 119

1, 2. Gịnị mere Pọl ji degara ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst akwụkwọ ozi?

N’AFỌ 61, ọgbakọ niile dị́ n’Izrel nwere obere oge udo. N’agbanyeghị na Pọl onyeozi nọ n’ụlọ mkpọrọ mgbe ahụ, o nwere olileanya na a ga-atọhapụ ya n’oge na-adịghị anya. Ọ dịbeghị anya a tọhapụrụ Timoti, bụ́ onye ya na ya na-eso eje ozi ala ọzọ, ha abụọ bukwa n’obi ịga leta ụmụnna nọ́ na Judia. (Ndị Hibru 13:23) Ma, ọ fọrọ naanị afọ ise ka ụmụnna nọ́ na Judia na Jeruselem gbapụ, karịchaa ndị bí na Jeruselem. N’ihi gịnị? Jizọs ebula ụzọ gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha gbapụ ozugbo ha hụrụ ka ndị agha Rom gbara Jeruselem gburugburu.—Luk 21:20-24.

2 Iri afọ abụọ na asatọ agaala kemgbe Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ahụ. N’oge ahụ, Ndị Kraịst nọ́ n’Izrel kwesịrị ntụkwasị obi n’agbanyeghị mmegide a na-emegide ha na ọtụtụ ọnwụnwa ndị ọzọ bịaara ha. (Ndị Hibru 10:32-34) Ma, Pọl chọrọ ka ha dịrị njikere maka ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ọ fọrọ obere ka ọnwụnwa siri ezigbo ike bịara ha. (Matiu 24:20, 21; Ndị Hibru 12:4) Ha kwesịrị inwe okwukwe ma tachie obi otú ha na-emetụbeghị ka ha nwee ike ịgbapụ otú ahụ Jizọs gwara ha, nke ga-eme ka ha ghara ịnwụ.  (Gụọ Ndị Hibru 10:36-39.) Ọ bụ ya mere Jehova ji nye Pọl ike mmụọ nsọ idegara ezigbo ụmụnna ndị ahụ akwụkwọ ozi iji mee ka okwukwe ha sie ike maka ihe na-aga ime. Akwụkwọ ozi ahụ o degaara ha ka a na-akpọzi akwụkwọ Ndị Hibru.

3. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe mmasị n’akwụkwọ Ndị Hibru?

3 Anyị niile bụ́ Ndị Kraịst taa kwesịrị inwe mmasị n’ihe e dere n’akwụkwọ Ndị Hibru. N’ihi gịnị? N’ihi na otú ihe dịịrị anyị ugbu a ka ọ dịịrị ụmụnna ndị ahụ nọ́ na Judia. Anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, nke tara akpụ.’ Ọtụtụ ụmụnna anyị ediela ọnwụnwa ma ọ bụ mmegide ndị siri ezigbo ike. (2 Timoti 3:1, 12) Ma ọtụtụ n’ime anyị bi n’ebe a na-anaghị enyecha anyị nsogbu, a naghịkwa emegide anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya otú ahụ ụmụnna ndị ahụ Pọl degaara akwụkwọ ozi mere. N’ihi gịnị? N’oge na-adịghị anya, ọnwụnwa siri ezigbo ike ga-abịara anyị niile.—Gụọ Luk 21:34-36.

4. Gịnị bụ isiokwu afọ 2016, gịnịkwa mere o ji daba adaba?

4 Gịnị ga-enyere anyị aka ịdị njikere maka ihe ahụ ga-eme n’ọdịnihu? N’akwụkwọ Ndị Hibru, Pọl kwuru ọtụtụ ihe ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. O kwuru otu n’ime ha nke dị́ ezigbo mkpa ná Ndị Hibru 13:1. Ọ gbara anyị ume, sị: “Ka ịhụnanya ụmụnna unu dịgide.” Ọ bụ n’amaokwu ahụ ka e si nweta isiokwu afọ 2016.

Isiokwu afọ 2016: “Ka ịhụnanya ụmụnna unu dịgide.”—Ndị Hibru 13:1

GỊNỊ BỤ ỊHỤNANYA ỤMỤNNA?

5. Gịnị bụ ịhụnanya ụmụnna?

5 Gịnị bụ ịhụnanya ụmụnna? Okwu Grik Pọl dere n’amaokwu ahụ pụtara “ịhụ nwanna n’anya.” Ịhụnanya ụmụnna bụ ụdị ịhụnanya ndị nọ́ n’otu ezinụlọ ma ọ bụ ndị bụ́ ezigbo enyi na-enwe n’ebe ibe ha nọ. Onye nke ọ bụla ga-eji obi ya niile hụ ibe ya n’anya. Ọ gaghị eji ya na-egwu egwu. (Jọn 11:36) Anyị anaghị eme ka a sịkwa na anyị bụ ụmụnna. Anyị bụ ụmụnna. (Matiu 23:8) Pọl kwuru, sị: “N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ obi ọmịiko n’ebe ibe unu nọ. N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” (Ndị Rom 12:10) Ihe a o kwuru na-egosi otú anyị si jiri obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya. Ụdị ịhụnanya a na ịhụnanya Ndị Kraịst na-enyere ndị Chineke aka ka ha na ibe ha bụrụ ezigbo enyi, dịrịkwa n’otu.

6. Olee otú ezigbo Ndị Kraịst si aghọta ịhụnanya ụmụnna?

6 A naghị ahụkarị okwu ahụ bụ́ “ịhụnanya ụmụnna” n’akwụkwọ ndị na-abụghị nke Ndị Kraịst. N’oge ochie, onye ndị Juu na-akpọ “nwanna” bụ onye ikwu ha nakwa mgbe ụfọdụ, onye na-abụghị onye ezinụlọ ha. Ma, ha emekataghị kpọọ onye na-abụghị onye Juu “nwanna.” Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, nwanna anyị bụ onye ọ bụla bụ́ ezigbo Onye Kraịst n’agbanyeghị ebe o si. (Ndị Rom 10:12) Jehova akụzielara anyị ka anyị na-ahụ ụmụnna anyị n’anya. (1 Ndị Tesalonaịka 4:9) Ma, gịnị mere o ji dị́ mkpa ka anyị na-ahụ ụmụnna anyị n’anya?

GỊNỊ MERE O JI DỊ́ EZIGBO MKPA KA ANYỊ NA-AHỤ ỤMỤNNA ANYỊ N’ANYA?

7. (a) Olee ihe kacha mkpa mere anyị ji kwesị ịhụ ụmụnna anyị n’anya? (b) Kwuo ihe ọzọ mere o ji dị́ mkpa ka anyị mee ka ịhụnanya anyị hụrụ ụmụnna anyị sikwuo ike.

7 Ihe kacha mkpa mere anyị ji kwesị ịhụ ụmụnna anyị n’anya bụ na Jehova gwara anyị ka anyị mee otú ahụ. Anyị agaghị  ahụli Jehova n’anya ma ọ bụrụ na anyị ahụghị ụmụnna anyị n’anya. (1 Jọn 4:7, 20, 21) Ihe ọzọ bụ na anyị kwesịrị ịna-enyere ibe anyị aka, karịchaa mgbe ihe siri ike. Mgbe Pọl degaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru akwụkwọ ozi ahụ, ọ ma na n’oge na-adịghị anya, ụfọdụ n’ime ha ga-ahapụ ụlọ ha na ihe ndị ọzọ ha nwere gbapụ. Jizọs ebula ụzọ kwuo otú ihe ga-esi sie ike mgbe ahụ. (Mak 13:14-18; Luk 21:21-23) N’ihi ya, tupu oge ahụ eruo, Ndị Kraịst ndị ahụ kwesịrị ime ka ịhụnanya ha hụrụ ibe ha sikwuo ike.—Ndị Rom 12:9.

Anyị kwesịrị ime ka ịhụnanya ụmụnna anyị sikwuo ike ugbu a n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’agbanyeghị ọnwụnwa ọ bụla ga-abịara anyị n’ọdịnihu

8. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ugbu a tupu oké mkpagbu ahụ amalite?

8 Mkpagbu a na-enwetụbeghị ụdị ya ga-amalite n’oge na-adịghị anya. (Mak 13:19; Mkpughe 7:1-3) N’oge ahụ, anyị ga-eme ihe Jehova kwuru n’akwụkwọ Aịzaya. Ọ sịrị: “Ndị m, gaanụ banye n’ọnụ ụlọ unu dị n’ime, mechiekwanụ ọnụ ụzọ mgbe unu banyesịrị. Zoonụ ruo nwa mgbe nta, ruo mgbe oké iwe gafere.” (Aịzaya 26:20) ‘Ọnụ ụlọ ahụ dị n’ime’ nwere ike ịbụ ọgbakọ anyị dị́ iche iche. Ọ bụ ebe ahụ ka anyị na ụmụnna anyị na-efe Jehova. Ma, ihe anyị kwesịrị ime abụghị naanị ịga ọmụmụ ihe mgbe niile. Pọl gwara ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst na ha kwesịrị ịna-agbarịta ibe ha ume iji gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya, na-emekwara ha ihe ọma. (Ndị Hibru 10:24, 25) Anyị kwesịrị ime ka ịhụnanya ụmụnna anyị sikwuo ike ugbu a n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’agbanyeghị ọnwụnwa ọ bụla ga-abịara anyị n’ọdịnihu.

9. (a) Olee mgbe ụfọdụ anyị kwesịrị igosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya? (b) Kọọ otú ụfọdụ ndị Jehova sirila gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya.

9 Ugbu a oké mkpagbu ahụ na-amalitebeghị, e nwere ọtụtụ mgbe anyị kwesịrị igosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya. Ala ọma jijiji, idei mmiri, oké ifufe, na ọdachi ndị ọzọ echiela ọtụtụ ụmụnna anyị ọnụ n’ala. A na-emegidekwa ụfọdụ ụmụnna anyị. (Matiu 24:6-9) Ihe na-esikwara ọtụtụ ndị ike n’ihi na anyị bi n’ụwa retọrọ eretọ. (Mkpughe 6:5, 6) Ma, ka ụmụnna anyị na-enwekwu nsogbu, otú ahụ ka anyị kwesịrị ịna-egosikwu na anyị hụrụ ha n’anya. N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị ahụghịzi ibe ha n’anya n’ụwa a, anyị kwesịrị igosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya. (Matiu 24:12) [1]—Tụlee ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI MEE KA ỊHỤNANYA ỤMỤNNA ANYỊ DỊGIDE?

10. Olee ihe anyị ga-atụle?

10 N’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara anyị, olee otú anyị ga-esi mee ka ịhụnanya ụmụnna anyị dịgide? Olee otú anyị ga-esi mata ma ànyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya otú a? Mgbe Pọl kwuchara, sị: “Ka ịhụnanya ụmụnna unu dịgide,” o kwuziri ụzọ dị́ iche iche Ndị Kraịst  ga-esi mee ya. Ka anyị leba anya n’isii n’ime ha.

11, 12. Gịnị ka ile ọbịa pụtara? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a)

11 “Unu echefula ile ọbịa.” (Gụọ Ndị Hibru 13:2.) Gịnị ka okwu bụ́ “ile ọbịa” pụtara? Ihe okwu Grik Pọl kwuru ebe a pụtara bụ “imere ndị ọbịa ihe ọma.” Okwu ahụ nwere ike ichetara anyị Ebreham na Lọt. Ha abụọ meere ndị ọbịa ha na-amaghị ihe ọma. Ha mechara mata na ndị ahụ ha lere ọbịa bụ ndị mmụọ ozi. (Jenesis 18:2-5; 19:1-3) Ihe a ha mere gbara ụmụnna ndị Hibru ahụ ume ịna-ele ọbịa iji gosi na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya.

12 Olee otú anyị ga-esi na-ele ndị ọzọ ọbịa? Anyị nwere ike ịkpọ ụmụnna anyị ka ha bịa n’ụlọ anyị soro anyị rie nri ma ọ bụ ka anyị gbarịta ibe anyị ume. Ọ bụrụ na onye nlekọta sekit abịa ileta ọgbakọ anyị, anyị nwekwara ike ịgwa ya na nwunye ya ka ha bịa n’ụlọ anyị n’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na anyị amaghị ha nke ọma. (3 Jọn 5-8) Ọ bụghị iwu na anyị ga-esi nri pụrụ iche ma ọ bụ mefuo nnukwu ego. Ihe dị́ mkpa bụ ka anyị gbaa ụmụnna anyị ume, ọ bụghị ka anyị gosi ha ihe anyị nwere. Anyị ekwesịghịkwa ịna-akpọ naanị ndị nwere ihe ha ga-eji kwụọ anyị ụgwọ. (Luk 10:42; 14:12-14) Ihe kacha mkpa bụ ka anyị ghara ikwe ka mere nke a mere nke ọzọ mee ka anyị chefuo ịna-ele ọbịa.

13, 14. Olee otú anyị ga-esi ‘na-echeta ndị nọ n’agbụ ụlọ mkpọrọ?

13 “Na-echetanụ ndị nọ n’agbụ ụlọ mkpọrọ.” (Gụọ Ndị Hibru 13:3.) Ndị Pọl bu n’uche dee ihe a bụ ụmụnna ndị a tụrụ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha. Pọl jara ụmụnna bụ́ ndị Hibru mma n’ihi na ha “nwere obi ebere n’ebe ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ nọ.” (Ndị Hibru 10:34) Ụfọdụ n’ime ụmụnna ndị ahụ nyeere Pọl aka n’afọ anọ ahụ ọ nọrọ n’ụlọ mkpọrọ. Ma, e nwere ụmụnna ndị bí n’ebe dị́ anya. Olee otú ha ga-esi nyere Pọl aka? Ha nwere ike ịna-ekpesi ekpere ike maka ya.—Ndị Filipaị 1:12-14; Ndị Hibru 13:18, 19.

Anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere maka ụmụnna anyị niile nọ́ n’ụlọ mkpọrọ n’Eritria, ma ụmụnna nwoke ma ụmụnna nwaanyị ma ụmụaka

14 Taa, ọtụtụ Ndịàmà Jehova nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha. Ụmụnna bí nso n’ebe a tụrụ ha mkpọrọ nwere ike ịna-enyere ha aka. Ma ọtụtụ n’ime anyị bi n’ebe dị́ ezigbo anya. Olee otú anyị ga-esi nyere ha aka ma ghara ichefu ha? Otú anyị si hụ ha n’anya ga-eme ka anyị na-ekpesi ekpere ike maka ha. Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere maka ụmụnna anyị niile nọ́ n’ụlọ mkpọrọ n’Eritria, ma ụmụnna nwoke ma ụmụnna nwaanyị ma ụmụaka. Ụfọdụ n’ime ha bụ Paulos Eyassu, Isaac Mogos, na Negede Teklemariam, bụ́ ndị nọrọla n’ụlọ mkpọrọ ihe karịrị afọ iri abụọ.

15. Olee otú anyị ga-esi na-akwanyere alụmdi na nwunye anyị ùgwù?

 15 “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile.” (Gụọ Ndị Hibru 13:4.) Otú ọzọ anyị si egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya bụ izere omume rụrụ arụ. (1 Timoti 5:1, 2) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị akwaa iko, ọ ga-akpatara onye ahụ na ndị ezinụlọ ya nsogbu. Ọ ga-emekwa ka ụmụnna anyị gharazie ịtụkwasị anyị obi. (1 Ndị Tesalonaịka 4:3-8) Chegodị otú obi ga-adị onye bụ́ nwunye ma ọ chọpụta na di ya na-ele ndị gba ọtọ. Ọ̀ ga-egosi na di ya hụrụ ya n’anya, na-akwanyekwara alụmdi na nwunye ha ùgwù?—Matiu 5:28.

16. Ọ bụrụ na ihe anyị nwere eju anyị afọ, olee otú ọ ga-esi nyere anyị aka ịhụ ụmụnna anyị n’anya?

16 “Na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a.” (Gụọ Ndị Hibru 13:5.) Ịtụkwasị Jehova obi ga-eme ka ihe anyị nwere ju anyị afọ. Ọ bụrụ na ihe anyị nwere eju anyị afọ, olee otú ọ ga-esi nyere anyị aka ịhụ ụmụnna anyị n’anya? Ọ ga-eme ka anyị na-echeta na ụmụnna anyị dị ezigbo mkpa karịa ego ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ. (1 Timoti 6:6-8) Anyị agaghị na-atamu ntamu banyere ụmụnna anyị ma ọ bụ otú ihe si dịrị anyị. Anyị agaghị na-enwere ụmụnna anyị anyaụfụ. Anyị agaghịkwa adị anyaukwu. Kama ime otú ahụ, anyị ga na-emesapụ aka.—1 Timoti 6:17-19.

17. Olee otú ‘inwe obi ike’ ga-esi nyere anyị aka ịhụ ụmụnna anyị n’anya?

17 “Ka anyị nwee obi ike.” (Gụọ Ndị Hibru 13:6.) Ịtụkwasị Jehova obi ga-eme ka anyị nwee obi ike idi ọnwụnwa ndị siri ike na-abịara anyị. Ụdị obi ike a ga-enyere anyị aka ịna-ele ụmụnna  anyị anya otú kwesịrị ekwesị. Anyị mee otú ahụ, anyị ga na-agba ụmụnna anyị ume ma na-akasi ha obi iji gosi na anyị hụrụ ha n’anya. (1 Ndị Tesalonaịka 5:14, 15) Ọ bụrụgodị na oké mkpagbu amalite, anyị ga-enwe obi ike, ebe anyị ma na nnapụta anyị dị nso.—Luk 21:25-28.

Anyị ga-enwe obi ike, ebe anyị ma na nnapụta anyị dị nso

18. Gịnị ga-enyere anyị aka ịhụkwu ndị okenye nọ́ n’ọgbakọ anyị n’anya?

18 “Na-echetanụ ndị na-edu ndú n’etiti unu.” (Gụọ Ndị Hibru 13:7, 17.) Ndị okenye ọgbakọ anyị na-eji oge ha arụsi ọrụ ike maka ọdịmma anyị. Ọ bụrụ na anyị echee banyere ihe niile ha na-arụ, anyị ga-ahụkwu ha n’anya ma na-ekele ha. Anyị agaghị eme ihe ga-eme ka obi jọọ ha njọ ma ọ bụ ka ike gwụ ha. Kama ime otú ahụ, anyị ga-eji obi anyị niile na-erubere ha isi. Anyị ga-esi otú a gosi na anyị ‘ji ịhụnanya na-asọpụrụ ha n’ụzọ pụrụ iche n’ihi ọrụ ha.’—1 Ndị Tesalonaịka 5:13.

Obi ọ̀ dị gị ụtọ maka ọrụ ndị okenye na-arụrụ anyị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

NA-AGBAKWUNỤ MBỌ NA-EME YA

19, 20. Olee otú anyị ga-esi na-egosikwu ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya?

19 Ihe e ji mara ndị Jehova bụ na ha hụrụ ibe ha n’anya. Otú ahụ ka ọ dikwa n’oge Pọl onyeozi. Ma Pọl gbara ụmụnna ya ume ka ha hụkwuo ibe ha n’anya. Ọ sịrị: “Ka unu na-eme ya n’ụzọ zuru ezu karị.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:9, 10) O doro anya na anyị kwesịrị ịna-ahụkwu ụmụnna anyị n’anya.

20 N’ihi ya, anyị lee anya n’isiokwu afọ a n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, ka anyị jụọ onwe anyị, sị: M̀ kwesịrị ịna-elekwu ndị ọzọ ọbịa? Olee otú m ga-esi nyere ụmụnna anyị nọ́ n’ụlọ mkpọrọ aka? M̀ na-akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù? Gịnị ga-enyere m aka ka ihe m nwere na-eju m afọ? Olee otú m ga-esi tụkwasịkwuo Jehova obi? Olee otú m ga-esi na-erubekwuru ndị na-edu ndú n’ọgbakọ isi? Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike ịna-emekwu nke ọma n’ebe isii ndị a, isiokwu afọ a agaghị abụ naanị ihe e dere n’ahụ́ Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị; ọ ga na-echetara anyị ime ihe ahụ Pọl kwuru, nke bụ́: “Ka ịhụnanya ụmụnna unu dịgide.”—Ndị Hibru 13:1.

^ [1] (paragraf nke 9) Ị chọọ ịhụ otú Ndịàmà Jehova si gosi na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya n’oge ọdachi, gụọ Ụlọ Nche July 15, 2002, peeji nke 8-9, leekwa vidio bụ́ Ụmụnna Anyị Nọ n’Ụwa Dum.