Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2016

Anyị na Chineke Ịrụkọ Ọrụ Na-eme Anyị Obi Ụtọ

Anyị na Chineke Ịrụkọ Ọrụ Na-eme Anyị Obi Ụtọ

“Ebe anyị na ya na-arụkọ ọrụ, anyị na-arịọsikwa unu ike ka unu ghara ịnara obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ ma nzube ya efunahụ unu.”—2 NDỊ KỌRỊNT 6:1.

ABỤ: 75, 74

1. N’agbanyeghị na Jehova bụ Onye Kacha Elu, gịnị ka ọ na-akpọ ndị ọzọ ka ha mee?

JEHOVA bụ Onye Kacha Elu. Ọ bụ ya kere ihe niile. Amamihe ya na ike ya enweghị atụ. Mgbe o mechara ka Job ghọta ihe ndị a, Job sịrị ya: “Amatawo m na i nwere ike ime ihe niile, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla i zubere nke ị na-apụghị ime.” (Job 42:2) Jehova ga-emeli ihe ọ bụla o kpebiri ime ọ bụrụgodị na e nweghị onye nyeere ya aka. Ma ọ bụ ịhụnanya ya mere o ji akpọ ndị ọzọ ka ha na ya rụkọọ ọrụ iji mezuo nzube ya.

2. Olee ọrụ dị́ mkpa Jehova nyere Jizọs ka ọ rụọ?

2 Chineke kere Ọkpara ya bụ́ Jizọs tupu ya ekee onye ọ bụla ọzọ na ihe ọ bụla ọzọ. Jehova kwere ka Ọkpara ya nyere ya aka ike ihe ndị ọzọ niile. (Jọn 1:1-3, 18) Pọl onyeozi dere banyere Jizọs, sị: “E si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ  niile n’eluigwe na n’elu ụwa, ihe ndị a pụrụ ịhụ anya na ihe ndị a na-apụghị ịhụ anya, n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ ocheeze ma ọ bụ ịbụisi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ikike. E kere ihe ndị ọzọ niile site n’aka ya nakwa maka ya.” (Ndị Kọlọsi 1:15-17) N’ihi ya, otu ụzọ Jehova si kwanyere Ọkpara ya ùgwù bụ na o nyere ya ọrụ dị́ mkpa, gwakwa ndị ọzọ banyere ọrụ ahụ.

3. Gịnị ka Jehova gwara Adam ka o mee? N’ihi gịnị?

3 Jehova kpọkwara ụmụ mmadụ ka ha na ya rụkọọ ọrụ. Dị ka ihe atụ, ọ gwara Adam ka ọ gụọ ụmụ anụmanụ aha. (Jenesis 2:19, 20) Chegodị ụdị obi ụtọ Adam nwere mgbe ọ na-arụ ọrụ ahụ. O leruru anụmanụ ndị ahụ anya, mata otú ha dị na otú ha si eme, kpebizie aha ọ ga-agụ nke ọ bụla n’ime ha. Ọ bụ Jehova kere anụmanụ niile ahụ. N’ihi ya, á sị na ọ chọrọ, ọ gaara eji aka ya gụọ ha aha. Ma, ọ hapụrụ Adam ka ọ gụọ ha aha iji gosi na ọ hụrụ ya n’anya. Ọrụ ọzọ Chineke nyere Adam bụ ime ka ụwa niile bụrụ paradaịs. (Jenesis 1:27, 28) Ma, Adam mechara kpebie na ya na Chineke agaghịzi arụkọ ọrụ. Ahụhụ ọ kpataara ya na ụmụ ya niile abụghị ihe e ji ọnụ ekwu.—Jenesis 3:17-19, 23.

4. Olee otú Chineke na ndị ọzọ si rụkọọ ọrụ iji mezuo uche ya?

4 Chineke mechara kpọọ ndị ọzọ ka ha na ya rụkọọ ọrụ. Noa rụrụ ụgbọ o ji zọpụta ya na ndị ezinụlọ ya n’Iju Mmiri. Mozis napụtara ndị Izrel n’aka ndị Ijipt. Jọshụa du ndị Izrel banye n’Ala Nkwa. Sọlọmọn rụrụ ụlọ nsọ na Jeruselem. Meri mụrụ Jizọs. Ndị a niile na ọtụtụ ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi so Jehova rụọ ọrụ iji mezuo uche ya.

5. Olee ọrụ anyị nwere ike iso rụọ? Á sị na Jehova enyeghị anyị ọrụ a, ọ̀ pụtara na a gaghị arụ ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

5 Taa, Jehova na-akpọ anyị ka anyị jiri obi anyị niile na-akwado Alaeze ya. E nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi jeere Chineke ozi. N’agbanyeghị na e nwere ndị nke anyị na-agaghị arụli, anyị niile ga-ekwusali ozi ọma Alaeze ya. Á sị na Jehova chọrọ, ọ gaara eji aka ya rụọ ọrụ a. Ọ gaara anọ n’eluigwe na-agwa ndị mmadụ okwu n’ụwa. Jizọs sịrị na Jehova nwere ike ime ka nkume gwa ndị ọzọ banyere Eze ga-achị n’Alaeze ya. (Luk 19:37-40) Ma, Jehova kwere ka anyị bụrụ ‘ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ.’ (1 Ndị Kọrịnt 3:9) Pọl onyeozi dere, sị: “Ebe anyị na ya na-arụkọ ọrụ, anyị na-arịọsikwa unu ike ka unu ghara ịnara obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ ma nzube ya efunahụ unu.” (2 Ndị Kọrịnt 6:1) Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù na Chineke kpọrọ anyị ka anyị na ya na-arụkọ ọrụ. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ mere ọrụ anyị na ya na-arụkọ ji eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ.

ANYỊ NA CHINEKE ỊRỤKỌ ỌRỤ NA-EME ANYỊ OBI ỤTỌ

6. Olee otú Ọkpara Chineke si kọwaa otú obi dị ya maka na ya na Nna ya rụkọrọ ọrụ?

6 Kemgbe ụwa, ndị ohu Jehova na-enwe obi ụtọ maka na ha na ya na-arụkọ ọrụ. Tupu Ọkpara Chineke abịa n’ụwa, o kwuru, sị: “Jehova kere m dị ka mmalite nke ụzọ ya . . . M nọ n’akụkụ ya dị ka onye ọkà ọrụ, m wee bụrụ onye ihe ya masịrị ya karịsịa kwa ụbọchị, mụ onwe m na-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu ya mgbe niile.” (Ilu 8:22, 30) Obi dị Jizọs ụtọ mgbe ya na Nna ya na-arụkọ ọrụ n’ihi na ọ rụrụ ọtụtụ ihe, marakwa na Jehova hụrụ ya n’anya. Anyịnwa kwanụ?

È nwere ihe ga-eme anyị obi ụtọ karịa ịkụziri mmadụ eziokwu Baịbụl? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Gịnị mere ikwusa ozi ọma ji eme ka anyị nwee obi ụtọ?

 7 Jizọs kwuru na obi na-adị anyị ụtọ ma mgbe anyị nyere ndị ọzọ ihe ma mgbe ha nyere anyị ihe. (Ọrụ Ndịozi 20:35) Obi tọrọ anyị ụtọ mgbe anyị mụtara eziokwu Baịbụl. Ma olee ihe mere anyị ji enwe obi ụtọ ma anyị kụziwere ndị ọzọ eziokwu ahụ? Ọ bụ n’ihi na anyị na-ahụ otú obi si adị ha ụtọ na ha aghọtala ihe Baịbụl na-akụzi nakwa na ha na Chineke adịwala ná mma. Obi na-adị anyị ụtọ ịhụ ka ha na-agbanwe otú ha si eche echiche na otú ha si akpa àgwà. Ikwusa ozi ọma bụ ọrụ kacha mkpa na ọrụ kacha eme obi ụtọ anyị nwere ike ịrụ. Ọ ga-eme ka ndị ghọrọ enyi Chineke nweta ndụ ebighị ebi.—2 Ndị Kọrịnt 5:20.

8. Gịnị ka ụfọdụ kwuru banyere obi ụtọ ha na-enwe maka na ha na Jehova na-arụkọ ọrụ?

8 Ọ bụrụ na anyị enyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Chineke, anyị ma na anyị na-eme ihe dị́ Jehova mma nakwa na o ji mbọ anyị na-agba n’ozi ya kpọrọ ihe. Ọ na-emekwa anyị obi ụtọ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:58.) Otu nwanna bí n’Ịtali aha ya bụ Marco sịrị: “M na-enwe obi ụtọ na-enweghị atụ n’ihi na m ma na ọ bụ Jehova ka m ji ike m niile na-ejere ozi, ọ bụghị onye ga-echefu ihe m mere n’oge na-adịghị anya.” Nwanna ọzọ bí n’Ịtali aha ya bụ Franco kwukwara, sị: “Jehova ji Okwu ya bụ́ Baịbụl na ihe ndị ọzọ o nyere anyị na-echetara anyị kwa ụbọchị na ọ hụrụ anyị n’anya nakwa na ihe niile anyị na-arụrụ ya dị mkpa ọ bụrụgodị na anyị chere na mbọ anyị na-agba enweghị ihe ọ bụ. Ọ bụ ya mere mụ na Chineke ịrụkọ ọrụ ji eme m obi ụtọ, na-emekwa ka ndụ m nwee isi.”

ANYỊ NA CHINEKE ỊRỤKỌ ỌRỤ NA-EME KA ANYỊ NA YA NA ỤMỤNNA ANYỊ DỊKWUO NÁ MMA

9. Olee otú Jehova na Jizọs dịruru ná mma? N’ihi gịnị?

9 Anyị na ndị anyị hụrụ n’anya rụkọwa ọrụ, anyị na ha na-adịkwu ná mma. Anyị na-amatakwu ụdị ndị ha bụ na àgwà  ọma ndị ha na-akpa. Anyị na-amata ihe ndị ha kpebiri ime na otú ha si agbalịsi ike ime ha. Jehova na Jizọs rụkọrọ ọrụ ma eleghị anya ruo ọtụtụ ijeri afọ. O mere ka ha hụ ibe ha n’anya nke na ihe ọ bụla agaghị emeli ka ha ghara ịdị ná mma. Jizọs kọwara otú ha dịruru ná mma. Ọ sịrị: “Mụ na Nna m bụ otu.” (Jọn 10:30) Ha dị n’otu, jirikwa otu obi rụkọọ ọrụ.

Ikwusa ozi ọma na-eme ka okwukwe anyị sie ike n’ihi na ọ na-eme ka anyị na-echeta nkwa ndị Chineke kwere nakwa iwu ọma ya

10. Gịnị mere ikwusa ozi ọma ji eme ka anyị na Chineke na ụmụnna anyị dịkwuo ná mma?

10 Jizọs rịọrọ Jehova ka o chebe ndị na-eso ụzọ ya. N’ihi gịnị? O kpere ekpere, sị: “Ka ha wee bụrụ otu, dị ka anyị bụ otu.” (Jọn 17:11) Ọ bụrụ na anyị na-erubere iwu Chineke isi, na-ekwusakwa ozi ọma, anyị ga-aghọtakwu àgwà Jehova ndị magburu onwe ha. Anyị ga-amụta ihe mere anyị ji kwesị ịtụkwasị ya obi ma na-eme ihe o kwuru. Ọ bụrụ na anyị abịarukwuo Chineke nso, ọ ga-abịarukwu anyị nso. (Gụọ Jems 4:8.) Anyị na ụmụnna anyị ga-adịkwa ná mma n’ihi na nsogbu na-abịara anyị na-abịara ha, ihe na-eme anyị obi ụtọ na-emekwa ha obi ụtọ, anyị na ha na-achụkwa otu ihe. Anyị na ha na-arụkọ ọrụ, na-aṅụrịkọ ọṅụ, na-edikọkwa nsogbu. Otu nwanna nwaanyị bí na Briten aha ya bụ Octavia sịrị: “Ọrụ mụ na Jehova na-arụkọ na-eme ka mụ na ụmụnna anyị na-adịkwu ná mma.” O kwuru na ọ bụ n’ihi na ndị bụ́ ndị enyi ya ugbu a bụ ‘ndị ya na ha na-achụ otu ihe na ndị ya na ha nwere otu obi.’ Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Ọ bụrụ na anyị ahụ otú ụmụnna anyị si agbalịsi ike ime ihe dị́ Jehova mma, ọ ga-eme ka anyị na ha dịkwuo ná mma.

11. Gịnị mere anyị na Jehova na ụmụnna anyị ga-eji na-adịkwu ná mma n’ụwa ọhụrụ?

11 Anyị hụrụ Chineke na ụmụnna anyị n’anya nke ukwuu ugbu a. Ma anyị ga-ahụkwu ha n’anya n’ụwa ọhụrụ. Chegodị banyere ụdị ọrụ anyị ga-arụ n’ọdịnihu. Anyị ga-anabata ndị nwụrụ anwụ ma kụziere ha banyere Jehova. Anyị ga na-arụkwa ọrụ iji mee ka ụwa bụrụ paradaịs. Obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ ịna-arụkọ ọrụ ma jiri nwayọọ nwayọọ zuo okè mgbe Kraịst ga na-achị. Mmadụ niile na ibe ha ga-adịkwu ná mma, ha na Jehova ga-adịkwukwa ná mma n’ihi na ọ ‘ga-ewere ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.’—Abụ Ọma 145:16.

ANYỊ NA CHINEKE ỊRỤKỌ ỌRỤ GA-EME KA ỤWA SETAN GHARA INWETA ANYỊ

12. Olee otú ikwusa ozi ọma si eme ka Setan ghara inweta anyị?

12 Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. Anyị bi n’ụwa Setan. Anyị ezughịkwa okè. N’ihi ya, ọ gaghị esiri anyị ike ichewe echiche ka ndị ụwa na imewe ka ha. Ọ dị ka ebe anyị na-egwu mmiri n’osimiri na-asọsi ike, nke chọrọ iburu anyị na-aga ebe anyị na-achọghị  ịga. Ọ bụrụ na anyị achọghị ka o buru anyị na-agbada, anyị ga-eji ike anyị niile gwuru na-agbago. Otú ahụ ka anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka ụwa Setan ghara inweta anyị. Olee otú ikwusa ozi ọma si eme ka ọ ghara inweta anyị? Ikwu banyere Jehova na Baịbụl na-eme ka anyị na-eche banyere ihe ndị dị́ mkpa na ihe ndị dị́ mma, ọ bụghị ihe ndị ga-eme ka okwukwe anyị nyụọ ka ọkụ. (Ndị Filipaị 4:8) Ikwusa ozi ọma na-eme ka okwukwe anyị sie ike n’ihi na ọ na-eme ka anyị na-echeta nkwa ndị Chineke kwere nakwa iwu ọma ya. Ọ na-enyekwara anyị aka ijisi ihe agha niile Chineke nyere anyị ike ka Setan na ụwa ya ghara inweta anyị.—Gụọ Ndị Efesọs 6:14-17.

Ọ bụrụ na anyị ana-ekwusa ozi ọma, anyị agaghịzi enwe ohere ichegbuwe onwe anyị banyere nsogbu anyị

13. Olee otú otu nwanna bí n’Ọstrelia si ele ikwusa ozi ọma anya?

13 Ọ bụrụ na anyị ana-ekwusa ozi ọma, na-amụ ihe, na-emekwara ndị ọzọ ihe ọma n’ọgbakọ, ọ ga-eme ka Setan ghara inweta anyị n’ihi na anyị agaghịzi enwe ohere ichegbuwe onwe anyị banyere nsogbu anyị. Otu nwanna bí n’Ọstrelia aha ya bụ Joel kwuru, sị: “Ikwusa ozi ọma na-enyere m aka ka m ghara ichefu na nsogbu juru n’ụwa a. Ọ na-eme ka m na-echeta nsogbu na-abịara ndị mmadụ nakwa uru ndị m riterela n’ihi ime ihe Baịbụl kwuru. Ikwusa ozi ọma na-enyere m aka ịna-agbalịsi ike ịdị umeala n’obi; ọ na-eme ka m tụkwasị Jehova na ụmụnna m obi.”

14. Gịnị mere ozi ọma anyị na-ekwusa n’agbanyeghị nsogbu ji egosi na mmụọ nsọ Chineke na-enyere anyị aka?

14 Ikwusa ozi ọma na-emekwa ka obi sikwuo anyị ike na mmụọ nsọ Chineke na-akwado anyị. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ọrụ gị bụ ịna-enye ndị bí n’obodo unu bred. Ma, a naghị akwụ gị ụgwọ n’ọrụ ahụ. Ị na-esi n’ego akpa gị emefu ihe niile ị na-emefu. Ọtụtụ ndị anaghịkwa achọ bred ahụ. Ụfọdụ ndị kpọdịrị gị asị maka na ị na-ewetara ha ya. Olee mgbe ị ga-arụru ọrụ ahụ? Ọ gaghị adị anya, ike ya agwụ gị, gị akwụsị. Ma, ọtụtụ n’ime anyị ka na-ekwusa ozi ọma sí n’afọ ruo n’afọ n’agbanyeghị na ọ na-efu anyị ma oge ma ego, ọtụtụ ndị na-achịkwa anyị ọchị ma ọ bụ na-ewesa anyị iwe. O gosiri na mmụọ nsọ Chineke na-enyere anyị aka.

ỌRỤ ANYỊ NA CHINEKE NA-ARỤKỌ NA-EGOSI NA ANYỊ HỤRỤ YA NA NDỊ ỌZỌ N’ANYA

15. Olee otú ikwusa ozi ọma si gbasa ihe Jehova bu n’obi kee ụmụ mmadụ?

15 Olee otú ikwusa ozi ọma si gbasa ihe Jehova bu n’obi kee ụmụ mmadụ? O kere ụmụ mmadụ ka ha dịrị ndụ ebighị ebi. Ihe ahụ o bu n’obi agbanweghị mgbe Adam mehiere. (Aịzaya 55:11) Chineke haziri otú a ga-esi napụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. Olee otú o si hazie ya? Jizọs bịara n’ụwa, jiri ndụ ya chụọ àjà. Ma, ụmụ mmadụ kwesịrị irubere Chineke isi ma ọ bụrụ na ha chọrọ  irite uru n’àjà ahụ Jizọs chụrụ. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kụziere ndị mmadụ ihe Chineke chọrọ ka ha mee. O nyekwara ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-eme otú ahụ. Mgbe anyị na-ezi ndị ọzọ ozi ọma ma na-enyere ha aka ịbụ enyi Chineke, anyị na Chineke na-arụkọ ọrụ ná ndokwa o mere iji napụta ndị mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ.

16. Olee otú ozi ọma anyị na-ekwusa si gbasa iwu kachanụ Chineke nyere?

16 Anyị nyere ndị ọzọ aka ịchọta ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi, ọ na-egosi na anyị hụrụ ma hanwa ma Jehova n’anya. ‘Ọ bụ uche Chineke ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.’ (1 Timoti 2:4) Mgbe otu onye Farisii jụrụ Jizọs nke kachanụ n’iwu niile Chineke nyere, Jizọs sịrị ya: “‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Ọ bụ ya bụ iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ. Nke abụọ, nke dị ka ya, bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’” (Matiu 22:37-39) Ikwusa ozi ọma na-egosi na anyị na-erubere iwu ndị a isi.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 10:42.

17. Olee otú obi dị gị maka ihe ùgwù i nwere ikwusa ozi ọma?

17 Jehova agọziela anyị. O nyela anyị ọrụ na-eme anyị obi ụtọ, ọrụ na-eme ka anyị na ya na ụmụnna anyị na-adị ná mma, na-emekwa ka Setan ghara inweta anyị. Ọrụ a na-emekwa ka anyị na-egosi na anyị hụrụ Chineke na ndị ọzọ n’anya. Jehova nwere ọtụtụ nde ndị na-efe ya n’ụwa niile. Otú ihe si dịrị ha niile dịkwa iche iche. Ma ànyị bụ ndị na-eto eto ma ànyị bụ ndị agadi, ọgaranya ma ọ bụ ogbenye, ndị siri ike ma ọ bụ ndị na-esighị ike, anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime iji na-agwa ndị ọzọ ihe anyị kweere. Obi dị anyị otú ọ dị otu nwanna nwaanyị bí na Frans, bụ́ onye sịrị: “Ọ bụ Onye kacha ike n’eluigwe na n’ụwa, Onye kere ihe niile, Chineke obi ụtọ, sịrị m: ‘Gaa kwusawa! Kwusawa okwu m, si n’obi gị kwusawa ya. Enyela m gị ike m, Okwu m bụ́ Baịbụl, enyemaka sí n’eluigwe, ụmụnna ibe gị, ezigbo ọzụzụ, na ntụziaka doro anya ma daba adaba.’ Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù na anyị na-eme ihe Jehova gwara anyị mee nakwa na anyị na Chineke anyị na-arụkọ ọrụ.”