Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2016

“Anyị Ga-eso Unu”

“Anyị Ga-eso Unu”

“Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.”—ZEKARAYA 8:23.

ABỤ: 65, 122

1, 2. (a) Gịnị ka Jehova kwuru ga-eme n’oge anyị a? (b) Olee ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu a? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

JEHOVA kwuru na n’oge anyị a, “ndị ikom iri ndị si n’asụsụ niile nke mba dị iche iche ga-ejide, ee, ha ga-ejide uwe mwụda nke nwoke bụ́ onye Juu, sị, ‘Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.’” (Zekaraya 8:23) ‘Nwoke ahụ bụ́ onye Juu’ nọchiri anya ndị Chineke ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Baịbụl kpọkwara ha “Izrel nke Chineke.” (Ndị Galeshia 6:16) ‘Ndị ikom iri ahụ’ nọchiri anya ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ha ma na Jehova agọziela ndị a e tere mmanụ, ghọtakwa na iso ha na-efe Chineke bụ ihe ùgwù.

2 Jizọs kwuru na ndị Chineke ga-adị n’otu otú ahụ Zekaraya onye amụma kwuru. Jizọs kpọrọ ndị nwere olileanya ịga eluigwe “ìgwè atụrụ nta,” kpọọkwa ndị nwere olileanya ibi n’ụwa “atụrụ ọzọ.” Ma, Jizọs kwuru na ha niile ga-abụ “otu ìgwè atụrụ, nweekwa otu onye ọzụzụ atụrụ.” (Luk 12:32; Jọn 10:16) Ebe ọ bụ na e nwere ìgwè abụọ, ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche, sị: (1) Ndị só n’atụrụ ọzọ hà kwesịrị ịma aha ndị niile e tere mmanụ taa? (2) Olee  otú ndị e tere mmanụ kwesịrị isi na-ele onwe ha anya? (3) Ọ bụrụ na onye ọgbakọ anyị amalite ịta achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs, olee otú m kwesịrị isi na-emeso ya? (4) M hụ na mmadụ ole na-ata achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs na-ebukwu ibu, ò kwesịrị ịna-echu m ụra? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.

ÀNYỊ KWESỊRỊ ỊMA AHA NDỊ NIILE BỤ́ NDỊ E TERE MMANỤ TAA?

3. Gịnị mere na ọ gaghị ekwe anyị omume ugbu a ịmata ndị ga-eso n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ?

3 Ndị só n’atụrụ ọzọ hà kwesịrị ịma aha ndị niile bụ́ ndị e tere mmanụ ka nọ́ n’ụwa taa? Mba. N’ihi gịnị? N’ihi na e nweghị otú mmadụ ga-esi mata ma onye nke ọ bụla n’ime ndị a e tere mmanụ ọ̀ ga-emecha nweta ụgwọ ọrụ ya. [1] (Gụọ ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.) Ọ bụ eziokwu na Chineke ahọrọla ha ka ha gaa eluigwe, naanị ihe ga-eme ka ha nweta ụgwọ ọrụ ha bụ ma ha kwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ. Setan ma nke a, ọ na-ejikwa “ndị amụma ụgha” na-agbalị ‘iduhie’ ha. (Matiu 24:24) Ndị e tere mmanụ agaghị ama ma hà ga-enweta ụgwọ ọrụ ha ruo mgbe Jehova ga-eme ka o doo ha anya na o kpebiela na ha ruru eru inweta ụgwọ ọrụ ha. Ọ bụ ya bụ akara ikpeazụ Jehova ga-aka ha. Ọ ga-aka ha ya tupu ha anwụọ ma ọ bụ tupu ‘oké mkpagbu’ ahụ amalite.—Mkpughe 2:10; 7:3, 14.

Ọ bụ Jizọs bụ Onye Ndú anyị, ọ bụkwa naanị ya ka anyị kwesịrị ịna-eso

4. Ọ bụrụ na anyị agaghị amatali aha ndị niile bụ́ ndị e tere mmanụ nọ́ n’ụwa taa, olee otú anyị ga-esi ‘soro’ ha?

4 Ọ bụrụ na o nweghị otú e si amata aha ndị niile bụ́ ndị e tere mmanụ nọ́ n’ụwa taa, oleekwanụ otú atụrụ ọzọ ga-esi ‘soro’ ha? Baịbụl kwuru na “ndị ikom iri” “ga-ejide uwe mwụda nke nwoke bụ́ onye Juu, sị, ‘Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.’” Amaokwu ahụ kwuru banyere otu onye Juu. Ma, “unu” o kwuru gosiri na ọ naghị ekwu banyere naanị otu onye. Ọ pụtara na onye Juu ahụ abụghị otu onye, kama ọ nọchiri anya ndị niile e tere mmanụ. Ndị só n’atụrụ ọzọ ma. Ọ bụ ya mere ha ji soro ndị e tere mmanụ na-efe Jehova. O nweghị uru ọ baara ha ịma aha onye ọ bụla só ná ndị e tere mmanụ ka ha sowe ya. Ọ bụ Jizọs bụ Onye Ndú anyị. Baịbụl gwakwara anyị na ọ bụ naanị ya ka anyị kwesịrị ịna-eso.—Matiu 23:10.

OLEE OTÚ NDỊ E TERE MMANỤ KWESỊRỊ ISI NA-ELE ONWE HA ANYA?

5. Olee ndụmọdụ ndị e tere mmanụ kwesịrị ichebasiri echiche ike? N’ihi gịnị?

5 Ndị e tere mmanụ kwesịrị ichesi echiche ike banyere ndụmọdụ dị́ ná 1 Ndị Kọrịnt 11:27-29. (Gụọ ya.) Olee otú onye e tere mmanụ nwere ike isi taa achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs “n’erughị eru”? Ọ bụrụ na ya na Jehova adịghị ná mma, ọ bụrụkwa na o kwesịghị ntụkwasị obi, ịta achịcha ahụ na ịṅụ mmanya ahụ ga-egosi na ọ naghị  akwanyere Jehova ùgwù. (Ndị Hibru 6:4-6; 10:26-29) Ndụmọdụ a na-eme ka ndị e tere mmanụ cheta na ha ga-ekwesị ntụkwasị obi ma ọ bụrụ na ha chọrọ inweta ụgwọ ọrụ ha, ya bụ, òkù Chineke si n’aka Kraịst Jizọs kpọọ ha ịga eluigwe.—Ndị Filipaị 3:13-16.

6. Olee otú ndị e tere mmanụ kwesịrị isi na-ele onwe ha anya?

6 Pọl gwara ndị e tere mmanụ, sị: “Ya mere, mụ onwe m, bụ́ onye mkpọrọ n’ime Onyenwe anyị, na-arịọsi unu ike ka unu na-eje ije n’ụzọ kwesịrị òkù ahụ a kpọrọ unu.” Olee otú ha kwesịrị isi eme ya? Pọl kwuru, sị: “N’ịdị umeala n’obi na ịdị nwayọọ zuru ezu, n’ogologo ntachi obi, jirikwa ịhụnanya na-ediri ibe unu ihe, na-agbasi mbọ ike ka unu nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.” (Ndị Efesọs 4:1-3) Mmụọ nsọ Jehova na-enyere ndị ohu ya aka ịdị umeala n’obi, ọ bụghị ịdị mpako. (Ndị Kọlọsi 3:12) Ndị e tere mmanụ anaghị eche na ha ka ndị ọzọ mma. Ha ma na ịbụ ndị e tere mmanụ apụtaghị na Jehova na-enye ha mmụọ nsọ karịrị nke ọ na-enye ndị ohu ya ndị ọzọ. Ha anaghị eche na ha na-aghọta eziokwu Baịbụl karịa onye ọ bụla ọzọ. Ha agaghịkwa agwa onye ọzọ na Chineke eteela ya mmanụ nakwa na o kwesịrị ịtawa achịcha na ịṅụ mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs. Kama ime otú ahụ, ha na-adị umeala n’obi, marakwa na ọ bụ naanị Jehova na-ahọrọ ndị ga-aga eluigwe.

7, 8. Gịnị ka ndị e tere mmanụ na-anaghị atụ anya ya? N’ihi gịnị?

7 Ọ bụ eziokwu na ndị e tere mmanụ ghọtara na ọ bụ ihe ùgwù na Chineke họọrọ ha ịga eluigwe, ha anaghị atụ anya ka ndị ọzọ na-akwanyere ha ùgwù pụrụ iche. (Ndị Efesọs 1:18, 19; gụọ Ndị Filipaị 2:2, 3.) Ha makwa na mgbe Jehova tere ha mmanụ, a maaraghị ya ụwa niile n’ọkwa. N’ihi ya, ọ gaghị eju onye e tere mmanụ anya ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị ekwetaghị ozugbo na ọ bụ onye e tere mmanụ. Ọ ma na Baịbụl gwara anyị na mmadụ kwuo na Chineke enyela ya ọrụ pụrụ iche, anyị ekwesịghị ikweta ngwa ngwa. (Mkpughe 2:2) Ebe ọ bụ na onye e tere mmanụ anaghị atụ anya ka ndị ọzọ na-akwanyere ya ùgwù pụrụ iche, ọ gaghị na-eme, ya hụhaala mmadụ, ya asị onye ahụ na ya bụ onye e tere mmanụ. O nwedịrị ike ọ gaghị agwawa ya mmadụ. Ọ gaghị eji ihe o nwere olileanya ime n’eluigwe na-etu ọnụ.—1 Ndị Kọrịnt 1:28, 29; gụọ 1 Ndị Kọrịnt 4:6-8.

8 Ndị e tere mmanụ anaghị eche na ọ bụ naanị ndị ọzọ e tere mmanụ ka ha na ha ga na-anọrị, ya adịzie ka hà nọ n’òtù. Ha anaghị achọwa ndị ọzọ sịrị na ha bụ ndị e tere mmanụ ka ha na ha kwuwe gbasara ịbụ ndị e tere mmanụ ma ọ bụ zukọwa na-amụ Baịbụl. (Ndị Galeshia 1:15-17) Ọgbakọ agaghị adị n’otu ma ọ bụrụ na ndị e tere mmanụ na-eme otú ahụ. Ime otú ahụ ga-egosi na ha na-alụso mmụọ nsọ ọgụ. Ọ bụ mmụọ nsọ ahụ ka Chineke ji enyere ndị ya aka inwe udo ma dịrị n’otu.—Gụọ Ndị Rom 16:17, 18.

OLEE OTÚ I KWESỊRỊ ISI NA-EMESO HA?

9. Gịnị mere i ji kwesị ịkpachara anya n’otú i si emeso ndị na-ata achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs? (Kwuo ihe dị́ n’igbe bụ́ “ Ịhụnanya ‘Adịghị Akpa Àgwà Na-ekwesịghị Ekwesị.’”)

9 Olee otú i kwesịrị isi na-emeso onye na-ata achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ  Jizọs? Jizọs sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “Unu niile bụ ụmụnna.” Ọ gwakwara ha, sị: “Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, onye ọ bụla nke na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.” (Matiu 23:8-12) N’ihi ya, ọ gaghị adị mma ka anyị na-ebuli nwanna elu, ọ bụrụgodị onye e tere mmanụ. Mgbe Baịbụl kwuru banyere ndị okenye, ọ gwara anyị ka anyị na-eṅomi okwukwe ha. Ma, ọ gwaghị anyị na anyị nwere ike ime mmadụ ọ bụla onye ndú anyị. (Ndị Hibru 13:7) Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kwuru na e kwesịrị inye ụfọdụ ndị “nsọpụrụ okpukpu abụọ,” ma ọ bụ n’ihi na ha “na-arụ ọrụ nlekọta n’ụzọ dị mma,” ‘na-arụsikwa ọrụ ike n’ikwu okwu na izi ihe,’ ọ bụghị n’ihi na ha bụ ndị e tere mmanụ. (1 Timoti 5:17) Ọ bụrụ na anyị na-enye ndị e tere mmanụ otuto na nsọpụrụ pụrụ iche, anyị ga-eme ka ihere mewe ha. Nke kadị njọ bụ na o nwere ike ime ka ha dịzie mpako. (Ndị Rom 12:3) O nweghị onye n’ime anyị chọrọ ime ihe ọ bụla nwere ike ime ka otu n’ime ụmụnna Kraịst e tere mmanụ kpawa ụdị àgwà ọjọọ ahụ.—Luk 17:2.

Olee otú i kwesịrị isi na-emeso onye na-ata achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 ruo nke 11)

10. Olee otú ị ga-esi gosi na ị na-akwanyere Ndị Kraịst e tere mmanụ ùgwù?

10 Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-akwanyere ndị Jehova tere mmanụ ùgwù? Anyị agaghị ajụwa ha otú ha si ghọọ ndị e tere mmanụ. Ọ bụ naanị ha ka ọ gbasara. N’ihi ya, anyị agaghị etinyewe ọnụ n’ihe na-agbasaghị anyị. (1 Ndị Tesalonaịka 4:11; 2 Ndị Tesalonaịka 3:11) Anyị ekwesịghịkwa iche na di ha ma ọ bụ nwunye ha, papa ha na mama ha, ma ọ bụ ndị ezinụlọ ha ndị ọzọ bụkwa ndị e tere mmanụ. Mmadụ anaghị esi n’ezinụlọ ya keta olileanya ya. (1 Ndị Tesalonaịka 2:12) Anyị ekwesịghịkwa ịjụwa ajụjụ nwere ike iwute ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, anyị ekwesịghị ịjụwa nwunye onye e tere mmanụ otú obi na-adị ya maka na di ya agaghị eso ya biri n’ụwa. A sị ka e kwuwe, obi kwesịrị isi anyị ike na n’ụwa ọhụrụ, Jehova ‘ga-ewere ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.’—Abụ Ọma 145:16.

11. Olee nsogbu anyị ga-agbara ọsọ ma ọ bụrụ na anyị anaghị ‘enwe mmasị n’ihe mmadụ bụ’?

11 Ọ bụrụ na anyị anaghị eme ndị e tere mmanụ ka hà ka ndị ọzọ, ọ ga-eme ka anyị gbaara nsogbu ọsọ. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Baịbụl gwara anyị na e nwere ike inwe “ụmụnna ụgha” n’ọgbakọ, ndị nwedịrị ike ịna-ekwu na ha bụ ndị e tere mmanụ. (Ndị Galeshia 2:4, 5; 1 Jọn 2:19) Ụfọdụ ndị e tere mmanụ nwekwara ike ịdapụ n’ọgbakọ. (Matiu 25:10-12; 2 Pita 2:20, 21) Ma ọ bụrụ na anyị anaghị ‘enwe mmasị n’ihe ndị mmadụ bụ,’ ụdị ndị ahụ agaghị eme ka anyị dapụ n’ọgbakọ. Okwukwe anyị agaghịkwa anyụ ka ọkụ ọ bụrụgodị na nwanna a ma ama ma ọ bụ onye ferela Jehova ọtụtụ afọ akwụsị ife ya.—Jud 16.

MMADỤ OLE NA-ATA ACHỊCHA Ò KWESỊRỊ ICHUWE ANYỊ ỤRA?

12, 13. Gịnị mere na mmadụ ole na-ata achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs ekwesịghị ịna-echu anyị ụra?

12 Ruo ọtụtụ afọ, mmadụ ole na-ata achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs nọ na-agbada agbada. Ma, n’oge na-adịbeghị anya, ha na-agbago kwa afọ. Ò kwesịrị ichuwe anyị ụra? Mba. Ka anyị tụlee ihe mere anyị ji zaa otú ahụ.

 13 “Jehova maara ndị bụ́ ndị ya.” (2 Timoti 2:19) Ndị na-agụkọ mmadụ ole na-ata achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs amaghị ndị bụ́ ndị e tere mmanụ n’eziokwu otú Jehova ma. N’ihi ya, ha na-agụnye ma ndị bụ́ ndị e tere mmanụ ma ndị na-abụghị. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-atabu achịcha mechara kwụsị. Ụfọdụ nwekwara ike ịbụ ndị isi na-akpakọchaghị ọnụ ma ọ bụ ndị nsogbu ọzọ mere ka ha chee na ha ga-eso Kraịst bụrụ eze n’eluigwe. O doro anya na anyị amaghị mmadụ ole n’ime ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa taa.

14. Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere mmadụ ole bụ́ ndị e tere mmanụ ga-anọ n’ụwa mgbe oké mkpagbu ga-amalite?

14 A ga-enwe ndị e tere mmanụ n’ọtụtụ ebe n’ụwa mgbe Jizọs ga-abịa ịkpọrọ ha gaa eluigwe. Baịbụl kwuru na Jizọs ‘ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya, ha ga-esikwa n’akụkụ anọ nke ụwa chịkọta ndị ọ họọrọ, site n’otu nsọtụ eluigwe ruo na nsọtụ ya nke ọzọ.’ (Matiu 24:31) Ihe Baịbụl kwukwara gosiri na n’oge ikpeazụ a, a ga-enwe mmadụ ole na ole bụ́ ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa. (Mkpughe 12:17) Ma o kwughị mmadụ ole n’ime ha ga-afọ n’ụwa mgbe oké mkpagbu ga-amalite.

15, 16. Gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta banyere otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ Jehova họọrọ?

15 Ọ bụ Jehova na-ekpebi mgbe ọ ga-ahọrọ ndị e tere mmanụ. (Ndị Rom 8:28-30) Jehova malitere ịhọrọ ndị e tere mmanụ mgbe ọ kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ. Ọ ga-abụ na ndị niile bụ́ ezigbo Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs bụ ndị e tere mmanụ. Ruo ọtụtụ narị afọ  malite mgbe ahụ, ọtụtụ n’ime ndị nọ́ na-ekwu na ha na-eso ụzọ Kraịst bụ Ndị Kraịst adịgboroja. Ma n’afọ ndị ahụ, Jehova tere mmadụ ole na ole bụ́ ezigbo Ndị Kraịst mmanụ. Ha yiri ọka wit ahụ Jizọs kwuru ga na-eto n’etiti ata. (Matiu 13:24-30) N’oge ikpeazụ a, Jehova ka na-ahọrọ ndị ga-eso n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. [2] (Gụọ ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.) N’ihi ya, ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịhọrọ ụfọdụ ndị tupu e bibie ụwa ochie a, ọ gaghị emewe anyị obi abụọ ma ihe ọ na-eme ọ̀ dịkwa mma. (Aịzaya 45:9; Daniel 4:35; gụọ Ndị Rom 9:11, 16.) [3] (Tụlee ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.) Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịkpa àgwà ka ndị ọrụ ahụ tamuru ntamu banyere otú nna ha ukwu si meso ndị malitere ịrụ ọrụ n’awa nke ikpeazụ.—Gụọ Matiu 20:8-15.

16 Ọ bụghị ndị niile nwere olileanya ịga eluigwe so ‘n’ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.’ (Matiu 24:45-47) Taa, Jehova na Jizọs si n’aka mmadụ ole na ole na-akụziri ọtụtụ ndị ihe otú ahụ ọ dị n’oge ndịozi. Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime Ndị Kraịst e tere mmanụ ka Jehova nyere mmụọ nsọ ide Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Taakwa, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime Ndị Kraịst e tere mmanụ ka Chineke si n’aka ha na-enye ndị ya ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị.’

17. Olee ihe ndị ị mụtara n’isiokwu a?

17 Olee ihe ndị anyị mụtara n’isiokwu a? Jehova ekpebiela na ya ga-eme ka ọtụtụ ndị ohu ya dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa, meekwa ka ndị ga-eso Jizọs chịa dịrị ndụ n’eluigwe. Ọ ga-akwụ ndị ohu ya niile ụgwọ ọrụ, ma ‘nwoke ahụ bụ́ onye Juu’ ma “ndị ikom iri” ahụ Zekaraya kwuru banyere ha. Jehova chọrọ ka ha niile na-erubere otu iwu ahụ isi ma jiri obi ha niile na-efe ya. Ha niile kwesịrị ịdị umeala n’obi, jirikwa otu obi na-ejere ya ozi. Ha kwesịkwara ịna-agbalịsi ike ka udo dịrị n’ọgbakọ. Ka ụwa ochie a na-agba egwú ụla ya, ka anyị niile nọsie ike n’ozi anyị na-ejere Jehova, bụrụkwa otu ìgwè atụrụ na-eso Kraịst.

^ [1] (paragraf nke 3) Ihe e kwuru n’Abụ Ọma 87:5, 6 gosiri na n’ọdịnihu, Chineke nwere ike ime ka a mata aha ndị niile ha na Jizọs na-achị n’eluigwe.—Ndị Rom 8:19.

^ [2] (paragraf nke 15) Ọ bụ eziokwu na ihe e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 2:33 gosiri na Jizọs na-enye aka n’ihe gbasara ite mmadụ mmanụ, ọ bụ Jehova na-ahọrọ ndị a ga-ete mmanụ.

^ [3] (paragraf nke 15) Ị chọọ ịhụ ebe a kọwakwuru ya, gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,” n’Ụlọ Nche May 1, 2007, peeji nke 30-31.