Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2016

Ozi Ọma Gị Ọ̀ Dị Ka Igirigi?

Ozi Ọma Gị Ọ̀ Dị Ka Igirigi?

OZI ỌMA anyị na-ekwusa dị mkpa, baakwa uru. Ma, ọ bụghị ndị niile anyị na-ezi ya ghọtara na ọ dị mkpa. Ọ bụrụgodị ndị nwere mmasị n’ihe Baịbụl kwuru, mgbe ụfọdụ, ha anaghị aghọta na ọ dị mkpa ka anyị na ha na-amụ Baịbụl.

Dị ka ihe atụ, otu nwoke aha ya bụ Gavin malitere ịbịa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ma, ọ chọghị ka a mụwara ya Baịbụl. O kwuru na ya amachaghị Baịbụl nakwa na ya achọghị ka ndị ọzọ mata na ya amachaghị Baịbụl. Ọ sịrị na ya achọghị ka a ghọgbuo ya ma ọ bụ tụwa anya ka ya na-abịa chọọchị. Gịnị ka i chere? È mechara nyere Gavin aka? Chegodị uru ihe Baịbụl na-akụzi nwere ike ịbara mmadụ. Jehova sịrị ndị Izrel: “Okwu m ga na-adasị dị ka igirigi, dị ka mmiri nke na-avụsị n’elu ahịhịa.” (Diuterọnọmi 31:19, 30; 32:2) Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ banyere igirigi ma jiri ya tụnyere ozi ọma anyị na-ekwusa, ka anyị nwee ike inyere “ụdị mmadụ niile” aka.—1 Timoti 2:3, 4.

 OLEE OTÚ OZI ỌMA ANYỊ GA-ESI DỊ́ KA IGIRIGI?

Igirigi na-ada nwayọọ nwayọọ. Igirigi na-esi n’urukpuru dị́ na mbara igwe ada nwayọọ nwayọọ. Olee otú okwu Jehova si “na-adasị dị ka igirigi”? O weturu obi, jiri obiọma gwa ndị ya okwu otú na-egosi na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi. Anyị na-eṅomi ya ma ọ bụrụ na anyị ana-akwanyere ihe ndị ọzọ kweere ùgwù. Anyị na-agba ha ume ka ha chebara ihe ha kweere echiche, jirikwa aka ha kpebie ihe ha ga-eme. Ọ bụrụ na anyị ana-egosi ndị mmadụ na anyị na-echere ha echiche ọma, ọ ga-eme ka ha kweta ihe anyị na-agwa ha, ozi ọma anyị na-ekwusa ana-abakwu uru.

Igirigi na-eme ka ahụ́ ruo ndị mmadụ ala. Ihe ga-eme ka ozi ọma anyị na-ekwusa mee ka ahụ́ ruo ndị mmadụ ala bụ ma anyị na-eche banyere ụzọ dị́ iche iche anyị ga-esi enyere ha aka ịmụta eziokwu Baịbụl. Onye mbụ gwara Gavin ka ya mụwara ya Baịbụl bụ otu nwanna aha ya bụ Chris. Ma, ọ manyeghị Gavin ka o kweta ịmụ ihe. Kama ime otú ahụ, o si n’ụzọ dị́ iche iche gbalịa ka ahụ́ rukwuo Gavin ala mgbe a na-ekwurịta gbasara Baịbụl. Chris gwara Gavin na e nwere otu ihe dị́ mkpa Baịbụl kwuru malite na Jenesis ruo Mkpughe nakwa na ịmata ihe a ga-enyere ya aka ịghọtakwu ihe a na-amụ n’ọmụmụ ihe. Chris gwaziri ya na amụma ndị e buru na Baịbụl mere ka ya kweta na ihe Baịbụl na-ekwu bụ eziokwu. Ihe a ọ gwara ya mere ka ha kwurịta ọtụtụ ugboro banyere otú amụma ndị e buru na Baịbụl si mezuo. Ihe ndị ha kwurịtara mere ka ahụ́ ruo Gavin ala, ya emechaa kweta ka a mụwara ya ihe.

Igirigi na-eme ka ihe a kụrụ akụ dị́ ndụ. N’oge ọkọchị n’Izrel, ebe niile na-ekpo ọkụ. E nwere ike ịnọcha ọtụtụ ọnwa, mmiri agaghị ezo. A sị na igirigi anaghị ada, ahịhịa na ihe a kụrụ akụ ga-akpọnwụ. Jehova buru amụma na n’oge anyị a, ọ ga-adị ka è nwere ụkọ mmiri ozuzo, ya bụ na akpịrị ga na-akpọ ndị mmadụ nkụ “ịnụ okwu Jehova.” (Emọs 8:11) O kwere nkwa na ndị e tere mmanụ “ga-adị ka igirigi nke si n’ebe Jehova nọ” ka ha na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, “atụrụ ọzọ” ana-akwado ha. (Maịka 5:7; Jọn 10:16) Ozi ọma anyị na-ekwusa so ná ndokwa Jehova mere iji mee ka ndị eziokwu Baịbụl na-agụsi ike nweta ndụ. Ànyị ji ozi ọma a kpọrọ ihe?

Igirigi bụ ngọzi sí n’aka Jehova. (Diuterọnọmi 33:13) Ozi ọma anyị na-ekwusa nwere ike ịbụrụ ndị nabatara ya ngọzi. Ịmụ Baịbụl bụụrụ Gavin ngọzi maka na o nyeere ya aka ịmata azịza ajụjụ niile ọ na-ajụ. O mewere nke ọma n’egbughị oge, e mee ya baptizim. Ugbu a, obi na-adị ya na nwunye ya bụ́ Joyce ụtọ izi ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke.

Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile

JIRI OZI ỌMA GỊ KPỌRỌ IHE

Iji ozi ọma anyị na-ekwusa tụnyere igirigi nwekwara ike inyere anyị aka ịghọta na mbọ anyị na-agba n’ozi ọma bara uru. Olee otú o si baa uru? Ọ bụrụ na mmiri atasa n’ala ugboro ole na ole, o nweghị ezigbo uru ọ ga-aba. Ma, ọ bụrụ na o zosie ike, ọ ga-ede ala nke ọma. Otú ahụ ka ozi ọma anyị na-ekwusa dị. O nwere ike ịdị anyị ka ozi ọma anyị na-ekwusa enweghị ihe ọ bụ. Ma, mbọ niile ọtụtụ nde ndị ohu Jehova na-agba na-eme ka ọ bụrụ àmà “nye mba niile.” (Matiu 24:14) Ozi ọma anyị na-ekwusa ọ̀ ga-abụrụ ndị ọzọ ngọzi sí n’aka Jehova? Ee, ma ọ bụrụ na ozi ọma anyị adị ka igirigi nke na-ada nwayọọ nwayọọ, na-eme ka ahụ́ ruo mmadụ ala, na-emekwa ka ihe a kụrụ akụ dị́ ndụ.