Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2016

“Ka Ntachi Obi Rụzuo Ọrụ Ya”

“Ka Ntachi Obi Rụzuo Ọrụ Ya”

“Ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya, ka unu wee zuo ezu, gbasiekwa ike n’ụzọ niile, n’enweghị ihe ọ bụla kọrọ unu.”—JEMS 1:4.

ABỤ: 135, 139

1, 2. (a) Olee ihe anyị ga-amụta n’otú Gidiọn na narị ndị ikom atọ ya si tachie obi? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Dị ka e kwuru na Luk 21:19, gịnị mere ntachi obi ji dị́ ezigbo mkpa?

CHEGODỊ mgbe Gidiọn du ndị agha Izrel gaa ịlụso ndị iro ha ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ ma na-agwụ ike. Gidiọn na ndị ikom ya chụ ndị Midian na ndị na-akwado ha ruo ihe dị́ ka iri kilomita atọ na abụọ, chụgide ha ruo mgbe chi bọrọ. Baịbụl kọọrọ anyị ihe ọzọ merenụ. Ọ sịrị: “E mesịa, Gidiọn bịarutere Jọdan, gafee ya, ya na narị ndị ikom atọ so ya, ike gwụrụ ha.” Ma, ha emeribeghị n’agha ahụ. Ha ka ga-alụso puku ndị agha iri na ise ọgụ, bụ́ ndị nọ́ na-emegbu ndị Izrel kemgbe ọtụtụ afọ. N’ihi ya, Gidiọn na ndị agha ya agaghị ada mbà. Ọ bụ ya mere ha ji chụrụ ndị iro ha ahụ na-aga, mechaa merie ha.—Ndị Ikpe 7:22; 8:4, 10, 28.

2 Anyịnwa na-alụkwa ọgụ tara akpụ ma na-agwụ ike. Ndị iro anyị na-alụso ọgụ bụ ma Setan ma ụwa ya ma ezughị okè anyị. Ụfọdụ n’ime anyị alụọla ọgụ a ọtụtụ afọ. Jehova enyerela anyị aka imeri ọtụtụ mgbe. Ma, anyị emeribeghị n’ọgụ nke ikpeazụ. Mgbe ụfọdụ, ike ịlụ ọgụ ahụ na ike ichere ọgwụgwụ ụwa ochie a nwere ike ịgwụwa anyị. Jizọs dọrọ  anyị aka ná ntị na n’oge ikpeazụ a, ọnwụnwa siri ike ga-abịara anyị nakwa na a ga na-emegide anyị. Ma, o kwukwara na anyị ga-emeri ma ọ bụrụ na anyị atachie obi. (Gụọ Luk 21:19.) Gịnị bụ ntachi obi? Olee ihe ga-enyere anyị aka ịtachi obi? Gịnị ka anyị ga-amụta n’aka ndị tachiri obi? Oleekwa otú anyị ga-esi kwe “ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya”?—Jems 1:4.

GỊNỊ BỤ NTACHI OBI?

3. Gịnị bụ ntachi obi?

3 Na Baịbụl, ntachi obi apụtaghị naanị idi nsogbu ma ọ bụ mmadụ iwere ụwa ya otú o si hụ ya. Ọ gbasara otú anyị si ele ọnwụnwa bịaara anyị anya na otú obi dị anyị maka ya. Ntachi obi na-enyere anyị aka inwe obi ike, ikwesị ntụkwasị obi, na inwe ndidi. Otu akwụkwọ kwuru na ntachi obi bụ àgwà na-enyere anyị aka inwe olileanya siri ike ma ghara ịda mbà ma ọnwụnwa bịara anyị. Ọ na-enyere anyị aka iguzosi ike ma kwụrụ chịm ọ bụrụgodị na ọnwụnwa tara akpụ abịara anyị. Ntachi obi ga-eme ka anyị lee ọnwụnwa ndị ahụ anya ka mmeri ma lekwasị anya n’ihe anyị na-achụ, ọ bụghị n’ahụhụ anyị na-ata.

4. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ọ bụ ịhụnanya na-eme ka anyị na-atachi obi?

4 Ịhụnanya na-eme ka anyị na-atachi obi. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 13:4, 7.) Olee ihe ụfọdụ anyị ga-atachi obi na ha? Otú anyị si hụ Jehova n’anya ga-eme ka anyị na-edi ihe ọ bụla o kwere ka o mee. (Luk 22:41, 42) Ịhụnanya anyị hụrụ ụmụnna anyị ga-enyere anyị aka ịna-edi ezughị okè ha. (1 Pita 4:8) Otú anyị si hụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị n’anya ga-enyere anyị aka ịna-edi “mkpagbu” ndị di na nwunye na-enwe n’agbanyeghị na ha na-enwe obi ụtọ. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịna-agba mbọ ka anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị na-adịkwu ná mma.—1 Ndị Kọrịnt 7:28.

OLEE IHE GA-ENYERE GỊ AKA ỊNA-ATACHI OBI?

5. Gịnị mere o ji bụrụ Jehova kacha kwesị inyere anyị aka ịtachi obi?

5 Na-arịọ Jehova ka o nye gị ike. Jehova bụ “Chineke onye na-enye ntachi obi na nkasi obi.” (Ndị Rom 15:5) Ọ bụ naanị ya na-aghọta ihe niile banyere ọnọdụ anyị, otú obi dị anyị, na otú e si zụọ anyị. N’ihi ya, ọ ma ihe ga-enyere anyị aka ịna-atachi obi. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ ga-emere ndị na-atụ egwu ya ihe na-agụ ha, ọ ga-anụkwa mkpu enyemaka ha na-eti, ọ ga-azọpụtakwa ha.” (Abụ Ọma 145:19) Ma, olee otú Chineke ga-esi zaa ekpere anyị na-ekpe ka o nye anyị ike anyị ga-eji tachie obi?

Ebe Jehova na-aghọta ihe niile banyere anyị, ọ ma ihe ga-enyere anyị aka ịna-atachi obi

6. Ọnwụnwa bịara anyị, olee otú Chineke nwere ike isi ‘meere anyị ụzọ mgbapụ’ otú ahụ o kwere nkwa na Baịbụl?

6 Jehova kwere nkwa ‘imere anyị ụzọ mgbapụ’ ma anyị rịọ ya ka o nyere anyị aka ịtachi obi. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:13.) Olee otú o si eme ya? Mgbe ụfọdụ, o nwere ike iwepụ ọnwụnwa bịaara anyị. Ma, ọtụtụ mgbe, ọ na-enye anyị ike ka anyị nwee ike ‘ịtachi obi n’ụzọ zuru ezu, jirikwa ọṅụ na-enwe ogologo ntachi obi.’ (Ndị Kọlọsi 1:11) Ebe ọ bụ na ọ ma  ihe anyị na-agaghị emeli na ihe anyị na-agaghị edili, ọ gaghị ekwe ka ọnwụnwa bịaara anyị sie ike nke na anyị agaghị ekwesịli ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ.

7. Nye ihe atụ na-egosi ihe mere nri ime mmụọ ga-eji mee ka anyị na-atachi obi.

7 Jiri nri ime mmụọ mee ka okwukwe gị sikwuo ike. Gịnị mere nri ime mmụọ ji dị́ mkpa? Chegodị banyere ihe atụ a: Ugwu Evarest bụ ugwu kacha elu n’ụwa. Mmadụ chọọ ịrị ya, nri ọ ga-eri otu ụbọchị ga-aha ka nri o kwesịrị iri abalị atọ ma ọ bụ anọ. Onye chọrọ ịtachi obi ma rịchaa ugwu ahụ kwesịrị iri nri ga-eme ka o nwee ume. Otú ahụ ka ọ dị anyị. Anyị kwesịrị ịna-eriju nri ime mmụọ afọ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-atachi obi ma nweta ihe anyị na-agba ọsọ ya. Anyị kwesịrị ikpebisi ike iwepụta oge anyị ga-eji na-amụ ihe nke onwe anyị, na-agakwa ọmụmụ ihe. Ihe ndị a ga-eme ka anyị mụta ihe ga-eme ka okwukwe anyị sie ike.—Jọn 6:27.

8, 9. (a) Dị ka e kwuru na Job 2:4, 5, olee ihe dị́ ezigbo mkpa mgbe ọnwụnwa bịaara anyị? (b) Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara gị, olee ihe a na-anaghị ahụ anya i nwere ike icheta?

8 Na-echeta na i kpebiri ịna-erubere Chineke isi. Ọnwụnwa bịara anyị, ọ bụghị naanị na ọ ga-eme ka anyị taa ahụhụ, ọ ga-emekwa ka a mata ma ànyị na-erubere Chineke isi. Ihe anyị mere mgbe ọnwụnwa bịaara anyị ga-egosi ma ànyị kwetara na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa. Olee otú ọ ga-esi egosi ya? Setan bụ onye iro Chineke, ọ na-alụsokwa ọchịchị Chineke ọgụ. Ọ kparịrị Jehova ma kwuo na ndị mmadụ na-efe Chineke naanị maka ihe ọma ọ na-emere ha. Setan sịrị: “Ihe ọ bụla mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ mkpụrụ obi ya.” Setan kwuru banyere Job, sị: “Iji nwee ihe dị iche, biko, matịa aka gị metụ ọbụna ọkpụkpụ ya na anụ ahụ́ ya, lee ma ọ́ gaghị akọcha gị n’ihu gị.” (Job 2:4, 5) Setan ọ̀ gbanweela kemgbe o kwuchara ihe a? Mbanụ. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, ya bụ, mgbe a chụpụrụ ya n’eluigwe, ọ ka nọkwa na-ebo ndị jí obi ha niile na-efe Chineke ebubo mgbe niile. (Mkpughe 12:10) Taa, Setan ka na-ekwu na ihe mere ndị mmadụ ji na-efe Chineke bụ maka ihe Chineke na-emere ha. Ọ chọsiri ike ka anyị jụ ọchịchị Chineke ma kwụsị ijere ya ozi.

9 Ọ bụrụ na ị tawa ahụhụ ma ọnwụnwa bịara gị, weregodị ya na ị na-ahụ ihe a na-agaghị ejili anya nkịtị ahụ. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya nọ n’otu akụkụ. Ha na-ele ka ha hụ ihe ị ga-eme, na-ekwukwa na ị ga-ada mbà. Jehova nọ n’akụkụ nke ọzọ, ya na Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst, ndị e tere mmanụ a kpọliterela n’ọnwụ, na ọtụtụ puku ndị mmụọ ozi. Ha na-ahụkwa ka ị na-agba mbọ, ma ha na-asị gị jisie ike. Obi dị ha ụtọ na ị na-atachi obi ma na-erubere Jehova isi. Ị nụziri ka Jehova sịrị gị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.”—Ilu 27:11.

Jizọs lekwasịrị anya n’uru ntachi obi ya ga-aba

10. Olee otú ị ga-esi lekwasị anya n’uru ntachi obi ga-aba otú ahụ Jizọs mere?

10 Lekwasị anya n’ụgwọ Chineke ga-akwụ gị. Weregodị ya na e nwere obodo  i ji ụkwụ na-aga. Mgbe ị nọ n’ụzọ, e nwere ebe yiri ọgba ị ga-esirịrị gafee. Ebe ahụ toro ogologo, gbaakwa ọchịchịrị. Ma, ị ma na ị́ gagide ruo n’isi, ị ga-ahụwakwa ìhè. E nwere ike iji ndụ anyị dị ugbu a tụnyere ụdị njem ahụ. Nsogbu bịaara gị nwere ike isi ezigbo ike, ya adị gị ka nsogbu nke gị ọ̀ karịala. Ị manụ na o nwere mgbe ọ dị Jizọs otú ahụ. Mgbe a kpọgidere ya n’elu osisi ịta ahụhụ, e menyere ya ihere, taakwa ya ezigbo ahụhụ. Oge ahụ nwere ike ịbụ oge kacha siere ya ike. Olee ihe nyeere ya aka ịtachi obi? Baịbụl sịrị na o legidere anya ‘n’ọṅụ e debere n’ihu ya.’ (Ndị Hibru 12:2, 3) Jizọs lekwasịrị anya n’uru ntachi obi ya ga-aba. Nke kacha mkpa bụ na ọ ga-eso mee ka e doo aha Chineke nsọ ma kwado na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị. Ọ ma na ọnwụnwa ahụ agaghị adịte aka, ma ụgwọ ọrụ a ga-enye ya n’eluigwe ga-adịru mgbe ebighị ebi. Taa, ọnwụnwa ndị na-abịara gị nwere ike ịna-ebu gị aka, na-ewutekwa gị. Ma, cheta na ha agaghị adịte aka.

“NDỊ TACHIRI OBI”

11. Gịnị mere anyị ji kwesị ịtụle ihe “ndị tachiri obi” mere?

11 Ọ bụghị naanị anyịnwa na-atachi obi. Mgbe Pita onyeozi chọrọ ịgba Ndị Kraịst ume ka ha tachie obi n’ọtụtụ ọnwụnwa sí n’aka Setan, o dere, sị: “Guzogidenụ ya, sienụ ike n’okwukwe, ebe unu maara na òtù ụmụnna unu niile ndị nọ n’ụwa na-ata ụdị ahụhụ a unu na-ata.” (1 Pita 5:9) Ihe Baịbụl kọrọ banyere “ndị tachiri obi” na-akụziri anyị otú anyị ga-esi kwesị ntụkwasị obi. Ọ na-eme ka obi sie anyị ike na anyị ga-atachili obi, na-echetakwara anyị na Chineke ga-agọzi anyị ma anyị na-erubere ya isi. (Jems 5:11) Ka anyị mụọ banyere ụfọdụ n’ime ndị tachiri obi. [1]—Gụọ ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.

12. Olee ihe ndị anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ndị cherọb nọ́ n’ogige Iden mere?

12 Ndị cherọb bụ ndị mmụọ ozi ọkwá ha dị elu. Mgbe Adam na Iv mehiechara, Jehova nyere ụfọdụ ndị cherọb ọrụ ọhụrụ n’ụwa. Ọ dị ezigbo iche n’ọrụ ha na-arụ mgbe ha nọ n’eluigwe. Ihe ha mere nwere ike ịkụziri anyị otú anyị ga-esi na-atachi obi ma é nye anyị ọrụ siri ike. Baịbụl kwuru na Jehova mere “ka ndị cherọb nọrọ n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ogige Iden, debekwa mma agha nke ihu ya na-egbukepụ ọkụ, nke nọ na-echigharị onwe ya iji na-eche ụzọ e si abanye n’ebe osisi nke ndụ ahụ dị nche.” [2] (Gụọ ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.) (Jenesis 3:24) Baịbụl ekwughị na ndị cherọb ahụ tamuru ntamu ma ọ bụ chee na ha akarịala ọrụ ahụ e nyere ha. Ike ya agwụghị  ha. Ha adaghịkwanụ mbà. Kama, ha rụgidere ọrụ ahụ ruo mgbe ha rụchara ya, nke nwere ike ịbụ n’oge Iju Mmiri, ya bụ, mgbe ihe karịrị otu puku afọ na narị isii gachara.

13. Olee ihe mere ka Job nwee ike ịtachi obi n’ọnwụnwa bịaara ya?

13 Job, bụ́ onye ezi omume. O nwere ike iwute gị mgbe ụfọdụ ma enyi gị ma ọ bụ onye ezinụlọ unu gwa gị okwu ọjọọ. O nwekwara ike ịbụ na ị na-arịa ezigbo ọrịa ma ọ bụ na-eru uju n’ihi na onye ị hụrụ n’anya nwụrụ. N’agbanyeghị ihe merenụ, ihe Job mere nwere ike ịkasi gị obi. (Job 1:18, 19; 2:7, 9; 19:1-3) Job amaghị ihe mere ọtụtụ ọnwụnwa ji bịara ya. Ma, ọ daghị mbà. Olee ihe nyeere ya aka ịtachi obi? Nke mbụ bụ na ọ hụrụ Jehova n’anya, ọ chọghịkwa ime ihe ga-ewe ya iwe. (Job 1:1) Job chọrọ ime ihe dị́ Chineke mma, ma mgbe ihe dị mma ma mgbe nsogbu bịara. Ihe ọzọ bụ na Jehova nyeere Job aka ịghọta ike ya. Otú o si mee ya bụ ịgwa Job banyere ihe ụfọdụ dị́ ebube o kere. Ihe a mere ka obi sikwuo Job ike na Jehova ga-eme ka ọnwụnwa ndị bịaara ya bie mgbe oge ruru. (Job 42:1, 2) Ọ bụ ihe mechara mee. Jehova wepụrụ nsogbu Job, meekwa ka o nwee ihe ndị o nwere na mbụ. ‘Jehova nyeghachiri Job ihe niile o nwere, okpukpu abụọ.’ Job “mere agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ.”—Job 42:10, 17.

14. Dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 1:6, olee otú ntachi obi Pọl si nyere ndị ọzọ aka?

14 Pọl onyeozi. À na-emegide gị ma ọ bụ na-akpagbu gị? Ọ bụrụ na ị bụ okenye ọgbakọ ma ọ bụ onye nlekọta sekit, ọtụtụ ọrụ ị na-arụ hà na-agwụ gị ike? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe Pọl mere nwere ike inyere gị aka. A kpagburu Pọl nke ukwuu, ya ana-echegbukwa onwe ya mgbe niile banyere ụmụnna nọ́ n’ọgbakọ dị́ iche iche. (2 Ndị Kọrịnt 11:23-29) Ma, Pọl adaghị mbà. Ihe o mere mere ka okwukwe ndị ọzọ sikwuo ike.  (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:6.) Otú i si atachi obi nwekwara ike ịgba ndị ọzọ ume ịtachi obi.

NTACHI OBI Ọ̀ ‘GA-ARỤZU ỌRỤ YA’ N’EBE Ị NỌ?

15, 16. (a) Olee “ọrụ” ntachi obi ga-arụzurịrị? (b) Nye ihe atụ na-egosi otú anyị ga-esi kwe “ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya.”

15 Jems, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya, ka unu wee zuo ezu, gbasiekwa ike n’ụzọ niile, n’enweghị ihe ọ bụla kọrọ unu.” (Jems 1:4) Olee otú ntachi obi ga-esi rụzuo “ọrụ” ya n’ebe anyị nọ? Ọnwụnwa bịaara anyị nwere ike ime ka anyị mata na anyị kwesịrị ịna-enwekwu ndidi, na-enwekwu obi ụtọ maka ihe e meere anyị, ma ọ bụ na-ahụkwu ndị ọzọ n’anya. Ka anyị na-atachi obi n’ọnwụnwa ahụ, anyị ga-amụtakwu àgwà ndị a, sí otú ahụ mee ka anyị na-akpakwu àgwà ka Ndị Kraịst.

Ịtachi obi n’ọnwụnwa ga-eme ka anyị na-akpakwu àgwà ka Ndị Kraịst (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16)

16 Ebe ọ bụ na ntachi obi nwere ike ime ka anyị na-akpakwu àgwà ka Ndị Kraịst, anyị agaghị achọ imebi iwu Jehova naanị iji mee ka ọnwụnwa bịaara anyị bie. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ echiche rụrụ arụ ka gị na ya na-alụ, ekwela ka a nwata gị. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịjụ echiche ahụ na-ezighị ezi. È nwere onye ezinụlọ unu na-emegide gị? Adala mbà. Kpebisie ike na ị ga na-efe Jehova. I mee otú ahụ, ị ga-atụkwasịkwu Jehova obi. Cheta na anyị ga-atachirịrị obi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị́ Chineke mma.—Ndị Rom 5:3-5; Jems 1:12.

17, 18. (a) Nye ihe atụ na-egosi na ọ dị mkpa ịtachi obi ruo ọgwụgwụ. (b) Ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru n’ike n’ike, gịnị kwesịrị ime ka obi sie anyị ike?

17 Anyị kwesịrị ịtachi obi ruo ọgwụgwụ, ọ bụghị ruo naanị obere oge. Chegodị banyere ụgbọ mmiri jí nwayọọ nwayọọ na-ekpu. Ọ bụrụ na ndị nọ́ n’ime ya achọghị ịnwụ, ha ga-egwuru mmiri ruo n’akụkụ osimiri ahụ. Mmadụ daa mbà ozugbo o bidoro igwu mmiri ahụ, mmiri ga-eri ya. Ọ bụrụkwa na ike agwụ mmadụ ma ọ́ fọ obere ka o gwuruo n’akụkụ osimiri ahụ, mmiri ga-erikwa ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ibi n’ụwa ọhụrụ, anyị kwesịrị ịna-atachi obi. Ka anyị nwee ụdị obi ahụ Pọl onyeozi nwere. Ọ sịrị: “Anyị adịghị ada mbà.”—2 Ndị Kọrịnt 4:1, 16.

18 Obi siri anyị ike otú o siri Pọl na Jehova ga-enyere anyị aka ịtachi obi ruo ọgwụgwụ. Pọl dere, sị: “Anyị na-enwe mmeri n’ụzọ zuru ezu site n’aka onye ahụ nke hụrụ anyị n’anya. N’ihi na ekwetara m na ọnwụ ma ọ bụ ndụ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị gaje ịbịa ma ọ bụ ike ma ọ bụ ịdị elu ma ọ bụ ịdị omimi ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke nke o gosiri site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 8:37-39) N’eziokwu, ike na-agwụ anyị mgbe ụfọdụ. Ma, ka anyị na-eme ka Gidiọn na ndị ikom ya. Ike gwụrụ ha, ma ha adaghị mbà. Ha “nọ na-achụ ndị iro ha.”—Ndị Ikpe 8:4.

^ [1] (paragraf nke 11) Ihe ọzọ ga-agba gị ume bụ ịgụ otú ndị Chineke n’oge anyị a si tachie obi. Dị ka ihe atụ, Akwụkwọ Mgbaafọ (Bekee) nke 1992, 1999, na 2008 kọrọ ihe na-agba ume banyere ụmụnna anyị nọ́ n’Itiopia, Malawi, na Rọshịa.

^ [2] (paragraf nke 12) Baịbụl ekwughị ndị cherọb ole e nyere ọrụ ahụ.