Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2016

Ikwesị Ntụkwasị Obi Ga-eme Ka Chineke Gọzie Anyị

Ikwesị Ntụkwasị Obi Ga-eme Ka Chineke Gọzie Anyị

“Bụrụnụ ndị na-eṅomi ndị ahụ sitere n’okwukwe na ndidi na-eketa nkwa ndị e kwere.”—NDỊ HIBRU 6:12.

ABỤ: 86, 54

1, 2. Olee ihe na-adịrịghị Jefta na ada ya mfe?

OTU nwa agbọghọ ji ọsọ gaa zute nna ya. Obi dị ya ezigbo ụtọ ịhụ na ọ lọtara n’udo n’agha ọ gara lụọ. Otú nna ya si merie n’agha ahụ mere ka ọ bụwa abụ ma jiri ọṅụ na-agba egwú. Ma, ọ ga-abụrịrị na ihe ọzọ nna ya mere na ihe o kwuru juru ya anya. Nna ya dọwara uwe ya, tie mkpu, sị: “Ewoo, ada m! I meela ka obi gbawaa m.” Ọ gwaziri ada ya na ya ekwela Jehova nkwa nke ga-agbanwe ndụ ada ya ruo mgbe ebighị ebi. Nkwa ahụ o kwere pụtara na ada ya agaghị alụ di ma ọ bụ mụta nwa. Ma, ozugbo ahụ, ada Jefta zara nna ya ihe magburu onwe ya, gbaa ya ume ka o mezuo nkwa ahụ o kwere Jehova. Ihe ahụ ọ zara gosiri na obi siri ya ezigbo ike na ihe ọ bụla Jehova chọrọ ka o mee ga-adị mma. (Ndị Ikpe 11:34-37) Mgbe nna ya hụrụ na o nwere okwukwe, ọ ṅụrịrị ọṅụ n’ihi na ọ ma na otú o si kweta ime uche Jehova ga-eme Jehova obi ụtọ.

 2 Jefta na ada ya tụkwasịrị Jehova na otú o si eme ihe obi. Ha rubeere Jehova isi, ma mgbe ọ na-adịrịghị ha mfe. Ha chọrọ ime ihe dị́ Jehova mma. Ihe ọ bụla ha hapụrụ iji mee ya efughịkwa ọhịa.

3. Olee otú ihe Jefta na ada ya mere ga-esi baara anyị uru taa?

3 Ọ naghị adị mfe mgbe niile ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ. Anyị kwesịrị ‘ịlụsi ọgụ ike maka okwukwe ahụ.’ (Jud 3) Iji nyere anyị aka ime otú ahụ, ka anyị tụlee otú Jefta na ada ya si merie ọtụtụ ihe siiri ha ike. Olee otú ha si kwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ?

IKWESỊ NTỤKWASỊ OBI N’AGBANYEGHỊ ÀGWÀ ỌJỌỌ JURU N’ỤWA

4, 5. (a) Olee iwu Jehova nyere ndị Izrel mgbe ha banyere n’Ala Nkwa ahụ? (b) Olee ihe Abụ Ọma nke 106 kwuru mere ndị Izrel n’ihi nnupụisi ha?

4 O nwere ike ịbụ na kwa ụbọchị, Jefta na ada ya nọ na-echeta nsogbu dị́ iche iche inupụrụ Jehova isi kpataara ndị Izrel. Ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ narị afọ atọ tupu mgbe ahụ, Jehova nyere ndị Izrel iwu ka ha gbuo ndị niile na-ekpere arụsị n’Ala Nkwa ahụ. Ma, ha emeghị otú ahụ. (Diuterọnọmi 7:1-4) Ọtụtụ ndị Izrel malitere ịna-eme ka ndị Kenan, bụ́ ndị na-efe arụsị ma na-eme omume rụrụ arụ.—Gụọ Abụ Ọma 106:34-39.

5 N’ihi nnupụisi ndị Izrel, Jehova echebeghị ha n’aka ndị iro ha. (Ndị Ikpe 2:1-3, 11-15; Abụ Ọma 106:40-43) Ọ ga-abụrịrị na o siiri ezinụlọ ndị hụrụ Jehova n’anya ike ikwesị ntụkwasị obi n’afọ ndị ahụ tara akpụ. Ma, Baịbụl kwuru na e nwere ndị kwesịrị ntụkwasị obi, dị́ ka Jefta na ada ya, nakwa Elkena, Hana, na Samuel. Ha kpebisiri ike ime Jehova obi ụtọ.—1 Samuel 1:20-28; 2:26.

6. Olee àgwà ọjọọ ndị mmadụ na-akpa n’ụwa taa? Gịnị ka anyị kwesịrị ime?

6 N’oge anyị a, ndị mmadụ na-eche echiche ka ndị Kenan, na-akpakwa àgwà ka ha. Ihe bụ́ mkpa ha bụ inwe mmekọahụ, tigbuo zọgbuo, na ịchụ ego. Ma, aka ná ntị Jehova na-adọ anyị doro anya. Ọ chọrọ ichebe anyị otú ahụ ọ chọrọ ichebe ndị Izrel oge ochie ka ha ghara ịmụta àgwà ọjọọ. Ànyị ga-amụta ihe n’ihe ndị ha mejọrọ? (1 Ndị Kọrịnt 10:6-11) Anyị kwesịrị ime ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị ghara ịna-eche echiche ka ndị ụwa. (Ndị Rom 12:2) Ànyị ga-agbalịsi ike ime otú ahụ?

JEFTA KWESỊRỊ NTỤKWASỊ OBI N’AGBANYEGHỊ IHE NDỊ WUTERE YA

7. (a) Olee ihe ọjọọ ndị obodo Jefta mere ya? (b) Gịnị ka Jefta mere?

7 N’oge Jefta, ndị Filistia na ndị Amọn nọ na-emegbu ndị Izrel n’ihi na ha nupụụrụ Jehova isi. (Ndị Ikpe 10:7, 8) E wezụga nsogbu sí n’aka mba ndị iro ha, nsogbu ọzọ Jefta nwere si n’aka ụmụnne ya na ndị ndú Izrel. Anyaụfụ ụmụnne ya na-emere ya na asị ha kpọrọ ya mere ka ha chụpụ ya n’ala nna ya. (Ndị Ikpe 11:1-3) Jefta ekweghị ka obi ọjọọ ha mee ka ọ kpọọ ha asị. Olee otú anyị si mara? Ọ bụ n’ihi na mgbe ndị okenye  Izrel rịọrọ ya ka ọ bịa nyere ha aka, o mere otú ahụ ozugbo. (Ndị Ikpe 11:4-11) Gịnị nwere ike ịbụ ihe mere Jefta ji meere ha ihe ha rịọrọ ya?

8, 9. (a) Olee ihe ndị e kwuru n’Iwu Mozis nwere ike ịbụ ihe nyeere Jefta aka? (b) Olee ihe kacha Jefta mkpa?

8 Jefta bụ dike n’agha, marakwa Iwu Mozis na akụkọ banyere ndị Izrel nke ọma. Otú Jehova si meso ndị ya mere ka ọ mata ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ n’anya Chineke. (Ndị Ikpe 11:12-27) Jefta ji ihe ahụ ọ matara kpebie ihe ndị o mere. Ọ ma otú obi na-adị Jehova ma mmadụ wewe iwe ma megwara ihe ọjọọ e mere ya nakwa otú Chineke chọrọ ka ndị ya sí hụ ibe ha n’anya. Iwu Mozis kụzikwaara ya otú o kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ, ọ bụrụgodị ndị kpọrọ ya asị.—Gụọ Ọpụpụ 23:5; Levitikọs 19:17, 18.

9 Ọ ga-abụ na àgwà ọma Josef kpara nyeere Jefta aka. Ọ ga-abụrịrị na ọ mụtara otú Josef si meere ụmụnne ya ebere n’agbanyeghị asị ha kpọrọ ya. (Jenesis 37:4; 45:4, 5) O nwere ike ịbụ na iche banyere ihe ahụ Josef mere nyeere Jefta aka ime ihe dị́ Jehova mma. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ụmụnne Jefta mere wutere ya. Ma, ịlụrụ aha Jehova na ndị ya ọgụ dị ya mkpa karịa otú obi dị ya. (Ndị Ikpe 11:9) O kpebisiri ike ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ. Ọ bụ ya mere Jehova ji gọzie ya na ndị Izrel.—Ndị Hibru 11:32, 33.

Anyị ekwesịghị ikwe ka iwe na-ewe anyị mee ka anyị kwụsị ife Jehova

10. Gịnị ka anyị ga-eme iji gosi na ihe Jehova na-akụziri anyị na-enyere anyị aka ịna-akpa àgwà ka Ndị Kraịst taa?

10 Ànyị ga-amụta ihe n’ihe Jefta mere? Gịnị ka anyị ga-eme ma ụmụnna anyị mee ihe wutere anyị, ma ọ bụ ma anyị chee na ihe ha mere anyị adịghị mma? Anyị ekwesịghị ikwe ka iwe na-ewe anyị mee ka anyị kwụsị ife Jehova. Akwụsịla ịga ọmụmụ ihe ma ọ bụ iso ọgbakọ na-akpakọrịta. Ka anyị mee ka Jefta ma rubere Jehova isi. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka imeri nsogbu ndị siri ike, ka anyị nwee ike ịbụ ndị e ji ama atụ.—Ndị Rom 12:20, 21; Ndị Kọlọsi 3:13.

ỊHAPỤ IHE ỤFỌDỤ MAKA OZI JEHOVA GA-EGOSI NA ANYỊ NWERE OKWUKWE

11, 12. Olee nkwa Jefta kwere? Gịnị ka ọ pụtara?

11 Jefta ma na ọ bụ enyemaka Chineke ga-eme ka o nwee ike ịnapụta ụmụ Izrel n’aka ndị Amọn. O kwere Jehova nkwa na ó mee ka ya merie, na ya ga-enye ya onye mbụ ga-esi n’ụlọ ya pụta mgbe o si n’agha lọta. Onye ahụ ga-abụ “àjà nsure ọkụ.” (Ndị Ikpe 11:30, 31) Gịnị ka ọ pụtara?

12 Iji mmadụ achụ àjà na-ewe Jehova iwe. N’ihi ya, anyị ma na Jefta agaghị eji onye ahụ chụọ àjà nkịtị.  (Diuterọnọmi 18:9, 10) N’Iwu Mozis, àjà nsure ọkụ bụ onyinye pụrụ iche mmadụ na-enye Jehova kpamkpam. N’ihi ya, ihe Jefta kwuru pụtara na onye ahụ ọ ga-enye Jehova ga na-eje ozi n’ụlọikwuu ya ruo mgbe ọ ga-anwụ. Jehova gere Jefta ntị ma nyere ya aka imeri n’agha ahụ. (Ndị Ikpe 11:32, 33) Ma, ònye ka Jefta ga-enye Jehova?

13, 14. Gịnị ka ihe Jefta kwuru ná Ndị Ikpe 11:35 na-eme ka a mata banyere okwukwe ya?

13 Chegodị banyere ihe ahụ a kọrọ ná mmalite isiokwu a. Mgbe Jefta si agha lọta, onye mbụ bịara izute ya bụ ada ya ọ hụrụ n’anya, naanị otu nwa ọ mụtara. Jefta ọ̀ ga-emezu nkwa ahụ o kwere? Ọ̀ ga-enye Jehova ada ya ka ọ gaa jewe ozi n’ụlọikwuu ruo mgbe ọ ga-anwụ?

14 Ọ ga-abụrịrị na ihe ndị e kwuru n’Iwu Chineke nyeere Jefta aka ime ihe ziri ezi. O nwere ike ịbụ na o chetara ihe e kwuru n’Ọpụpụ 23:19, bụ́ ebe gwara ndị Chineke ka ha nye Jehova ihe kacha mma ha nwere. Iwu ahụ kwukwara na mmadụ kwe Jehova nkwa, “ya emebila ihe o kwuru. Dị ka ihe niile si ya n’ọnụ pụta si dị, otú ahụ ka ọ ga-eme.” (Ọnụ Ọgụgụ 30:2) N’agbanyeghị na Jefta ma ihe ọ ga-apụtara ya na ada ya, o mezuru nkwa ya otú ahụ Hana mere. Ọ ga-abụ na Jefta na Hana biri ndụ n’otu oge. Ebe ada Jefta ga na-eje ozi n’ụlọikwuu, ọ gaghị amụ nwa. N’ihi ya, a gaghị enwe onye ga-aza aha Jefta ma ọ bụ keta ala ya. (Ndị Ikpe 11:34) Ma, Jefta ji obi ya niile sị: “Mụ onwe m emegheworo Jehova ọnụ m, enweghịkwa m ike ịgbanwe ihe m kwuru.” (Ndị Ikpe 11:35) Jehova nabatara ihe ahụ niile Jefta  mere ma gọzie ya. Ọ bụrụ gị, ị̀ gaara emezu nkwa i kwere otú ahụ Jefta mere?

15. Olee nkwa ọtụtụ n’ime anyị kwere Jehova? Olee otú anyị ga-esi mezuo ya?

15 Mgbe anyị nyefere Jehova onwe anyị, anyị kwere ya nkwa na anyị ga na-eme uche ya, ihe ọ sọkwara ya bụrụ. Anyị ma mgbe ahụ na ọ gaghị adị mfe mgbe niile imezu nkwa ahụ. Ma, olee ihe anyị na-eme ma á gwa anyị mee ihe anyị na-achọghị ime? Ọ bụrụ na anyị erubere Chineke isi n’agbanyeghị na anyị achọbughị ime ya, anyị na-egosi na anyị na-emezu nkwa anyị kwere Chineke. Imezu nkwa anyị kwere Jehova nwere ike isiri anyị ezigbo ike, ma o nweghị mgbe ngọzi ya na-agaghị aka ihe ọ bụla anyị hapụrụ. (Malakaị 3:10) Ada Jefta kwanụ? Gịnị ka o mere mgbe ọ nụrụ nkwa nna ya kwere?

Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị nwere ụdị okwukwe ahụ Jefta na ada ya nwere? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na nke 17)

16. Gịnị ka ada Jefta mere mgbe ọ matara nkwa nna ya kwere? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

16 Nkwa Jefta kwere Jehova dị iche na nke Hana kwere ya. Hana kwere Jehova nkwa na ya ga-enye ya nwa ya Samuel ka ọ bụrụ onye Naziraịt ga na-eje ozi n’ụlọikwuu Jehova. (1 Samuel 1:11) Onye Naziraịt nwere ike ịlụ nwaanyị, mụọkwa ụmụ. Ma, Jefta nyere ada ya ka ọ bụrụ “àjà nsure ọkụ.” N’ihi ya, ọ gaghị alụ di, ma ya fọkwa ịmụ nwa. (Ndị Ikpe 11:37-40) Chegodị echiche. Ebe nna ya bụ onye ndú n’Izrel, ọ gaara alụta ezigbo di n’ala ha. Ma, ọ ga-ejizi obi umeala na-eje ozi n’ụlọikwuu Jehova. Gịnị ka nwa agbọghọ a mere? O gosiri na ọ bụ ozi Jehova kacha ya mkpa. Ọ bụ ya mere o ji sị nna ya: “Mee m ihe si n’ọnụ gị pụta.” (Ndị Ikpe 11:36) Ịlụ di na ịmụ ụmụ na-agụ nwaanyị ọ bụla agụụ. Ma, ada Jefta hapụrụ ihe ahụ niile iji jeere Jehova ozi. Olee otú anyị ga-esi ṅomie ihe ahụ o mere?

Ịlụ di na ịmụ ụmụ na-agụ nwaanyị ọ bụla agụụ. Ma, ada Jefta hapụrụ ihe ahụ niile iji jeere Jehova ozi

17. (a) Olee otú anyị ga-esi ṅomie okwukwe Jefta na ada ya nwere? (b) Olee otú ihe e kwuru ná Ndị Hibru 6:10-12 si agba gị ume ka i wepụta onwe gị jekwuoro Jehova ozi?

17 Ọtụtụ puku Ndị Kraịst, ma ndị  nwoke ma ndị nwaanyị, na-ahapụtụgodị ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ kpebie ka ha hapụtụgodị ịmụ nwa. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha chọrọ ilekwasị anya n’ijekwuru Jehova ozi. E nwekwara ọtụtụ ụmụnna katarala ahụ́ ha na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha gaara na-anọrị. Ma, ha na-ahapụ ya jiri oge ha na ike ha na-ejere Jehova ozi. Ụfọdụ n’ime ha na-eso arụ ụlọ ndị nzukọ Jehova na-arụ ma ọ bụkwanụ gaa Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze ma kwaga n’ọgbakọ a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma. Ụfọdụ na-ahazi otú ha ga-esi jekwuoro Jehova ozi n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs. Jehova agaghị echefu ihe ọ bụla ụmụnna ndị a kwesịrị ntụkwasị obi hapụrụ iji jeere ya ozi. (Gụọ Ndị Hibru 6:10-12.) Gịnwa kwanụ? Ị̀ ga-ahapụli ihe ụfọdụ iji jekwuoro Jehova ozi?

OLEE IHE NDỊ ANYỊ MỤTARALA?

18, 19. Olee ihe ndị anyị mụtara n’ihe Baịbụl kọrọ banyere Jefta na ada ya? Olee otú anyị ga-esi ṅomie ha?

18 Olee ihe nyeere Jefta aka ijere Jehova ozi n’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ihe na-adịrịghị ya mfe? O kwere ka Jehova duzie ya mgbe ọ na-ekpebi ihe ọ ga-eme. O kpebiri na ya agaghị ekwe ka ndị gbara ya gburugburu megharịa ya anya. O kwesịrị ntụkwasị obi, ma mgbe ndị ọzọ mere ihe wutere ya. Jehova gọziri Jefta na ada ya maka ihe ndị ha hapụrụ iji jeere ya ozi. O jikwa ha abụọ nyere ndị ọzọ aka ịna-efe ya. Mgbe ndị ọzọ kwụsịrị ime ihe ziri ezi, Jefta na ada ya akwụsịghị iji obi ha niile na-efe Jehova.

19 Baịbụl sịrị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi ndị ahụ sitere n’okwukwe na ndidi na-eketa nkwa ndị e kwere.” (Ndị Hibru 6:12) Ka anyị ṅomie Jefta na ada ya, ebe anyị ma na ọ bụrụ na anyị ekwesị ntụkwasị obi, Jehova ga-agọzi anyị.