Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2016

Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-ezukọ Maka Ife Chineke?

Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-ezukọ Maka Ife Chineke?

“Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche . . . , ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị.”—NDỊ HIBRU 10:24, 25.

ABỤ: 20, 119

1-3. (a) Olee otú Ndị Kraịst sirila gosi na ọ na-agụsi ha agụụ ike ịga ọmụmụ ihe? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

MGBE otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Corinna dị afọ iri na asaa, a nwụchiri mama ya ma kpọga ya n’ụlọ mkpọrọ dị́ ezigbo anya. E mechara kpọgakwa Corinna n’ebe a na-akpọ Saịberịa, nke dị́ ọtụtụ puku kilomita ma é si n’obodo ha gawa ya. Ọ rụrụ ọrụ n’ugbo dị́ n’ebe ahụ, a na-emekwa ya ka ohu. Mgbe ụfọdụ, a manyere ya ịrụ ọrụ n’èzí mgbe ezigbo oyi na-atụ n’enweghị ezigbo efe o yi. Ma, Corinna na nwanna nwaanyị ọzọ kpebiri na ha ga-eme ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji sí n’ugbo ahụ pụọ ma gaa ọmụmụ ihe.

2 Corinna sịrị: “Anyị hapụrụ ebe ahụ anyị na-arụ ọrụ ná mgbede, jiri ụkwụ gaa kilomita iri abụọ na ise ruo n’otu ọdụ ụgbọ okporo ígwè. Ụgbọ okporo ígwè ahụ kwọpụrụ n’elekere abụọ nke ime abalị. Anyị nọrọ n’ụgbọ ahụ awa isii tupu anyị arịtuo, jirizie ụkwụ gaa kilomita iri ruo n’ebe anyị na-amụ ihe.” Obi dị Corinna ezigbo ụtọ na o mere  njem ahụ. Ọ sịrị: “Anyị mụrụ Ụlọ Nche, bụọkwa abụ Alaeze n’ọmụmụ ihe. Ọmụmụ ihe ahụ gbara anyị ume, meekwa ka okwukwe anyị sikwuo ike.” Mgbe abalị atọ gachara, ụmụnna nwaanyị abụọ ahụ laghachiri ebe ha na-arụ arụ, ma onye na-elekọta ugbo ahụ amataghịdị na ha pụrụ.

3 Kemgbe ụwa, obi na-adị ndị ohu Jehova ụtọ iso ibe ha zukọọ. Dị ka ihe atụ, ọ na-amasị Ndị Kraịst oge mbụ izukọ ka ha fee Jehova, mụọkwa banyere ya. (Ọrụ Ndịozi 2:42) N’eziokwu, ọ ga-abụ na ọ na-agụkwa gịnwa agụụ ịna-aga ọmụmụ ihe. Ma, otú ahụ ọ na-anaghị adịrị ụmụnna gị niile mfe ịgachi ọmụmụ ihe anya ka o nwekwara ike ịbụ na ọ naghị adịrị gịnwa mfe. O nwere ike ịbụ na ị na-eji ọtụtụ awa arụ ọrụ ego ma ọ bụ na i nwere ọtụtụ ihe ị na-eme n’ụbọchị ma ọ bụkwanụ na ike na-agwụ gị mgbe niile. Olee ihe ga-enyere anyị aka ime ihe niile anyị nwere ike ime iji na-agachi ọmụmụ ihe anya? [1] (Gụọ ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.) Olee otú anyị ga-esi gbaa ndị anyị na-amụrụ ihe ume ka ha na-agachi ọmụmụ ihe anya? N’isiokwu a, a ga-akọwa (1) uru ịga ọmụmụ ihe na-abara anyị, (2) otú ọmụmụ ihe anyị na-aga si enyere ndị ọzọ aka, na (3) ihe mere o ji eme Jehova obi ụtọ. [2]—Gụọ ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.

ỌMỤMỤ IHE NA-ABARA ANYỊ URU

4. Olee otú ịga ọmụmụ ihe si enyere anyị aka ịmụta banyere Jehova?

4 Anyị na-amụta ihe n’ọmụmụ ihe. Ọmụmụ ihe ọ bụla anyị gara na-enyere anyị aka ịmụtakwu banyere Jehova. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ọgbakọ mụrụ akwụkwọ Bịaruo Jehova Nso n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ n’oge na-adịbeghị anya. Olee otú obi dị gị mgbe a na-amụ àgwà dị́ iche iche Jehova nwere nakwa mgbe ị nụrụ ka ụmụnna anyị na-ekwu otú obi dị ha banyere Jehova? O doro anya na o mere ka ị hụkwuo Jehova n’anya. Anyị gaa ọmụmụ ihe, ige ntị nke ọma na-eme ka anyị mụtakwuo ihe na Baịbụl ma n’okwu ndị a na-ekwu ma n’ihe ngosi ndị a na-eme ma n’ebe ndị a na-agụ na Baịbụl. (Nehemaya 8:8) Chegodị banyere ọtụtụ ihe anyị na-amụta kwa izu mgbe anyị na-akwadebe maka ọgụgụ Baịbụl nakwa mgbe ndị ọzọ na-aza ihe ha mụtara n’ihe ha gụrụ.

5. Olee otú ọmụmụ ihe sirila nyere gị aka ime ihe ị mụtara na Baịbụl nakwa ime ka otú i si ezi ozi ọma ka mma?

5 Ọmụmụ ihe na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-eme ihe anyị mụtara na Baịbụl. (1 Ndị Tesalonaịka 4:9, 10) Dị ka ihe atụ, ò nwetụla mgbe ị gara Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, ya emee ka ị chọọ ijekwuru Jehova ozi, ka i mee ka ekpere gị ka mma, ma ọ bụ ka ị gbaghara nwanna mejọrọ gị? Ọmụmụ ihe anyị na-aga n’etiti izu na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma na otú anyị ga-esi na-enyere ndị ọzọ aka ịghọta eziokwu Baịbụl.—Matiu 28:19, 20.

6. Olee otú ọmụmụ ihe anyị na-aga si agba anyị ume, na-emekwa ka okwukwe anyị sie ike?

 6 Ọmụmụ ihe na-agba anyị ume. Ụwa Setan na-agbalị ime ka okwukwe anyị nyụọ ka ọkụ. O nwekwara ike ime ka ike gwụ anyị, anyị adaa mbà. Ma ọmụmụ ihe na-agba anyị ume, na-emekwa ka anyị nwee ume anyị ga-eji na-ejere Jehova ozi. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 15:30-32.) Ọtụtụ mgbe, anyị na-amụ otú amụma ndị e buru na Baịbụl sirila mezuo. O nwere ike ime ka obi sikwuo anyị ike na Jehova ga-emezu ihe ndị o kwere nkwa ime n’ọdịnihu. Ụmụnna anyị na-agba anyị ume, ọ bụghị naanị mgbe ha na-eme ihe omume, kamakwa mgbe ha na-aza ajụjụ na mgbe ha ji obi ha niile na-abụ abụ iji too Jehova. (1 Ndị Kọrịnt 14:26) Mgbe anyị na ha na-akparịta ụka tupu ọmụmụ ihe amalite nakwa mgbe a gbasara, obi na-adị anyị mma n’ihi na anyị nwere ọtụtụ ndị enyi ihe banyere anyị na-emetụ n’obi n’eziokwu.—1 Ndị Kọrịnt 16:17, 18.

Ọmụmụ ihe na-agba anyị ume, na-emekwa ka anyị nwee ume anyị ga-eji na-ejere Jehova ozi

7. Gịnị mere o ji dị́ ezigbo mkpa ka anyị na-aga ọmụmụ ihe?

7 Mmụọ nsọ Chineke na-enyere anyị aka n’ọmụmụ ihe. Jizọs ji mmụọ nsọ na-eduzi ọgbakọ Ndị Kraịst. N’eziokwu, ọ gwara anyị ka anyị “nụrụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a.” (Mkpughe 2:7) Mmụọ nsọ nwere ike inyere anyị aka imeri ọnwụnwa na iji obi ike na-ekwusa ozi ọma. O nwekwara ike inyere anyị aka ime mkpebi dị́ mma. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịna-eme ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị gaa ọmụmụ ihe ka mmụọ nsọ Chineke nyere anyị aka.

ANYỊ NA-ENYERE NDỊ ỌZỌ AKA N’ỌMỤMỤ IHE

8. Ụmụnna anyị hụ anyị n’ọmụmụ ihe, nụ azịza anyị na abụ anyị na-abụ, olee otú o si enyere ha aka? (Kwuo ihe dị́ n’igbe bụ́ “ Ahụ́ Na-adịtụ Ya Mma ma Ọ Gachaa Ọmụmụ Ihe.”)

8 Ọmụmụ ihe na-eme ka anyị nwee ohere igosi ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya. Ọtụtụ ndị nọ́ n’ọgbakọ anyị na-edi ihe isi ike ndị na-abịara ha. Pọl onyeozi dere, sị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Otú anyị ga-esi gosi na ihe banyere ụmụnna anyị na-emetụ anyị n’obi bụ iso ha zukọọ ka anyị gbarịta ibe anyị ume. Anyị gaa ọmụmụ ihe, anyị na-egosi  ụmụnna anyị na anyị chọrọ ka anyị na ha na-anọ ma na-akparịta ụka, nakwa na anyị chọrọ ịma otú obi dị ha. Anyị na-agbakwa ha ume mgbe ha na-anụ ihe anyị na-aza na abụ anyị ji obi anyị niile na-abụ.—Ndị Kọlọsi 3:16.

9, 10. (a) Kọwaa otú ihe Jizọs kwuru na Jọn 10:16 si enyere anyị aka ịghọta ihe mere o ji dị́ mkpa ka anyị na-eso ụmụnna anyị aga ọmụmụ ihe. (b) Ọ bụrụ na anyị na-agachi ọmụmụ ihe anya, olee otú anyị ga-esi nyere onye ndị ezinụlọ ya jụrụ ajụ aka?

9 Ọmụmụ ihe na-eme ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu. (Gụọ Jọn 10:16.) Jizọs ji onwe ya tụnyere onye ọzụzụ atụrụ, jirikwa ndị na-eso ụzọ ya tụnyere ìgwè atụrụ. Chegodị echiche. Ọ bụrụ na atụrụ abụọ nọ n’elu ugwu, atụrụ abụọ ọzọ anọrọ na ndagwurugwu, otu atụrụ anọrọ ebe ọzọ, à ga-asị na ha ise bụ otu ìgwè atụrụ? Mba. N’ihi na ìgwè atụrụ na-anọkọta ọnụ, na-esokwa onye na-azụ ha. Otú ahụ ka ọ dị anyị. Anyị ekwesịghị ịna-ahapụ ịga ọmụmụ ihe, ya bụ, ịhapụ ụmụnna anyị gaa nọrọ iche. Anyị kwesịrị ịna-eso ha ezukọ ka anyị nwee ike ịghọ “otu ìgwè atụrụ” ma na-eso “otu onye ọzụzụ atụrụ.”

10 Ọmụmụ ihe na-enyere anyị aka ịbụ otu ezinụlọ hụrụ ibe ha n’anya. (Abụ Ọma 133:1) E nwere ụmụnna nne ha na nna ha ma ọ bụ ụmụnne ha jụrụ. Ma, Jizọs kwere nkwa na ya ga-eme ka ha nweta ndị ezinụlọ ga-ahụ ha n’anya ma na-elekọta ha. (Mak 10:29, 30) Ọ bụrụ na ị na-agachi ọmụmụ ihe anya, i nwere ike ịbụrụ onye nọ́ n’ọgbakọ unu nna, nne, nwanne nwoke ma ọ bụ nwanne nwaanyị. Ọ bụrụ na anyị ana-echeta ihe a, anyị kwesịrị ịna-eme ike anyị niile ka anyị na-aga ọmụmụ ihe niile.

 ANYỊ GA-EME JEHOVA OBI ỤTỌ

11. Olee otú ịga ọmụmụ ihe si eme ka anyị nye Jehova ihe o kwesịrị inweta?

11 Anyị gaa ọmụmụ ihe, anyị na-enye Jehova ihe o kwesịrị inweta. Ebe ọ bụ ya kere anyị, anyị kwesịrị ịna-ekele ya, na-asọpụrụ ya, na-etokwa ya. (Gụọ Mkpughe 7:12.) Anyị na-eme ihe ndị a n’ọmụmụ ihe mgbe anyị na-ekpegara Jehova ekpere, na-abụku ya abụ, na-ekwukwa banyere ya. Ịga ọmụmụ ihe so n’otú magburu onwe ya anyị si efe Jehova kwa izu.

12. Olee otú obi na-adị Jehova ma anyị na-aga ọmụmụ ihe otú ahụ ọ gwara anyị ka anyị na-eme?

12 Ọ bụ Jehova kere anyị, anyị kwesịkwara ịna-erubere ya isi. O nyere anyị iwu ka anyị na-ezukọ, nke ka nke, ka ọgwụgwụ ụwa ochie a na-erukwu nso. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị erubere iwu ahụ o nyere isi, obi na-adị ya ezigbo ụtọ. (1 Jọn 3:22) Ọ na-ahụ mbọ anyị na-agba iji gaa ọmụmụ ihe. O jikwa ya kpọrọ ihe.—Ndị Hibru 6:10.

13, 14. Olee otú anyị si abịaru Jehova na Jizọs nso ma anyị gaa ọmụmụ ihe?

13 Anyị gaa ọmụmụ ihe, anyị na-egosi Jehova na anyị chọrọ ịbịaru ya na Ọkpara ya nso. Anyị gaa ọmụmụ ihe, anyị na-amụ Baịbụl, Jehova na-akụzikwara anyị ihe anyị kwesịrị ime na otú anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ. (Aịzaya 30:20, 21) Ndị na-anaghị efe Jehova bịa ọmụmụ ihe anyị, ha na-aghọta na ọ bụ Chineke na-eduzi anyị. (1 Ndị Kọrịnt 14:23-25) Jehova na-eji mmụọ nsọ ya eduzi ọmụmụ ihe anyị. Ọ bụkwa ya na-akụziri anyị ihe na ya. N’ihi ya, anyị gaa ọmụmụ ihe, anyị na-ege ihe Jehova na-ekwu, ghọta otú ọ hụruru anyị n’anya ma bịaruo ya nso.

14 Jizọs, bụ́ Onyeisi ọgbakọ ya, sịrị: “N’ebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọtara n’aha m, anọ m n’ebe ahụ n’etiti ha.” (Matiu 18:20) Baịbụl kwukwara na Jizọs “na-eje ije n’etiti” ọgbakọ ndị Chineke. (Mkpughe 1:20–2:1) O doro anya na Jehova na Jizọs na-anọnyere anyị n’ọmụmụ ihe, na-emekwa ka okwukwe anyị sikwuo ike. Olee otú i chere obi ga-adị Jehova ma ọ hụ na ị na-agbalịsi ike ka ị bịaruo ya na Ọkpara ya nso?

15. Olee otú ịga ọmụmụ ihe si egosi Chineke na anyị chọrọ ịna-erubere ya isi?

15 Anyị gaa ọmụmụ ihe, anyị na-egosi Jehova na anyị chọrọ ịna-erubere ya isi. Jehova anaghị amanye anyị ime ihe o kwuru. (Aịzaya 43:23) N’ihi ya, anyị gaa ọmụmụ ihe otú ahụ ọ gwara anyị, anyị na-egosi ya na anyị hụrụ ya n’anya nakwa na anyị kwetara na ọ bụ ya kwesịrị ịna-agwa anyị ihe anyị ga-eme. (Ndị Rom 6:17) Dị ka ihe atụ, gịnị ka anyị ga-eme ma onye anyị na-arụrụ ọrụ chọọ ka anyị na-arụ ọrụ otú ga-eme ka anyị ghara ịna-agachi ọmụmụ ihe anya? Ndị ọchịchị nwere ike ikwu na onye gaa ọmụmụ ihe, e rie ya iwu, tụọ ya mkpọrọ, ma ọ bụ taa ya ahụhụ ka njọ. O nwekwara mgbe ụfọdụ anyị nwere ike ịchọ imewe ihe ọzọ kama ịga ọmụmụ  ihe. Nke ọ bụla ọ sọrọ ya bụrụ, ọ bụ anyị ga-ekpebi ihe anyị ga-eme. (Ọrụ Ndịozi 5:29) Ma, mgbe ọ bụla anyị rubeere Jehova isi, anyị na-eme ya obi ụtọ.—Ilu 27:11.

AKWỤSỊLA ISO ỤMỤNNA GỊ NA-EZUKỌ

16, 17. (a) Olee otú anyị si mara na Ndị Kraịst oge mbụ ji ịga ọmụmụ ihe kpọrọ ihe? (b) Olee otú Nwanna George Gangas si were ịga ọmụmụ ihe?

16 Mgbe Ndị Kraịst zukọchara na Pentikọst afọ 33, ha nọzi na-ezukọ mgbe niile ka ha fee Jehova. Ha nọ ‘na-echebara ibe ha echiche,’ ha ‘ahapụghịkwa nzukọ ha.’ (Ndị Hibru 10:24, 25) O nweghị mgbe ha kwụsịrị ịna-ezukọta, ma mgbe ndị ọchịchị Rom na ndị ndú okpukpe ndị Juu nọ na-akpagbu ha. N’agbanyeghị na ọ dịrịghị ha mfe, ha mere ike ha niile ịna-ezukọta.

17 Taakwa, ndị ohu Jehova anaghị eji ọmụmụ ihe egwu egwu, ịga ọmụmụ ihe na-atọkwa ha ụtọ. Nwanna George Gangas, onye sobu n’Òtù Na-achị Isi ruo ihe karịrị afọ iri abụọ na abụọ, sịrị: “Iso ụmụnna ezukọ na-agba m ume, o sokwa n’ihe kacha eme m obi ụtọ. Obi na-adị m ụtọ iso ná ndị mbụ ga-abịarute n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, sorokwa ná ndị ikpeazụ ga-alanụ ma ó kwe omume. M na-enwe ezigbo ọṅụ ma mụ na ndị Chineke kparịtawa ụka. Mụ na ha nọrọ, obi na-eru m ala ka à ga-asị na mụ na ndị ezinụlọ m nọ. Ọ na-adị m ka m̀ nọ na paradaịs.” Ọ sịkwara: “Ịga ọmụmụ ihe na-agụsi m agụụ ike.”

18. Olee otú ịga ọmụmụ ihe na-adị gị? Gịnịkwa ka i kpebiri ịna-eme?

18 Ife Jehova ọ̀ na-adịkwa gịnwa otú ahụ? Ọ bụrụ na ọ na-adị gị otú ahụ, akwụsịla ime ihe niile i nwere ike ime ka i soro ụmụnna gị na-aga ọmụmụ ihe, ma mgbe o siiri gị ike. Gosi Jehova na ọ dị gị otú ahụ ọ dị Eze Devid, bụ́ onye sịrị: “Jehova, ahụrụ m ụlọ gị nke bụ́ ebe obibi gị n’anya.”—Abụ Ọma 26:8.

^ [1] (paragraf nke 3) Ụfọdụ ụmụnna anyị agaghị na-agachili ọmụmụ ihe anya n’ihi otú ihe si dịrị ha, nke ha na-agaghị agbanweli. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ha na-arịa ọrịa. Obi kwesịrị isi ha ike na Jehova ghọtara ọnọdụ ha, na obi dịkwa ya ezigbo ụtọ maka ihe niile ha na-eme iji na-efe ya. Ndị okenye nwere ike inyere ha aka igere ihe ndị e kwuru n’ọmụmụ ihe. Ha nwere ike ime ka ha sí n’ekwentị gere ya ma ọ bụkwanụ ha etinyere ha ya na teepụ.

^ [2] (paragraf nke 3) Gụọ igbe bụ́ “ Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-aga Ọmụmụ Ihe.”

Jehova na-ahụ mbọ anyị na-agba iji gaa ọmụmụ ihe. O jikwa ya kpọrọ ihe