Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2016

Etinyela Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị n’Ụwa A Na-adịghị n’Otu

Etinyela Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị n’Ụwa A Na-adịghị n’Otu

“Kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”—MATIU 22:21.

ABỤ: 33, 137

1. Olee otú anyị ga-esi rubere ma Chineke ma ndị ọchịchị isi?

BAỊBỤL gwara anyị ka anyị na-erubere ndị ọchịchị isi, gwakwa anyị ka anyị na-erubere Chineke isi mgbe niile. (Ọrụ Ndịozi 5:29; Taịtọs 3:1) Olee otú anyị ga-esi mee ihe abụọ a? Jizọs kọwara ihe ga-enyere anyị aka ịmata onye anyị kwesịrị irubere isi. Ọ sịrị na anyị kwesịrị ịkwụ ‘Siza ihe Siza, ma kwụọ Chineke ihe Chineke.’ [1] (Gụọ ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.) (Matiu 22:21) Otú anyị si akwụ “Siza ihe Siza” bụ ịna-erubere iwu ndị ọchịchị isi, ịna-akwanyere ndị ọchịchị na ndị na-arụrụ ha ọrụ ùgwù, nakwa ịna-atụ ụtụ isi anyị. (Ndị Rom 13:7) Ma, ọ bụrụ na ndị ọchịchị agwa anyị mee ihe Chineke sịrị anyị emela, anyị anaghị ekwe eme ya. Ma anyị anaghị akparị ha.

2. Olee otú anyị si egosi na o nweghị ndị anyị na-adụnyere úkwù n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

2 Ịkwụ “Chineke ihe Chineke” pụtara na anyị agaghị etinye aka n’esemokwu ụwa a. (Aịzaya 2:4) Ebe ọ bụ na Jehova kwere ka ụmụ mmadụ na-achị, anyị anaghị emegide ha. Anyị anaghịkwa eso eme ihe ọ bụla ga-egosi na anyị hụrụ mba anyị n’anya ma ọ bụ na obodo anyị ka nke ndị ọzọ mma. (Ndị Rom 13:1, 2)  Anyị anaghị agba mbọ ka a gbanwee ndị ọchịchị ma ọ bụ na-agwa ndị na-azọ ọchịchị ihe ha ga-eme. Anyị anaghịkwa azọ ọchịchị ma ọ bụ tụnyere ndị ọzọ vootu.

3. Gịnị mere na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

3 E nwere ọtụtụ ihe mere Chineke ji gwa anyị ka anyị ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Otu n’ime ha bụ na anyị na-eṅomi Jizọs, bụ́ onye “na-abụghị nke ụwa.” E nweghị mgbe o tinyere aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’agha. (Jọn 6:15; 17:16) Ihe ọzọ bụ na anyị na-akwado Alaeze Chineke. Ebe ọ bụ na anyị anaghị akwado ọchịchị ụmụ mmadụ, anyị na-enwe akọnuche dị́ ọcha mgbe anyị na-ekwusa na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-akwụsị nsogbu ụmụ mmadụ niile. Okpukpe ụgha na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ na-eme ka ndị na-ekpe ya ghara ịdị n’otu. Ma, anyị na ụmụnna anyị nọ́ n’ụwa niile dị n’otu n’ihi na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.—1 Pita 2:17.

4. (a) Olee otú anyị si mara na ọ ga-esikwu ike ịhapụ itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ikpebisi ike ugbu a na anyị agaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

4 O nwere ike ịbụ na n’ebe anyị bi, ndị mmadụ anaghị atụ anya ka anyị tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma, ka ọgwụgwụ ụwa ochie a na-eru nso, e nwere ike inyewe anyị nsogbu ka anyị tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Taa, ndị mmadụ ‘adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla,’ ha bụkwa “ndị isi ike.” Ọ bụ ya mere ha ga-eji na-ekewakwu. (2 Timoti 3:3, 4) N’obodo ụfọdụ, mgbanwe e nwere na mberede n’ihe gbasara ọchịchị emeela ka a na-enyekwu ụmụnna anyị nsogbu ka ha tinye aka n’esemokwu ụwa a. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ikpebisi ike ugbu a na anyị agaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị é nwegodị nsogbu tara akpụ. Ka anyị leba anya n’ihe anọ ga-enyere anyị aka ime otú ahụ.

NA-ELE ỌCHỊCHỊ ỤMỤ MMADỤ ANYA OTÚ JEHOVA SI ELE YA

5. Olee otú Jehova si ele ọchịchị ụmụ mmadụ anya?

5 Ihe mbụ ga-enyere anyị aka ikpebisi ike na anyị agaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ ịna-ele ọchịchị ụmụ mmadụ anya otú Jehova si ele ya. Mgbe Jehova kere ụmụ mmadụ, o nyeghị ha ikike ịchị ibe ha. (Jeremaya 10:23) Ọ na-ele ụmụ mmadụ niile anya ka otu ezinụlọ. Ma ọchịchị ụmụ mmadụ na-ekwu na mba ha ka nke ndị ọzọ mma. Ọ na-eme ka ndị mmadụ ghara ịdị n’otu. E nwegodị ndị ọchịchị yiri ka hà na-achị nke ọma, ha agaghị ewepụli nsogbu niile. Ihe ọzọ bụ na ha aghọọla ndị iro Alaeze Chineke, nke malitere ịchị n’afọ 1914. N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ niile.—Gụọ Abụ Ọma 2:2, 7-9.

6. Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọchịchị?

6 Ihe mere Chineke ji hapụ ụmụ mmadụ ka ha na-achị bụ na ha na-eme ka ọgba aghara ghara ịdị, nke na-enyere anyị aka  ịna-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Ndị Rom 13:3, 4) Chineke gwadịrị anyị ka anyị na-ekpe ekpere maka ndị na-achị achị ka anyị nwee ike ịna-efe ya n’enweghị nsogbu. (1 Timoti 2:1, 2) Ọ bụrụ na a na-emegbu anyị, anyị nwere ike ịgwa ndị ọchịchị ka ha nyere anyị aka. Pọl mere otú ahụ. (Ọrụ Ndịozi 25:11) Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kwuru na e nyefere Setan ọchịchị ụwa a, e nweghị ebe o kwuru na ọ bụ ya na-eduzi onye ọchịchị ọ bụla. (Luk 4:5, 6) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwu ihe ga-eme ka mmadụ chewe na ọ bụ Ekwensu na-eduzi otu onye ọchịchị. Baịbụl kwuru na anyị ekwesịghị ikwu okwu ọjọọ banyere onye ọ bụla.—Taịtọs 3:1, 2.

7. Olee ihe anyị na-ekwesịghị ịna-eche?

7 Anyị na-erubere Chineke isi ma ọ bụrụ na anyị anaghị adụnyere onye ọchịchị ọ bụla ma ọ bụ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla úkwù, ọ bụrụgodị na ihe ha chere ga-abara anyị uru. Ma, o nwere ike isiri anyị ike mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, weregodị ya na e nwere ndị na-agba mbọ ka ha kwatuo ọchịchị mere ka Ndịàmà Jehova na ndị ọzọ na-ata ahụhụ. O doro anya na ị gaghị eso ha. Ma, ị̀ ga-eche na ihe ha na-eme dị mma, chọọkwa ka ha kwatuo ọchịchị ahụ? (Ndị Efesọs 2:2) Ọ bụrụ na anyị achọghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, anyị ekwesịghị ichewe na ihe otu ndị mere dị mma karịa ihe ndị nke ọzọ mere. Ihe anyị na-ekwu na ihe anyị na-eme ga-egosi ihe dị́ anyị n’obi.

“DỊ AKỌ,” MA ADỊLA “AGHỤGHỌ”

8. E nwee ihe mere ka o siere anyị ike ịhapụ itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, olee otú anyị ga-esi gosi na anyị “dị akọ” ma ghara ‘ịdị aghụghọ’?

8 Ụzọ nke abụọ anyị si egosi na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ na anyị ‘ga-adị akọ dị ka agwọ, ma ghara ịdị aghụghọ, dị ka nduru.’ (Gụọ Matiu 10:16, 17.) Otú anyị ga-esi egosi na anyị “dị akọ” bụ ibu ụzọ chee banyere ihe nwere ike ime ka anyị tinyewe aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Anyị ga-egosi na anyị adịghị “aghụghọ” ma ọ bụrụ na anyị ekweghị ka e jiri ihe ndị ahụ nwata anyị. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha na ihe anyị kwesịrị ime banyere ha.

9. Gịnị ka anyị kwesịrị ịkpachara anya maka ya ma anyị na mmadụ kparịtawa ụka?

9 Mkparịta ụka. Anyị kwesịrị ịkpachara ezigbo anya ma ndị mmadụ kparịtawa banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Dị ka ihe atụ, anyị gwawa mmadụ banyere Alaeze Chineke, anyị agaghị ekwu na anyị kwetara ma ọ bụ na anyị ekwetaghị ihe otu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ otu onye ọchịchị kwuru ma ọ bụ ihe o chere. Kama ikwuwe ihe ndị mmadụ chọrọ ime ka nsogbu ụmụ mmadụ kwụsị, jiri Baịbụl gosi otú Alaeze Chineke ga-esi kwụsị nsogbu niile kpamkpam. Ndị mmadụ rụwa ụka gbasara otu okwu, dị́ ka okwu gbasara nwoke ịlụ nwoke ibe ya na nwaanyị ịlụ nwaanyị ibe ya ma ọ bụ imepụ ime, gwa ha ihe Baịbụl kwuru na otú i si eme ihe ahụ o kwuru. Mmadụ kwuo na e kwesịrị iwepụ iwu ụfọdụ ma ọ bụ gbanwee ha, anyị anaghị akwado onye ahụ ma ọ bụ rụwa ya ụka, anyị anaghịkwa amanye ya ịgbanwe echiche ya.

10. Anyị gewe akụkọ ụwa ma ọ bụ gụwa akwụkwọ akụkọ, olee otú anyị ga-esi gosi na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

10 Ụlọ ọrụ mgbasa ozi. Mgbe ụfọdụ, a na-akọ akụkọ ụwa otú na-akwadosi otu òtù ike. Ọ na-adịkarị otú ahụ n’obodo ndị ọ bụ gọọmenti na-agwa ụlọ ọrụ mgbasa ozi ihe ha ga-ekwu. Ọ bụrụ na ndị nta akụkọ adụnyere òtù ọ bụla úkwù, anyị  ga-akpachara anya ka anyị ghara ichewe echiche otú ha si eche. Dị ka ihe atụ, jụọ onwe gị, sị, ‘È nwere onye otú o si agbasa ozi na-atọ m ụtọ n’ihi na m kwetara ihe ọ na-ekwu gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị?’ Ihe ga-enyere gị aka ka ị ghara ịdụnyere òtù ọ bụla úkwù bụ ịhapụ ịgụ akụkọ ndị na-akwado otu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ile ya na tiivi. Gbalịa chọta akụkọ na-anaghị akwado òtù ọ bụla. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịchọpụta ma ihe ị nụrụ ọ̀ dabara adaba ‘n’ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ’ e dere na Baịbụl.—2 Timoti 1:13.

11. Olee otú o nwere ike isi siere anyị ike ịhapụ itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụrụ na ihe ndị anyị nwere dị anyị oké mkpa?

11 Ịhụ ihe onwunwe n’anya. Ọ bụrụ na ego na ihe ndị ọzọ anyị nwere adị anyị oké mkpa, o nwere ike ime ka anyị tinyewe aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe afọ 1970 gasịrị, ọtụtụ ụmụnna nọ́ na Malawi hapụrụ ihe niile ha nwere n’ihi na ha ekweghị abanye n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma, ọ dị mwute na ụfọdụ ekweghị ahapụ ihe ha nwere. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ruth chetara ihe merenụ. Ọ sịrị, “Ụfọdụ so anyị mgbe a kpọgara anyị n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ. Ma ha mechara banye n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị, laghachikwa n’ụlọ ha n’ihi na ha achọghị idiwe ahụhụ a na-ata n’ebe ahụ.” Ma ọtụtụ ndị ohu Chineke anaghị eme otú ahụ. Ha anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ bụrụgodị na ọ ga-eme ka ego kọọ ha ma ọ bụ mee ka ha gbara aka ihe niile ha nwere.—Ndị Hibru 10:34.

12, 13. (a) Olee otú Jehova si ele ụmụ mmadụ anya? (b) Olee otú anyị ga-esi mata ma obodo anyị ọ̀ na-ebu anyị isi?

12 Mpako. Ndị mmadụ na-ejikarị agbụrụ ha, omenala ha, obodo ha, ma ọ bụ mba ha etu ọnụ. Ma Jehova anaghị ewere ya na onye ọ bụla ma ọ bụ ndị ọ bụla ka ibe ha mma. Anyị niile bụ otu n’anya ya. O doro anya na Jehova kere anyị ka anyị dị́ iche n’ibe anyị. Otú a o si mee ya dị anyị mma, na-emekwa anyị obi ụtọ. Ọ chọghị ka anyị hapụ omenala anyị. Ma, ọ chọghịkwa ka anyị chewe na anyị ka ndị ọzọ mma.—Ndị Rom 10:12.

13 Anyị ekwesịghị iji mba anyị na-etu ọnụ nke na anyị ga-echewe na ọ ka nke ndị ọzọ mma. Anyị chewe otú ahụ, o nwere ike isiri anyị ike izere esemokwu ụwa a. Ụdị ihe a mere n’oge ndịozi Jizọs. Ụfọdụ ụmụnna ndị Hibru nọ na-eleghara ndị inyom Grik di ha nwụrụ anya. (Ọrụ Ndịozi 6:1) Olee otú anyị ga-esi ama ma ànyị amalitela iche na obodo anyị ka nke ndị ọzọ mma? Ọ bụrụ na nwanna sí obodo ọzọ atụọrọ gị aro, ị̀ na-eche ozugbo, sị, ‘Otú anyị si eme ihe ebe a ka mma,’ gị ajụ aro ahụ ọ tụrụ? Ọ bụrụ otú ahụ, cheta ndụmọdụ a dị́ mkpa Baịbụl nyere. Ọ sịrị: “N’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu.”—Ndị Filipaị 2:3.

JEHOVA GA NA-ENYERE GỊ AKA

14. Olee otú ekpere ga-esi nyere anyị aka, oleekwa ihe a kọrọ na Baịbụl na-egosi na ekpere na-enye aka?

14 Ụzọ nke atọ anyị ga-esi gosi na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị  bụ ịtụkwasị Jehova obi. Na-arịọ ya ka o nye gị mmụọ nsọ, nke ga-eme ka ị na-enwe ndidi ma na-ejide onwe gị. Àgwà ndị a ga-enyere gị aka ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị emee ihe na-adịghị mma ma ọ bụ ghara ịkwụwa aka ọtọ. Rịọ Jehova ka o nye gị amamihe ga-eme ka ị mata ihe nwere ike ime ka i tinyewe aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Rịọ ya ka o nyere gị aka ime ihe i kwesịrị ime ma ụdị ihe ahụ mee. (Jems 1:5) E nwere ike ịtụ gị mkpọrọ ma ọ bụ sí n’ụzọ ọzọ taa gị ahụhụ n’ihi na ị na-erubere Jehova isi. Ụdị ihe ahụ mee, rịọ Jehova ka o mee ka i nwee obi ike, ka i nwee ike ime ka ndị ọzọ ghọta ihe mere na ị gaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Obi kwesịrị isi gị ike na Jehova ga-enyere gị aka ịtachi obi.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 4:27-31.

Buru amaokwu Baịbụl ụfọdụ n’isi, bụ́ ndị ga-enyere gị aka ka ị ghara itinye aka n’esemokwu ụwa a nakwa amaokwu ndị na-akọwa ụwa ọhụrụ

15. Olee otú Baịbụl nwere ike isi nyere anyị aka ka anyị ghara itinye aka n’esemokwu ụwa a? (Kwuokwa ihe dị́ n’igbe bụ́ “ Okwu Chineke Mere Ka Ha Kpebisie Ike na Ha Agaghị Aga Agha.”)

15 Jehova nyere anyị Baịbụl iji mee ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Na-atụgharị uche n’amaokwu ndị ga-enyere gị aka ka ị ghara itinye aka n’esemokwu ụwa a. Gbalịa ka i buru amaokwu ndị ahụ n’isi n’ihi na ha ga-enyere gị aka mgbe ị na-ejighị Baịbụl. Baịbụl nwekwara ike ime ka olileanya i nwere n’ihe Chineke kwere nkwa ime n’ọdịnihu sikwuo ike. Olileanya a na-enyere anyị aka ịna-atachi obi mgbe a na-emegide anyị. (Ndị Rom 8:25) Họrọ amaokwu ndị na-akọwa ihe ndị ị kacha atụ anya ime n’ụwa ọhụrụ, cheekwa otú ọ ga-adị gị ma ị nọrọ n’ụwa ọhụrụ.

MỤTA IHE N’AKA NDỊ JÍ OBI HA NIILE FEE JEHOVA

16, 17. Olee ihe anyị ga-amụta n’aka ndị ohu Jehova na-etinyeghị aka n’esemokwu ụwa a? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

16 Ihe nke anọ ga-enyere anyị aka ka anyị ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ iche banyere ndị jí obi ha niile fee Jehova. Ọtụtụ ndị n’oge Baịbụl nwere obi ike. Ha mere mkpebi dị́ mma, nke nyeere ha aka ka ha ghara ime ihe ha na-ekwesịghị  ime. Dị ka ihe atụ, Shedrak, Mishak, na Abednego ekweghị efe ihe oyiyi nọchiri anya ọchịchị Babịlọn. (Gụọ Daniel 3:16-18.) Ihe a Baịbụl kọrọ na-enyere ọtụtụ Ndịàmà Jehova aka taa inwe obi ike ma ghara ife ọkọlọtọ mba ebe ha bi. Jizọs etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’ihe ndị ọzọ na-eme ka ndị mmadụ ghara ịdị n’otu. Ọ ma na ihe o mere ga-enyere ndị na-eso ụzọ ya aka. Ọ sịrị ha: “Nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.”—Jọn 16:33.

17 Ọtụtụ Ndịàmà Jehova n’oge anyị a anaghị etinye aka n’esemokwu ụwa a. A taala ụfọdụ n’ime ha ahụhụ, tụọ ha mkpọrọ, gbuodị ụfọdụ n’ihi na ha rubeere Jehova isi. Ihe ha mere nwere ike inyere anyị aka inwe obi ike. Otu nwanna, bụ́ onye Tọki, kwuru, sị: “E gburu otu nwanna bụ́ nwa okorobịa aha ya bụ Franz Reiter n’ihi na o kweghị abụ onye agha Hitler. Akwụkwọ ozi o degaara mama ya n’abalị bọtara ụbọchị e gburu ya gosiri na o nwere okwukwe siri ike nakwa na ọ tụkwasịrị Jehova obi. M chọrọ ime ka ya ma ọnwụnwa siri ike otú ahụ bịara m.” [2]—Tụlee ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.

18, 19. (a) Olee otú ndị nọ́ n’ọgbakọ unu nwere ike isi nyere gị aka ka ị ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị? (b) Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

18 Ụmụnna nọ́ n’ọgbakọ unu ga-enyekwara gị aka ka ị ghara itinye aka n’esemokwu ụwa a. Gwa ndị okenye ma ọ bụrụ na ọnwụnwa bịaara gị. Ha ga-eji Baịbụl nye gị ezigbo ndụmọdụ. Ọ bụrụkwa na ndị ọgbakọ unu amata ihe bụ́ nsogbu gị, ha nwere ike ịna-agba gị ume. Gwa ha ka ha na-echeta gị n’ekpere. Ma, anyịnwa kwesịrị ịna-akwado ụmụnna anyị, na-echetakwa ha n’ekpere. (Matiu 7:12) Ị chọọ ịhụ ebe e dere aha ụmụnna a tụrụ mkpọrọ, gaa n’isiokwu bụ́ “Ebe Ndị A Tụrụ Ndịàmà Jehova Mkpọrọ n’Ihi Ihe Ha Kweere,” nke dị́ n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig. Pịa ebe e dere AKỤKỌ, ma pịzie OKWU IKPE. Họrọ ụfọdụ ụmụnna ma rịọ Jehova ka o nyere ha aka inwe obi ike ma na-erubere ya isi.—Ndị Efesọs 6:19, 20.

19 Ka anyị na-eru ọgwụgwụ ụwa ochie a, anyị kwesịrị ịtụ anya na ndị ọchịchị ga na-enyekwu anyị nsogbu ka anyị dụnyere ha úkwù. Ọ bụ ya mere o ji dị́ mkpa ka anyị kpebisie ike ugbu a na anyị agaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

^ [1] (paragraf nke 1) Ọ bụ ndị ọchịchị ka Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru maka Siza. N’oge ahụ, Siza bụ onye na-achị achị. Ọ bụkwa ya bụ onye ọchịchị kacha elu.

^ [2] (paragraf nke 17) Gụọ peeji nke 662 n’akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, na igbe isiokwu ya bụ “E Gburu Ya Maka na Ọ Chọghị Inupụrụ Chineke Isi,” nke dị́ n’isi nke 14 n’akwụkwọ bụ́ Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

Kpebisie ike ugbu a na ị gaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị é nwegodị nsogbu tara akpụ

Chọpụta ma ihe ị nụrụ ọ̀ dabara adaba ‘n’ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ’ e dere na Baịbụl