Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2016

Chineke Mere Ka Unu Si ná Mmehie Pụọ n’Ihi Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ

Chineke Mere Ka Unu Si ná Mmehie Pụọ n’Ihi Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ

‘Mmehie agaghị abụ nna unu ukwu, ebe unu maara na unu nọ n’okpuru obiọma na-erughịrị mmadụ.’—ROM 6:14.

ABỤ: 2, 61

1, 2. Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji ejikarị Ndị Rom 5:12 akụziri ndị mmadụ Baịbụl?

WERE ya na ị chọrọ ide amaokwu Baịbụl Ndịàmà Jehova ma nke ọma, nke ha na-ejikarị akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ndị Rom 5:12 ọ̀ ga-eso ná ndị ị ga-ebu ụzọ dee? Chegodị ugboro ole i jirila amaokwu ahụ zie mmadụ ozi ọma. Ebe ahụ sịrị: “Dị nnọọ ka mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.”

2 E dere amaokwu Baịbụl ahụ ugboro ugboro n’akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ka i ji akwụkwọ ahụ na-amụrụ ụmụ gị ma ọ bụ ndị ọzọ ihe, i nwere ike ịgụ Ndị Rom 5:12 mgbe unu na-amụ banyere ihe Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ, ihe mgbapụta, na ebe mmadụ na-aga ma ọ nwụọ, n’isiokwu nke 3, nke 5, na nke 6. Ma, ugboro ole ka i chetarala Ndị Rom 5:12 ma e kwuwe gbasara adịm ná mma gị na Jehova, omume gị, na ihe Chineke kwere nkwa imere gị n’ọdịnihu?

3. Olee ihe anyị kwesịrị icheta banyere mmehie?

3 Ma anyị niile kwesịrị icheta na anyị bụ ndị mmehie. Anyị  na-emehie kwa ụbọchị. Ma, obi siri anyị ike na Chineke na-echeta na anyị bụ ájá. Ọ dịkwa njikere imere anyị ebere. (Ọma 103:13, 14) Otu n’ime ihe Jizọs kwuru n’Ekpere Onyenwe Anyị bụ: “Gbaghara anyị mmehie anyị.” (Luk 11:2-4) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị banyere mmehie Chineke gbaghaara anyị. Ma, o nwere ike ịbara anyị uru ma anyị chee otú o si agbaghara anyị mmehie na ihe mere o ji eme ya.

CHINEKE GBAGHAARA ANYỊ N’IHI OBIỌMA YA NA-ERUGHỊRỊ MMADỤ

4, 5. (a) Gịnị ga-enyere anyị aka ịghọta Ndị Rom 5:12? (b) Gịnị ka “obiọma na-erughịrị mmadụ” e kwuru okwu ya ná Ndị Rom 3:24 pụtara?

4 Akwụkwọ Ndị Rom, nke ka nke, isi nke isii, na-enyere anyị aka ịghọta otú Jehova nwere ike isi gbaghara anyị mmehie anyị. N’isi nke atọ, Pọl kwuru, sị: “Mmadụ niile emehiewo . . . , a na-akpọkwa ha ndị ezi omume, nke bụ́ onyinye e nyere n’efu, site n’obiọma ya na-erughịrị mmadụ site ná ntọhapụ nke si n’ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ.” (Rom 3:23, 24) Gịnị ka “obiọma na-erughịrị mmadụ” Pọl kwuru okwu ya pụtara? Otu akwụkwọ kwuru na okwu Grik e si sụgharịta ya pụtara “onyinye e nyere mmadụ n’efu, nke na-abụghị ihe ọ rụtara ma ọ bụ ihe ọ tụrụ anya ka a kwụọ ya.” Ọ bụ ihe na-erughịrị mmadụ.

5 Otu ọkà mmụta kwuru, sị: ‘E kwuwe gbasara Chineke ma ọ bụ Kraịst, okwu Grik ahụ na-apụtakarị amara ma ọ bụ obiọma ha meere ụmụ mmadụ n’efu, nke na-erughịrị ha, iji gbapụta ha ma zọpụta ha.’ N’ihi ya, ọ dabara adaba na Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ sụgharịrị okwu ahụ ka ọ bụrụ “obiọma na-erughịrị mmadụ.” Ma, olee otú Chineke si meere anyị obiọma ya na-erughịrị mmadụ? Olee otú o si gbasa olileanya i nwere nakwa adịm ná mma gị na ya? Ka anyị chọpụta.

6. Olee ndị obiọma Chineke na-erughịrị mmadụ nwere ike ịbara uru? Oleekwa otú ọ ga-esi baara ha uru?

6 “Otu mmadụ” ahụ mmehie na ọnwụ si n’aka ya “bata n’ụwa” bụ Adam. N’ihi ya, “ọnwụ si n’aka otu onye ahụ chịa dị ka eze.” Pọl kwukwara na “obiọma dị ukwuu nke na-erughịrị mmadụ” si n’aka “otu onye ahụ, ya bụ, Jizọs Kraịst.” (Rom 5:12, 15, 17) Obiọma ahụ na-erughịrị mmadụ abaarala ụmụ mmadụ uru. “A ga-eme ka ọtụtụ mmadụ ghọọ ndị ezi omume site ná nrubeisi nke otu onye ahụ.” N’eziokwu, obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke meere anyị “na-eduga ná ndụ ebighị ebi site na Jizọs Kraịst.”—Rom 5:19, 21.

7. Gịnị mere ihe mgbapụta Chineke nyere anyị ji bụrụ obiọma na-erughịrị mmadụ?

7 Iwu ejighị Jehova izite Ọkpara ya ka ọ bịa n’ụwa nwụọ maka anyị. Ihe ọzọ bụ na ụmụ mmadụ na-ezughị okè erughị eru ka Chineke na Jizọs nye ha ihe mgbapụta iji mee ka a gbaghara ha mmehie. N’ihi ya, ọ bụ obiọma na-erughịrị mmadụ mere ka Chineke na-agbaghara anyị, meekwa ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Anyị kwesịrị iji ihe ọma a na-enweghị atụ o meere anyị kpọrọ ihe ma na-ebi ndụ otú ga-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ya.

NA-EGOSI NA OBI DỊ GỊ ỤTỌ MAKA OBIỌMA NA-ERUGHỊRỊ MMADỤ CHINEKE MEERE GỊ

8. Olee ihe na-adịghị mma ndị mmadụ nwere ike ịna-eche gbasara mmehie ha?

8 Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị nwere ike imejọ, mee ihe na-adịghị mma, meekwa mmehie. Ma ọ ga-ajọgbu onwe ya ma anyị were obiọma Chineke gwuo egwu, na-eche, sị: ‘M megodị ihe Chineke sịrị na ọ bụ mmehie, o kwesịghị ichuwe m ụra. Jehova ga-agbaghara m.’ Ọ dị mwute na ụfọdụ Ndị Kraịst chedịrị otú  ahụ mgbe ụfọdụ ndịozi Jizọs ka dị ndụ. (Gụọ Jud 4.) O nwere ike anyị agaghị ekwupụta ụdị ihe ahụ ekwupụta. Ma, anyị nwere ike ibu ya n’obi ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ emee ka anyị chewe otú ahụ.

9, 10. Olee otú e si gbapụta Pọl na ndị ọzọ n’aka mmehie na ọnwụ?

9 Pọl mere ka o doo anya na anyị ekwesịghị ịna-eche, sị: ‘Chineke ghọtara. Ọ ga na-agbaghara m ma m na-eme mmehie.’ N’ihi gịnị? N’ihi na Pọl sịrị na Ndị Kraịst “nwụrụ anwụ n’ebe mmehie dị.” (Gụọ Ndị Rom 6:1, 2.) Gịnị ka ihe a Pọl kwuru pụtara ebe ọ bụ na Ndị Kraịst ka dị ndụ n’ụwa?

10 Chineke ji ihe mgbapụta ahụ gbapụta Pọl na Ndị Kraịst ndị ọzọ dịrị ndụ n’oge ya. Jehova si otú ahụ gbaghara ha mmehie ha, jiri mmụọ nsọ tee ha mmanụ ka ha bụrụ ụmụ ya, ha enwee olileanya ịga eluigwe. Ọ bụrụ na ha erubere Chineke isi, ha ga-adị ndụ ma soro Kraịst chịa n’eluigwe. Ma, gịnị mere Pọl ji kwuo na ha “nwụrụ anwụ n’ebe mmehie dị” ebe ọ bụ na ha ka dị ndụ n’ụwa na-efe Chineke? Pọl ji Jizọs mee ihe atụ n’ihi na Jizọs nwụrụ, a kpọlite ya n’ọnwụ, ya abụrụzie mmụọ na-anaghị anwụ anwụ n’eluigwe. Ọnwụ abụkwaghị nna ya ukwu. Otú ahụ ka ọ dị Ndị Kraịst e tere mmanụ. Ha nwere ike ile onwe ha anya ka “ndị nwụrụ anwụ n’ezie n’ebe mmehie dị, ma bụrụ ndị na-adịrị Chineke ndụ site n’aka Kraịst Jizọs.” (Rom 6:9, 11) Ndụ ha gbanwere kpamkpam. Ha kwụsịrị ime ihe ọjọọ na-agụ anụ ahụ́ ha. Ha nwụrụ n’ebe mmehie ha na-emebu dị.

11. Olee otú o si bụrụ na Ndị Kraịst taa “nwụrụ anwụ n’ebe mmehie dị”?

11 Anyịnwa kwanụ? Tupu anyị aghọọ Ndị Kraịst, anyị na-eme mmehie ọtụtụ mgbe. O nwedịrị ike anyị amaghị na ihe ndị ahụ dị njọ n’anya Chineke. N’oge ahụ, anyị dị ka “ohu nke adịghị ọcha na mmebi iwu.” E nwere ike ikwu na anyị “bụ ndị ohu nke mmehie.” (Rom 6:19, 20) Anyị mechara mụta eziokwu Baịbụl, gbanwee àgwà anyị, nyefee Chineke onwe anyị ma mee baptizim. Kemgbe ahụ, ọ na-agụsi anyị agụụ ike ‘isi n’obi anyị na-erube isi’ n’ihe Chineke na-akụziri anyị. E ‘mere ka anyị si ná mmehie pụọ nwere onwe anyị’ ma ‘ghọọ ndị ohu nke ezi omume.’ (Rom 6:17, 18) N’ihi ya, e nwere ike ikwu na anyịnwa “nwụrụ anwụ n’ebe mmehie dị.”

12. Olee ihe onye ọ bụla n’ime anyị ga-eji aka ya kpebie?

12 Chebagodịrị onwe gị echiche n’ihi ihe Pọl kwuru. Ọ sịrị: “Unu ekwela ka mmehie na-achị dị ka eze n’ahụ́ unu nke pụrụ ịnwụ anwụ ka unu wee na-erubere ọchịchọ ya isi.” (Rom 6:12) Anyị nwere ike ịna-eme ihe ọ bụla anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè chọrọ, sí otú ahụ gosi na anyị ‘kwere ka mmehie na-achị anyị.’ Ebe anyị nwere ike ‘kwee’ ka mmehie na-achị anyị ma ọ bụ ghara ikwe ka ọ na-achị anyị, ajụjụ bụ, Olee nke anyị chọrọ ime n’eziokwu? Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-ekwe ka ihe ọjọọ gụsie m ike ruo nke na m ga-eme ihe na-adịghị mma? Ka m̀ na-ajụ ya ozugbo? M̀ na-eme ihe Chineke na Kraịst Jizọs chọrọ?’ Ọ bụrụ na obi dị anyị ezigbo ụtọ maka obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke meere anyị, anyị ga-agbasi mbọ ike ime ihe ga-adị ya mma.

Ị GA-EMERILI N’ỌGỤ Ị NA-ALỤSO MMEHIE

13. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na anyị ga-ahapụli mmehie?

13 Ndị Jehova ahapụla omume ọjọọ ha na-emebu tupu ha amata Chineke, hụ ya n’anya ma fewe ya. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ ha na-emebu bụ ‘ihe ndị na-eme ha ihere ugbu a’ na ihe ndị gaara akpatara ha ọnwụ. (Rom 6:21) Ma ha gbanwere. Otú ahụ ka ọtụtụ n’ime ndị Kọrịnt Pọl degaara akwụkwọ ozi mere. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị na-ekpere arụsị, ndị na-akwa iko, ndị na-edina ndị ikom ibe ha, ndị ohi, ndị aṅụrụma,  na ihe yiri ya. Ma, ‘a sachara ha, dookwa ha nsọ.’ (1 Kọr. 6:9-11) O yiri ka ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa ụfọdụ ndị nọ́ n’ọgbakọ dị́ na Rom. Pọl si n’ike mmụọ nsọ degara ha akwụkwọ, sị: “Unu enyefekwala akụkụ ahụ́ unu n’aka mmehie ka ọ bụrụ ngwá ọgụ nke ajọ omume, kama na-enyefenụ onwe unu n’aka Chineke dị ka ndị si ná ndị nwụrụ anwụ dị ndụ, na-enyefekwanụ akụkụ ahụ́ unu n’aka Chineke ka ọ bụrụ ngwá ọgụ nke ezi omume.” (Rom 6:13) Obi siri Pọl ike na ha ga na-eme ihe dị́ mma, obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke meere anyị ana-abakwara ha uru.

14, 15. Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị gbasara ‘isi n’obi anyị na-erube isi’?

14 Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ụmụnna anyị na-akpabu àgwà ka ndị ahụ nọ́ na Kọrịnt. Ma, ha gbanwere, hapụ mmehie ha na-emebu, ‘a sachaa ha.’ Ọ bụrụ na i mere otú ahụ, olee otú Chineke si ele gị anya ugbu a? Ugbu a Chineke meere gị obiọma ya na-erughịrị mmadụ ma gbaghara gị, ì kpebisiela ike na ị gaghịzi ‘enyefe ahụ́ gị n’aka mmehie’? Ị̀ ga ‘na-enyefe onwe gị n’aka Chineke dị ka onye si ná ndị nwụrụ anwụ dị ndụ’?

15 Ka anyị nwee ike ime otú ahụ, anyị ekwesịghị ime mmehie ndị ahụ jọgburu onwe ha ụfọdụ ndị nọ́ na Kọrịnt mere. Anyị gbaara mmehie ndị ahụ ọsọ, ọ ga-egosi na obi dị anyị ụtọ maka obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke meere anyị, gosikwa na ‘mmehie abụghị nna anyị ukwu.’ Ma, ànyị kpebisiri ike ‘isi n’obi anyị na-erubere Chineke isi’ ma na-agbalịsi ike ka anyị ghara ime mmehie ụfọdụ ndị na-ewere na ọ dịchaghị njọ?—Rom 6:14, 17.

16. Olee otú anyị si mara na ịbụ Onye Kraịst apụtaghị naanị isepụ aka ná mmehie ndị dị oké njọ?

16 Chegodị banyere Pọl onyeozi. O doro anya na ọ naghị eme ihe ndị ahụ jọgburu onwe ha e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 6:9-11. Ma, o kwuru na ya na-eme mmehie. Ọ sịrị: “Abụ m anụ ahụ́, onye e rere ịnọ n’okpuru mmehie. N’ihi na ihe m na-arụpụta ka m na-amaghị. N’ihi na ihe m na-achọ ime ka m na-adịghị eme; ma ihe m kpọrọ asị ka m na-eme.” (Rom 7:14, 15) Ihe a Pọl kwuru gosiri na e nwere ihe ndị ọzọ o weere ka mmehie, ya ana-agbasikwa mbọ ike ka ọ ghara ime ihe ọjọọ ndị ahụ. (Gụọ Ndị Rom 7:21-23.) Ka anyị na-eme otú ahụ o mere ma na-agbalịsi ike ‘isi  n’obi anyị na-erubere Chineke isi.’

17. Gịnị mere i ji chọọ ịna-akwụwa aka ọtọ?

17 Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara ịkwụwa aka ọtọ. Ndị Kraịst kwesịrị ịna-ekwu eziokwu. (Gụọ Ilu 14:5; Ndị Efesọs 4:25.) Setan bụ “nna ụgha.” Ananayas na nwunye ya nwụrụ n’ihi na ha ghara ụgha. Anyị achọghị ime ka ha. N’ihi ya, anyị anaghị agha ụgha. (Jọn 8:44; Ọrụ 5:1-11) Ma, ịkwụwa aka ọtọ ọ̀ pụtara naanị na anyị agaghị agha ụgha? N’eziokwu, otú anyị si akwụwa aka ọtọ kwesịrị igosi na obi dị anyị ezigbo ụtọ maka obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke meere anyị.

18, 19. Gịnị mere ịkwụwa aka ọtọ apụtaghị naanị na anyị agaghị agha ụgha?

18 Ịgha ụgha bụ ikwu ihe na-abụghị eziokwu. Ma, ihe Jehova chọrọ ka ndị ya na-eme abụghị naanị na ha agaghị agha ụgha. Ọ gwara ndị Izrel oge ochie, sị: “Unu ga-adị nsọ, n’ihi na mụ onwe m bụ́ Jehova Chineke unu dị nsọ.” O ji ihe atụ kọwaa ihe ịdị nsọ pụtara. Ọ sịrị: “Unu ezula ohi, unu aghọla aghụghọ, unu emesola mmadụ ibe unu ihe n’ụzọ aghụghọ.” (Lev. 19:2, 11) Ma, ọ dị mwute na onye kwuru na ya anaghị agha ụgha nwere ike ịna-aghọ aghụghọ.

Ànyị kpebisiri ike ịgbara ma ịgha ụgha ma ịghọ aghụghọ ọsọ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)

19 Dị ka ihe atụ, ka e were ya na mmadụ gwara onye ọ na-arụrụ ọrụ ma ọ bụ ndị ọrụ ibe ya na ya agaghị abịa ọrụ echi  ma ọ bụ na ya ga-alawa tupu a gbasaa ọrụ n’ihi na ọ chọrọ ịga hụ dọkịta. Nke bụ́ eziokwu bụ na dọkịta ọ chọrọ ịga hụ bụ ịba n’ebe a na-ere ọgwụ ma ọ bụ ịga kwụọ dọkịta ụgwọ n’egbughị oge. Ihe mere o ji kwuo ihe ahụ bụ ka o bido n’oge gawa ebe ọ chọrọ ịga ma ọ bụ ka ọ kpọrọ ndị ezinụlọ ya gaa ebe ha ga-ekpori ndụ. Ihe o kwuru nwere ike iyi eziokwu, ma ị̀ ga-asị na o kwuru eziokwu? Ka ọ̀ ghọrọ aghụghọ? I nwere ike mara ihe atụ yiri nke a. O nwere ike ịbụ na onye ahụ ghọrọ aghụghọ ka a ghara ịta ya ahụhụ ma ọ bụ ka o nweta ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụgodị na onye ahụ aghaghị ụgha, ọ̀ bụ na Chineke asịghị: “Unu aghọla aghụghọ”? Chetakwa na Ndị Rom 6:19 sịrị: “Nyefeenụ ahụ́ unu otú ahụ ugbu a ka ọ bụrụ ohu nke ezi omume, ka o wee rụpụta ihe dị nsọ.”

20, 21. Ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ maka obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke meere anyị, gịnị ka anyị na-ekwesịghị ime?

20 Otú anyị si egosi na obi dị anyị ụtọ maka obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke meere anyị abụghị naanị na anyị agaghị akwa iko, ṅụbiga mmanya ókè ma ọ bụ mee mmehie ndị ọzọ ụfọdụ ndị mere na Kọrịnt. Ọ pụtaghị naanị na anyị agaghị akwa iko, kama ọ pụtakwara na anyị agaghị etinye aka ná ntụrụndụ rụrụ arụ. Ọ bụghị naanị na anyị anaghị aṅụbiga mmanya ókè, kama anyị anaghị aṅụ mmanya ruo mgbe ọ fọrọ obere ka o gbuwe anyị. O nwere ike ịbụ na anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị merie n’ọgụ anyị na-alụso omume ọjọọ ndị a. Ma, anyị ga-emerili n’ọgụ ahụ.

21 Ihe anyị kwesịrị ibu n’obi bụ ka anyị ghara ime ma mmehie ndị dị oké njọ ma ndị e nwere ike iche na ha adịghị oké njọ. Anyị agaghị emetacha ihe niile. Ma, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike otú ahụ Pọl mere. Ọ gbara ụmụnna ya ume, sị: “Unu ekwela ka mmehie na-achị dị ka eze n’ahụ́ unu nke pụrụ ịnwụ anwụ ka unu wee na-erubere ọchịchọ ya isi.” (Rom 6:12; 7:18-20) Ọ bụrụ na anyị na-agbalịsi ike ka anyị ghara ime ụdị mmehie ọ bụla, anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke si n’aka Kraịst meere anyị.

22. Olee ụgwọ Chineke ga-akwụ anyị ma anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka obiọma na-erughịrị mmadụ o meere anyị?

22 Chineke agbagharala anyị ma ka na-agbaghara anyị n’ihi obiọma na-erughịrị mmadụ o meere anyị. N’ihi otú obi si dị anyị ụtọ maka ya, ka anyị gbasie mbọ ike ka anyị ghara ime ihe Chineke sịrị na ọ dị njọ, ọ bụrụgodị na ndị ọzọ ewereghị ya na ọ bụ mmehie. Pọl gwara anyị ụgwọ Chineke ga-akwụ anyị. Ọ sịrị: “Ebe e mere ka unu si ná mmehie pụọ nwere onwe unu ugbu a, ma ghọọ ndị ohu Chineke, mkpụrụ unu na-enweta bụ ịdị nsọ, ọ ga-edugakwa ná ndụ ebighị ebi.”—Rom 6:22.