Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2016

“Ịtụkwasị Uche na Mmụọ Nsọ Pụtara Ndụ na Udo”

“Ịtụkwasị Uche na Mmụọ Nsọ Pụtara Ndụ na Udo”

“Ndị na-eme ihe mmụọ nsọ chọrọ na-atụkwasị uche ha n’ihe mmụọ nsọ.”—ROM 8:5.

ABỤ: 57, 52

1, 2. Gịnị mere ihe e kwuru ná Ndị Rom isi asatọ ji kacha gbasa Ndị Kraịst e tere mmanụ?

O NWERE ike ịbụ na ị gụọla Ndị Rom 8:15-17 n’oge a na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs. Amaokwu ndị ahụ kọwara otú Ndị Kraịst si amata na ha bụ ndị e tere mmanụ. Mmụọ nsọ na-agbara mmụọ ha àmà. Amaokwu nke mbụ kwuru na ha bụ “ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu.” Ma, Ndị Rom isi asatọ ọ̀ gbasara naanị ndị e tere mmanụ? Ka ọ̀ gbasakwara Ndị Kraịst nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa?

2 Ọ bụ ndị e tere mmanụ ka e bu n’obi dee Ndị Rom isi asatọ. Ha natara “mmụọ ahụ” ebe ọ bụ na ha ‘na-eche ka e doo ha dị ka ụmụ, ka e jiri ihe mgbapụta tọhapụ ahụ́ ha.’ (Rom 8:23) N’ọdịnihu, ha ga-abụ ụmụ Chineke n’eluigwe, n’ihi na ha bụ Ndị Kraịst e mere baptizim, Chineke agbaghara ha mmehie ha n’ihi ihe mgbapụta ahụ, kpọọkwa ha ndị ezi omume ka ha nwee ike ịbụ ụmụ ya.—Rom 3:23-26; 4:25; 8:30.

3. Gịnị mere anyị ji kwuo na ihe e dere ná Ndị Rom isi asatọ gbasakwara ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa?

3 Ma, ihe e kwuru ná Ndị Rom isi asatọ gbasakwara ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa n’ihi na Chineke  weere ha ka ndị ezi omume. Ihe Pọl dere ná Ndị Rom gosiri na ọ bụ eziokwu. N’isi nke anọ, o kwuru banyere Ebreham, bụ́ nwoke nwere okwukwe. Ọ dịrị ndụ tupu Jehova enye ndị Izrel Iwu ya nakwa ọtụtụ afọ tupu Jizọs anwụọ maka mmehie anyị. Ma, Jehova hụrụ na okwukwe Ebreham siri ike ma kpọọ ya onye ezi omume. (Gụọ Ndị Rom 4:20-22.) Taa, ọtụtụ Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Jehova nwekwara ike ịkpọ ha ndị ezi omume. N’ihi ya, ha nwere ike irite uru na ndụmọdụ e nyere ndị ezi omume ná Ndị Rom isi asatọ.

4. Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ma anyị gụọ Ndị Rom 8:21?

4 Ndị Rom 8:21, Jehova mesiri anyị obi ike na ụwa ọhụrụ ga-abịa. Amaokwu ahụ kwere anyị nkwa na a “ga-emekwa ka ihe e kere eke nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” Ajụjụ bụ, Ànyị ga-aba n’ụwa ọhụrụ ahụ ma nweta nkwa ahụ Chineke kwere anyị? Obi ò siri gị ike na ị ga-aba na ya? Ndụmọdụ dị́ ná Ndị Rom isi asatọ ga-enyere gị aka ime otú ahụ.

“ỊTỤKWASỊ UCHE N’ANỤ AHỤ́”

5. Ndị Rom 8:4-13, olee ihe dị mkpa Pọl kwuru banyere ya?

5 Gụọ Ndị Rom 8:4-13. Ndị Rom isi asatọ kwuru ihe dị iche ná ndị na-eme ihe “ihe anụ ahụ́ chọrọ” na ndị na-eme ihe “mmụọ nsọ chọrọ.” Ụfọdụ ndị nwere ike iche na ebe ahụ na-ekwu banyere ihe dị iche ná ndị nọ n’ọgbakọ na ndị na-anọghị, ihe dị iche ná ndị bụ́ Ndị Kraịst na ndị na-abụghị. Ma, ndị Pọl degaara akwụkwọ ozi a bụ “ndị nọ na Rom bụ́ ndị Chineke hụrụ n’anya, ndị a kpọrọ ịbụ ndị nsọ.” (Rom 1:7) N’ihi ya, Pọl na-ekwu banyere ihe dị iche ná Ndị Kraịst na-eme ihe anụ ahụ́ ha chọrọ na ndị na-eme ihe mmụọ nsọ chọrọ. Olee ihe dị iche?

6, 7. (a) Olee ihe ụfọdụ okwu ahụ bụ́ “anụ ahụ́” pụtara na Baịbụl? (b) N’ihe Pọl kwuru ná Ndị Rom 8:4-13, gịnị ka okwu ahụ bụ́ “anụ ahụ́” pụtara?

6 Chegodị banyere okwu ahụ bụ́ “anụ ahụ́.” Gịnị ka okwu a Pọl kwuru pụtara? E nwere ihe dị iche iche “anụ ahụ́” pụtara na Baịbụl. Mgbe ụfọdụ, ọ na-apụta ahụ́ mmadụ. (Rom 2:28; 1 Kọr. 15:39, 50) E nwekwara ike iji ya kọwaa ndị si n’otu ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl  kwuru na Jizọs “si ná mkpụrụ Devid pụta dị ka anụ ahụ́ si dị.” Pọl kpọkwara ndị Juu ‘ndị ikwu ya n’anụ ahụ́.’—Rom 1:3; 9:3.

7 Ma, ihe Pọl dere n’isi nke asaa mere ka anyị mata ihe “anụ ahụ́” e kwuru okwu ya ná Ndị Rom 8:4-13 pụtara. Ihe Pọl kwuru gosiri na e nwere ihe jikọrọ ‘ime ihe dị ka anụ ahụ́ si chọọ’ na “ọchịchọ mmehie” nke ‘nọ na-akpa ike n’ahụ́ ha.’ (Rom 7:5) Ihe a mere ka anyị ghọta ihe okwu ahụ bụ́ “ndị na-eme ihe anụ ahụ́ chọrọ” pụtara, bụ́ ndị Pọl sịrị na ha “na-atụkwasị uche ha n’ihe anụ ahụ́.” Ndị Pọl na-ekwu banyere ha bụ ndị anụ ahụ́ na-achị ma ọ bụ ndị uche ha niile dị n’ihe na-agụ ha agụụ na ihe ha chọrọ. Ha na-eme ihe ọ bụla batara ha n’obi na ihe ọ bụla gụrụ ha agụụ, ma ọ̀ bụ ihe gbasara mmekọahụ ma ọ bụ ihe ọzọ.

8. Gịnị mere o ji daba adaba na Pọl dọrọ Ndị Kraịst e tere mmanụ aka ná ntị ka ha ghara ‘ịna-eme ihe anụ ahụ́ ha chọrọ’?

8 Ma i nwere ike ịna-eche ihe mere Pọl ji dọọ Ndị Kraịst e tere mmanụ aka ná ntị ka ha ghara ‘ịna-eme ihe anụ ahụ́ ha chọrọ.’ Ụdị ihe ahụ ò nwere ike ime Ndị Kraịst taa, bụ́ ndị Chineke kpọrọ ndị enyi ya na ndị ezi omume? Ọ dị mwute na Onye Kraịst nwere ike imewe ihe anụ ahụ́ ya na-ezughị okè chọrọ. Dị ka ihe atụ, Pọl dere na ụfọdụ ụmụnna nọ́ na Rom bụ ohu “nke afọ ha,” ya bụ, ihe ndị na-agụ ha agụụ. O nwere ike ịbụ na ihe Pọl na-ekwu bụ na mmekọahụ, nri, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bụ ihe kacha mkpa ná ndụ ha. Ụfọdụ n’ime ha ‘na-arafu ndị na-adịghị aghụghọ.’ (Rom 16:17, 18; Fil. 3:18, 19; Jud 4, 8, 12) Chetakwa na e nwere mgbe otu nwoke nọ́ na Kọrịnt “kpọọrọ nwunye nna ya.” (1 Kọr. 5:1) Ka a sịkwa ihe mere Chineke ji si n’ọnụ Pọl dọọ Ndị Kraịst aka ná ntị ka ha ghara ‘ịna-atụkwasị uche ha n’ihe anụ ahụ́.’—Rom 8:5, 6.

9. Olee ihe ndụmọdụ Pọl nyere ná Ndị Rom 8:6 na-apụtaghị?

9 Ihe ahụ Pọl kwuru gbasakwara anyị taa. Uche Onye Kraịst nwere ike ịdịwa n’ihe anụ ahụ́ n’agbanyeghị na o feela Chineke ọtụtụ afọ. Ihe a na-ekwu okwu ya abụghị Onye Kraịst iche banyere nri, ọrụ, ịtụrụ ndụ ma ọ bụdị mmekọahụ di na nwunye. Ihe ndị a bụ ihe onye na-efe Chineke nwere ike ime. Jizọs riri nri, nyekwa ndị ọzọ nri. E nwekwara mgbe  ụfọdụ ọ tụụrụ ndụ. Pọl kwukwara na di na nwunye ga na-enwe mmekọahụ.

Ihe ị na-ekwu ọ̀ na-egosi na ị ‘na-atụkwasị uche na mmụọ nsọ’ ka ọ̀ bụ “n’anụ ahụ́”? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na 11)

10. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ịtụkwasị uche” e kwuru ná Ndị Rom 8:5, 6 pụtara?

10 Gịnịzi ka “ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́” Pọl kwuru okwu ya pụtara? Okwu Grik Pọl kwuru ebe a pụtara ‘mmadụ ime ka uche ya niile dịrị n’ihe, ya ana-eche otú ọ ga-esi eme ya, àgwà ya ana-egosikwa ihe ọ na-eche.’ Ndị uche ha dị n’anụ ahụ́ na-eji ihe na-agụ anụ ahụ́ ha na-ezughị okè ekpebi ihe ha ga-eme. Otu ọkà mmụta kwuru banyere ihe e dere ná Ndị Rom 8:5, sị: “Ha na-eme ka uche ha dịrị n’ihe gbasara anụ ahụ́. Ọ bụ ihe kacha amasị ha, ihe ha na-ekwukarị gbasara ya, na ihe ha na-emekarị, nke rikwara ha isi.”

11. Olee ihe ụfọdụ nwere ike ịkacha anyị mkpa?

11 Ndị Kraịst nọ́ na Rom kwesịrị ichebara onwe ha echiche ma chọpụta ihe kacha ha mkpa. Ọ̀ bụ ‘ihe anụ ahụ́’? Taa, anyị kwesịkwara iche gbasara ihe kacha anyị mkpa ná ndụ. Olee ihe kacha amasị anyị? Olee ihe anyị na-ekwukarị gbasara ya? Gịnị ka anyị ji kpọrọ mkpa kwa ụbọchị? Ụfọdụ nwere ike ịchọpụta na ihe kacha ha mkpa bụ ịmata otú mmanya dị iche iche na-atọ, ịchọ ụlọ ha mma, ịmata ụdị efe ndị pụtara ọhụrụ, iji ego achụ ego, ma ọ bụ iji oge ezumike gaa kporie ndụ. Ihe ndị a adịghị njọ. A na-eme ha eme. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe Jizọs mere ka mmiri ghọọ mmanya. Pọl gwakwara Timoti ka ọ na-aṅụ “ntakịrị mmanya.” (1 Tim. 5:23; Jọn 2:3-11) Ma, Jizọs na Pọl hà ‘na-aṅụkarị mmanya, na-ekwukarị gbasara ya, ya eriekwa ha isi’? Mbanụ. Anyịnwa kwanụ? Olee ihe na-amasịkarị anyị?

12, 13. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya n’ihe uche anyị kacha dịrị na ya?

12 Anyị kwesịrị ileru onwe anyị anya. Maka gịnị? Pọl dere, sị: “Ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́ pụtara ọnwụ.” (Rom 8:6) Ọ pụtara na o nwere ike mee ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma ugbu a, meekwa ka anyị nwụọ n’ọdịnihu. Ma, ihe Pọl kwuru apụtaghị na mmadụ malite “ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́,” na onye ahụ ga-anwụrịrị. Onye ahụ nwere ike ịgbanwe. Chegodị banyere nwoke ahụ na-eme omume rụrụ arụ n’ọgbakọ dị́ na Kọrịnt, onye mere ihe na-agụ ‘anụ ahụ́’ ya, a chụọ ya n’ọgbakọ. Ma, ọ gbanwere, kwụsị ime omume rụrụ arụ, malitekwa ime ihe dị Jehova mma.—2 Kọr. 2:6-8.

13 Ebe nwoke ahụ gbanwere, Onye Kraịst n’oge anyị a nwekwara ike ịgbanwe, nke ka nke, onye mmehie ya na-erughị ka nke nwoke ahụ nọ́ n’ọgbakọ dị́ na Kọrịnt. N’eziokwu, ihe Pọl kwuru gbasara ihe nwere ike imecha mee onye ‘na-atụkwasị uche n’anụ ahụ́’ kwesịrị ime ka Ndị Kraịst gbanwee ihe ọ bụla ha kwesịrị ịgbanwe.

“ỊTỤKWASỊ UCHE NA MMỤỌ NSỌ”

14, 15. (a) Olee ihe Pọl gwara anyị ka anyị ‘tụkwasị uche anyị’ na ya? (b) Olee ihe “ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ” na-apụtaghị?

14 Mgbe Pọl onyeozi dọchara anyị aka ná ntị banyere “ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́,” o kwuru, sị: “Ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ pụtara ndụ na udo.” Ndụ na udo bụ ụgwọ ọrụ na-enweghị atụ anyị ga-enweta. Olee otú anyị ga-esi enweta ya?

15 Mmadụ ‘ịtụkwasị uche ya na mmụọ nsọ’ apụtaghị na onye ahụ anaghị eche gbasara ihe na-eme n’ebe ọ nọ. Ọ pụtaghị na naanị ihe onye ahụ na-eche ma ọ bụ na-ekwu gbasara ya bụ Baịbụl ma ọ bụ otú o si hụ Chineke n’anya nakwa olileanya o nwere maka ọdịnihu. Ka anyị cheta na n’oge ndịozi Jizọs, Pọl na ndị ọzọ, bụ́ ndị mere ihe Chineke  na-achọ, mere ihe ndị a na-eme eme na-adịghị njọ. Ha riri nri, ṅụọ ihe ọṅụṅụ. Ọtụtụ ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, mụọ ụmụ, na-arụkwa ọrụ iji nweta ihe ha ga-eji na-egbo mkpa ha.—Mak 6:3; 1 Tesa. 2:9.

16. Ọ bụ eziokwu na Pọl mere ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-eme, gịnị bụ ọrụ kacha ya mkpa?

16 Ma, ndị ohu Chineke ndị a ekweghị ka ihe ndị a ha na-eme bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ ha. Mgbe Baịbụl kwuchara na ọrụ Pọl bụ ịkpa ákwà ụlọikwuu, o kwuru na ọrụ kacha mkpa ọ na-arụ bụ ikwusa ozi ọma na ịkụzi Okwu Chineke. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 18:2-4; 20:20, 21, 34, 35.) Ọ bụ ọrụ a ka ọ gwara ụmụnna nọ́ na Rom ka ha na-arụ. N’eziokwu, ihe kacha Pọl mkpa bụ ijere Chineke ozi. Ụmụnna nọ́ na Rom kwesịrị iṅomi Pọl. Anyị kwesịkwara ime otú ahụ.—Rom 15:15, 16.

17. Olee uru anyị ga-erite ma anyị ‘tụkwasị uche na mmụọ nsọ’?

17 Olee uru anyi ga-erite ma anyị jiri ozi anyị na-ejere Jehova kpọrọ ihe? Ndị Rom 8:6 sịrị: “Ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ pụtara ndụ na udo.” Ọ pụtara na anyị ga-ekwe ka mmụọ nsọ na-eduzi obi anyị, anyị ana-eche echiche otú Jehova si eche. Obi kwesịrị isi anyị ike na anyị kwe ka “mmụọ nsọ” na-eduzi anyị n’ihe niile anyị na-eme, anyị ga na-enwe obi ụtọ, ndụ anyị ga-enwekwa isi. Anyị ga-enweta ndụ ebighị ebi, ma ọ̀ bụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa.

18. Olee otú obi ga-esi ruo anyị ala ma anyị ‘tụkwasị uche anyị na mmụọ nsọ’?

18 Ka anyị chegodị ihe ahụ Pọl kwuru, nke bụ́ na “ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ pụtara . . . udo.” Ọtụtụ ndị na-agbalị ka obi ruo ha ala. Ka ha na-achọ otú obi ga-esi ruo ha ala, Jehova emeela ka obi ruo anyị ala. Otu n’ime ihe mere obi ji ruo anyị ala bụ na anyị na ndị ezinụlọ anyị na ndị ọgbakọ anyị dị ná mma. O doro anyị anya na anyị na ụmụnna anyị ezughị okè. N’ihi ya, anyị na ha nwere ike inwe nghọtahie. Ụdị ihe ahụ mee, Jizọs agwala anyị ihe anyị kwesịrị ime. Ọ sịrị: “Mee ka gị na nwanne gị dị n’udo.” (Mat. 5:24) Ọ ga-adịrị anyị mfe ime otú ahụ ma anyị cheta na ụmụnna anyị na-efekwa “Chineke onye na-enye udo.”—Rom 15:33; 16:20.

19. Olee ụdị udo pụrụ iche anyị ga-enweta ma anyị ‘tụkwasị uche na mmụọ nsọ’?

19 E nwere ụdị udo ọzọ bara ezigbo uru anyị ga-enweta. Anyị na Chineke ga-adị ná mma ma anyị ‘tụkwasị uche na mmụọ nsọ.’ Aịzaya buru amụma mezuru n’oge ya, ma otú o si na-emezu n’oge anyị a ka nke oge Aịzaya. Ọ gwara Jehova, sị: “Ị ga-echebe onye nwere ọchịchọ siri ike ka o nwee udo na-adịghị akwụsị akwụsị, n’ihi na ọ bụ gị ka e mere ka ọ tụkwasị obi.”—Aịza. 26:3; gụọ Ndị Rom 5:1.

20. Gịnị mere obi ji dị gị ụtọ maka ndụmọdụ dị́ ná Ndị Rom isi asatọ?

20 Ma ànyị bụ ndi e tere mmanụ ma ànyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs n’ụwa, obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ maka ndụmọdụ dị́ ná Ndị Rom isi asatọ. Obi dị anyị ụtọ na Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara ikwe ka ‘ihe anụ ahụ́’ bụrụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ. Kama, anyị ma na ọ ga-abara anyị uru ma anyị na-eme ihe a Baịbụl kwuru bụ́: “Ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ pụtara ndụ na udo.” Anyị mee otú ahụ, anyị ga-enweta ndụ ebighị ebi. Ọ bụ ya mere Pọl ji kwuo, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ, ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.”—Rom 6:23.