Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2016

Jehova Na-akwụ Ndị Na-achọsi Ya Ike Ụgwọ Ọrụ

Jehova Na-akwụ Ndị Na-achọsi Ya Ike Ụgwọ Ọrụ

“Onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, na ọ bụkwa onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”—HIB. 11:6.

ABỤ: 85, 134

1, 2. (a) Olee otú ịhụnanya si gbasa inwe okwukwe? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

ANYỊ hụrụ Jehova n’anya “n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya.” (1 Jọn 4:19) Otu n’ime ụzọ Jehova si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya bụ na o kwere nkwa ịgọzi ndị ji obi ha niile na-efe ya. Ọ bụrụ na anyị ana-ahụkwu Chineke n’anya, obi ga-esikwu anyị ike na Chineke dị nakwa na e nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara ịkwụ ndị ọ hụrụ n’anya ụgwọ.—Gụọ Ndị Hibru 11:6.

2 Ịkwụ ndị mmadụ ụgwọ anaghị esiri Jehova ike. Ọ na-atọ ya ụtọ ime ya. Okwukwe anyị agaghị ezu ezu ma ọ bụrụ na obi esighị anyị ike na Chineke ga-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ, n’ihi na “okwukwe bụ atụmanya e ji n’aka na ihe ndị a na-ele anya ha ga-emezu.” (Hib. 11:1) Inwe okwukwe pụtara na anyị ga na-atụsi anya ike ka Chineke mezuo nkwa ndị o kwere anyị. Ma, olee uru anyị ga-erite ma anyị nwee olileanya na Chineke ga-akwụ anyị ụgwọ? Olee otú Jehova sirila kwụọ ndị jeere ya ozi ụgwọ, ma n’oge gara aga ma n’oge anyị a? Ka anyị chọpụta.

JEHOVA KWERE NKWA ỊGỌZI NDỊ NA-EFE YA

3. Olee nkwa Chineke kwere anyị na Malakaị 3:10?

3 Jehova Chineke ekwela nkwa na ya ga-agọzi ndị ji obi ha  niile na-efe ya. Ọ bụ ya mere o ji gwa anyị ka anyị gbalịsie ike inweta ngọzi ya. Baịbụl gwara anyị, sị: “‘Biko, nwaleenụ m . . . ,’ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘ma ḿ gaghị emeghe ọnụ ụzọ mmiri nke eluigwe wee wụsa unu ngọzi ruo mgbe ọ na-adịghị ihe ga-akọ unu.’” (Mal. 3:10) Anyị mee ihe a Jehova kwuru, ọ ga-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọ gwara anyị.

4. Gịnị mere anyị ji kwesị ịtụkwasị nkwa ahụ Jizọs kwere na Matiu 6:33 obi?

4 Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa na Chineke ga na-elekọta ha ma ha buru ụzọ na-achọ Alaeze ya. (Gụọ Matiu 6:33.) Ihe mere Jizọs ji kwe ha nkwa ahụ bụ na ọ ma na Jehova na-eme ihe ọ bụla o kwuru. Obi siri ya ike na nkwa ọ bụla Chineke kwere ga-emezurịrị. (Aịza. 55:11) Obi kwesịkwara isi anyị ike na anyị tụkwasị Jehova obi anyị niile, ọ ga-emezu nkwa ahụ o kwere anyị, nke bụ́: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” (Hib. 13:5) Nkwa a o kwere anyị na-echetara anyị ihe ahụ Jizọs kwuru gbasara ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume ya.

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na Chineke ga-akwụ ha ụgwọ maka ihe ndị ha hapụrụ iji jeere ya ozi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

5. Gịnị mere ihe Jizọs zara Pita ji eme ka okwukwe anyị sikwuo ike?

5 O nwere mgbe Pita onyeozi jụrụ Jizọs, sị: “Anyị ahapụwo ihe niile, soro gị; gịnịkwanụ ka anyị ga-enweta?” (Mat. 19:27) Kama ịbara Pita mba, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na Chineke ga-akwụ ha ụgwọ maka ihe ndị ha hapụrụ. Ndịozi ya na ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi ga-eso ya chịa n’eluigwe. Ma, e nwere ụgwọ Chineke na-akwụ anyị ugbu a.  Jizọs sịrị: “Onye ọ bụla nke hapụworo ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom ma ọ bụ nna ma ọ bụ nne ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ala n’ihi aha m ga-enweta ihe karịrị ya okpukpu okpukpu, ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.” (Mat. 19:29) Ndị na-eso ụzọ ya ga-enweta ngọzi karịrị ihe ọ bụla ha hapụrụ. Ọ̀ bụ na nna, nne, ụmụnne ndị ikom, ụmụnne ndị inyom, na ụmụ anyị na-enweta n’ọgbakọ akarịghị ihe ọ bụla anyị hapụrụ iji na-ejere Chineke ozi?

“ARỊLỊKA MAKA MKPỤRỤ OBI”

6. Gịnị mere Jehova ji kwe ndị na-efe ya nkwa na ya ga-akwụ ha ụgwọ?

6 Jehova chọrọ inyere ndị ohu ya aka ịtachi obi n’ọnwụnwa bịaara ha. Ọ bụ ya mere o ji kwe nkwa na ya ga-akwụ anyị ụgwọ. E wezụga ihe ọma ndị Jehova na-emere anyị ugbu a, anyị na-atụsi anya ike ịhụ ihe ọma ndị ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu. (1 Tim. 4:8) Obi sie anyị ike na Jehova “na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ,” okwukwe anyị ga-esi ezigbo ike.—Hib. 11:6.

7. Olee otú olileanya si dị ka arịlịka?

7 N’ihe Jizọs kụziri n’elu ugwu, ọ sịrị: “Ṅụrịanụ ọṅụ, nweekwanụ obi ụtọ nke ukwuu, n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe; n’ihi na otú ahụ ka ha kpagburu ndị amụma bu unu ụzọ.” (Mat. 5:12) Ụfọdụ ndị ohu Chineke ga-enweta ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe. Ndị ọzọ ga-enweta ndụ ebighị ebi mgbe ụwa ga-abụ paradaịs. Olileanya ahụ kwesịkwara ime ka ha ‘ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nke ukwuu.’ (Ọma 37:11; Luk 18:30) Ma ànyị ga-aga eluigwe ma ànyị ga-ebi n’ụwa, olileanya anyị nwere ike ‘ịdị ka arịlịka maka mkpụrụ obi,’ ya bụ, na o kwesịrị ime ka okwukwe anyị sie ezigbo ike. (Hib. 6:17-20) Arịlịka bụ ihe na-eme ka ụgbọ mmiri kwụsie ike. Otú ahụ ka olileanya anyị nwere na Chineke ga-akwụ anyị ụgwọ ga-esi nyere anyị aka ka okwukwe anyị sie ike. Ọ ga-emekwa ka anyị nwee ike idi nsogbu bịaara anyị.

8. Olee otú olileanya anyị si eme ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị?

8 Olileanya anyị sí na Baịbụl nwere ike ime ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị. Nkwa Chineke kwere anyị nwere ike ime ka obi dajụọ anyị otú ahụ ọ na-abụ, e tee mmadụ ọgwụ n’ebe ihe mere ya, ya akwụsị ịfụ ya ụfụ. Obi ga-eru anyị ala ma anyị ‘tụkwasị Jehova ibu’ ọ bụla na-anyịgbu anyị, ebe anyị ma na ọ ‘ga-akwado anyị.’ (Ọma 55:22) Obi siri anyị ezigbo ike na Chineke “pụrụ ime ihe nke ukwuu karịa ihe niile anyị na-arịọ ma ọ bụ na-eche n’echiche.” (Efe. 3:20) Chegodị echiche. Ọ bụghị naanị na Chineke ga-emere anyị ihe niile anyị na-arịọ ya, kama ọ ga-eme “karịa ihe niile anyị na-arịọ.”

9. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ngọzi Jehova?

9 Ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ụgwọ ọrụ ahụ, anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi anyị niile ma na-eme ihe o kwuru. Mozis gwara mba Izrel, sị: “Jehova aghaghị ịgọzi gị n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka i nweta dị ka ihe nketa, naanị ma ọ bụrụ na i gee ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị wee lezie anya debe iwu a dum m na-enye gị taa. N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị ga-agọzi gị dị nnọọ ka o kwere gị ná nkwa.” (Diut. 15:4-6) Obi ò siri gị ike na Jehova ga-agọzi gị ma i jiri obi gị niile na-efe ya? Obi kwesịrị isi gị ike.

NDỊ JEHOVA KWỤRỤ ỤGWỌ

10, 11. Olee otú Jehova si kwụọ Josef ụgwọ?

10 E dere Baịbụl ka ọ baara anyị uru. Ọ kọrọ ọtụtụ ihe gbasara otú Chineke si kwụọ ndị ji obi ha niile fee ya ụgwọ. (Rom 15:4) Dị ka ihe atụ, chegodị banyere  Josef. Ụmụnne ya rere ya ka ọ gaa gbawa ohu. Nwunye nna ya ukwu emechaa bo ya ebubo ụgha, a tụọ ya mkpọrọ maka ya n’Ijipt. Ihe a ò mere ka Chineke kwụsị inyere ya aka. Mbanụ. “Jehova nọnyeere Josef wee na-egosi ya obiọma . . . Jehova nọnyeere Josef, Jehova na-emekwa ka ihe ọ na-eme na-aga nke ọma.” (Jen. 39:21-23) N’oge ọnwụnwa ahụ niile, Josef nwere ndidi ma chere Chineke ya.

11 Mgbe ọtụtụ afọ gara, Fero kpọpụtara Josef n’ụlọ mkpọrọ, mee ya onye na-esote eze Ijipt n’agbanyeghị na ọ bụ ohu. (Jen. 41:1, 37-43) Mgbe nwunye Josef mụtaara ya ụmụ nwoke abụọ, ọ “[gụrụ] nke ọkpara Manase, n’ihi na, dị ka o si kwuo, ‘Chineke emewo ka m chefuo nsogbu m niile nakwa ụlọ nna m dum.’ Aha ọ gụrụ nwa ya nke abụọ bụ Ifrem, n’ihi na, dị ka o si kwuo, ‘Chineke emewo ka m mụọ ọmụmụ n’ala m nọ hụjuo anya.’” (Jen. 41:51, 52) N’ihi otú Josef si rubere Chineke isi, Chineke gọziri ya, mee ka ọ zọpụta ndị Izrel na ndị Ijipt mgbe ụnwụ dara. Josef ghọtara na ọ bụ otú Jehova si kwụọ ya ụgwọ ma gọzie ya.—Jen. 45:5-9.

12. Olee otú Jizọs si rubere Chineke isi mgbe ọnwụnwa bịaara ya?

12 Jizọs Kraịst rubekwaara Chineke isi n’agbanyeghị ọnwụnwa dị iche iche bịaara ya, Chineke akwụọ ya ụgwọ. Gịnị nyeere ya aka ịtachi obi? Baịbụl kwuru, sị: “N’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya, o diri osisi ịta ahụhụ, leghara ihere anya.” (Hib. 12:2) Obi tọrọ Jizọs ụtọ maka na o mere ka e doo aha Chineke nsọ. Ụgwọ Nna ya kwụrụ ya bụ na ha abụọ dị ná mma, ya emekwaara Jizọs ọtụtụ ihe ọma ndị ọzọ. Baịbụl kwuru na ‘ọ nọrọla ala n’aka nri nke ocheeze Chineke.’ Baịbụl kwukwara n’ebe ọzọ, sị: “Chineke buliri ya elu ka ọ nọrọ n’ọkwá ka elu, o jikwa obiọma nye ya aha dị elu karịa aha ọ bụla ọzọ.”—Fil. 2:9.

JEHOVA ANAGHỊ ECHEFU IHE ANYỊ NA-EME

13, 14. Olee otú obi na-adị Jehova maka ihe anyị na-emere ya?

13 Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova anaghi eji mbọ ọ bụla anyị gbara iji jeere ya ozi egwu egwu. Ọ na-aghọta mgbe ụjọ na-atụ anyị ma ọ bụ mgbe obi na-esighị anyị ike na anyị ga-emeli ihe anyị kwesịrị ime. Ọ na-emere anyị ebere ma anyị chegbuwe onwe anyị maka ego ma ọ bụ mgbe anyị na-agaghị emeli ihe niile anyị kwesịrị ime n’ozi ya n’ihi ọrịa ma ọ bụ na obi adịghị anyị mma. Ka obi sie anyị ezigbo ike na Jehova ji mbọ ndị na-efe ya na-agba iji rubere ya isi kpọrọ ihe.—Gụọ Ndị Hibru 6:10, 11.

14 Chetakwa na Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.” Obi kwesịrị isi anyị ike na anyị kpeere ya ekpere, ọ ga-anụ ya. (Ọma 65:2) “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi niile” ga-enye anyị ihe niile ga-enyere anyị aka ka anyị na ya dịrị ná mma. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eji ụmụnna anyị enyere anyị aka. (2 Kọr. 1:3) Obi na-adị Jehova ụtọ ma anyị meere ndị ọzọ ebere. Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya amara na-agbazinye Jehova ihe, ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe o mere.” (Ilu 19:17; Mat. 6:3, 4) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị enyere ndị ihe na-esiri ike aka, Jehova na-ewere ya ka ego anyị gbazinyere ya. O kwere anyị nkwa na ọ ga-akwụ anyị ụgwọ maka ya.

ỤGWỌ JEHOVA GA-AKWỤ ANYỊ UGBU A NAKWA N’ỌDỊNIHU

15. Olee ụgwọ ọrụ ị na-atụ anya inweta? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

15 Ndị Kraịst e tere mmanụ nwere olileanya inweta “okpueze ezi omume, nke Onyenwe anyị, bụ́ onyeikpe ezi omume, ga-enye . . . dị ka ụgwọ ọrụ n’ụbọchị ahụ.” (2 Tim. 4:7, 8) Ma, ọ bụrụ na  olileanya i nwere dị iche, ọ gaghị aghọ gị ahịa. Ọtụtụ nde ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ na-atụsi anya ike ịdị ndụ ebighị ebi mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs. N’ebe ahụ, ‘ha ga-enwe obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.’—Jọn 10:16; Ọma 37:11.

16. Olee ihe e kwuru na 1 Jọn 3:19, 20 nke na-akasi anyị obi?

16 O nwere ike ịdị anyị ka ihe anyị na-arụ n’ozi Jehova ọ̀ dị ntakịrị, ma ọ bụ anyị ana-eche ma mbọ anyị na-agba ọ̀ na-eme Jehova obi ụtọ. Anyị nwedịrị ike ịna-eche ma ànyị ruru eru inweta ụgwọ ọrụ ọ bụla. Ma, ka anyị ghara ichefu na “Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe niile.” (Gụọ 1 Jọn 3:19, 20.) Ọ bụrụ na anyị ana-ejere Jehova ozi maka na anyị nwere okwukwe ma hụ ya n’anya, ka obi sie anyị ike na ọ ga-akwụ anyị ụgwọ, ọ bụrụgodị na ọ dị anyị ka ozi anyị na-ejere ya ọ̀ dị ntakịrị.—Mak 12:41-44.

17. Olee ụfọdụ ụgwọ ọrụ anyị na-enweta ugbu a?

17 Jehova na-agọzi ndị ya n’agbanyeghị na anyị bi n’oge ikpeazụ n’ụwa ọjọọ Setan. Ọ na-akụziri ndị na-efe ya ọtụtụ ihe, na-emekwa ka udo dịrị n’ọgbakọ ya. (Aịza. 54:13) Nkwa ahụ Jizọs kwere na-emezu. Ụgwọ Jehova na-akwụ anyị ugbu a bụ na o kwere ka anyị soro n’ezinụlọ ya zuru ụwa ọnụ, ndị bụ́ ụmụnna nwoke na nwaanyị hụrụ ibe ha n’anya. (Mak 10:29, 30) Ihe ọzọ bụ na ndị na-achọsi Chineke ike na-enweta ụgwọ ọrụ na-enweghị atụ, nke bụ́ na obi na-eru ha ala, ihe ha nwere juru ha afọ, ha na-enwekwa obi ụtọ.—Fil. 4:4-7.

18, 19. Olee otú obi na-adị ndị ohu Jehova maka ụgwọ ọ na-akwụ ha?

18 Ndị Jehova n’ụwa niile ahụla otú Jehova si na-enye ha ụgwọ ọrụ magburu onwe ya. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Bianca, bụ́ onye Jamanị, sịrị: “Amaghị m ọnụ m ga-eji kelee Jehova maka otú o si enyere m aka ka m ghara ịna-echegbu onwe m nakwa otú o si anọnyere m kwa ụbọchị. Ọgba aghara juru n’ụwa a. Ọtụtụ ndị enweghịkwa olileanya. Ma, ka mụ na Jehova na-arụkọ ọrụ, obi na-eru m ala. Mgbe ọ bụla m hapụrụ ihe ụfọdụ iji jeere ya ozi, ọ na-akwụ m ụgwọ mmaji kwuru mmaji.”

19 Chegodị banyere nwanna nwaanyị ọzọ bí na Kanada aha ya bụ Paula, onye dị afọ iri asaa. O nwere mkpumkpu azụ. Ọ sịrị: “Ịga ije na-esiri m ike. Ma ọ pụtaghị na anaghị m ekwusasi ozi ọma ike. M na-esi ụzọ dị iche iche ekwusa ozi ọma, ma iji ekwentị ezi ozi ọma ma izi ndị mmadụ ozi ọma mgbe m na-anọghị n’ozi ọma. E nwere akwụkwọ m na-ede amaokwu Baịbụl na ihe ụfọdụ e kwuru n’akwụkwọ anyị. Ọ na-abụ, m nọtụ, mụ agụọ ya, ya agbaa m ume. M na-akpọ ya ‘Akwụkwọ Na-azọ M Ndụ.’ Obi agaghị na-ajọ anyị njọ mgbe niile ma obi anyị dịrị ná nkwa Jehova kwere. Jehova ga na-enyere anyị aka mgbe niile n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị.” Nsogbu gị nwere ike ịdị iche na nke Bianca na Paula. Ma, i nwere ike icheta ụzọ dị iche iche Jehova sirila kwụọ gị na ndị gị na ha nọ ụgwọ. Ọ dị mma ka ị na-echeta otú Jehova si na-akwụ gị ụgwọ ugbu a nakwa otú ọ ga-esi kwụọ gị ụgwọ n’ọdịnihu.

20. Gịnị ka anyị ga-atụ anya ya ma anyị jiri obi anyị niile na-ejere Jehova ozi?

20 Echefula na Chineke ga-akwụ gị “ụgwọ ọrụ dị ukwuu” maka ekpere i ji obi gị niile na-ekpe ma na-agwa ya otú ọ dị gị n’obi. Ka obi sie gị ike na Chineke ‘ga-emezuru gị nkwa ya mgbe i mesịrị uche ya.’ (Hib. 10:35, 36) N’ihi ya, ka anyị na-eme ka okwukwe anyị sie ike, jirikwa obi anyị niile na-ejere Jehova ozi. Anyị ga-emeli otú ahụ, ebe anyị ma na ọ bụ Jehova ga-akwụ anyị ụgwọ ma oge ruo.—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:23, 24.