Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) DISEMBA 2016

 AKỤKỌ NDỤ

Aghọrọ M “Ihe Niile n’Ebe Ụdị Mmadụ Niile Nọ”

Aghọrọ M “Ihe Niile n’Ebe Ụdị Mmadụ Niile Nọ”

N’afọ 1941, papa m gwara mama m, sị: “I mee baptizim, m ga-ahapụ gị.” Mama m mere baptizim iji gosi na o nyefeela Jehova Chineke onwe ya n’agbanyeghị egwu ahụ papa m yiri ya. Papa m mere ihe ahụ o kwuru, hapụ mama m. N’oge ahụ, adị m naanị afọ asatọ.

TUPU ihe a emee, amalitela m inwe mmasị n’eziokwu Baịbụl na-akụzi. Mama m nwetara akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ihe ndị dị́ na ha tọrọ m ezigbo ụtọ, nke ka nke, ihe ndị e sere na ha. Papa m achọghị ka mama m na-agwa m ihe ndị ọ na-amụta. Ma, m na-ajụ mama m ajụjụ n’ihi na m chọrọ ịmata ihe ọ na-amụta. N’ihi ya, mama m na-amụrụ m ihe mgbe papa m na-anọghị n’ụlọ. Ihe ndị m mụtara mere ka m kpebie na m ga-enyefe Jehova onwe m. M mere baptizim na Blak-pul dị́ n’Ịngland n’afọ 1943 mgbe m dị afọ iri.

M MALITERE IFE JEHOVA

Malite n’oge ahụ m mere baptizim, mụ na mama m na-arụ n’ozi ọma mgbe niile. N’oge ahụ, anyị na-eji gramafon ezi ndị mmadụ ozi ọma. Gramafon na-ebu ibu, dịkwa arọ. Chegodị ebe nwatakịrị dị ka m gbụgba otu gramafon.

N’oge m dị afọ iri na anọ, m chọrọ ịsụ ụzọ. Mama m gwara m ka m bu ụzọ gwa ohu ụmụnna (nke a na-akpọzi onye nlekọta sekit). Nwanna ahụ gwara m ka m mụọ ọrụ m ga-eji na-egbo mkpa m ma na-asụ ụzọ. M mere ihe ahụ ọ gwara m. Mgbe  m rụrụ ọrụ afọ abụọ, m gwara onye nlekọta sekit ọzọ banyere ịsụ ụzọ, ya asị m, “Malite ozugbo.”

N’ọnwa Eprel afọ 1949, mụ na mama m rere ụfọdụ oche anyị, nyekwa ndị mmadụ ụfọdụ. Anyị kwagara Mịdụltịn dị́ nso na Manchesta, malite ịsụ ụzọ n’ebe ahụ. Mgbe ọnwa anọ gachara, m họọrọ nwanna mụ na ya ga-eso na-asụ ụzọ. Alaka ụlọ ọrụ gwara anyị ka anyị gafee n’ọgbakọ e hiwere ọhụrụ n’Elam. Mama m na nwanna nwaanyị ọzọ nọ n’ọgbakọ ọzọ na-asụ ụzọ.

N’agbanyeghị na m dị naanị afọ iri na asaa n’oge ahụ, e nyere mụ na nwanna ahụ mụ na ya so na-asụ ụzọ ọrụ ịna-eduzi ọmụmụ ihe n’ihi na ọ bụ naanị ụmụnna ole na ole ruru eru n’ọgbakọ ọhụrụ ahụ. E mechara gwa m gafee n’Ọgbakọ Bọkstịn, bụ́ ebe e nwere ndị nkwusa ole na ole. Ha chọkwara enyemaka. Ọrụ ndị a m nọ na-arụ mere ka m mụta otú m ga-esi rụọ ọrụ ndị e mechara nye m.

Ebe mụ na ndị ọzọ na-akpọsa okwu ihu ọha na Rochesta dị́ na Niu Yọk, n’afọ 1953

N’afọ 1951, m dejupụtara akwụkwọ ka m gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ma, n’ọnwa Disemba afọ 1952, a kpọrọ m ka m soro gaa agha. M gwara ha ka ha gụpụ m ná ndị ga-aga agha n’ihi na m ji oge m niile na-arụ ọrụ Chineke. Ma, ụlọikpe ekwetaghị ihe m kwuru. A tụrụ m mkpọrọ ọnwa isii. N’oge m nọ n’ụlọ mkpọrọ, a kpọrọ m ka m gaa klas nke iri abụọ na abụọ nke Ụlọ  Akwụkwọ Gilied. Ọ dịghị anya a tọhapụrụ m, mụ abaa ụgbọ mmiri gawa Niu Yọk n’ọnwa Julaị afọ 1953.

Ozugbo m rutere, m gara Mgbakọ Òtù Ụwa Ọhụrụ e mere n’afọ 1953. M banyere ụgbọ okporo ígwè gawa Saụt Lansịn dị́ na Niu Yọk, bụ́ ebe ụlọ akwụkwọ ahụ dị. Enweghị m ego ga-ezuru m n’ihi na m ka si na mkpọrọ pụta. Mgbe m si n’ụgbọ okporo ígwè rịtuo, m banyere ụgbọala ga-ebu m gaa Saụt Lansịn. Otu n’ime ndị nọ n’ụgbọala ahụ gbazinyere m obere ego m ji kwụọ ụgwọ.

IKWUSA OZI ỌMA NÁ MBA ỌZỌ

Ihe anyị mụtara n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied nyeere anyị aka ‘ịghọ ihe niile n’ebe ụdị mmadụ niile nọ’ mgbe anyị gara ozi ala ọzọ. (1 Kọr. 9:22) Mgbe anyị gụchara, e zigara mụ na Paul Bruun, na Raymond Leach n’obodo Filipinz. Anyị chere ọnwa ụfọdụ ka anyị nweta akwụkwọ ikike e ji agafe mba ọzọ. Anyị banyere ụgbọ mmiri gawa Rọtadam dị́ na Nedalandz, sí ya gafee Oké Osimiri Mediterenian, Ọdọ Mmiri Suez, Oké Osimiri India, Maleshia na Họng Kọng. Anyị nọrọ n’osimiri ụbọchị iri anọ na asaa tupu anyị eruo Manila n’abalị iri na itoolu n’ọnwa Nọvemba afọ 1954.

Ebe mụ na Raymond Leach bụ́ onye ozi ala ọzọ ibe m nọ n’ụgbọ mmiri na-aga Filipinz. Njem ahụ were anyị ụbọchị iri anọ na asaa

Anyị malitere ịmụ omenala ọhụrụ na asụsụ ọhụrụ, na-agbakwa mbọ ka obodo ọhụrụ mara anyị ahụ́. Ná mmalite, anyị atọ nọ n’ọgbakọ dị́ na Kesọn Siti, bụ́ ebe ọtụtụ ndị na-asụ Bekee. N’ihi ya, mgbe ọnwa isii gachara, anyị mụtara naanị okwu ole na ole n’asụsụ Tagalọg. Ọrụ ọzọ e nyere anyị ga-enyere anyị aka ịmụtakwu asụsụ a.

Otu ụbọchị n’ọnwa Mee afọ 1955, mgbe mụ na Nwanna Leach si ozi ọma lọta, anyị hụrụ akwụkwọ ozi n’ụlọ anyị. A gwara anyị ka anyị bụrụ ndị nlekọta sekit. Adị m naanị afọ iri abụọ na abụọ, ma ọrụ a ga-eme ka m mụta ihe ọhụrụ ndị ga-eme ka ‘m ghọọ ihe niile n’ebe ụdị mmadụ niile nọ.’

Ebe m na-ekwu okwu ihu ọha ná mgbakọ sekit n’asụsụ Bikol

Dị ka ihe atụ, okwu ihu ọha mbụ m kwuru bụ n’ihu ụlọ ahịa dị́ n’obodo ahụ. Ọ dịghị anya, mụ amata na n’oge ahụ, ndị Filipinz na-ekwu okwu ihu ọha n’ebe ọhaneze na-anọ. Ka m na-eleta ọgbakọ dị iche iche na sekit, m na-ekwu okwu ihu ọha n’ebe ndị mmadụ na-anọ elepụ anya, n’ahịa, n’ihu ụlọ ezumeezu, n’ebe a na-atụ basketbọl, n’ogige ntụrụndụ nakwa ọtụtụ mgbe, n’okporo ámá. N’otu oge m gara ikwu okwu ihu ọha n’obodo San Pablo, oké mmiri ozuzo ekweghị m kwuo ya n’ahịa. N’ihi ya, m tụụrụ ụmụnna na-ahazi okwu ihu ọha aro ka m kwuo ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha mechara jụọ m ma hà ga-ede ya na ọ bụ okwu ihu ọha ebe ọ bụ na e kwughị ya n’ebe ọhaneze na-anọ.

Anyị na-ebi n’ụlọ ụmụnna. N’agbanyeghị na ụlọ ndị ahụ abụghị ụlọ ndị oké ozu, ha na-adị ọcha. Ọtụtụ mgbe, m na-edina n’ute a tọrọ n’ala e ji osisi rụọ. O nweghị ihe e ji mechie ebe a na-asa ahụ́. N’ihi ya, m mụtara otú m ga-esi na-eyi efe asa ahụ́. M gawa agwaetiti ndị ọzọ, m na-agba bọs. Mgbe ụfọdụ, mụ abanye ụgbọ mmiri. N’afọ niile m jere ozi, enweghị m ụgbọala.

Ịga ozi ọma na ileta ọgbakọ dị iche iche nyeere m aka ịmụta asụsụ Tagalọg. E nweghị mgbe m gara ebe a na-akụzi asụsụ a. Otú m si mụta ya bụ ịna-ege ụmụnna ntị n’ozi ọma nakwa n’ọmụmụ ihe. Ụmụnna na-achọ inyere m aka ka m mụta ya. Obi dị m ụtọ maka otú ha si nweere m ndidi ma na-aja m mma.

 Ka oge na-aga, m gbanwere ihe ụfọdụ m na-eme n’ihi ọrụ ọhụrụ e nyere m. N’afọ 1956, anyị nwere mgbakọ mgbe Nwanna Nathan Knorr bịara ileta anyị. A gwara m ka mụ na ndị ụlọ ọrụ na-agbasa ozi rụkọọ ọrụ. Arụtụbeghị m ọrụ ahụ, ma ndị ọzọ nyeere m aka ịmụta ya. O rughị otu afọ, anyị enwee mgbakọ ọzọ. Nwanna Frederick Franz si n’isi ụlọ ọrụ anyị bịa ileta anyị. Abụ m onye nlekọta mgbakọ ahụ. Nwanna Franz yi uwe ọdịnala ndị Filipinz kwuo okwu ihu ọha. Obi tọrọ ụmụnna ụtọ mgbe ha hụrụ ya. Ihe a o mere kụziiri m na m kwesịrị ịmụta omenala ndị obodo ahụ.

Mgbe m ghọrọ onye nlekọta distrikti, e nwere ihe ndị ọzọ m kwesịrị ịmụta. N’oge ahụ, anyị na-egosi fim bụ́ The Happiness of the New World Society. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ mgbe niile ka anyị na-egosi fim a n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị. Mgbe ụfọdụ, ụmụ ahụhụ na-enye anyị nsogbu. Ihe na-akpọta ha bụ ọkụ sí n’ígwè e ji egosi fim ahụ. Ha na-atọkịrị n’ime ígwè ahụ. Ihicha ya na-abụ nnukwu ọrụ. Ọ dịghị mfe ịhazi ihe ndị a. Ma, obi na-adị anyị ụtọ ịhụ ka ndị mmadụ bịara mụta banyere nzukọ Jehova zuru ụwa ọnụ.

N’ebe ụfọdụ, ndị ụkọchukwu Katọlik na-agwa ndị ọchịchị ka ha ghara ikwe ka anyị nwee mgbakọ. Mgbe ọ bụla anyị na-ekwu okwu n’ebe dị́ nso na chọọchị ha, ha  na-akụ mgbịrịgba ka mmadụ ghara ịnụ ihe a na-ekwu. N’agbanyeghị ihe a niile, ndị mmadụ akwụsịghị ịna-amụta eziokwu Baịbụl. Ọtụtụ ndị na-efekwa Jehova ugbu a n’ebe ndị ahụ.

ỌRỤ ỌHỤRỤ NA IHE NDỊ ỌZỌ M GBANWERE

N’afọ 1959, a gwara m ka m bịa jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ. M mụtakwuola ọtụtụ ihe n’ebe a. Ka oge na-aga, a gwara m ka m bụrụ onye nlekọta zoonu na-aga eleta mba ndị ọzọ. N’otu n’ime obodo ndị ahụ m gara, m matara nwanna nwaanyị bụ́ onye ozi ala ọzọ na Taịland aha ya bụ Janet Dumond. Mụ na ya derịtara akwụkwọ ozi ugboro ugboro. Ọ dịghị anya, anyị alụọ. Anyị ejirila obi ụtọ jeere Jehova ozi afọ iri ise na otu.

Ebe mụ na Janet nwunye m nọ n’otu n’ime ọtụtụ agwaetiti dị́ na Filipinz

Agaala m mba iri atọ na atọ leta ụmụnna anyị. Obi dị m ezigbo ụtọ na ọrụ ndị mbụ e nyere m mere ka m mụta otú m ga-esi na-emeso ndị sí ebe dị iche iche. Ebe niile ahụ m gara nyeere m aka ịghọta na Jehova hụrụ ụdị mmadụ niile n’anya.—Ọrụ 10:34, 35.

Anyị na-agba mbọ ịgachi ozi ọma anya

ANYỊ KA NA-AGBANWE IHE ỤFỌDỤ

Obi dị mụ na nwunye m ụtọ na anyị na ụmụnna anyị na-ejekọ ozi na Filipinz. Ndị nkwusa nọ́ na Filipinz ugbu a ejirila okpukpu iri karịa ndị nkwusa nọ́ na ya mgbe anyị malitere ije ozi n’obodo a. Mụ na nwunye m ka na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị́ na Kesọn Siti dị́ na Filipinz. N’agbanyeghị na ejeela m ozi ná mba ọzọ ihe karịrị afọ iri isii, m ka dị njikere ime ihe ọ bụla Jehova kwuru ka e mee. Dị ka ihe atụ, n’ihi ihe ndị a gbanwere ná nzukọ Jehova n’oge na-adịbeghị anya, anyị kwesịrị ịna-agbanwe otú anyị si eme ihe n’ozi anyị na-ejere Chineke na ụmụnna anyị.

Otú ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova si na-amụba na-eme anyị obi ụtọ mgbe niile

Anyị agbaala mbọ ime ihe ọ bụla Jehova chọrọ ka anyị mee. Ọ bụ ụzọ kacha eme obi ụtọ mmadụ ga-esi bie ndụ. Anyị agbaakwala mbọ ịgbanwe ihe ọ bụla anyị kwesịrị ịgbanwe iji jeere ụmụnna anyị ozi nke ọma. N’eziokwu, anyị kpebisiri ike ‘ịghọ ihe niile n’ebe ụdị mmadụ niile nọ’ ruo oge niile Jehova kwere.

Anyị ka na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị́ na Kesọn Siti