Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! Nke 6 n'Afọ 2016

 IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ALỤMDI NA NWUNYE

Otú Ị Ga-esi Na-akwanyere Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù

Otú Ị Ga-esi Na-akwanyere Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù

IHE MERE O JI ESI IKE

Di kwuru sị: “Mgbe anyị lụrụ ọhụrụ, ihe nwunye m ma bụ́ ịkwanyere mmadụ ùgwù dị iche na ihe mụnwa ma. Ọ bụghị na ọ naghị emeta ya ma ọ bụkwanụ na mụnwa anaghị emeta ya. Kama, otú o si eme nke ya dị iche n’otú mụnwa si eme nke m. M nọ na-eche na nwunye m kwesịrị ijitụkwu nkwanye ùgwù na-agwa m okwu.”

Nwunye kwuru sị: “N’ebe m nọ too, o nweghị ihe o mere ịgwa mmadụ okwu n’olu ike. O nweghịkwa ihe o mere ịna-emere mmadụ ihu ma ị na-agwa ya okwu, ma ọ bụkwanụ nara mmadụ okwu n’ọnụ. Anyị anaghị ewere ya ka mkparị. Ma, ihe a na-eme n’ebe di m nọ too dị nnọọ iche.”

N’alumdi na nwunye, nkwanye ùgwù abụghị ihe a na-eme mgbe ọ dabara, kama ọ bụ ihe e kwesịrị ịna-eme mgbe niile. Olee otú ị ga-esi na-akwanyere di gị ma ọ bụ nwunye gị ùgwù?

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Ụmụ nwoke chọrọ ka a na-akwanyere ha ùgwù. Baịbụl gwara ndị bụ́ di, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya.” Ọ sịkwara: “Onye bụ́ nwunye kwesịrị ịdị na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.” (Ndị Efesọs 5:33) Ọ bụ eziokwu na di na nwunye chọrọ ka a na-ahụ ha n’anya, na-akwanyekwara ha ùgwù. Ma, ndị bụ́ di anaghị eji nkwanye ùgwù egwu egwu. Otu di aha ya bụ Carlos, * sịrị: “Ụmụ nwoke na-achọkarị ka ọ bụrụ ha ga na-ekpebi ihe a na-eme n’ezinụlọ, na-egboro ha mkpa ha ma na-elekọta ha.” Ọ bụrụ na nwaanyị ana-akwanyere di ya ùgwù maka ihe ndị a ọ na-eme, ọ ga-abara ya na di ya uru. Otu nwunye aha ya bụ Corrine sịrị: “Di m na-aka ahụ m n’anya ma m na-akwanyere ya ùgwù.

Ndị Nwunye chọkwara ka a na-akwanyere ha ùgwù. Nke ahụ bụ eziokwu, n’ihi na o nweghị otú di ga-esi hụ nwunye ọ na-anaghị akwanyere ùgwù n’anya. Otu di aha bụ Daniel sịrị: “Ekwesịrị m ịna-ege nwunye m ntị, na-echebakwara ihe o kwuru echiche, na-achọkwa ka m mara otú obi dị ya. Na mụ aghọtaghị ihe mere o ji kwuo ihe o kwuru abụghị ya ga-ame ka m leghara ihe o kwuru anya.”

Ihe otu onye kpọrọ nkwanye ùgwù nwere ike ịdị iche n’ihe onye ọzọ kpọrọ ya. Ihe dị mkpa abụghị gịnwa iche na ịna-akwanyere onye nke ọzọ ùgwù, kama ọ bụ ịchọpụta ma yanwa ọ̀ na-ewere ya na ị na-akwanyere ya ùgwù. Ihe a ka nwaanyị ahụ anyị kwuru okwu ya ná mmalite mụtara. Ọ sịrị: “Ọ bụrụgodị na ọ dị m ka m̀ na-akwanyere di m ùgwù, ma di m asị m na mụ anaghị akwanyere ya ùgwù, kwesịrị ịgbanwe.”

 IHE I NWERE IKE IME

  • Dee ihe atọ na-amasị gị n’ebe di gị ma ọ bụ nwunye gị nọ. Ihe ndị ahụ na-amasị gị n’ebe ọ nọ nwere ike ịbụ ihe ndị mere ị ga-eji bido ịna-akwanyere ya ùgwù.

  • Jiri otu izu lee otú si eme (ọ bụghị otú di gị ma ọ bụ nwunye gị si eme) ma a bịa n’otú i si:

Ekwu okwu. Otu nchọpụta e mere gbasara ndị di na nwunye gosiri na “ọ bụrụ na di na nwunye na-ebi n’udo ana-ekwurịta esemokwu ha, ha na-agwa ibe ha okwu ọma ise tupu ha ekwuo otu okwu ọjọọ. Ma, di na nwunye na-achọ ịgba alụkwaghịm na-abụkarị okwu ọjọọ ka ha na-agwa onwe ha.” *Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 12:18.

Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-eji nkwanye ùgwù agwa di m ma ọ bụ nwunye m okwu? Mgbe m na-akatọ ya ọ̀ na-akarị mgbe m na-aja ya mma? Olee ụdị olu m na-eji agwa di m na ihe ọ na-eme adịghị mụ mma?’ Ì chere na di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-ekweta n’ihe ị zara n’ajụjụ ndị a?—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Kọlọsi 3:13.

Megodị ihe a: Kpebie na ị ga na-aja di gị ma ọ bụ nwunye gị mma, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu ugboro n’ụbọchị. Ihe i nwere ike ime: Cheta ihe ndị ahụ i dere na-amasị gị n’ebe di gị ma ọ bụ nwunye gị nọ. Mụta ịna-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe ndị ahụ.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Ndị Kọrịnt 8:1.

Akpa àgwà. Otu nwunye aha ya bụ Alicia kwuru, sị: “Ije ozi dị n’ụlọ na-ewe m ọtụtụ oge. N’ihi ya, ọ bụrụ na di m ana-ahazi ihe ya ma ọ bụ na-enye aka asa efere, m na-amata na o ji mbọ m na-agba kpọrọ ihe nakwa na ọ hụrụ m n’anya.”

Jụọ onwe gị, sị: ‘Otú m si emeso di m ma ọ bụ nwunye m ọ̀ na-egosi na m na-akwanyere ya ùgwù? M̀ na-ewepụta ohere gee ya ntị nke ọma?’ Di gị ma ọ bụ nwunye gị ọ̀  ga-ekweta n’ihe ị zara n’ajụjụ ndị a?

Megodị ihe a: Depụta ebe atọ ị ga-achọ ka di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akwanyere gị ùgwù. Gwa ya ka o deekwa nke ya. Nye ya ihe i dere, natakwa ya nke ya. Onye ọ bụla bidozie ime ihe ibe ya dere. Bido mewe nke gị ozugbo. Otu onye bidohaala ime nke ya, onye nke ọzọ ga-esoro ya.

^ para. 8 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 14 O si n’akwụkwọ aha ya bụ Ten Lessons to Transform Your Marriage.