Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! Nke 5 n'Afọ 2016

 IHE BAỊBỤL KWURU

Na-ekele Ndị Meere Gị Ihe Ọma

Na-ekele Ndị Meere Gị Ihe Ọma

O doro anya na ikele ndị meere anyị ihe ọma nwere ọtụtụ uru ọ na-abara anyị. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịkwara ịna-eme otú ahụ kwa ụbọchị.

Olee uru ikele ndị meere gị ihe ọma ga-abara gị?

IHE NDỊ DỌKỊTA KWURU

Otu isiokwu gbara n’akwụkwọ a na-akpọ Harvard Mental Health Letter, kwuru na “ikele ndị meere anyị ihe ọma na-eme ka anyị na-enwekwu obi ụtọ. Ọ na-emekwa ka anyị na-ekwu okwu ọma gbasara ha, na-eme ka ahụ́ na-adịkwu anyị mma. Ihe ọzọ bụ na ọ na-enyere anyị aka idi nsogbu, nyekwara anyị aka ka anyị na ndị ọzọ na-adịkwu ná mma.”

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl gwara anyi ka anyị na-ekele ndị meere anyị ihe ọma. Pọl onyeozi kwuru, sị: ‘Gosinụ na unu bụ ndị nwere ekele.’ O mekwara ihe a o kwuru. Dị ka ihe atụ, o ‘kelere Chineke n’akwụsịghị akwụsị’ n’ihi otú ndị mmadụ si kwere n’ozi ọma o ziri ha. (Ndị Kọlọsi 3:15; 1 Ndị Tesalonaịka 2:13) Ihe na-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ abụghị naanị ikele onye meere anyị ihe ọma, kama, ịna-emekwa ihe ndị ọzọ gosiri na obi dị anyị ụtọ maka ihe e meere anyị. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị ghara ịna-enwe anyaụfụ, ịna-ebu iwe n’obi, na ịna-eche na ihe e meere anyị bụ ihe e kwesịrị imere anyị. Ihe ndị a ga-eme ka ndị mmadụ na-agbara anyị ọsọ, anyị agharakwa ịna-enwe obi ụtọ.

Onye kere anyị na-egosikwa na obi dị ya ụtọ maka ihe e meere ya. Ọ naghị echefu ihe ndị mmadụ meere ya. Ndị Hibru 6:10 kwuru, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.” Nke bụ́ eziokwu bụ na Onye kere anyị weere ya na mmadụ ichefu ihe ọma e meere ya bụ ajọ omume.

“Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile. Na-ekelenụ Chineke banyere ihe ọ bụla.”1 Ndị Tesalonaịka 5:16, 18.

 Olee otú anyị ịna-ekele ndị meere anyị ihe ọma nwere ike isi mee ka anyi na ha na-adịkwu ná mma?

IHE NDỊ A CHỌPỤTARALA

Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile kelee onye nyere anyị onyinye, onye gwara anyị okwu ọma, ma ọ bụ onye nyeere anyị aka, ọ ga-eme ka onye ahụ mata na anyị hụrụ ya n’anya, nakwa na anyị ji ya kpọrọ ihe. Obi na-atọdị ndị anyị na-amaghị ụtọ ma anyị jiri obi anyị niile kelee ha maka ihe ọma ha meere anyị, dị ka imepere anyị ụzọ ka anyị gafee.

IHE BAỊBỤL KWURU

Jizọs kwuru, sị: “Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe. Ha ga-awụnyekwa n’apata ụkwụ unu ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma, nke a bịara aka, yọkọta ọnụ, nke jubigakwara ókè.” (Luk 6:38) Ka anyị lebagodị anya n’ihe mere otu nwa agbọghọ onye ogbi aha ya bụ Rose. O bi na Vanuwatu, dị n’agwaetiti dị́ n’Ebe Ndịda Pasifik.

Rose na-aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova ma ọ naghị aghọtacha ihe a na-amụ. Ihe kpatara ya bụ na ya na ndị ọzọ na-abịa ọmụmụ ihe ahụ amaghị asụsụ ndị ogbi. Mgbe otu di na nwunye ma asụsụ ndị ogbi nke ọma bịara ọmụmụ ihe ha ma chọpụta ihe na-emenụ, ha malitere ịkụziri Rose na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ahụ asụsụ ndị ogbi. Ihe a ha mere tọrọ Rose ezigbo ụtọ. Rose sịrị: “Obi na-atọ m ụtọ na m nwere ọtụtụ ndị enyi hụrụ m n’anya.” Obi na-adịkwa di na nwunye ahụ mma ka ha na-ahụ otú Rose si enwe aṅụrị, nakwa otú o si aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe ma na-eme ihe omume. Obi na-atọkwa Rose ezigbo ụtọ ka ọ na-ahụ mbọ ndị ọzọ na-agba ịmụ asụsụ ndị ogbi ka ha na ya nwee ike ịna-ekwurịta okwu.Ọrụ Ndịozi 20:35.

‘Ọ bụ onye na-achụ ekele dị ka àjà bụ onye na-enye Chineke otuto.’Abụ Ọma 50:23.

Gịnị ga-enyere gị aka ịna-ekele ndị meere gị ihe ọma?

IHE BAỊBỤL KWURU

Ihe di anyị n’obi ka anyị na-echekarị n’echiche. Otu onye so dee Baịbụl aha ya bụ Devid gwara Chineke n’ekpere, sị: “Atụgharịwo m uche n’ọrụ gị dum; eji m obi m dum na-echebara ọrụ aka gị echiche.” (Abụ Ọma 143:5) O doro anya na Devid chebaara ihe Chineke meere ya echiche ma kelee ya maka ya. Ihe mere o ji kelee Chineke bụ na ọ na-echebara otú Chineke si eme ihe echiche mgbe niile. Ihe a bụ ihe o mere n’oge niile ọ dị ndụ.Abụ Ọma 71:5, 17.

Baịbụl gwara anyị ihe magburu onwe ya anyị ga na-eme. Ọ sịrị: ‘Ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu, ihe ọ bụla nke na-akpali ịhụnanya, ihe ọ bụla nke a na-ekwu okwu ọma banyere ya, omume ọma ọ bụla dịnụ na ihe ọ bụla dịnụ nke kwesịrị otuto, na-echebaranụ ihe ndị a echiche.’ (Ndị Filipaị 4:8) Okwu a bụ́ “na-echebaranụ” gosikwara na anyị kwesịrị ịna-echebara ihe echiche. Ime otú ahụ ga-eme ka obi na-atọkwa anyị ụtọ maka ihe ndị mmadụ meere anyị, anyị ekeleekwa ha.

“Ihe m na-atụgharị n’uche ga-abụkwa ihe nghọta dị na ya.”Abụ Ọma 49:3.