Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! Nke 4 n'Afọ 2016

 IHE BAỊBỤL KWURU

Mma Elu Ahụ́

Mma Elu Ahụ́

Ọ bụrụ na mmadụ na-ele mma elu ahụ́ anya otú dị mma, obi ga na-adị ya ụtọ. Ma, obi ga na-ajọ ya njọ ma ọ bụrụ na ọ na-ele ya anya otú na-ekwesịghị ekwesị.

Gịnị mere ihe mara mma ji amasị anyị?

Ndị mmadụ amatabeghị kpọmkpem otú ụbụrụ anyị na-esi achọpụta na ihe mara mma. Baịbụl ekwughị otú ụbụrụ anyị na-esi eme ya, kama, ọ gwara anyị ihe mere ihe mara mma na-eji amasị anyị. O kwuru na Chineke kere anyị n’oyiyi ya. (Jenesis 1:27; Ekliziastis 3:11) O kekwara ụmụ mmadụ ka ha pụọ iche, ahụ́ ha ana-arụkwa ọrụ otú pụrụ iche. Ọ bụ ya mere otu onye dere abụ n’oge ochie ji kwuo, sị: “M ga-eto gị [Chineke] n’ihi na i kere m n’ụzọ dị egwu, dịkwa ebube.”—Abụ Ọma 139:14.

Taa, ọtụtụ ndị na-ewere ya na ọ bụ mma ka e ji ele. Ihe mere ha ji eche otú ahụ bụ n’ihi ụdị ejiji na ihe ndị e ji achọ mma ha na-ahụ n’ebe e si akpọsa ngwá ahịa. O nwere ihe otu akwụkwọ kwuru gbasara ndị ọcha. Ọ sịrị na ọ bụrụgodị na mmadụ na-akpa ezigbo àgwà, na obi anaghị adị ya mma ma ọ bụrụ na o chere na ya amaghị mma. Ihe ọ pụtara bụ na onye si otú a ele mma elu ahụ́ anya ga-eleghara àgwà ya anya, nke bụ́kwanụ ihe ka mkpa.—1 Samuel 16:7.

N’ọtụtụ obodo, ndị mmadụ na-achọ ịdị otú ọ ga-abụ onye ọzọ hụ ha agụụ mmekọahụ agụwa onye ahụ

Ọtụtụ ndị na-achọkwa ịdị otú ọ ga-abụ mmadụ hụ ha agụụ mmekọahụ́ agụwa onye ahụ. Ndị kacha eme ihe a bụ ụmụ nwaanyị. N’afọ 2007, òtù na-amụ gbasara àgwà ndị mmadụ n’Amerịka kwuru na n’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ n’ebe niile e si agbasa ozi ma ọ bụ na-atụrụ ndụ, a na-egosikarị ụmụ nwaanyị otú ga-eme ka mmekọahụ gụwa onye ọ bụla hụrụ ha. Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị izere ụdị àgwà a, kwuokwa ihe mere anyị ji kwesị izere ya.—Ndị Kọlọsi 3:5, 6.

“Unu ekwekwala ka mma unu na-achọ bụrụ ịkpa isi efu . . . , kama ka ọ bụrụ mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi, nke yi uwe na-apụghị imebi emebi, bụ́ mmụọ dị jụụ, nke dịkwa nwayọọ, nke bara uru nke ukwuu n’anya Chineke.”1 Pita 3:3, 4.

Gịnị mere na anyị ekwesịghị ilekwasị anya naanị ná mma elu ahụ́?

Ụfọdụ ndị na-ekwu na onye mara mma kwesịrị ịna-egosi ụwa niile na ya mara mma. Òtù ahụ na-amụ gbasara àgwà ndị mmadụ kwukwara na a bịa n’obodo a na-ewere na ọ bụ onye mara mma bụ mmadụ, ihe ụmụ nwaanyị ka na-etopụta etopụta na-amụtakarị bụ na ahụ́ ha kwesịrị ịna-agụ ndị ọzọ agụụ, nakwa na ọ bụ otú ahụ́ ha dị kacha mkpa. Ụdị ihe a na-emebi ihe. Ọ na-akpa ma mmekọrịta mmadụ na ibe ya ma ahụ́ ike  mmadụ aka ọjọọ. Nchọpụta e mere egosikwala na mmadụ ilekwasị anya ná mma elu ahụ́ ya nwere ike ime ka onye ahụ na-echegbu onwe ya, kpọọ onwe ya asị, na-eleda onwe ya anya, gharakwa ịna-eri nri nke ọma. O nwekwara ike ime ka onye ahụ daa mbà.

“Wepụ ihe na-enye nsogbu n’obi gị, ekwekwala ka ọdachi dakwasị anụ ahụ́ gị; n’ihi na oge okorobịa na uju ndụ bụ ihe efu.”Ekliziastis 11:10.

Olee otú onye uche ya zuru okè si ele mma elu ahụ́ anya?

Baịbụl kwuru na onye ma ihe, ma ọ bụ onye nwere “uche zuru okè” na-emeru ihe n’ókè. (1 Timoti 2:9) Ihe ọ pụtara bụ na onye na-emeru ihe n’ókè anaghị echegbu onwe ya maka otú ahụ́ ya dị, kama, ọ na-elekọta onwe ya, ọ naghịkwa achọ ka ọ makarịa ndị ọzọ. Ọ na-echebakwara otú ndị ọzọ nwere ike isi na-ele ya anya echiche. Ndị mmadụ ga na-akwanyere ụdị onye a ùgwù, ihe ya ga na-amasị ha, nke ka nke bụ na ya na Chineke ga-adị ná mma. (Maịka 6:8) Ndị na-emeru ihe n’ókè na-akakwa enweta ezigbo ndị enyi. Àgwà ha na-adọtakarị onye ọ bụla chọrọ ịlụta onye ya na ya ga na-ebi n’udo, ọ bụghị onye nwere mmasị naanị n’otú ahụ́ ha dị.

E nwere ọtụtụ ihe mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị lekwasị anya karịa n’ụdị mmadụ anyị bụ, ya bụ, “mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi.” (1 Pita 3:3, 4) Nká anaghị agbanwe àgwà ọma mmadụ otú ọ na-agbanwe mma elu ahụ́. Mmadụ nwedịrị ike ịna-akpakwu àgwà ọma ka afọ ndụ ya na-agbago. Ilu 16:31 kwuru, sị: “Isi awọ́ bụ okpueze mara mma mgbe e nwere ya n’ụzọ ezi omume.” N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị agbalịa na-eme ihe Baịbụl kwuru, ma ànyị ka na-eto eto ma ànyị emeela agadi, anyị ga-ama ụdị mma na-adịgide adịgide, ndị ọzọ ga na-akwanyere anyị ùgwù, onwe anyị ejukwa anyị afọ.

“Ịma mma pụrụ ịbụ ụgha, mma elu ahụ́ pụkwara ịbụ ihe efu; ma nwaanyị nke na-atụ egwu Jehova na-enwetara onwe ya otuto.”Ilu 31:30.

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Jizọs kọwara ihe mere o ji dị mma ka Chineke na-eduzi anyị, kwuokwa banyere iwu abụọ kacha mkpa.