Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! Nke 4 n'Afọ 2016

Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Nwoke na Nwoke ma Ọ Bụ Nwaanyị na Nwaanyị Inwe Mmekọahụ

Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Nwoke na Nwoke ma Ọ Bụ Nwaanyị na Nwaanyị Inwe Mmekọahụ

N’ỌTỤTỤ obodo, ndị mmadụ ka na-arụrịta ụka ma nwoke ò kwesịrị ịlụ nwoke ibe ya, nwaanyị alụọkwa nwaanyị ibe ya. Ma, n’afọ 2015, ụlọikpe kacha elu dị́ n’Amerịka kwuru na nwoke nwere ike ịlụ nwoke nakwa na nwaanyị nwere ike ịlụ nwaanyị ibe ya. Ihe a ụlọikpe a kwuru mere ka ọtụtụ ndị malite ịchọgharị ihe gbasara ya n’Ịntanet. Otu n’ime ajụjụ ndị mmadụ kacha jụọ bụ, “Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara nwoke ịlụ nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị ịlụ nwaanyị ibe ya?”

Ihe Baịbụl kwuru abụghị ma iwu ò ji nwoke ịlụ nwoke ma ọ̀ bụ nwaanyị ịlụ nwaanyị ibe ya. Ajụjụ ka mkpa anyị kwesịrị ileba anya bụ, Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ?

Ọtụtụ ndị na-ebughị ụzọ chebara ihe Baịbụl kwuru echiche na-eche na ha ma azịza ajụjụ a, ma, ha anaghị aza otu ihe. Ụfọdụ na-ekwu na Baịbụl kpọrọ ụdị mmekọahụ a asị, ndị ọzọ ana-ekwu na Baịbụl kwadoro ụdị mmekọahụ niile n’ihi na o kwuru na anyị kwesịrị ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya.—Ndị Rom 13:9.

GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?

Olee nke i chere bụ́ eziokwu n’ime ihe ndị a e kwuru ebe a?

  1. Baịbụl akwadoghị nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ.

  2. Baịbụl kwadoro nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ.

  3. Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ịkpọ ndị ha na nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-enwe mmekọahụ asị.

AZỊZA:

  1. EZIOKWU. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị ikom na-edina ndị ikom . . . agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10) Ihe a o kwuru gbasakwara ndị inyom.—Ndị Rom 1:26.

  2. ỤGHA. Baịbụl kwuru na ọ bụ naanị nwoke na nwaanyị bụ́ di na nwunye kwesịrị ịna-enwe mmekọahụ.—Jenesis 1:27, 28; Ilu 5:18, 19.

  3. ỤGHA. Ọ bụ eziokwu na Baịbụl akwadoghị nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ, ma, o kwughị na anyị kwesịrị ịkpọ ndị na-eme ya asị, na-alụso ha ọgụ, ma ọ bụkwanụ si n’ụzọ ndị ọzọ na-emegide ha.—Ndị Rom 12:18. [1]

 Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Ele Ya Anya?

Ndịàmà Jehova kweere na ọ bụ ihe Baịbụl kwuru kacha abara mmadụ uru, ha na-erubekwa isi n’ihe ọ bụla o kwuru. (Aịzaya 48:17) [2] Ihe ọ pụtara bụ na Ndịàmà Jehova kpọrọ ụdị mmekọahụ niile na-adịghị mma asị, tịnyere mmekọahụ nwoke na nwoke ma ọ bụ nke nwaanyị na nwaanyị. (1 Ndị Kọrịnt 6:18) [3] Ọ bụ ihe a ka ha kweere, ọ bụkwa hanwa kwesịrị ikpebi otú ha ga-esi na-ebi ndụ ha.

Ndịàmà Jehova na-emeso ndị ọzọ otú ha chọrọ ka a na-emeso ha

Ndịàmà Jehova na-agbasikwa mbọ ike ka ha na mmadụ niile dịrị n’udo. (Ndị Hibru 12:14) Ọ bụ eziokwu na ha anaghị akwado nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ, ha anaghị amanye ndị ọzọ ka ha kwere ihe ha kweere. Ha anaghị alụso ndị na-enwe ụdị mmekoahụ a ọgụ, ha anaghịkwa aṅụrị ọṅụ ma ha nụ na e mesiri ụdị ndị a ike. Ndịàmà Jehova na-emeso ndị ọzọ otú ha chọrọ ka a na-emeso ha.—Matiu 7:12.

Baịbụl Ọ̀ Gwara Anyị Kpọọ Ndị Na-eme Ya Asị?

Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-ekwu na ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru kpọrọ ndị ọzọ asị, nakwa na ọ bụ Baịbụl kwuru ka a na-emegide ndị ha na nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-enwe mmekọahụ. Ụdị ndị a na-ekwu na e dere Baịbụl mgbe ndị mmadụ ka nọ n’ìsì. Ha na-ekwukwa na mmadụ kwesịrị ịnabata onye ọ bụla n’agbanyeghị ebe onye ahụ si nakwa otú o si ele mmekoahụ anya. Ha na-ewerekwa ya na onye kpọrọ mmekọahụ nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị asị yiri onye kpọrọ onye si mba ọzọ asị. Ma, ihe a ha na-ekwu adabaghị adaba. N’ihi gịnị?

Ọ bụ n’ihi na e nwere ihe dị iche n’ịkpọ mmekọahụ ahụ asị na ịkpọ ndị na-enwe ya asị. Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha na-asọpụrụ ụdị mmadụ niile. (1 Pita 2:17) [4] Ma, ọ pụtaghị na ha ga-anabata ụdị omume niile.

Ka e were ya na ị na-asọ sịga oyi n’ihi na ọ na-egbu mmadụ, ma ya adaba na onye gị na ya na-arụkọ ọrụ na-aṅụ sịga. È kwesịrị iwere ya na ị chọrọ ka o mewe ka gị n’ihi na otú i si ele sịga anya dị iche n’otú yanwa si ele ya? Na ị naghị aṅụ sịga ọ̀ pụtara na ị kpọrọ onye ahụ asị? Ọ bụrụ na ọ gwawa gị ka ị gbanwe otú i si ele sịga anya, ị́ gaghị ewere ya na ọ chọrọ ka i mewe ka ya?

Ndịàmà Jehova na-ebi ndụ otú Baịbụl kwuru e kwesịrị isi na-ebi ndụ. Ha anaghị anabata omume ọ bụla Baịbụl na-akwadoghị. Ha anaghị eleda ndị na-anaghị ebi ndụ ka ha si ebi anya, ha anaghịkwa emegide ha.

Baịbụl Ò Kere Ndị Mmadụ Agbụ?

O nwere ndị ọ na-agụ agụụ ka ha na nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha nwee mmekọahụ. Ụfọdụ nwere ike ịna-ekwu na ndị ahụ bu agụụ ụdị mmekọahụ ahụ pụta ụwa, nakwa na ịsị na ha ekwesịghị ịna-enwe ụdị mmekọahụ ahụ na-agụ ha agụụ yiri ike ha agbụ.

Baịbụl ekwughị ihe ọ bụla banyere otú ahụ́ ndị na-eme ụdị omume a si arụ ọrụ, ma o kwuru na e nwere àgwà ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike n’obi ndị mmadụ. Baịbụl gwakwara anyị omume ndị anyị kwesịrị izere ma ọ bụrụ na anyị chọrọ irubere Chineke isi. Otu n’ime ha bụ nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ.—2 Ndị Kọrịnt 10:4, 5.

Ụfọdụ ndị na-ekwu na Baịbụl na-eke mmadụ agbụ. Ma, ihe mere ha ji ekwu ihe a bụ na ha na-eche na mmadụ kwesịrị ime ihe ọ bụla gụrụ ya agụụ, ma ọ bụkwanụ na mmadụ agaghị edili agụụ mmekọahụ. Ma, mmadụ adịghị ka anụmanụ. Baịbụl kwuru na mmadụ ga-ejideli onwe ya ma ọ chọọ, ma zere ihe ọ ma na-adịghị mma.—Ndị Kọlọsi 3:5. [5]

Ka anyị weregodị ihe atụ a tụlee ihe anyị na-ekwu: Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na o nwere àgwà ụfọdụ mmadụ nwere ike  ibu apụta ụwa, otu n’ime ha bụ iwe ọkụ. Baịbụl ekwughị ma iwe ọkụ ọ̀ bụ ihe mmadụ na-ebu apụta ụwa ka ọ̀ bụ na ọ bụghị, kama, o kwuru na e nwere ndị “na-ewekarị iwe” na ndị “na-ewe iwe ọkụ.” (Ilu 22:24; 29:22) N’agbanyeghị ya, ọ gwara ụdị ndị ahụ, sị: “Hapụ iwe, hapụkwa ọnụma.”—Abụ Ọma 37:8; Ndị Efesọs 4:31.

O nweghị onye ga-asị na ihe ahụ Baịbụl kwuru kere ndị iwe ọkụ agbụ. N’agbanyeghị na ndị ọkachamara ụfọdụ na-ekwu na iwe ọkụ na-adị ndị mmadụ n’ọbara, ha na-agba mbọ inyere ndị ahụ aka ka ha kwụsị ịna-ewe oké iwe.

Ndịàmà Jehova na-enyekwara ndị mmadụ aka ka ha kwụsị àgwà ọ bụla Baịbụl kpọrọ asị, dị ka nwoke na nwaanyị na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ. Baịbụl gwara anyị, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu mara otú ọ ga-esi jide arịa nke ya n’ịdị nsọ na nsọpụrụ, ọ bụghị iji anyaukwu na-enwe agụụ mmekọahụ.”—1 Ndị Tesalonaịka 4:4, 5.

‘Ọ Bụ Ihe Ụfọdụ n’Ime Unu Bụbu’

N’oge ndịozi Jizọs, o nwere ndị si n’ebe dị iche iche chọrọ ịbụ Ndị Kraịst. Ụfọdụ n’ime ha kwụsịrị àgwà ọjọọ ha na-akpa. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na ha bụbu ndị na-akwa iko, ndị na-ekpere arụsị, nakwa ndị ikom ha na ndị ikom ibe ha ma ọ bụ ndị inyom ha na ndị inyom ibe ha na-enwe mmekọahụ. Baịbụl kwuziri, sị: “Nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ n’ime unu bụbu.”1 Ndị Kọrịnt 6:9-11.

Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ pụtara na agụụ inwe ụdị mmekọahụ a agaghịzi agụ ndị ahụ kwụsịrịla ya? Mba. Ihe mere anyị ji kwuo otú a bụ na Baịbụl mechara gwa ụdị ndị a, sị: “Nọgidenụ na-eje ije site na mmụọ nsọ, unu agaghịkwa emezu ọchịchọ anụ ahụ́.”—Ndị Galeshia 5:16.

Cheta na Baịbụl ekwughị na ihe ọjọọ agaghị agụ onye na-efe Chineke agụụ. Kama, ihe o kwuru bụ na ọ bụ onye ahụ ga-ekpebi na ọ gaghị eme ihe ọjọọ ahụ. Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha jide onwe ha mgbe ihe ọjọọ na-agụ ha agụụ, ọ bụghị ịnọ na-eche ya ruo mgbe ha mere ya.—Jems 1:14, 15. [6]

Ihe Baịbụl kwuru gosiri na mmadụ ga-ekpebili na ọ gaghị eme ihe na-agụ ya agụụ. (Ndị Rom 7:16-25) Onye ọ na-agụ agụụ ka ya na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya nwee mmekọahụ ga-ewepụli ihe ọjọọ ahụ n’obi ya, dịkwa ka ọ ga-ewepụli ihe ọjọọ ndị ọzọ dị ka iwe na anyaukwu n’obi ya.—1 Ndị Kọrịnt 9:27; 2 Pita 2:14, 15.

Ndịàmà Jehova na-erube isi n’ihe ọ bụla Baịbụl kwuru. Ma, ha anaghị amanye ndị ọzọ ka ha kwere ihe ndị ha kweere. Ha anaghịkwa emegide ndị ahụ, ebe ọ bụ na onye ọ bụla nweere onwe ya ikpebi otú ọ ga-esi na-ebi ndụ. Ozi ọma Ndịàmà Jehova na-ezi ndị mmadụ bara ezigbo uru, ha na-ezikwa ya onye ọ bụla chọrọ ịnụ ya.—Ọrụ Ndịozi 20:20.

^ 1. Ndị Rom 12:18: “Unu na mmadụ niile dịrị n’udo.”

^ 2. Aịzaya 48:17: “Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru.”

^ 3. 1 Ndị Kọrịnt 6:18: “Gbaaranụ ịkwa iko ọsọ.”

^ 4. 1 Pita 2:17: “Sọpụrụnụ ụdị mmadụ niile.”

^ 5. Ndị Kọlọsi 3:5: “Meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ.”

^ 6. Jems 1:14, 15: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe ọchịchọ nke aka ya rapụtara ya wee rafuo ya. Mgbe ọchịchọ ahụ tụụrụ ime, ọ na-amụpụta mmehie.”

GỤKWUO GBASARA YA

Baịbụl Ọ̀ Kwadoro Nwoke Ịlụ Nwoke Ibe Ya Ma Ọ Bụ Nwaanyị Ịlụ Nwaanyị Ibe Ya?

Onye kere anyị ga-aka anyị ama ụdị alụmdi na nwunye ga-eme anyị obi ụtọ.