Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! Nke 3 n'Afọ 2016

 ISIOKWU TETA! A | IME KA NDỊ NA-ASỤ ASỤSỤ DỊ ICHE ICHE NỤ OZI ỌMA

Ime Ka Ndị Na-asụ Asụsụ Dị Iche Iche Nụ Ozi Ọma—Otú Anyị Si Arụ Ọrụ Nsụgharị

Ime Ka Ndị Na-asụ Asụsụ Dị Iche Iche Nụ Ozi Ọma—Otú Anyị Si Arụ Ọrụ Nsụgharị

Otu akwụkwọ kwuru na ndị mmadụ na-ekwu mgbe ụfọdụ na o nweghị ọrụ siri ike ka ọrụ nsụgharị.

NDỊÀMÀ JEHOVA na-ebu ụzọ hazie ihe ha chọrọ ibipụta, meere ya nchọnchọ, ma dee ya ede tupu a malite ịsụgharị ya. Ọ bụ n’isi ụlọ ọrụ ha dị n’Amerịka ka ndị na-edere ha ihe na-anọ ahazi ihe ndị ahụ. Ha na-enyocha ihe niile e dere mara ma hà bụkwa eziokwu, chọpụtakwa ma hà dị otú asụsụ Bekee kwesịrị ịdị. *

Ndị ahụ na-edere ha ihe dechaa, ha ezigara ọtụtụ ndị nsụgharị ha nọ́ n’ebe dị iche iche ihe ndị ahụ ha dere. Ọtụtụ n’ime ha nọ n’ebe a na-asụ asụsụ ha na-asụgharị ya. Onye nsụgharị ọ bụla ga-amarịrị asụsụ ọ na-asụgharị, marakwa Bekee.

Olee otú ndị nsụgharị na-esi arụ ọrụ ha?

E nwere otu nwoke Onyeàmà Jehova aha ya bụ Geraint a gbara ajụjụ ọnụ. Ya na ndị ọzọ na-arụ ọrụ nsụgharị na Briten. Ka anyị hụ ihe o kwuru gbasara otú ha si arụ ọrụ. “Ihe na-akacha enyere anyị aka bụ ịrụkọ ọrụ ọnụ. Anyị na-agbakọ aka chọpụta otú anyị ga-esi asụgharị ihe ndị tara akpụ. Anyị na-ebu ụzọ chọpụta ihe okwu ndị dị n’otu ahịrịokwu pụtara, chọpụtakwa ihe a chọrọ ka onye ga-agụ ya ghọta, dezie  ya otú ndị anyị na-asụgharịrị ya ga-enwe ike ịghọta ya.”

Olee otú ndị nsụgharị na-achọ ka ihe ha na-asụgharị dị?

“Anyị na-achọ ka ihe anyị na-asụgharị dị ndị ga-agụ ya ka ọ̀ bụ asụsụ ha ka e ji dee ya na mbụ, ka ọ gharakwa ịdị ha ka ihe a sụgharịrị asụgharị. N’ihi ya, anyị na-agbalị ịsụgharị ya ka ọ dị otú ha si ekwu okwu. Ha na-agụ ihe ahụ, ya ana-atọ ha ụtọ, uche ha adịrịkwa na ya.”

Olee uru dị ná ndị nsụgharị ibi n’ebe a na-asụ asụsụ ha na-asụgharị?

“Ọ na-enyere anyị aka ịna-asụgharị ihe otú ndị na-agụ ya ga-aghọta ya. N’ebe a anyị bi, anyị na-anụ otú ndị anyị na-asụgharịrị ihe si asụ asụsụ kwa ụbọchị. Anyị na-enwekwa ike ịjụ ha otú ha si aghọta okwu ụfọdụ anyị na-edere ha iji mara ma ọ̀ na-edokwa ha anya, ya abụrụkwa otú ha si ekwu okwu. Ime otú ahụ na-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi asụgharịrị ha ihe dị na Bekee.”

Olee otú unu si hazie ọrụ unu?

“E nweta ihe ọ bụla a ga-asụgharị, a na-enye ya ndị ga-asụgharị ya. Onye nke ọ bụla n’ime anyị na-ebu ụzọ gụọ nke Bekee, ghọta ihe ọ na-ekwu, nakwa ndị e bu n’obi dee ya. Anyị na-ajụzi onwe anyị, sị: ‘Gịnị ka ihe a na-ekwu maka ya? Gịnị ka e bu n’obi dee ya? Olee ihe a chọrọ ka onye ga-agụ ya mụta?’ Ihe ndị a na-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi asụgharị ihe ahụ.

“Anyị na-ekwurịtazi ihe ndị anyị chọpụtara, jụọkwa onwe anyị ajụjụ ndị a: Ànyị aghọtala isiokwu a nke ọma? Olee otú anyị ga-esi asụgharị ya ka ihe ọ pụtara bụrụ ihe nke Bekee pụtara? Anyị na-agba mbọ ka otú obi ga-adị onye ga-agụ ihe anyị sụgharịrị bụrụ otú ọ ga-adị onye ga-agụ nke Bekee.”

Olee otú ndị nsụgharị si arụkọ ọrụ?

“Anyị na-achọ ka ihe anyị sụgharịrị dị́ otú ọ ga-abụ a gụọ ya, a ghọta ya ozugbo. N’ihi ya, anyị na-agụpụta paragraf ọ bụla anyị sụgharịrị ugboro ugboro.

“Otu onye n’ime anyị ga na-edenye ihe a na-asụgharị na kọmputa. Anyị na-eleru ihe ahụ e dere anya ka a ghara iwepụ ihe ma ọ bụ tinye ihe. Anyị na-elezikwa ya anya iji mara ma è detara ya, marakwa ma ọ̀ bụ otú e si ekwu ya. Otu onye n’ime anyị na-agụpụtazi paragraf ahụ, ndị nke ọzọ ana-ege ntị. O nwee  ebe siiri ya ike ọgụgụ, anyị agbalịa chọpụta ihe kpatara ya. A sụgharịchaa ihe ahụ niile, otu onye n’ime anyị agụpụta ya, ndị nke ọzọ ana-akanye ihe n’ebe ndị ha chere a ga-emezi ihe.”

Ọ dị m ka ihe a abụghị obere ọrụ

“Ọ bụghị obere ọrụ. Ezigbo ike na-agwụ anyị ma anyị mechie ọrụ n’ụbọchị ọ bụla. N’ihi ya, anyị na-agụgharị ihe ahụ n’ụtụtụ echi ya mgbe isi ka jụrụ anyị oyi. Izu ole na ole gachaa, ndị na-edere anyị ihe na-ezitere anyị ihe ndị ha chọrọ ka a gbanwee n’ihe ndị ha ziteere anyị na mbụ. Anyị na-emeda obi gụgharịa ihe ahụ anyị sụgharịrị, ma dezie ihe ndị e kwesịrị idezi na ya.”

Ò nwere ihe ndị dị na kọmputa na-enyere unu aka?

“Nke bụ́ eziokwu bụ na kọmputa anaghị arụ ọrụ ndị nsụgharị na-arụ. Ma, Ndịàmà Jehova arụpụtala ihe ndị ha tinyere na kọmputa na-enyere ha aka ma ha sụgharịwa ihe. Otu n’ime ha bụ ebe anyị na-etinye ma okwu ndị anyị na-edekarị ma ihe okwu Bekee dị iche iche pụtara. Nke ọzọ bụ ebe anyị na-etinye ihe ndị anyị sụgharịrịla. Ọ na-enyere anyị aka ịchọta otú e si sụgharịa ihe ndị nwere ike isiri anyị ike ma ọ bụrụ na o nweela mgbe a sụgharịrị ya.”

Olee otú obi na-adị unu maka ọrụ a unu na-arụ?

“Anyị na-ewere ya na ihe ndị anyị na-asụgharị bụ onyinye a ga-enye ndị mmadụ. N’ihi ya, anyị na-agbalị hụ na ihe ọ bụla anyị sụgharịrị ga-abara ndị  ga-agụ ya uru. Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma anyị chọpụta na ihe mmadụ gụtara na magazin anyị ma ọ bụ na jw.org ruru ya n’obi, meekwa ka ọ gbanwee otú na-adịghị mma o si ebi ndụ.”

Uru Ịsụgharị Ihe n’Asụsụ Dị iche iche Bara

N’ụwa niile, akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova na-ebipụta na-abara nde kwuru nde mmadụ uru ma ha gụọ ya n’asụsụ ha. Ọ bụ na Baịbụl ka ha na-esi enweta ihe ndị dị n’akwụkwọ ha, vidio ha, nakwa ihe ndị ha na-etinye na jw.org. Chineke kwuru na Baịbụl na ya chọrọ ka e zie “mba niile na ebo niile na asụsụ niile” ozi ọma ya.—Mkpughe 14:6. *

^ para. 4 A na-ebu ụzọ ede ihe ọ bụla n’asụsụ Bekee tupu a sụgharịwa ya.

^ para. 25 Gaa na www.jw.org ka ị hụ akwụkwọ, ihe ndị a na-egere egere, na vidio n’asụsụ Igbo nakwa n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ.