Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! Nke 2 n'Afọ 2016

 AJỤJỤ ỌNỤ | YAN-DER HSUUW

Otu Ọkachamara Kwuru Ihe Mere O Ji Kwere na Chineke

Otu Ọkachamara Kwuru Ihe Mere O Ji Kwere na Chineke

YAN-DER HSUUW bụ prọfesọ na mahadum dị́ na Taịwan. Ọ bụ onyeisi nke ngalaba na-achọpụta ihe gbasara nwa e bu n’afọ. O kwebughị na Chineke. Ma, ihe ndị ọ chọpụtara mgbe ọ na-arụ ọrụ mere ka o kweta. Ọ kọọrọ ndị bipụtara akwụkwọ a otú o si mee.

Biko, kọtụrụ anyị ihe ụfọdụ gbasara onwe gị.

A mụrụ m n’afọ 1966. M toro na Taịwan. Okpukpe papa m na mama m na-ekpe yiri nke ndị Tao na nke ndị Buda. Anyị na-efe ndị nna nna anyị hà nwụrụ anwụ, na-ekpegakwara ihe ndị a kpụrụ akpụ ekpere. Ma, anyị ekwetaghị na ọ bụ Chineke kere ihe niile.

Gịnị mere i ji mụọ gbasara ihe ndị dị ndụ n’ụlọ akwụkwọ?

Mgbe m dị obere, ana m elekọtakarị ụmụ anụmanụ. Ọ bụ ya mere m ji chọọ ịmụtakwu otú m ga-esi na-enyere ma ụmụ anụmanụ ma ụmụ mmadụ aka ma ha daa ọrịa. Ebu m ụzọ mụọ otú e si agwọ ụmụ anụmanụ ọrịa, mechazie mụọ gbasara ụmụ e bu n’afọ, bụ́ nke m chere ga-eme ka m ghọtakwuo otú ndụ si malite.

Gịnị mere na i kweghị na Chineke na mbụ?

Na mahadum, ndị prọfesọ na-akụziri anyị na mmadụ si n’enwe pụta, mụ ekwetanụ.

Olee ihe mere i ji malite ịgụ Baịbụl?

Ọ bụ n’ihi ihe abụọ. Nke mbụ bụ na m nọ na-eche na a ga-enwerịrị chi kacha chi niile n’ime chi dị iche iche ndị mmadụ na-efe. Mana amaghị m chi nke ọ bụ. Nke abụọ abụrụ na m ma na ndị mmadụ ejighị Baịbụl egwu egwu. N’ihi ya, amalitere m ịmụ ya.

Mgbe m malitere ịmụ Baịbụl na mahadum ndị Katọlik dị́ na Beljọm n’afọ 1992, agara m n’otu ụlọ ụka ndị Katọlik rịọ ụkọchukwu nọ ebe ahụ ka o nyere m aka ịmara ihe dị́ na Baịbụl, ya ajụ.

Oleezi otú i si nweta ihe ị nọ na-achọ?

Mgbe afọ abụọ gachara, o nwere Onyeàmà Jehova sí Poland aha ya bụ Ruth kpọtụụrụ m mgbe ahụ m nọ Beljọm. Ihe o kwo gaa mụọ asụsụ Chaịniiz bụ ka ya na ndị Chaịna na-agụ akwụkwọ na mahadum nwee ike ịmụwa Baịbụl. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ mgbe m hụrụ Ruth n’ihi na ọ dịla anya m chọwara ụdị enyemaka a.

O gosiri m otú ihe ndị sayensị chọpụtara si daba n’ihe Baịbụl kwuru n’agbanyeghị na Baịbụl abụghị akwụkwọ sayensị. Dị ka ihe atụ, Devid, bụ́ onye so dee Baịbụl gwara Chineke, sị: “Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ, e dekwara akụkụ ahụ́ m niile n’akwụkwọ gị, bụ́ ụbọchị a kpụrụ ha, mgbe a na-enwebeghị ọbụna otu n’ime ha.” (Abụ Ọma 139:16) Devid bụrụ ihe a o kwuru ka abụ, ma, ihe o kwuru bụ eziokwu. A hazichaala ihe niile gbasara otú akụkụ ahụ́ niile dị́ n’ahụ́ mmadụ ga-esi na-arụ ọrụ tupu nke ọ bụla apụta. Otú ihe ndị dị́ na Baịbụl si bụrụ eziokwu mere ka m kweta na ọ bụ Okwu Chineke. M bịakwara ghọta na e nwere naanị otu ezi Chineke aha ya bụ Jehova. 1

Gịnị mere ka i kweta na ọ bụ Chineke kere ihe niile?

Isi ihe mere e ji eme nchọnchọ bụ ka a chọpụta nke bụ́ eziokwu, ọ bụghị ka a kwado ihe ndị mmadụ chepụtara. Ọ bụ ihe ndị  m chọpụtara mgbe m na-amụ gbasara nwa e bu n’afọ mere ka m kweta na e nwerịrị onye kere ihe niile. Iji maa atụ, ndị njinia chọwa ịrụpụta ụgbọala, ha na-arụ akụkụ ahụ́ ya dị́ iche iche otú a ga-enwe ike ijikọta ha ka ha ghọọ ụgbọala. Ma, otú akụkụ ahụ́ dị́ iche iche na-esi ejikọta onwe ha n’akpa nwa ma ghọọ mmadụ karịdịrị otú e si ejikọta ahụ́ ụgbọala.

Ọ̀ bụ eziokwu na ọ bụ otu mkpụrụ ndụ na-eji nwayọọ nwayọọ aghọ nwa?

Ee. A naghị ahụ mkpụrụ ndụ ahụ anya. Ma, ọ na-ekewa, mepụtawa mkpụrụ ndụ ndị ọhụrụ, na-amụbakwa n’ike n’ike. Ha nwere ike ịmụba okpukpu abụọ n’ime awa iri na abụọ ma ọ bụ n’ime awa iri abụọ na anọ. Ọ bụ mgbe ahụ mkpụrụ ndụ ndị ahụ na-amụba ka ha na-emepụta mkpụrụ ndụ ndị nke ga-amalite ịghọ nwa. 2 Mkpụrụ ndụ ndị ahụ ha mepụtara na-emepụtazi ihe ga-eru narị mkpụrụ ndụ abụọ ga-aghọ ihe dị iche iche na-adị n’ahụ́ mmadụ, dị ka ọbara, ọkpụkpụ, akwara, na ihe ndị ọzọ.

Ihe ndị m chọpụtara mgbe m na-amụ gbasara nwa e bu n’afọ mere ka m kweta na e nwerịrị onye kere ihe niile

Mkpụrụ ndụ nke ọ bụla ga-adịrịrị otú o kwesịrị ịdị, dịrịkwa ebe o kwesịrị ịdị. Ha ga-ebu ụzọ jikọọ onwe ha ghọọ uru ahụ́, ha mechaa, ha aghọọ akụkụ ahụ́ dị iche iche. O nwebeghị njinia chere echiche ịrụpụta ihe ga na-akpa ụdị ike a mkpụrụ ndụ na-akpa. Ihe niile gbasara otú mkpụrụ ndụ ga-esi aghọ nwa dị n’ime ihe a na-akpọ DNA. Mgbe m chebaara ihe a niile echiche, ọ bịara doo m anya na ọ bụ Chineke kere ihe niile.

Gịnị mere i ji ghọọ Onyeàmà Jehova?

N’ikwu ya ná nkenke, ọ bụ ịhụnanya. Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Ndị hụrụ mmadụ ibe ha n’anya anaghị akpa ókè. Ha anaghịkwa ahọ obodo mmadụ si, omenala onye ahụ, ma ọ bụ otú onye ahụ na-acha. Achọpụtara m na Ndịàmà Jehova hụrụ ibe ha n’anya otú ahụ Jizọs kwuru. Ha mekwara ihe gosiri m na ha hụrụ m n’anya mgbe m bidoro iso ha.

^ 2. N’ihi ihe Prọfesọ Yan-Der Hsuuw mụtara na Baịbụl, ọ naghị eji mkpụrụ ndụ ndị e si n’akpa nwa nweta eme nchọnchọ.