Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! Nke 2 n'Afọ 2016

 ISIOKWU TETA! A

Baịbụl Ọ̀ Pụrụ Iche n’Eziokwu?

Baịbụl Ọ̀ Pụrụ Iche n’Eziokwu?

E dechara Baịbụl n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga. Ọ ka dịkwa ruo taa. Kemgbe ahụ, e nweela ọtụtụ akwụkwọ ndị ọzọ ndị mmadụ dere na-adịghịzi ugbu a. Chebagodịrị ihe ndị anyị na-aga ikwu ugbu a echiche.

  • Mbọ niile ndị mmadụ gbara ka Baịbụl ghara ịdị kụrụ afọ n’ala. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ kọrọ ihe mere n’oge ochie n’obodo ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst. Akwụkwọ ahụ kwuru na a na-ewere onye ọ bụla nwere Baịbụl na-abụghị nke e dere n’asụsụ Latịn, ma ọ bụ na-agụ ya, ka onye nnupụisi. Ndị sụgharịrị Baịbụl n’asụsụ ndị nkịtị ma ọ bụ ndị nyeere ndị ọzọ aka ịmụ ya kara obi n’ihi na e gburu ụfọdụ n’ime ha.

  • N’agbanyeghị ihe ndị a, Baịbụl ka bụ akwụkwọ a kacha ekesa n’ụwa niile. E bipụtala ihe dị ka ijeri Baịbụl ise, ma nke zuru ezu ma nke bụ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik, n’ihe karịrị puku asụsụ abụọ na narị asatọ. O nweghị akwụkwọ ọzọ e kesarala ka Baịbụl. Ọ dịghịkwa ka akwụkwọ ndị ọzọ bụ́ ndị oge ihe e dere na ha na-agafe agafe.

  • Nsụgharị a sụgharịrị Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ enyela aka kwalite asụsụ ndị ahụ ma chebe ha. Dị ka ihe atụ, Baịbụl Matịn Luta sụgharịrị n’asụsụ Jaman nyere aka kwalite asụsụ ahụ. Otu akwụkwọ kwukwara na Baịbụl King James mbụ a sụgharịrị nyere aka kụziere ọtụtụ ndị asụsụ Bekee.

  • Otu akwụkwọ kwuru otú Baịbụl sirila nyere ndị Bekee aka ịgbanwe ọtụtụ ihe n’omenala ha. O kwuru na ọ bụghị naanị n’ihe gbasara omenala ka Baịbụl nyeere ha aka, kama, na o nyerela ha aka ịgbanwe ihe ndị ha kweere gbasara Chineke, iwu obodo ha, nyekwara ha aka n’ọchịchị nakwa n’ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

Ihe ndị a e kwuru ebe a bụ ihe ole na ole n’ime ọtụtụ ihe gosiri na Baịbụl dị iche n’akwụkwọ ndị ọzọ. Ma, olee ihe mere Baịbụl ji bụrụ akwụkwọ a ma ama otú a? Oleekwa ihe mere ọtụtụ ndị ji sụgharịa Baịbụl n’agbanyeghị na e nwere ike igbu ha maka ya? E nwere ihe ndị kpatara ya. Ka anyị kwuo ụfọdụ n’ime ha. Ihe ndị e dere na Baịbụl na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-akpa àgwà ọma ka anyị na Chineke dị ná mma. Baịbụl gwara anyị ihe mere ụmụ mmadụ ji na-ata ahụhụ ma na-egburịta onwe ha. O kwuru na ihe ndị ahụ ga-akwụsị, kwuokwa otú ha ga-esi akwụsị.

 Baịbụl Na-akụziri Anyị Àgwà Ọma

Ọ bụ eziokwu na ịga akwụkwọ bara uru, ma, otu akwụkwọ akụkọ kwuru na ọ bụghị ịga akwụkwọ na-eme ka mmadụ mụta ịkpa ezigbo àgwà. Ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ anaghị akwụwa aka ọtọ. Dị ka ihe atụ, ndị gụrụ akwụkwọ nọ́ n’ọchịchị na ndị nke ji ego achụ ego na-aghọ aghụghọ. Otu ụlọ ọrụ kwuru na ihe a ha na-eme emeela ka ndị mmadụ ghara ịna-atụkwasị ha obi.

Baịbụl na-akụziri anyị ka anyị na-akpa ezigbo àgwà. Ọ na-eme ka anyị ghọta ihe bụ́ “ezi omume na ikpe ziri ezi na ịkwụwa aka ọtọ, bụ́ ụzọ dum nke ihe dị mma.” (Ilu 2:9) Iji maa atụ, o nwere otu nwoke dị́ afọ iri abụọ na atọ anyị ga-akpọ Stephen n’isiokwu a. A tụrụ nwoke a mkpọrọ na Poland. Ma, ọ malitere ịmụ Baịbụl n’ụlọ mkpọrọ ahụ, na-emekwa ihe ndị ọ na-amụta. O mechara kwuo, sị: “Aghọtala m ihe mmadụ ịsọpụrụ nne ya na nna ya pụtara. Amụtakwala m otú m ga-esi na-ejide onwe m ma iwe na-ewe m.”—Ndị Efesọs 4:31; 6:2.

Ihe nyeere Stephen aka bụ ihe e kwuru n’Ilu 19:11. Ebe ahụ sịrị: “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ, ileghara mmejọ anya bụkwaara ya ịma mma.” Ọ na-abụzi a kpasuo Stephen iwe, ya agbalịa jide onwe ya ma cheta ihe Baịbụl kwuru ga-enyere ya aka ịma ihe o kwesịrị ime. Ọ sịrị na ya achọpụtala na o nweghị akwụkwọ ka Baịbụl akụziri mmadụ otú o kwesịrị isi na-akpa àgwà.

O nwere otu nwaanyị bụ́ Onyeàmà Jehova aha ya bụ Maria. Otu ụbọchị, otu nwaanyị kparịrị ya n’ihu ọha. Ihe ahụ nwaanyị ahụ mere kpatara aghara. Ma, Maria gawaara onwe ya kama ịsawa ya okwu. Nwaanyị ahụ kwara ụta maka ihe ahụ o mere. O mechara chọwa Ndịàmà Jehova. Mgbe ihe dị ka otu ọnwa gachara, ọ hụrụ Maria,  ya amakụọ ya ma rịọ ya mgbaghara. O mechakwara chọpụta na ihe mere Maria ji jide onwe ya mgbe ahụ ọ kparịrị ya bụ maka ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl. Nwaanyị a na mmadụ ise ndị ezinụlọ ya kpebiziri ka ha na Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl.

Jizọs kwuru na ihe e ji ama na amamihe ziri ezi bụ ihe ọ na-arụpụta. (Matiu 11:19) E nwere ọtụtụ ihe na-egosi na ihe Baịbụl kwuru bara uru. Ọ na-eme ka anyị na-akpa àgwà ọma, “na-eme ka onye na-amaghị ihe mara ihe,” “na-eme ka obi ṅụrịa ọṅụ,” na-emekwa ka anyị mara ihe anyị kwesịrị ime na ihe anyị na-ekwesịghị ime.—Abụ Ọma 19:7, 8.

Baịbụl Kwuru Ihe Mere Ụmụ Mmadụ Ji Na-ata Ahụhụ ma Na-egburịta Onwe Ha

Ọ bụrụ na e nwere ọrịa na-efe efe n’obodo, ndị ọkachamara na-agbasi mbọ ike ka ha chọpụta ihe kpatara ya. Ọ bụkwa otú ahụ ka anyịnwa kwesịrị ịchọpụta ihe mere ụmụ mmadụ ji na-ata ahụhụ ma na-egburịta onwe ha. Baịbụl ga-enyere anyị aka ịchọpụta ya n’ihi na ọ bụ n’ime ya ka e dere ihe niile mere mgbe nsogbu a malitere.

Akwụkwọ Jenesis gwara anyị na ọ bụ mgbe Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi ka ahụhụ malitere. Ha chọrọ iji aka ha na-ekpebiri onwe ha ihe bụ ihe ọma na ihe ọjọọ kama ikwe ka Chineke na-agwa ha ihe ha ga-eme. (Jenesis 3:1-7) Kemgbe ahụ ha nupụchara isi, ọtụtụ ndị na-eme ka ha, na-ebi ndụ otú masịrị ha. Kama ihe ga-aka mma, ya ana-aka njọ, ahụhụ na mmegbu ana-arị ibe ya elu. (Ekliziastis 8:9) Ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ọ dịrịghị mmadụ . . . iduzi nzọụkwụ ya.” (Jeremaya 10:23) Obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ na oge a ga-ebibi ndị na-enupụrụ Chineke isi eruwela.

 Baịbụl Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya

Baịbụl na-emesi anyị obi ike na Chineke hụrụ ndị na-efe ya n’anya nakwa na ọ gaghị agbachi nkịtị ka ndị ọjọọ mere ha ji na-ata ahụhụ dịruo ebighị ebi. O kwuru na ndị ọjọọ ga-anata ụgwọ ọrụ ha. (Ilu 1:30, 31) Ma, “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:11.

“Ọ bụ uche [Chineke] ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”—1 Timoti 2:3, 4

Chineke ga-eji “Alaeze” ya mee ka udo dị n’ụwa niile. (Luk 4:43) Alaeze ya ahụ bụ ọchịchị ga-achị ụwa niile. Ọ bụkwa ya ka ọ ga-eji eme ka o doo ewu na ọkụkọ anya na ọ bụ yanwa kwesịrị ịchị ụmụ mmadụ. N’ekpere ahụ Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya, o kwuru na ọchịchị ahụ ga-achị ụwa. Ọ gwara ha ka ha rịọ sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa.”—Matiu 6:10.

Ndị niile Alaeze ahụ ga-achị ga na-eme naanị uche Chineke iji gosi na ọ bụ ya kere ha ma kwesị ịchị ha. A gaghịzi enwe nrụrụ aka, anyaukwu, ịkpọasị, na agha. O nweghịkwa onye ga-ada ogbenye. Ọ bụ otu ọchịchị ga na-achị ụwa niile. Ọ bụkwa naanị Chineke ga na-agwa ụmụ mmadụ ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ.—Mkpughe 11:15.

A ga-akụzirịrị onye ọ bụla chọrọ ibi n’ụwa ọhụrụ ahụ ihe bụ́ uche Chineke. 1 Timoti 2:3, 4 kwuru na “ọ bụ uche [Chineke] ka a zọpụta  ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” Ihe so n’eziokwu ahụ amaokwu a kwuru okwu ya bụ ihe ndị Baịbụl kwuru Chineke chọrọ ka ndị ga-aba n’Alaeze ya na-eme. Jizọs kwuru ụfọdụ n’ime ha mgbe ọ nọ n’elu ugwu na-ezi ndị mmadụ ihe. E dere ha na Matiu isi ise ruo isi asaa. Ị gụwa ebe ahụ, jiri anya nke uche gị hụ otú ndụ ga-adị ma mmadụ niile na-eme ihe ndị ahụ Jizọs kwuru.

O kwesịghị iju anyị anya na o nweghị akwụkwọ zuru ụwa ka Baịbụl. Ihe ndị ọ na-akụzi enweghị atụ. Otú e si na-ekesara ya mmadụ niile na-egosikwa na Chineke chọrọ ka onye ọ bụla mụta gbasara ya ma soro nweta ihe ọma ndị ga-adị n’Alaeze ya.—Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.

GỤKWUO GBASARA YA

Baịbụl Ọ̀ Na-ekwu Eziokwu?

Ọ bụrụ na Baịbụl bụ okwu Chineke, ọ ga-adị iche n’akwụkwọ ọ bụla ọzọ e detụrụla.

Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

Baịbụl na-enyere ọtụtụ ndị aka ịmata azịza ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa. Ị̀ ga-achọ ka Baịbụl nyere gị aka?