Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2016

Unu Echefula Imere Ndị Bịara Abịa Ihe Ọma

Unu Echefula Imere Ndị Bịara Abịa Ihe Ọma

“Unu echefula ile ọbịa, [ya bụ, imere ndị bịara abịa ihe ọma.]”—HIB. 13:2.

ABỤ: 124, 79

1, 2. (a) Olee nsogbu ọtụtụ ndị bịara abịa na-enwe taa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị ka Pọl gwara anyị mee, oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-elebara anya?

N’IHE karịrị afọ iri atọ gara aga, Osei [1] si Gana gaa Yurop. N’oge ahụ, ọ bụghị Onyeàmà Jehova. O kwuru, sị: “Ọ dịghị anya, mụ amata na ihe banyere m anaghị emetụ ọtụtụ ndị n’obi. Ihu ígwé kpakwara m aka ọjọọ. Mgbe m hapụrụ ọdụ ụgbọelu, ụdị oyi tụrụ m atụtụbeghị m. M malitere ibe ákwá.” O were Osei ihe karịrị otu afọ inweta ezigbo ọrụ n’ihi na o siiri ya ike ịmụta asụsụ ndị obodo ahụ. Ebe ndị ezinụlọ ya na-anọghị ya nso, owu nọ na-ama ya, agụụ ịhụ ha ana-agụkwa ya.

2 Chegodị otú ị ga-achọ ka ndị ọzọ si mesoo gị ma ụdị ihe a mere Osei mee gị. Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ka ndị ọzọ jiri obi ụtọ nabata gị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’agbanyeghị obodo i si bịa ma ọ bụ otú akpụkpọ ahụ́ gị na-acha? N’eziokwu, Baịbụl gbara  ezigbo Ndị Kraịst ume, sị: “Unu echefula ile ọbịa, [ya bụ, imere ndị bịara abịa ihe ọma.]” (Hib. 13:2) N’ihi ya, ka anyị lebara ajụjụ ndị a anya: Olee otú Jehova si ele ndị bịara abịa anya? Gịnị mere o nwere ike iji dị mkpa ka anyị gbanwee otú anyị si ele ndị bịara abịa anya? E nwee ndị si obodo ọzọ bịa ọhụrụ n’ọgbakọ anyị, olee otú anyị ga-esi mee ka obi ruo ha ala?

OTÚ JEHOVA SI ELE NDỊ BỊARA ABỊA ANYA

3, 4. N’Ọpụpụ 23:9, olee otú Chineke chọrọ ka ndị Izrel sí na-emeso ndị bịara abịa, n’ihi gịnịkwa?

3 Mgbe Jehova napụtachara ndị ya n’Ijipt, o nyere ha iwu ndị kụziiri ha ka ha na-emere ndị na-abụghị ndị Izrel so ha si Ijipt pụta ihe ọma. (Ọpụ. 12:38, 49; 22:21) Ebe ọ na-anaghị adịchara ndị bịara abịa mfe, Jehova ji obiọma hazie otú a ga-esi lekọta ha. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịga tụtụkọrọ ihe ndị e wefọrọ n’ubi.—Lev. 19:9, 10.

4 Kama naanị inye ndị Izrel iwu ka ha na-akwanyere ndị bịara abịa ùgwù, Jehova rịọrọ ha ka ha ghara imegbu ha. (Gụọ Ọpụpụ 23:9.) Ha ma otú ọ na-adị onye mbịarambịa. Tupu ndị Izrel aghọọ ndị ohu n’Ijipt, ndị Ijipt kpọrọ ha asị, ikekwe, n’ihi agbụrụ ha na okpukpe ha. (Jen. 43:32; 46:34; Ọpụ. 1:11-14) Ndị Izrel tara ezigbo ahụhụ n’Ijipt, ma Jehova chọrọ ka ha were ndị bịara abịa nọ́ n’obodo ha “ka nwa afọ.”—Lev. 19:33, 34.

5. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-emere ndị bịara abịa ihe ọma otú ahụ Jehova na-eme?

5 Jehova agbanwebeghị. N’ihi ya, e nwee ndị si obodo ọzọ bịa n’ọgbakọ anyị, anyị ekwesịghị ichefu na Jehova chọrọ ka a na-emere ha ihe ọma. (Diut. 10:17-19; Mal. 3:5, 6) Chegodị banyere nsogbu ndị bịara abịa na-enwe. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ha amaghị asụsụ a na-asụ n’obodo ha bịara, e nwekwara ike ịna-emegbu ha. Ka anyị na-agbalịsi ike inyere ha aka ma na-emere ha ihe ọma.—1 Pita 3:8.

ÀNYỊ KWESỊRỊ ỊGBANWE OTÚ ANYỊ SI ELE NDỊ BỊARA ABỊA ANYA?

6, 7. Olee ihe gosiri na Ndị Kraịst oge mbụ kwụsịrị ịkpọ ndị si obodo ọzọ asị?

6 N’oge ndịozi Jizọs, ọtụtụ ndị Juu kpọrọ ndị si ebe ọzọ asị. Ma, Ndị Kraịst kwụsịrị ịkpọ ndị ọzọ asị. Na Pentikọst afọ 33, ndị bi na Jeruselem lere ndị ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ ọbịa n’agbanyeghị na ha si ebe dị iche iche bịa. (Ọrụ 2:5, 44-47) Ihe ahụ Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu mere gosiri na ha ghọtara ihe ‘ile ọbịa’ pụtara.

7 Ma, ka ọgbakọ Ndị Kraịst nọ na-amụba, e nwere ihe merenụ. Ndị Juu na-asụ Grik nọ na-ekwu na a na-emegbu ụmụ nwaanyị ha di ha nwụrụ. (Ọrụ 6:1) Ihe ndịozi mere iji dozie nsogbu ahụ bụ na ha họpụtara ndị ikom asaa, ndị ga-ahụ na e nweghị onye e leghaara anya. Ndị ahụ niile ha họpụtara na-aza aha ndị Grik. O nwere ike ịbụ n’ihi na ndịozi Jizọs chọrọ ka obi ruo ụmụ nwaanyị ndị ahụ di ha nwụrụ ala.—Ọrụ 6:2-6.

8, 9. (a) Olee ihe nwere ike igosi na anyị kpọrọ ndị si obodo ọzọ asị ma ọ bụ na obodo anyị na-ebu anyị isi? (b) Olee ihe anyị kwesịrị iwepụ n’obi anyị? (1 Pita 1:22)

8 Ma ànyị kwere ma anyị ekweghị, e nwere omenala ndị riri anyị ahụ́. (Rom 12:2) Anyị nwere ike ịnụ ka ndị agbata obi anyị, ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị na-ekwu okwu ọjọọ banyere ndị ọzọ n’ihi ebe ha si, agbụrụ ha, ma ọ bụ otú akpụkpọ ahụ́ ha na-acha. Ụdị echiche ahụ ọ̀ na-akpa anyị aka ọjọọ? Gịnị ka anyị na-eme ma  mmadụ chịwa anyị ọchị maka obodo anyị, ma eleghị anya, ha kwuwe ihe ụfọdụ gbasara omenala anyị, ha etinye ya nnu na ose?

9 E nwere mgbe Pita onyeozi kpọrọ ndị na-abụghị ndị Juu asị, ma o ji nwayọọ nwayọọ kwụsị ya. (Ọrụ 10:28, 34, 35; Gal. 2:11-14) Ọ bụrụ na anyị achọpụta na e nwere otú anyị si kpọ ndị si obodo ọzọ asị ma ọ bụ na obodo anyị na-ebu anyị isi, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị wepụ ịkpọasị n’obi anyị. (Gụọ 1 Pita 1:22.) Anyị kwesịrị icheta na o nweghị onye n’ime anyị kwesịrị ka a zọpụta ya; anyị niile bụ ndị na-ezughị okè n’agbanyeghị obodo anyị si. (Rom 3:9, 10, 21-24) Gịnịzi mere anyị ga-eji chewe na anyị ka ndị ọzọ? (1 Kọr. 4:7) Anyị kwesịrị ịna-ele ndị ọzọ anya otú ahụ Pọl onyeozi si lee ha. Ọ gwara Ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ na ha ‘abụkwaghị ndị mba ọzọ na ndị mbịarambịa, kama na ha so n’ezinụlọ Chineke.’ (Efe. 2:19) Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị kwụsị ịkpọ ndị bịara abịa asị n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ.—Kọl. 3:10, 11.

OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-EMERE NDỊ BỊARA ABỊA IHE ỌMA

10, 11. Olee otú ihe Boaz meere Rut bụ́ nwaanyị Moab si gosi na o ṅomiri otú Jehova si ele ndị bịara abịa anya?

10 O doro anya na otú Boaz si meso Rut bụ́ nwaanyị Moab gosiri na ọ mụtara otú Jehova si ele ndị bịara abịa anya. Mgbe ọ bịara ịhụ ndị na-ewere ya ihe ubi, ọ hụrụ otu nwaanyị na-arụsi ọrụ ike, nke si obodo ọzọ. Mgbe Boaz nụrụ na ọ rịọrọ ka e kwe ya na-atụtụkọrọ ọka ndị a hapụrụ ahapụ n’agbanyeghị na o nwere ikike ime otú ahụ, ọ hapụrụ ya ka ọ tụtụkọrọ ọka ndị a dọpụtara n’ùkwù ọka.—Gụọ Rut 2:5-7, 15, 16.

11 Mkparịta ụka Boaz na Rut gosiri na ihe gbasara Rut na otú ihe si siere ya ike na-emetụ Boaz n’obi. Ọ gwara Rut ka o soro ụmụ nwaanyị ndị na-arụrụ ya ọrụ ka ụmụ nwoke ndị na-ewere ya ihe ubi ghara imetụ ya aka. O medịrị ndokwa ka e nwee nri na mmiri ga-ezuru Rut otú ahụ o meere ndị na-arụrụ ya ọrụ. Ihe ọzọ bụ na Boaz akparịghị nwaanyị a bụ́ ogbenye, kama ọ gwara ya okwu mere ka obi sie ya ike.—Rut 2:8-10, 13, 14.

12. Ọ bụrụ na anyị na-emere ndị si obodo ọzọ bịa ihe ọma, olee uru o nwere ike ịba?

12 Ihe mere Boaz ji meere Rut ihe ọma abụghị naanị maka na ọ hụrụ Neomi bụ́ nne di ya n’anya, kama ọ bụkwa maka na obi dị ya ụtọ na Rut efewela Jehova, ‘gbabakwa n’okpuru nku ya.’ Ihe ọma Boaz meere Rut gosiri na ọ na-eṅomi ịhụnanya Jehova na obiọma ya. (Rut 2:12, 20; Ilu 19:17) Taakwa, ọ bụrụ na anyị na-emere ndị ọzọ ihe ọma, ọ ga-eme ka “ụdị mmadụ niile” mụta eziokwu ma ghọta na Jehova hụrụ ha n’anya nke ukwuu.—1 Tim. 2:3, 4.

Anyị hụ ndị si mba ọzọ bịa ọhụrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, ànyị na-ekele ha nke ọma? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na 14)

13, 14. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ịgbalịsi ike ka anyị na-ekele ndị si obodo ọzọ bịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị? (b) Olee ihe nwere ike inyere gị aka ka obi ruo gị ala ịgwa ndị si obodo ọzọ bịa okwu?

13 Otú anyị nwere ike isi meere ndị si obodo ọzọ bịa ọhụrụ ihe ọma bụ ikele ha nke ọma n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe ụfọdụ, ndị si obodo ọzọ bịa ọhụrụ na-eme ihere, na-anọkwara onwe ha. Otú e si zụọ ha ma ọ bụ otú e si ele ha anya nwere ike ime ka ha chee na ndị agbụrụ ọzọ ma ọ bụ ndị obodo ọzọ ka ha. N’ihi ya, anyị kwesịrị ibu ụzọ kelee ha ma gosi ha na ihe ha masịrị anyị. Ọ bụrụ na e nwere ihe a na-akpọ JW Language n’asụsụ unu, ọ ga-enyere gị aka ịmụta otú ị ga-esi kelee ha n’asụsụ ha.—Gụọ Ndị Filipaị 2:3, 4.

 14 O nwere ike obi agaghị eru gị ala ịgwa onye si obodo ọzọ bịa okwu. Ị chọọ ka obi ruo gị ala, i nwere ike ịgwa ya ihe ụfọdụ banyere onwe gị. I nwedịrị ike ịchọpụta na e nwere ọtụtụ ihe unu na-eme hanwa na-emekwa, nke ị na-amabughị. Cheta na obodo ọ bụla nwere ihe ndị ha na-emeta na ihe ndị ha na-anaghị emeta.

MEE KA AHỤ́ RUO MMADỤ NIILE ALA

15. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-aghọtakwu ndị bịara ọhụrụ n’obodo anyị?

15 Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ahụ́ ruo ndị bịara abịa ala n’ọgbakọ unu, jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ bụrụ na m nọ n’obodo ọzọ, olee otú m chọrọ ka ha si mesoo m?’ (Mat. 7:12) Anyị kwesịrị ịna-enwere ndị bịara ọhụrụ n’obodo anyị ndidi. Ná mmalite, o nwere ike anyị agaghị aghọta otú ha si akpa àgwà ma ọ bụ otú ha si eche echiche. Ma, kama ịtụwa anya ka ha mụta omenala anyị ozugbo, ọ́ gaghị aka mma ka anyị were ha otú ha dị?—Gụọ Ndị Rom 15:7.

16, 17. (a) Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ka anyị matakwuo ndị si obodo ọzọ bịa? (b) Olee ihe ndị anyị nwere ike ime iji nyere ndị si mba ọzọ bịa n’ọgbakọ anyị aka?

16 Anyị hụ ndị si obodo ọzọ bịa, o nwere ike ịdịrị anyị mfe ịmatakwu ha ma anyị mụọ banyere obodo ha na omenala ha. E nwee ndị anyị na-amachaghị n’ọgbakọ anyị ma ọ bụ n’ebe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị nwere ike ime nchọnchọ gbasara omenala ha ma anyị nwewe ofufe ezinụlọ. Ihe ọzọ nwere ike ime ka anyị na ha na-adịkwu ná mma bụ ịkpọ ha ka ha bịa kụọ ngaji n’ezé n’ụlọ anyị. Ebe Jehova ‘megheere ndị mba ọzọ ọnụ ụzọ nke okwukwe,’ ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịkpọbata ndị bịara abịa n’ụlọ anyị, ya bụ, “ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe”?—Ọrụ 14:27; Gal. 6:10; Job 31:32.

Ànyị na-ele ndị si mba ọzọ bịa ọhụrụ ọbịa nke ọma? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na 17)

17 Anyị wepụta oge ka anyị na ezinụlọ ndị si mba ọzọ bịa nọrịa, anyị  ga-aghọtakwu mbọ ha na-agba ịmụta omenala anyị. Ma, anyị nwere ike ịmata na anyị kwesịrị ịna-enyere ha aka ịmụta asụsụ anyị. Anyị nwekwara ike inyere ha aka chọta ọrụ ma ọ bụ ebe ha ga-ebi. Anyị sí otú ahụ nyere ụmụnna anyị aka, o nwere ike ime ka ahụ́ ruo ha ala.—Ilu 3:27.

18. Olee àgwà ọma Rut kpara ndị si mba ọzọ bịa kwesịrị ịmụta taa?

18 O doro anya na ndị si mba ọzọ bịa kwesịrị ịgbalịsi ike ka ebe ha bịara mara ha ahụ́. Ọ bụ ihe Rut mere. Nke mbụ, ọ natara ikike tupu ya ebido ịtụtụkọrọ ọka a hapụrụ ahapụ, sí otú ahụ gosi na ọ na-akwanyere omenala obodo ahụ ọ bịara ùgwù. (Rut 2:7) O jighị aka abụọ zọwa ihe ahụ ka à ga-asị na onye nwe ubi ahụ ji ya ụgwọ. Nke abụọ, ozugbo e meere ya ihe ọma, o kwuru ihe gosiri na obi dị ya ụtọ maka ya. (Rut 2:13) Ọ bụrụ na ndị si obodo ọzọ ana-eme otú a, o nwere ike ime ka ụmụnna na ndị ọzọ na-akwanyere ha ùgwù.

19. Gịnị na gịnị mere anyị ji kwesị ịna-anabata ndị si obodo ọzọ bịa n’ọgbakọ anyị?

19 Obi dị anyị ụtọ na obiọma na-erughịrị mmadụ Jehova na-egosi anyị mere ka o kwe ka ndị si ebe dị iche iche nụ ozi ọma. Ụfọdụ ndị agaraghị enwe ike ịmụ Baịbụl ma ọ bụ iso Ndịàmà Jehova na-aga ọmụmụ ihe ma a sị na ha nọ n’obodo ha. Ma, ugbu a ha nwere ohere iso anyị na-aga ọmụmụ ihe, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-enyere ha aka ka ọ ghara ịna-adị ha ka ha esoghị biri? O nwere ike ịbụ na anyị agaghị enyeli ha ego buru ibu ma ọ bụ meere ha ihe niile ha chọrọ, ma ihe ọma anyị meere ha ga-egosi ha na Jehova hụrụ ha n’anya. Ebe anyị “na-eṅomi Chineke,” ka anyị na-agbalịsi ike ịna-anabata ndị si obodo ọzọ bịa n’ọgbakọ anyị.—Efe. 5:1, 2.

^ [1] (paragraf nke 1) Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.