Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2016

Nwee Okwukwe ná Nkwa Ndị Jehova Kwere

Nwee Okwukwe ná Nkwa Ndị Jehova Kwere

“Okwukwe bụ . . . ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-adịghị ahụ anya dị adị n’ezie.”—HIB. 11:1.

ABỤ: 54, 125

1. Olee otú anyị kwesịrị isi were okwukwe?

OKWUKWE Ndị Kraịst bụ àgwà bara ezigbo uru. Ma, ọ bụghị mmadụ niile nwere ya. (2 Tesa. 3:2) Ma, Jehova na-eme ka onye ọ bụla jí obi ya niile na-efe ya nwee okwukwe. (Rom 12:3; Gal. 5:22) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na o mere ka anyị nwee okwukwe.

2, 3. (a) Olee ihe ọma onye nwere okwukwe nwere ike inweta? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

2 Jizọs Kraịst kwuru na Nna ya nke eluigwe na-esi n’aka Ọkpara ya eme ka ndị mmadụ bịakwute ya. (Jọn 6:44, 65) Mmadụ inwe okwukwe na Jizọs ga-eme ka a gbaghara ya mmehie ya. Onye ahụ ga-esi otú ahụ nwee olileanya na ya na Jehova ga-adị ná mma ruo mgbe ebighị ebi. (Rom 6:23) Ànyị ruru eru ka Jehova meere anyị ụdị ihe ọma a? Ebe anyi bụ ndị mmehie, naanị ihe anyị kwesịrị inweta bụ ọnwụ. (Ọma 103:10) Ma, Jehova hụrụ na anyị ga-emeli ihe ọma. O ji obiọma ya na-erughịrị mmadụ mee ka anyị nụ ozi ọma. N’ihi ya, anyị malitere  inwe okwukwe ma nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.—Gụọ 1 Jọn 4:9, 10.

3 Ma, gịnị bụ okwukwe? Ọ̀ pụtara naanị ịghọta ihe ọma ndị Chineke kwere nkwa imere anyị? Oleekwa otú anyị kwesịrị isi gosi na anyị nwere okwukwe?

‘NWEE OKWUKWE N’OBI GỊ’

4. Kọwaa ihe mere na okwukwe apụtaghị naanị ịghọta ihe bụ́ nzube Chineke.

4 Inwe okwukwe apụtaghị naanị ịghọta ihe bụ́ nzube Chineke, kama ọ pụtakwara na anyị ga-achọsi ike ime uche ya. Mmadụ nwee okwukwe n’onye Chineke ga-esi n’aka ya zọpụta ụmụ mmadụ, onye ahụ ga na-ezi ndị ọzọ ozi ọma. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị ga-eji ‘ọnụ gị’ kwusaa ‘okwu ahụ’ n’ihu ọha, na Jizọs bụ Onyenwe anyị, ma na-enwe okwukwe n’obi gị na Chineke si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya, a ga-azọpụta gị. N’ihi na mmadụ na-eji obi enwe okwukwe maka ezi omume, ma ọnụ ka mmadụ na-eji eme nkwupụta ihu ọha maka nzọpụta.”—Rom 10:9, 10; 2 Kọr. 4:13.

5. Gịnị mere okwukwe ji dị ezigbo mkpa, oleekwa otú anyị ga-esi mee ka ọ na-esi ike? Nye ihe atụ.

5 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke, o doro anya na anyị kwesịrị inwe okwukwe ma na-eme ka o sie ike. Okwukwe yiri ihe a kụrụ akụ e kwesịrị ịna-agba mmiri ka o nwee ike na-eto. Ihe a kụrụ akụ adịghị ka ihe a kpụrụ akpụ. Ihe a kụrụ akụ ga-akpọnwụ ma ọ bụrụ na a naghị agba ya mmiri. Otú ahụ ka okwukwe anyị dị. Anyị leghara ya anya, ọ ga-anyụ ka ọkụ. (Luk 22:32; Hib. 3:12) Ma, ọ bụrụ na anyị na-elebara okwukwe anyị anya, ọ ga na-ama pokopoko ka ihe a kụrụ akụ, ‘na-etokwa eto,’ anyị ‘anọgidesiekwa ike n’okwukwe.’—2 Tesa. 1:3; Taị. 2:2.

OTÚ BAỊBỤL SI KỌWAA OKWUKWE

6. Olee ụzọ abụọ Ndị Hibru 11:1 si kọwaa okwukwe?

6 Baịbụl kọwara okwukwe ná Ndị Hibru 11:1. (Gụọ ya.) Ihe abụọ amaokwu a kwuru banyere okwukwe bụ ihe ndị anyị na-anaghị ahụ anya. Nke mbụ bụ “ihe ndị a na-ele anya ha,” nke nwere ike ịbụ ihe ndị Chineke kwere ná nkwa ga-eme n’ọdịnihu, ma ha emebeghị. Dị ka ihe atụ, Chineke kwuru na ya ga-ewepụ ihe ọjọọ niile, meekwa ka ụwa ọhụrụ bịa. Nke abụọ bụ “ihe ndị a na-adịghị ahụ anya dị adị n’ezie.” Okwu Grik e si sụgharịta “ihe àmà doro anya” pụtara ihe na-egosi na ihe a na-anaghị ahụ anya dị adị n’eziokwu. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bụ Jehova Chineke, Jizọs Kraịst, ndị mmụọ ozi, na ihe dị iche iche Alaeze Chineke merela. (Hib. 11:3) Olee otú anyị ga-esi gosi na olileanya anyị siri ike nakwa na anyị kwetasiri ike n’ihe ndị a na-anaghị ahụ anya Baịbụl kwuru banyere ha? Ọ bụ okwu ọnụ anyị na omume anyị ka anyị ga-eji egosi ya n’ihi na ma anyị emeghị otú ahụ, okwukwe anyị agaghị ezu ezu.

7. Olee otú ihe Noa mere si nyere anyị aka ịghọta ihe okwukwe pụtara? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

7 Ndị Hibru 11:7 kwuru banyere okwukwe Noa. ‘Mgbe Chineke dọrọ ya aka ná ntị banyere ihe ndị a na-ahụbeghị anya,’ ọ tụrụ “egwu Chineke ma rụọ ụgbọ maka ịzọpụta ezinụlọ ya.” Ụgbọ ahụ Noa rụrụ gosiri na o nwere okwukwe. Ọ ga-abụrịrị na ndị agbata obi ya nọ na-ajụ ya ihe mere o ji na-arụ ụgbọ há otú ahụ. Noa ọ̀ gbachiri nkịtị ma ọ bụ gwa ha na ọ gbasaghị ha? Mbanụ. Okwukwe ya mere ka ọ kata obi gbaara ha àmà, dọọkwa ha aka ná ntị na Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ. O nwere ike ịbụ na Noa gwara ha ugboro ugboro ihe Jehova gwara ya,  ya bụ, “Ahụla m na ọgwụgwụ nke anụ ahụ́ niile eruwo, n’ihi na ụwa jupụtara n’ime ihe ike n’ihi ha . . . M ga-eweta iju mmiri n’elu ụwa iji bibie anụ ahụ́ niile ike ndụ na-arụ ọrụ n’ime ha n’okpuru eluigwe. Ihe ọ bụla dị n’ụwa ga-ekubi ume.” Ọ ga-abụkwa na Noa gwara ha ihe ha ga-eme ka e chebe ha. Chineke nyere ya iwu, sị: ‘Ị ga-abanye n’ụgbọ ahụ.’ Noa si otú ahụ gosi na o nwere okwukwe, bụrụkwa “onye na-ekwusa ezi omume.”—Jen. 6:13, 17, 18; 2 Pita 2:5.

8. Gịnị ka Jems si n’ike mmụọ nsọ kọwaa banyere ihe ezigbo okwukwe Ndị Kraịst pụtara?

8 Jems dekwara banyere okwukwe. Ọ dị ka ò dere akwụkwọ ozi ya obere oge Pọl degachaara ndị Hibru akwụkwọ ozi nke ya. Jems kwuru na ezigbo okwukwe Ndị Kraịst apụtaghị naanị ikwere na Chineke dị; ọ bụ omume anyị ga-egosi na anyị nwere okwukwe. O dere, sị: “Gosi m okwukwe gị nke na-agụnyeghị ọrụ, m ga-egosikwa gị okwukwe m site n’ọrụ m.” (Jems 2:18) Jems mekwara ka a ghọta ihe dị́ iche n’ikwere na Chineke dị nakwa n’igosi na mmadụ nwere okwukwe. Ndị mmụọ ọjọọ kweere na Chineke dị, ma ha enweghị ezigbo okwukwe. Kama, ha na-agba nzube Chineke mgba okpuru. (Jems 2:19, 20) Ma, onye nwere okwukwe  na-arụ ezi ọrụ iji mee ihe dị́ Chineke mma. Jems dere, sị: “Ọ̀ bụ na e siteghị n’ọrụ kpọọ nna anyị bụ́ Ebreham onye ezi omume mgbe ọ chụsịrị nwa ya bụ́ Aịzik n’àjà n’elu ebe ịchụàjà? Ị hụrụ na okwukwe ya na ọrụ ya rụkọrọ ọrụ, e sitekwara n’ọrụ ya mee ka okwukwe ya zuo okè.” Iji mee ka a ghọta na mmadụ kwesịrị isi n’ọrụ ya gosi na ya nwere okwukwe, Jems kwukwara, sị: “Dị ka ahụ́ nke na-enweghị mmụọ bụ ihe nwụrụ anwụ, otú ahụkwa, okwukwe nke na-enweghị ọrụ bụ ihe nwụrụ anwụ.”—Jems 2:21-23, 26.

9, 10. Olee otú Jọn onyeozi si nyere anyị aka ịghọta na inwe okwukwe dị mkpa?

9 Mgbe ihe karịrị afọ iri atọ gachara, Jọn onyeozi dere Oziọma ya na akwụkwọ ozi atọ ndị o dere. Ọ̀ ghọtara ihe Pọl na Jems si n’ike mmụọ nsọ kọwaa banyere ezigbo okwukwe Ndị Kraịst? Jọn kwuru ọtụtụ ugboro banyere okwu Grik e si sụgharịta ‘inwe okwukwe’ karịa onye ọzọ só dee Baịbụl.

10 Dị ka ihe atụ, Jọn kwuru, sị: “Onye nwere okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; onye na-enupụrụ Ọkpara ahụ isi agaghị ahụ ndụ, kama ọnụma Chineke na-adịgide n’ahụ́ ya.” (Jọn 3:36) Okwukwe Ndị Kraịst pụtara na anyị ga na-erubere Jizọs isi. Ihe Jọn dere na-eme ka anyị ghọta na Jizọs kwuru ugboro ugboro na inwe okwukwe abụghị ihe a na-eme naanị otu mgbe.—Jọn 3:16; 6:29, 40; 11:25, 26; 14:1, 12.

11. Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ na anyị ma eziokwu Baịbụl?

11 Obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ na Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka anyị ghọta eziokwu Baịbụl, meekwa ka anyị nwee okwukwe n’ozi ọma. (Gụọ Luk 10:21.) Anyị ekwesịghị ịkwụsị ịna-ekele Jehova maka na o si n’aka Ọkpara ya, bụ́ “Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke okwukwe anyị,” mee ka anyị bịakwute ya. (Hib. 12:2) Anyị kwesịrị ịna-eme ka okwukwe anyị sie ike iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọma ahụ Chineke meere anyị. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-ekpe ekpere na ịna-amụ Okwu Chineke.—Efe. 6:18; 1 Pita 2:2.

Jiri ohere ọ bụla na-ekwusa ozi ọma iji gosi na i nwere okwukwe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12. Olee ụzọ ndị anyị kwesịrị isi gosi na anyị nwere okwukwe?

12 Omume anyị kwesịrị ịna-egosi ndị ọzọ na okwukwe anyị siri ike na Jehova ga-emezu nkwa ya. Dị ka ihe atụ, anyị ga na-ekwusa banyere Alaeze Chineke, na-enyekwara ndị ọzọ aka ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Anyị ga ‘na-emekwa ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ, ma karịsịa, n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.’ (Gal. 6:10) Anyị ga na-agbalịsi ike ‘iyipụ mmadụ ochie ahụ na omume ya’ ma kpachara anya ka ihe ọ bụla ghara ime ka okwukwe anyị nyụwa ka ọkụ.—Kọl. 3:5, 8-10.

INWE OKWUKWE NA CHINEKE SO N’IHE DỊ MKPA

13. Olee otú ‘inwe okwukwe na Chineke’ si dị mkpa? Gịnị ka Baịbụl kpọrọ ya, n’ihi gịnịkwa?

13 Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụkwa na okwukwe adịghị, ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị ya ezi mma, n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, na ọ bụkwa onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Hib. 11:6) Ihe Baịbụl kwuru gosiri na onye chọrọ ịbụ ezigbo Onye Kraịst ga-ebu ụzọ ‘nwee okwukwe na Chineke dị.’ O so n’ihe Baịbụl kpọrọ “ntọala.” (Hib. 6:1) Ma, e wezụga okwukwe, e nwere àgwà ndị ọzọ dị mkpa Ndị Kraịst kwesịrị inwe, nke ga-eme ka ha ‘nọrọ n’ịhụnanaya Chineke.’—Gụọ 2 Pita 1:5-7; Jud 20, 21.

14, 15. Gịnị mere inwe ịhụnanya ji dị mkpa karịa inwe okwukwe?

14 Ndị so dee Akwụkwọ Nsọ Grik kwuru  ọtụtụ ugboro banyere okwukwe iji gosi na ọ dị mkpa. E nweghị àgwà ọzọ Onye Kraịst kwesịrị inwe e kwuru gbasara ya ọtụtụ ugboro otú ahụ. Ma, ọ̀ pụtara na okwukwe bụ àgwà kacha mkpa Onye Kraịst kwesịrị inwe?

15 Pọl kwuru na inwe ịhụnanya dị mkpa karịa inwe okwukwe. O dere, sị: “Ọ bụrụkwa na m nwere okwukwe niile iji bupụ ugwu, ma enweghị m ịhụnanya, ọ dịghị ihe m bụ.” (1 Kọr. 13:2) Mgbe Jizọs zara ajụjụ bụ́ “Olee iwu kasị ukwuu n’ime Iwu ahụ?” o mere ka o doo anya na ịhụ Chineke n’anya dị ezigbo mkpa. (Mat. 22:35-40) Ịhụnanya na-enyere anyị aka inwe ma okwukwe ma ọtụtụ àgwà ndị ọzọ Onye Kraịst kwesịrị inwe. Baịbụl kwuru na ịhụnanya “na-ekwere ihe niile.” Ịhụnanya ga-eme ka anyị kwere ihe niile Chineke gwara anyị na Baịbụl.—1 Kọr. 13:4, 7.

16, 17. Olee otú Baịbụl si mee ka o doo anya na okwukwe na ịhụnanya dị mkpa, ma olee nke kachanụ n’ime ha, n’ihi gịnị?

16 Otú okwukwe na ịhụnanya si dị mkpa mere ka ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik kwuo banyere ha abụọ ọtụtụ ugboro, ọtụtụ mgbe n’otu ahịrịokwu. Pọl gbara ụmụnna ya ume ka ha “yiri ihe mgbochi obi bụ́ okwukwe na ịhụnanya.” (1 Tesa. 5:8) Pita dere banyere Jizọs, sị: “Ọ bụ ezie na unu ahụghị ya, unu hụrụ ya n’anya. Ọ bụ ezie na unu adịghị ele ya anya ugbu a, ma unu nwere okwukwe n’ebe ọ nọ.” (1 Pita 1:8) Jems jụrụ ụmụnna ya e tere mmanụ, sị: “Ọ̀ bụ na Chineke ahọrọghị ndị dara ogbenye n’ihe nke ụwa ka ha bụrụ ndị bara ọgaranya n’okwukwe, bụrụkwa ndị nketa nke alaeze ahụ, nke o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n’anya?” (Jems 2:5) Jọn dere na ihe Chineke nyere n’iwu bụ “ka anyị nwee okwukwe n’aha Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst ma hụ ibe anyị n’anya.”1 Jọn 3:23.

17 Ọ bụ eziokwu na okwukwe dị mkpa, ihe ụfọdụ gbasara okwukwe agaghịzi adị ma Chineke mezuo nkwa ndị o kwere, anyị enwetakwa ihe ndị anyị na-ele anya ha. Ma, o nweghị mgbe anyị ga-akwụsị ịhụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya. Ọ bụ ihe mere Pọl ji dee, sị: “Otú ọ dị, ihe ndị fọdụrụ ugbu a bụ okwukwe, olileanya, ịhụnanya, ihe atọ ndị a; ma nke kasị n’ime ha bụ ịhụnanya.”—1 Kọr. 13:13.

IHE GBARA ỌKPỤRỤKPỤ NA-EGOSI NA ANYỊ NWERE OKWUKWE

18, 19. Olee ihe gbara ọkpụrụkpụ na-egosi na anyị nwere okwukwe, ònyekwa ka e kwesịrị ito maka ya?

18 N’oge anyị a, ndị Jehova na-egosi na ha nwere okwukwe n’Alaeze Chineke, nke na-achị n’eluigwe. Ọ bụ ya mere e ji nwee ihe karịrị nde ụmụnna anyị asatọ n’ụwa niile, ha niile adịrị n’otu n’ọgbakọ ha dị iche iche, bụ́ ebe mkpụrụ nke mmụọ nsọ juru eju bara abara. (Gal. 5:22, 23) Ọ bụ ihe gbara ọkpụrụkpụ na-egosi na anyị nwere okwukwe na ịhụnanya.

19 Ọ bụghị n’ike mmadụ. Ọ bụ aka ọrụ Chineke anyị. Ihe a dị́ ebube Jehova mere na-eme ka ‘aha ya na-ede ude. Ọ bụkwa ihe ịrịba ama nke ga-adịru mgbe ebighị ebi, nke a na-agaghị ebipụ ebipụ.’ (Aịza. 55:13) N’eziokwu, Chineke chọrọ ka ‘e si n’okwukwe zọpụta anyị.’ Ọ bụ “onyinye” o nyere anyị. (Efe. 2:8) Jehova ga na-eme ka ọtụtụ ndị ọzọ na-enwe okwukwe na ya ruo mgbe ihe ga-eju n’ụwa a bụ ndị zuru okè na ndị ezi omume. Ha ga-eji obi ụtọ na-eto ya ruo mgbe ebighị ebi. Ka anyị nwee okwukwe mgbe niile ná nkwa ndị Jehova kwere.