Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2016

Ị̀ ‘Na-echekwa Ezi Amamihe’?

Ị̀ ‘Na-echekwa Ezi Amamihe’?

E NWERE otu akụkọ a kọrọ gbasara otu nwata nwoke dara ogbenye, nke bi n’ime ime obodo. Ndị obodo ahụ na-achị ya ọchị maka na ha chere na ọ dara iberiibe. E nwee ndị ọbịa, ụfọdụ ndị obodo ha na-eji ya eme ihe ọchị n’ihu ndị enyi ha. Ha na-eweta mkpụrụ ego abụọ, ya bụ, otu mkpụrụ ego ọlaọcha buru ibu na otu mkpụrụ ego ọlaedo dị́ ntakịrị. Nke ọlaedo ahụ ka nke ọlaọcha ahụ okpukpu abụọ. Ha na-asị ya, “Họrọ nke ị chọrọ.” Ọ na-ewere nke ọlaọcha gbapụ.

Otu ụbọchị, otu onye ọbịa jụrụ nwatakịrị ahụ, sị, “Ọ̀ bụ na ị maghị na mkpụrụ ego ọlaedo ahụ ka mkpụrụ ego ọlaọcha ahụ okpukpu abụọ?” Nwatakịrị ahụ chịtụrụ ọchị, sị, “Ama m.” Onye ọbịa ahụ ajụọ ya, sị, “Gịnịzi mere i ji ewere nke ọlaọcha? I were nke ọlaedo, ego ị ga-enweta ga-aka nke ọlaọcha ahụ okpukpu abụọ.” Nwatakịrị ahụ sịrị: “Ma, m were nke ọlaedo ahụ, ndị mmadụ agaghịzi na-egwusa m egwuregwu a. Ị̀ makwa mkpụrụ ego ọlaọcha ole m nwetarala?” Nwatakịrị a a kọrọ akụkọ ya kpara àgwà ga-abara ndị dimkpa uru, ya bụ, inwe ezi amamihe.

Baịbụl kwuru, sị: “Chekwaa ezi amamihe na ikike iche echiche. Mgbe ahụ, ị ga na-eje ije n’ụzọ gị n’obi iru ala, ọbụna ụkwụ gị agaghị akpọ n’ihe ọ bụla.” (Ilu 3:21, 23) N’ihi ya, anyị mata ihe bụ́ “ezi amamihe” na otú anyị ga-esi jiri ya na-eme ihe bara uru, obi ga-eru anyị ala. Ọ ga-eme ka anyị ghara ịkwụsị ife Chineke, mee ka “ụkwụ” sie anyị ike.

GỊNỊ BỤ EZI AMAMIHE?

Inwe ezi amamihe dị iche n’ịmụta ihe na inwe nghọta. Mmadụ nwere ike ịmụta ihe a kụziiri ya ma buru ya n’isi. Onye nwere nghọta na-amata otú otu ihe si gbasa ihe ọzọ. Onye nwere amamihe na-eji ihe ọ mụtara na ihe ọ ghọtara mee ihe ga-abara ya uru.

Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike iji obere oge gụọ akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? ma ghọta ya. O nwere ike na-azata ajụjụ mgbe a na-amụrụ ya ihe. O nwekwara ike na-abịa ọmụmụ ihe, na-azadị ajụjụ nke ọma. Ihe ndị a niile nwere ike igosi na ọ na-eme nke ọma. Ma ọ̀ pụtara na o nwere amamihe? Mba. O nwere ike ịbụ na ụbụrụ na-aghọ ya nkọ. Ma, ọ bụrụ na ọ na-eme ihe ọ na-amụta, jiri ihe ọ mụtara na ihe ọ ghọtara na-eme ihe bara uru, ọ pụtara na o nwere amamihe. Ọ bụrụ na ihe ndị ọ na-eme ana-aga nke ọma, na-egosikwa na ọ na-ebu ụzọ chebara ihe ọ chọrọ ime echiche, ọ ga-edo anya na o nwere ezi amamihe.

Jizọs nyere ihe atụ na Matiu 7:24-27 gbasara ụmụ nwoke abụọ. Onye nke ọ bụla rụrụ ụlọ nke ya. Jizọs kwuru na otu n’ime ha nwere “uche.” Nwoke ahụ chetara echi, rụọ ụlọ ya n’elu nkume. Ihe ahụ o mere gosiri na ọ ma ihe nwere ike ime n’ọdịnihu. Ọ bụ ya mere o ji mee ihe ga-abara ya uru. O cheghị na ịrụ ụlọ ya n’elu ájá ga-eme ka ọ ghara imefu nnukwu ego ma ọ bụ mee ka ọ rụọ ya ngwa ngwa. O nwere amamihe ma cheta ahụhụ ọ ga-emecha taa ma ọ rụọ ya n’elu ájá. N’ihi ya, e nweghị ihe oké mmiri ozuzo na oké ifufe mere ụlọ ya. Ma, ajụjụ bụ, Ebe ezi amamihe bara ezigbo uru, olee otú anyị ga-esi nwee ya ma chekwaa ya?

 OLEE OTÚ M GA-ESI NWEE EZI AMAMIHE?

Nke mbụ, cheta na Maịka 6:9 kwuru na ‘onye nwere ezi amamihe ga-atụ egwu aha Chineke.’ Ịtụ egwu aha Jehova pụtara na anyị ga na-asọpụrụ ya, na-akwanyere ma aha ya ma iwu ya ezigbo ùgwù. Ị chọọ ịna-asọpụrụ mmadụ, ị ga-ebu ụzọ mata otú onye ahụ si eche echiche. Ị ga-enwezi ike ịtụkwasị onye ahụ obi, mụta ihe n’aka ya, na-emekwa ihe o mere ka ihe na-agara ya nke ọma. Ọ bụrụ na anyị ana-eche otú omume anyị ga-esi kpaa adịm ná mma anyị na Jehova aka, ọ bụrụkwa na anyị eburu iwu ya n’obi mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme, ọ pụtara na anyị nwere ezi amamihe.

Nke abụọ, Ilu 18:1 kwuru, sị: “Onye na-akpa iche ga-achọ ihe na-agụ naanị onwe ya; ọ bụ ezi amamihe niile ka ọ ga-agbaso mgba.” Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike hapụ Jehova na ọgbakọ ya. Ọ bụrụ na anyị achọghị ịna-akpapụ iche, anyị na ndị na-atụ egwu aha Jehova na ndị na-erubere iwu ya isi kwesịrị ịna-akpachi anya. Anyị kwesịrị ịna-aga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ka anyị soro ọgbakọ Ndị Kraịst na-akpachi anya. Obi anyị na uche anyị kwesịrị ịdị n’ihe a na-amụ n’ọmụmụ ihe, anyị ana-agbakwa mbọ ka ihe a na-ekwu ruo anyị n’obi.

Ọ bụrụkwa na anyị na-ekpe ekpere gwa Jehova otú obi dị anyị, anyị na ya ga na-adịkwu ná mma. (Ilu 3:5, 6) Obi anyị dịrị n’ihe anyị na-agụ ma na Baịbụl ma n’akwụkwọ nzukọ Jehova na-ebipụtara anyị, anyị ga-amata ihe omume anyị ga-emecha  kpata, anyị emeekwa ihe anyị kwesịrị ime. Anyị kwesịkwara ịnabata ndụmọdụ ụmụnna ma nke a na-akọ na-enye anyị. (Ilu 19:20) Anyị mee otú ahụ, anyị ga na-enwekwu ezi amamihe, kama ịjụ ya.

OLEE OTÚ Ọ GA-ESI BAARA EZINỤLỌ M URU?

Ezi amamihe nwere ike ichebe ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara onye bụ́ nwunye ka ọ “na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.” (Efe. 5:33) Olee otú di ga-esi mee ka nwunye ya na-akwanyere ya ezigbo ùgwù? Ọ manye nwunye ya amanye, nwunye ya nwere ike ịkwanyere ya ùgwù mgbe ahụ, na-asọpụrụ ya mgbe ọ nọ ya ka ha ghara ise okwu. Ma, ọ̀ ga-achọ irubere ya isi mgbe ọ na-anọghị ya? O nwere ike ọ gaghị achọ. O kwesịrị ịchọpụta ihe ga-eme ka nwunye ya na-akwanyere ya ùgwù mgbe niile. Ọ bụrụ na ọ na-akpa àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ma ịhụ nwunye ya n’anya ma ịdị obiọma, nwunye ya ga na-akwanyere ya ezigbo ùgwù. Ma, nwunye bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ịna-akwanyere di ya ùgwù, ma di ya ọ̀ na-akpa àgwà ọma ma ọ bụ na ọ naghị akpa.—Gal. 5:22, 23.

Baịbụl kwukwara na di kwesịrị ịhụ nwunye ya n’anya. (Efe. 5:28, 33) Nwunye nwere ike iche na ọ ga-akacha mma izochi ihe ndị na-adịghị mma di ya kwesịrị ịma n’ihi na ọ chọrọ ka di ya hụ ya n’anya. Ma, ọ̀ na-egosi na o nwere ezi amamihe? Di ya mechaa chọpụta ihe ndi ahụ o zochiri, gịnị ga-eme? Ọ̀ ga-ahụkwu ya n’anya? O nwere ike isiri di ya ike. Kama, nwaanyị wepụta oge dabara adaba, wetuo obi kọwaara di ya ihe ndị ahụ na-adịghị mma, obi nwere ike ịtọ ya ụtọ na nwunye ya gwara ya eziokwu. Ọ ga-ahụkwu ya n’anya.

Otú i si adọ ụmụ gị aka ná ntị taa ga-emecha mee ka gị na ha na-ekwurịta okwu nke ọma ma ọ bụ ghara ịna-ekwurịta okwu nke ọma

Ụmụ kwesịrị ịna-erubere papa ha na mama ha isi. Ndị nne na nna kwesịkwara ịna-azụ ụmụ ha otú Jehova chọrọ. (Efe. 6:1, 4) Ọ̀ pụtara na ha ga-edepụtara ụmụ ha ihe niile ha kwesịrị ịna-eme na ihe ha na-ekwesịghị ịna-eme? Ihe ha ga-eme abụghị naanị ịgwa ụmụ ha ihe ha chọrọ ka ha na-eme ma ọ bụ ịta ha ahụhụ ma ha mejọọ ihe. Nne ma ọ bụ nna nwere ezi amamihe na-enyere nwa ya aka ịghọta ihe mere o ji kwesị irube isi.

Dị ka ihe atụ, ka e were ya na nwatakịrị kparịrị papa ya ma ọ bụ mama ya. Ịgwa ya okwu ọjọọ ma ọ bụ iji iwe taa ya ahụhụ nwere ike imenye ya ihere ma ọ bụ mee ka ọ gbachi nkịtị. Ma o nwere ike buru iwe n’obi, gharazie ịna-abịa papa ya na mama ya nso.

Nne na nna ndị nwere ezi amamihe ga-ebu ụzọ chee otú ha kwesịrị isi dọọ ụmụ ha aka ná ntị nakwa uru ọ ga-abara ụmụ ha n’ọdịnihu. Ha ekwesịghị iji iwe mee nwa ha ihe ozugbo maka na o mechuru ha ihu. Mgbe naanị ha na ya nọ, ha nwere ike wetuo obi gwa ya na Jehova chọrọ ka ọ na-erubere ha isi ka o nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi. Mgbe nwa ahụ na-eme ihe gosiri na ọ na-asọpụrụ ndị mụrụ ya, ọ ga-aghọta na ọ bụ Jehova ka ọ na-asọpụrụ. (Efe. 6:2, 3) Iji aka a na-azụ nwatakịrị nwere ike iru ya n’obi, ya amata na papa ya na mama ya hụrụ ya n’anya, ya ana-akwanyekwuru ha ùgwù. Ọ ga-enwezi ike ịgwa ha ka ha nyere ya aka ma o mechaa nwee ihe ya na ya na-alụ.

Ụfọdụ ndị nne na nna anaghị adọ nwa ha aka ná ntị n’ihi na ha achọghị ịkpasu ya iwe. Ma, gịnị ga-eme ma nwa ahụ too? Ọ̀ ga na-atụ egwu Jehova ma ghọta na ime ihe Chineke kwuru na-aba uru? Ọ̀ ga-eji obi ya niile na-efe Jehova, ka ọ̀ ga-ahapụ ọgbakọ Jehova?—Ilu 13:1; 29:21.

Ezigbo onye na-akpụ ihe na-ebu ụzọ chee otú ọ chọrọ ka ihe ọ na-akpụ dịrị. Ọ naghị eme ya were ụrọ, ya akpụwa ya n’echeghị echiche, buru n’obi na ọ ga-akpụta ya. Nne na nna ndị nwere ezi amamihe na-ewepụta oge na-amụ ihe Jehova kwuru, na-emekwa ya, sí otú ahụ na-atụ egwu aha ya. Ha na-enwe ezi amamihe ma jiri ya na-eme ka okwukwe ezinụlọ ha sie ike. Ha anaghị ahapụ Jehova na nzukọ ya.

Ihe ndị anyị na-ekpebi kwa ụbọchị nwere ike ịbara anyị uru ma ọ bụ ghọ anyị ahịa n’ọdịnihu. Kama imewe ihe ọkụ ọkụ n’echeghị ya eche, buru ụzọ chebara ya echiche. Chebara nsogbu ọ ga-akpata echiche. Rịọ Jehova ka o duzie gị, jirikwa amamihe o nyere gị mee ihe bara uru. Anyị mee otú ahụ, o gosiri na anyị na-echekwa ezi amamihe. Anyị ga-enwetakwa ndụ.—Ilu 3:21, 22.