Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2016

Mee Ka Okwukwe Gị Na-esi Ike Mgbe Ị Nọ n’Ọgbakọ Na-eji Asụsụ Mba Ọzọ Amụ Ihe

Mee Ka Okwukwe Gị Na-esi Ike Mgbe Ị Nọ n’Ọgbakọ Na-eji Asụsụ Mba Ọzọ Amụ Ihe

“Edebewo m okwu gị n’obi m.”—ỌMA 119:11.

ABỤ: 142, 92

1-3. (a) N’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị, gịnị ka anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-eme? (b) Olee nsogbu ụfọdụ ndị na-amụ asụsụ ọzọ na-enwe, oleekwa ajụjụ ndị e kwesịrị ịjụ maka ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

TAA, ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-agbasi mbọ ike ịna-ezi “mba niile na ebo niile na asụsụ niile na ndị niile” ozi ọma otú ahụ Jọn hụrụ ya n’ọhụụ. (Mkpu. 14:6) Ì so ná ndị na-amụ asụsụ ọzọ? Ị̀ bụ onye ozi ala ọzọ ma ọ bụ na-eje ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu ná mba ọzọ, ka ị̀ malitela iso ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe n’obodo unu?

2 Ebe anyị na-efe Chineke, anyị niile kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka okwukwe anyị na okwukwe ndị ezinụlọ anyị na-esi ike. (Mat. 5:3) Ma, o nwere ike isiri anyị ike mgbe ụfọdụ ịna-amụ ihe nke onwe anyị n’ihi na anyị anaghị enwe efe. Ma, e nwere nsogbu ndị ọzọ ndị nọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe na-enwe.

3 E wezụga ịmụ asụsụ ọzọ, ndị nọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe kwesịkwara ịna-amụ “ihe ndị miri emi nke Chineke.” (1 Kọr. 2:10) Olee otú ha ga-esi na-amụ ya ma ọ bụrụ na ha  anaghị aghọta asụsụ e ji amụ ihe n’ọgbakọ ha nke ọma? Gịnị mere ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ji kwesị ime ka Okwu Chineke ruo ụmụ ha n’obi?

IHE NWERE IKE IME KA OKWUKWE ANYỊ NYỤWA KA ỌKỤ

4. Olee ihe nwere ike ime ka okwukwe anyị nyụwa ka ọkụ? Nye ihe atụ.

4 Ọ bụrụ na anyị anaghị aghọta asụsụ e ji amụ Okwu Chineke n’ọgbakọ anyị, okwukwe anyị nwere ike ịnyụwa ka ọkụ. Mgbe Nehemaya lọghachiri Jeruselem narị afọ ise Tupu Oge Ndị Kraịst, o wutere ya mgbe ọ chọpụtara na ụfọdụ ụmụ ndị Juu sí Babịlọn lọta anaghị asụ Hibru. (Gụọ Nehemaya 13:23, 24.) Ebe ụmụaka ndị ahụ na-enweghị ike ịghọta Okwu Chineke, o mere ka ha ghara inwe okwukwe na Jehova.—Nehe. 8:2, 8.

5, 6. Gịnị ka ụfọdụ ndị nne na nna nọ́ n’ọgbakọ ndị na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe chọpụtarala, n’ihi gịnịkwa?

5 Ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ ndị nne na nna nọ́ n’ọgbakọ ndị na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe achọpụtala na okwukwe ụmụ ha ji nwayọọ nwayọọ na-anyụ ka ọkụ. Ihe a na-amụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anaghị eru ha n’obi n’ihi na ha anaghị aghọta ihe a na-ekwu n’ọmụmụ ihe. Otu nwanna aha ya bụ Pedro, [1] onye ya na ezinụlọ ya si Amerịka kwaga Ọstrelia, sịrị: “E kwuwe ihe gbasara ofufe Chineke, mmadụ kwesịrị ịghọta ya, ya eruokwa ya n’obi.”—Luk 24:32.

6 Anyị gụwa ihe n’asụsụ na-abụghị nke anyị, o nwere ike ọ gaghị eru anyị n’obi otú ọ gaara eru anyị ma a sị na ọ bụ n’asụsụ anyị. Mmadụ nwekwara ike ịnọ ebe ọ na-agbalị ịna-asụ asụsụ ọzọ nke ọma, isi ana-agba ya gharaghara, ike ife Chineke ana-agwụkwa ya. N’ihi ya, ka anyị na-agba mbọ ịna-ejere Jehova ozi n’ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe, anyị ekwesịghị ikwe ka okwukwe anyị nyụwa ka ọkụ.—Mat. 4:4.

NDỊ GBASIRI MBỌ IKE KA OKWUKWE HA SIE IKE

7. Olee otú ndị Babịlọn si gbalịa ịmanye Daniel ka o mewe omenala ndị Babịlọn, kpewekwa okpukpe ha?

7 Mgbe a dọọrọ Daniel na ndị enyi ya n’agha laa Babịlọn, ndị Babịlọn gbara mbọ ịmanye ha ka ha mewe omenala ha, kpewekwa okpukpe ha. Olee otú ha si mee ya? Ha kụziiri ha “asụsụ ndị Kaldia,” gụọkwa ha aha ndị Babịlọn. (Dan. 1:3-7) Aha a gụrụ Daniel si n’aha Bel, bụ́ chi ndị Babịlọn kacha efe. Ọ ga-abụ na Eze Nebukadneza chọrọ ime ka Daniel chee na chi ndị Babịlọn ka Jehova, bụ́ Chineke Daniel, ike.—Dan. 4:8.

8. Olee ihe nyeere Daniel aka ka okwukwe ya sie ike mgbe o bi ná mba ọzọ?

8 N’agbanyeghị na e nyere Daniel nri pụrụ iche eze na-eri, o “kpebisiri ike n’obi ya” na ọ gaghị ‘emerụ onwe ya.’ (Dan. 1:8) O mere ka okwukwe ya na-esikwu ike n’oge ahụ o bi ná mba ọzọ. Otú o si mee ya bụ ịna-amụ Akwụkwọ Nsọ e dere n’asụsụ Hibru. (Dan. 9:2) N’ihi ya, mgbe ọ nọrọ ihe dị ka afọ iri asaa na Babịlọn, a ka jikwa aha Hibru ya mara ya.—Dan. 5:13.

9. Olee uru Okwu Chineke baara onye dere Abụ Ọma 119?

9 Onye dere Abụ Ọma 119 tachiri obi mgbe ndị na-eje ozi n’obí eze kwuru okwu ọjọọ banyere ya. Ma, Okwu Chineke mere ka obi sie ya ike, meekwa ka ọ ghara ime ihe ọjọọ ndị ọzọ na-eme. (Ọma 119:23, 61) O kwere ka ihe Chineke kwuru ruo ya n’obi.—Gụọ Abụ Ọma 119:11, 46.

NA-EME KA OKWUKWE GỊ SIE IKE

10, 11. (a) Gịnị kwesịrị ịbụ mkpa anyị mgbe anyị na-amụ Okwu Chineke? (b) Olee ihe ga-enyere anyị aka ime ya? Nye ihe atụ.

10 Ọ bụ eziokwu na ọrụ ọgbakọ na ọrụ  ego nwere ike ime ka anyị ghara ịna-enwe efe, anyị niile kwesịrị ịna-ewepụta oge na-amụ ihe nke onwe anyị, na-enwekwa ofufe ezinụlọ. (Efe. 5:15, 16) Ma, ihe bụ́ mkpa anyị ekwesịghị ịbụ ka anyị gụchaa ihe niile ma ọ bụ kwado ihe anyị ga-aza n’ọmụmụ ihe. Anyị chọrọ ka Okwu Chineke ruo anyị n’obi nakwa ka okwukwe anyị sie ike.

11 Ihe ga-enyere anyị aka ime otú ahụ abụghị naanị iche otú anyị ga-esi jiri ihe anyị na-amụ nyere ndị ọzọ aka, kama anyị kwesịkwara ịna-eche otú ọ ga-esi baara anyị uru. (Fil. 1:9, 10) Anyị kwesịrị ịghọta na mgbe anyị na-akwado ihe omume, ozi ọma, ma ọ bụ ọmụmụ ihe, o nwere ike anyị agaghị echecha otú o si gbasa anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụ eziokwu na osi nri kwesịrị iritụ ihe o siri tupu ya ebupụta ya, ọ bụghị nke ahụ o ritụrụ ga-eme ka afọ ju ya. Ọ chọọ ka ahụ́ gbasie ya ike, o kwesịrị isi ezigbo nri ọ ga-eri. Otú ahụ ka ọ dị anyị. Anyị chọọ ka okwukwe anyị na-esi ike, anyị kwesịrị ịna-amụchi Baịbụl anya. Ọ ga-enyere anyị aka ịmata ebe anyị ga-emekwu nke ọma.

12, 13. Gịnị mere o ji abara ọtụtụ ndị nọ́ n’ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe uru iji asụsụ nke ha na-amụchi Baịbụl anya?

12 Ọtụtụ ndị nọ́ n’ọgbakọ ndị na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe achọpụtala na iji ‘asụsụ ha na-asụ kemgbe a mụrụ ha’ na-amụchi Baịbụl anya na-abara ha uru. (Ọrụ 2:8) Ndị ozi ala ọzọ ghọtara na ọ bụrụ na ha chọrọ ka okwukwe ha na-esi ike n’ebe ha na-eje ozi, ọ bụghị naanị ihe ha na-amụta n’ọmụmụ ihe ga-enyere ha aka.

13 Otu nwanna aha ya bụ Alain amụọla asụsụ Peshian ihe dị ka afọ asatọ. Ọ sịrị: “M kwadowe ọmụmụ ihe n’asụsụ Peshian, ihe na-adị m mkpa bụ ịmụta asụsụ ahụ. Ebe ọ bụ na ihe m bu n’obi bụ otú m ga-esi mụtakwuo asụsụ ahụ, ihe m na-agụ  anaghị eru m n’obi. Ọ bụ ya mere m ji ewepụta oge mgbe niile ka m mụọ Baịbụl na akwụkwọ ndị ọzọ n’asụsụ anyị.”

MEE KA OKWU CHINEKE RUO ỤMỤ GỊ N’OBI

14. Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ime, n’ihi gịnịkwa?

14 Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ime ka ụmụ ha ghọta Okwu Chineke, ya eruokwa ha n’obi. Mgbe Serge na nwunye ya bụ́ Muriel nọrọla ihe karịrị afọ atọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe, ha chọpụtara na ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma anaghịzi atọ nwa ha nwoke dị́ afọ iri na asaa ụtọ. Muriel sịrị: “Obi adịghịzi ya ụtọ iji asụsụ ọzọ ezi ozi ọma. Ma, ịga ozi ọma na-atọ ya ezigbo ụtọ mgbe ahụ ọ na-eji asụsụ anyị bụ́ French ezi ozi ọma.” Serge kwuru, sị: “Mgbe anyị chọpụtara na iji asụsụ ọzọ amụ ihe na-eme ka nwa anyị ghara ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ, anyị kpebiri ịlaghachi n’ọgbakọ anyị nọbu na ya.”

Mee ka eziokwu Baịbụl ruo ụmụ gị n’obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na 15)

15. (a) Gịnị nwere ike ime ka ndị nne na nna laghachi n’ọgbakọ na-eji asụsụ ụmụ ha na-aghọta nke ọma amụ ihe? (b) Olee ndụmọdụ e nyere ndị nne na nna na Diuterọnọmi 6:5-7?

15 Gịnị ga-enyere ndị nne na nna aka ikpebi ma hà ga-alaghachi n’ọgbakọ a na-eji asụsụ ụmụ ha na-aghọta nke ọma amụ ihe? Nke mbụ, ha kwesịrị ịchọpụta ma hà nwere oge na ihe ndị ọzọ ha ga-eji kụziere ụmụ ha otú ha ga-esi hụ Jehova n’anya, na-akụzikwara ha asụsụ mba ọzọ. Nke abụọ, ha nwere ike ịchọpụta na ịga omụmụ ihe na ịga ozi ọma anaghịzi atọ ụmụ ha ụtọ ma ọ bụ na ụmụ ha achọghịzi ịnọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe. Ụdị ihe a nwere ike ime ka ndị nne na nna kpebie ịlaghachi n’ọgbakọ na-eji asụsụ ụmụ ha na-aghọta nke ọma amụ ihe. Ụkwụ sichaa ụmụ ha ike n’ọgbakọ, ha nweziri ike ịlaghachi n’ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe.—Gụọ Diuterọnọmi 6:5-7.

16, 17. Olee otú ụfọdụ ndị nne na nna nọ́ n’ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe si mee ka okwukwe ụmụ ha sie ike?

16 Ụfọdụ ndị nne na nna achọpụtala otú ha ga-esi na-akụziri ụmụ ha ihe n’asụsụ ha, ha aka nọrọkwa n’ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe. Otu nwanna aha ya bụ Charles mụrụ ụmụ nwaanyị atọ. Otu dị afọ itoolu, otu adịrị afọ iri na abụọ, nke ọzọ adịrị afọ iri na atọ. Ha nọ n’obere ìgwè na-eji asụsụ Lingala amụ ihe. Ọ sịrị: “Anyị kpebiri na anyị na ụmụ anyị ga-eji asụsụ anyị na-amụ ihe, jirikwa ya na-enwe ofufe ezinụlọ. Ma, anyị na-eji asụsụ Lingala akwado ọmụmụ ihe na ozi ọma, na-asụkwa ya mgbe anyị na ha na-egwuri egwu ka ha nwee ike ịmụta ya mgbe ha na-eme ihe na-atọ ha ụtọ.”

Gbaa mbọ ka ị mụta asụsụ a na-asụ n’ebe ị na-eje ozi nakwa ka ị na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na 17)

17 Otu nwanna aha ya bụ Kevin mụrụ ụmụ nwaanyị abụọ. Otu dị afọ ise, nke ọzọ adịrị afọ asatọ. Nwanna a na ezinụlọ ya nọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe. Ọ na-agba mbọ ịkụziri ụmụ ya eziokwu Baịbụl n’ihi na ha anaghị aghọtacha ihe a na-amụ n’ọmụmụ ihe. Ọ sịrị: “Mụ na nwunye m na-eji asụsụ anyị bụ́ French amụrụ ụmụ anyị abụọ ihe. Anyị kpebikwara na anyị ga na-aga ọmụmụ ihe n’asụsụ French otu ugboro n’ọnwa ọ bụla. Anyị na-ejikwa oge ezumike anyị aga mgbakọ ukwu n’asụsụ anyị.”

18. (a) Olee ihe e kwuru ná Ndị Rom 15:1, 2 nke nwere ike inyere gị aka ikpebi ihe ga-akacha baara ụmụ gị uru? (b) Olee aro ụfọdụ ndị nne na nna tụrụ? (Kwuo ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.)

18 N’eziokwu, ezinụlọ ọ bụla ga-eji aka ha kpebie ihe ga-akacha mee ka okwukwe ụmụ ha sie ike. [2] (Gal. 6:5) Nwanna nwaanyị ahụ aha ya bụ Muriel, onye anyị kwuburu okwu ya, kwuru na n’agbanyeghị na ya na di ya chọrọ ịnọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ  mba ọzọ amụ ihe, ha kpebiri ịhapụ ya ka ha nwee ike inyere nwa ha aka ka okwukwe ya sie ike. (Gụọ Ndị Rom 15:1, 2.) Taa, di ya bụ́ Serge ma na ha mere ihe ha kwesịrị ime. Ọ sịrị: “Malite oge ahụ anyị laghachiri n’ọgbakọ na-eji asụsụ French amụ ihe, nwa anyị nwoke mewere nke ọma n’ọgbakọ ma mee baptizim. Ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile ugbu a. O chewela echiche isowe obere ìgwè na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe.”

MEE KA OKWU CHINEKE RUO GỊ N’OBI

19, 20. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ji Okwu Chineke kpọrọ ihe?

19 Jehova hụrụ mmadụ niile n’anya. Ọ bụ ya mere o ji mee ka e nwee Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ ka “ụdị mmadụ niile” nwee ike ịmụta nke bụ́ eziokwu. (1 Tim. 2:4) Ọ ma na okwukwe anyị ga na-esikwu ike ma anyị na-amụ Baịbụl n’asụsụ anyị na-aghọta nke ọma.

20 Ma, n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị, anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike ka okwukwe anyị sikwuo ike. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-amụchi Baịbụl anya n’asụsụ anyị na-aghọta nke ọma. Anyị ga-enyekwara ezinụlọ anyị aka ka okwukwe ha sie ike, gosikwa na anyị ji Okwu Chineke kpọrọ ihe n’eziokwu.—Ọma 119:11.

^ [1] (paragraf nke 5) Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ [2] (paragraf nke 18) Ị chọọ ịhụ ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru nwere ike inyere gị na ezinụlọ gị aka, gụọ isiokwu bụ́ “Ịzụlite Ụmụ n’Ala Ọzọ—Ihe Ịma Aka na Ụgwọ Ọrụ Ndị Dị na Ya,” nke gbara n’Ụlọ Nche October 15, 2002.