Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2016

 AKỤKỌ NDỤ

M Gbara Mbọ Ṅomie Ndị Ji Ofufe Chineke Kpọrọ Ihe

M Gbara Mbọ Ṅomie Ndị Ji Ofufe Chineke Kpọrọ Ihe

Nwanna Izak Marais si na Patasịn dị́ na Niu Yọk kpọọ m na Kọlọrado. M jụrụ ya, sị: “Ị̀ makwa afọ ole m dị?” Ya azaa m, sị: “Ama m afọ ole ị dị.” Ka m kọọ ihe butere mkparịta ụka a.

A MỤRỤ m na Wichita, Kansas, dị́ n’Amerịka n’abalị iri n’ọnwa Disemba afọ 1936. Papa m na mama m, bụ́ William na Jean, mụrụ ụmụ anọ. Ọ bụ m bụ nwa mbụ ha. Ha ji obi ha niile na-efe Jehova. Papa m bụ ohu ọgbakọ. Ọ bụ ihe a na-akpọ onye na-elekọta ọgbakọ n’oge ahụ. Ọ bụ nne nne m aha ya bụ Emma Wagner kụziiri mama m eziokwu Baịbụl, kụziekwara ya ọtụtụ ndị ọzọ, ma Gertrude Steele, bụ́ onye jere ozi ala ọzọ ọtụtụ afọ na Pueto Riko. * N’ihi ya, e nwere ọtụtụ ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe m kwesịrị iṅomi.

ICHETA NDỊ JI OFUFE CHINEKE KPỌRỌ IHE

Ebe papa m kwụ n’ụzọ na-enye ndị na-agafe agafe magazin anyị

Otu mgbede Satọdee, mgbe m dị afọ ise, mụ na papa m nọ na-enye ndị na-agafe agafe Ụlọ Nche na Consolation (nke a na-akpọ Teta! ugbu a). Mba Amerịka so na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, nke kpụ ọkụ n’ọnụ n’oge ahụ. Otu dọkịta ṅụrọrọ anya bịara na-akparị papa m maka na o kweghị aga agha. Ọ kpọrọ papa m onye ụjọ, sị na ọ na-agbara ịga agha ọsọ. Ọ bịara papa m nso, legide ya anya n’ihu, sị ya, “Kụọnụ m ihe, onye ụjọ dị́ ka gị.” Ụjọ tụrụ m, ma ihe papa m mere tọgburu m atọgbu. Ọ kwụsịghị ịna-enye ndị gbakọrọ n’ebe ahụ akwụkwọ ndị ahụ ọ na-enye ha. Mgbe nwoke ahụ hụrụ ka otu onye agha na-agafe, o tiri mkpu, sị, “Mara ihe ị ga-eme onye ụjọ a.” Onye soja ahụ hụrụ na mmanya na-egbu nwoke ahụ, ya asị ya, “Laa n’ụlọ gị ka anya doo gị.” Ha abụọ pụwara. Obi na-adị m ụtọ ma m cheta otú Jehova si mee ka papa m nwee obi ike. Papa m nwere ebe abụọ a na-akpụ isi na Wichita. Dọkịta ahụ so ná ndị na-abịa ebe ndị ahụ akpụ isi.

Ebe mụ na papa m na mama m na-aga mgbakọ na Wichita n’afọ 1943

Mgbe m dị afọ asatọ, papa m na mama m rere ụlọ ha na ebe ndị ahụ a na-akpụ isi, rụọ obere ụlọ a na-ebugharị ebugharị ma kwaga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu n’obodo Kọlọrado. Ebe anyị kwagara dị nso na Grand Jọnshọn, papa m na mama m abụrụ ndị ọsụ ụzọ. Ha ji ụbọchị ụfọdụ na-akọ ugbo, na-azụkwa anụ ụlọ. E hiwere ọgbakọ n’ebe ahụ n’ihi na  Jehova gọziri ozi ha ji obi ha niile jeere ya. N’abalị iri abụọ n’ọnwa Jun afọ 1948, papa m mere mụ na ndị ọzọ mụtara eziokwu Baịbụl baptizim n’otu iyi dị́ n’akụkụ ugwu, ma Nwanna Billie Nichols na nwunye ya. Ha abụọ mechara rụwa ọrụ sekit. Otú ahụ ka nwa ha nwoke na nwunye ya mekwara.

Anyị na ọtụtụ ndị nọ n’ozi oge niile kpachiri anya, kwurịtakwa ihe sí na Baịbụl, nke ka nke, ndị ezinụlọ Nwanna Steele. Ha bụ Don na Earlene, Dave na Julia, na Si na Martha. M mụtara ọtụtụ ihe n’aka ha. Ha mere ka m ghọta na ibu ụzọ na-achọ Alaeze ga-eme ka ndụ m nwee isi, mụ ana-enwekwa obi ụtọ.

M KWAGARA EBE ỌZỌ

Mgbe m dị afọ iri na itoolu, otu nwanna anyị na ya dị ná mma, aha ya bụ Bud Hasty, gwara m ka m soro ya sụwa ụzọ n’ebe ndịda Amerịka. Onye nlekọta sekit gwara anyị ka anyị kwaga Rọstịn dị́ na Luiziana, bụ́ ebe ọtụtụ ụmụnna kwụsịrị ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. A gwara anyị ka anyị na-enwe ọmụmụ ihe niile n’izu ọ bụla n’agbanyeghị mmadụ ole bịaranụ. Anyị chọtara ebe dị́ mma anyị ga na-anọ enwe ọmụmụ ihe ma mezie ya. Anyị nọ na-enwe ọmụmụ ihe niile. Ma, ná mmalite, ọ bụ naanị anyị abụọ na-abịa. Ọ na-abụ otu onye na-eduzi, onye nke ọzọ ana-aza ajụjụ niile. E nwee ihe ngosi a ga-eme, anyị abụọ na-anọ n’elu ikpo okwu n’enweghị onye ọzọ bịara ọmụmụ ihe. Otu nwanna nwaanyị katarala ahụ́ mechara bịawa ọmụmụ ihe. Ụfọdụ ndị a na-amụrụ ihe na ụfọdụ n’ime ndị ahụ kwụsịrị ịbịa ọmụmụ ihe mechakwara bịawa ọmụmụ ihe. Ọ dịghị anya, e nwee ọgbakọ na-eme nke ọma.

Otu ụbọchị, mụ na Nwanna Bud hụrụ otu pastọ chọọchi a na-akpọ Church of Christ. Nwoke ahụ kwuru banyere amaokwu Baịbụl ndị m na-amaghị. O nyere m nsogbu n’obi, mee ka m chebakwuoro ihe ndị m kweere echiche. M mụrụ anya otu izu ka m nwee ike ịmata azịza ajụjụ ndị ọ jụrụ. Ihe a mere ka okwukwe m sikwuo ike. Ọ gụkwara m agụụ ịhụ pastọ ọzọ.

Ọ dịghị anya, onye nlekọta sekit agwa m ka m kwaga El Dorado, dị́ n’Akansas, gaa nyere ọgbakọ dị́ ebe ahụ aka. N’oge m nọ ebe ahụ, m na-aga Kọlọrado ọtụtụ ugboro ịga hụ ndị na-ekpebi ma mmadụ ọ̀ ga-agarịrị agha. Otu ụbọchị m bu ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ n’ụgbọala m na-aga Kọlọrado, anyị nwere ihe mberede na Teksas, ụgbọala m akpọkasịa. Anyị kpọrọ otu nwanna, ya abịa kpọrọ anyị gaa n’ụlọ ya, kpọrọkwa anyị gaa ọmụmụ ihe. A maara ụmụnna ọkwa na anyị nwere ihe mberede okporo ụzọ, ha emetara anyị ebere ma nye anyị  ego. Nwanna ahụ rekwara ụgbọala m ahụ dọla iri abụọ na ise.

Anyị gbara ụgbọ gaa Wichita, bụ́ ebe Nwanna E. F. McCartney nọ na-asụ ụzọ. Nwanna a na ndị ezinụlọ anyị dị n’ezigbo mma. Ihe anyị na-akpọ ya bụ “Doc.” Mụ na ụmụ ejima ya bụ́ Frank na Francis ka bụkwa ezigbo enyi. Ha resịrị m ụgbọala ochie ha n’ọnụ ego dọla iri abụọ na ise, nke bụ́ ego ole e retara ụgbọala m ahụ kpọkasịrị akpọkasị. Nke ahụ bụ nke mbụ ọ bịara doo m anya na Jehova gbooro m mkpa m n’ihi na m bu ụzọ na-achọ Alaeze ya. N’oge ahụ, Nwanna McCartney na ezinụlọ ya gosiri m otu ọmarịcha nwanna nwaanyị aha ya bụ Bethel Crane. O ji ọgbakọ kpọrọ ihe. Aha mama ya bụ Ruth, onye biri na Welintịn, dị́ na Kansas. O jighị ihe gbasara ofufe Chineke gwuo egwu. Ọ sụrụ ụzọ ruo mgbe ọ gafere afọ iri itoolu. O rughị otu afọ mụ na Bethel matara, anyị alụọ n’afọ 1958. Ọ kwakwutere m n’El Dorado, malite ịsụ ụzọ ebe ahụ.

ÒKÙ A KPỌRỌ ANYỊ MERE ANYỊ OBI ỤTỌ

Mgbe anyị chechara banyere ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe mgbe anyị na-eto eto, anyị kpebiri na anyị ga-aga ebe ọ bụla nzukọ Jehova zigara anyị. E zigara anyị Wọlnọt Rij, dị́ n’Akansas, ka anyị bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. N’afọ 1962, obi bụ anyị sọ aṅụrị mgbe a kpọrọ anyị ka anyị soro na klas nke iri atọ na asaa n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Obi tọrọ anyị ụtọ na anyị na Nwanna Don Steele nọ n’otu klas. Mgbe anyị gụchara, e zigara mụ na nwunye m na Nairobi dị́ na Kenya. Obi adịghị anyị mma na anyị na-ahapụ Niu Yọk, ma obi tọgburu anyị atọgbu mgbe anyị ruru n’ọdụ ụgbọelu dị́ na Naịrobi, hụ ụmụnna anyị bịara ịnabata anyị.

Ebe anyị na Chris Kanaiya na Mary nwunye ya nọ n’ozi ọma na Nairobi

Ọ dịghị anya, obi atọwa anyị ụtọ ịnọ na Kenya, na ịna-ezi ozi ọma na ya. Ndị mbụ anyị mụụrụ ihe ha abata n’ọgbakọ bụ Chris Kanaiya na Mary nwunye ya. Ha ka nọkwa n’ozi oge niile na Kenya. N’afọ na-eso ya, e zigara anyị Kampala, dị́ na Yuganda. Anyị bụ ndị ozi ala ọzọ mbụ e zigara n’obodo ahụ. Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ n’oge niile anyị nọ ebe ahụ n’ihi na ọtụtụ ndị chọsiri ike ịmụta eziokwu Baịbụl, ha ghọkwara Ndịàmà Jehova. Ma mgbe anyị nọrọ afọ atọ na ọnwa isii n’Afrịka, anyị hapụrụ Afrịka n’ihi na anyị chọrọ ịmụ nwa. Anyị laghachiri Amerịka. Obi adịghị anyị mma n’ụbọchị ahụ anyị hapụrụ Afrịka. Obi ọjọọ a ka nke mere anyị mgbe anyị hapụrụ Niu Yọk. Anyị hụrụ ụmụnna anyị bí n’Afrịka n’anya, nweekwa olileanya na otu ụbọchị, anyị ga-alaghachi.

ANYỊ NWETARA ỌRỤ ỌHỤRỤ

Anyị gara biri n’ebe ọdịda anyanwụ Kọlọrado, bụ́ ebe papa m na mama m biri. Ọ dịghị anya, a mụọ ada anyị bụ́ Kimberly. Mgbe otu afọ na ọnwa ise gachara, anyị mụrụ nwa nwaanyị ọzọ aha ya bụ Stephany. Ọrụ ọhụrụ anyị nwetara bụ ịbụ papa na mama. Anyị ejighị ya gwuo egwu. Anyị gbara mbọ ịkụziri ọmarịcha ụmụ anyị eziokwu Baịbụl. Anyị chọkwara ịkụziri ha otú ha ga-esi jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe otú ahụ a kụziiri anyị. Anyị ma na ọ bụrụ na anyị ejiri ofufe Chineke kpọrọ ihe, o nwere ike ịbara ha uru. Ma, ọ pụtaghị na ha ga-eferịrị Jehova ma ha too. Nwanne m nwoke m tọrọ na nwanne m nwaanyị pụrụ n’ọgbakọ. M nwere olileanya na ha ga-emecha kpawakwa àgwà ọma ndị ahụ a kụziiri ha.

Ịzụ ụmụ nwaanyị abụọ anyị mụtara tọrọ anyị ụtọ. Ezinụlọ anyị gbara mbọ mgbe niile ịna-emekọ  ihe ọnụ. Ebe anyị bibu dị nso n’Aspen, dị́ na Kọlọrado. N’ihi ya, anyị mụrụ otú e si eji ihe agbagharị n’elu snoo ka anyị nwee ike ịna-eme ya mgbe ụfọdụ. Mgbe ụfọdụ, anyị na-abanye n’ígwè ga-eburu anyị sí n’otu ugwu gafee n’ọzọ. Anyị na ụmụ anyị na-eji ohere ahụ akparịta ụka. Anyị na-akpọkwa ha aga kwanye ọkụ n’ime ọhịa n’abalị, gbaa ya gburugburu na-ekwurịta ihe ndị na-atọ anyị ụtọ. N’agbanyeghị na ha ka dị obere mgbe ahụ, ha na-ajụ ajụjụ ndị dị ka “Gịnị ka m ga-eme ma m too?” na “Olee ụdị onye m chọrọ ịlụ?” Anyị gbara mbọ ịkụziri ụmụ anyị ka ha na-erubere iwu Jehova isi. Anyị gbara ha ume mgbe niile ka ha buru n’obi ịbanye n’ozi oge niile nakwa ka ha lụọ naanị onye obi ya dị n’ozi oge niile. Anyị gbakwara mbọ nyere ha aka ka ha ghọta na ha ekwesịghị ịlụ di mgbe ha na-etorubeghị. Anyị na-agwakarị ha, sị: “Alụla di ruo mgbe i ruru afọ iri abụọ na atọ.”

Anyị gbara mbọ hụ na anyị na-akpọ ha agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya otú ahụ papa anyị na mama anyị meere anyị. Anyị na-akpọtakwa ụfọdụ ndị nọ n’ozi oge niile ka ha bịa nọrọ n’ụlọ anyị. Ọtụtụ mgbe, anyị na-ekwukwa otú ozi ala ọzọ anyị jere si tọọ anyị ezigbo ụtọ. Anyị na-agwa ha na anyị nwere olileanya na otu ụbọchị, anyị anọ ga-eso gaa Afrịka. Ụmụ anyị chọsiri ike ime otú ahụ.

Anyị na-enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya. Anyị na-eji ihe ndị nwere ike ime n’ụlọ akwụkwọ eme ihe ngosi. Anyị na-agwa ha ka ha mee ka hà bụ Onyeàmà Jehova na-aza ajụjụ a jụrụ ya. Isi otú a na-amụ ihe tọrọ ha ụtọ, meekwa ka ha kata obi. O nwere ebe ha toruru, ha anaghịzi achọ mgbe ụfọdụ ka e nwee ọmụmụ ihe ezinụlọ. Otu ụbọchị, amaghị m ihe m ga-eme eme, mụ asị ha baa n’ime ụlọ ha, na anyị agaghị amụ ihe. O juru ha anya, ha ebewe ákwá, na-asị na ha chọrọ ịmụ ihe. Mgbe ahụ ka anyị matara na ihe ndị anyị na-akụziri ha banyere Jehova na-aba ha n’obi. Ka oge na-aga, ịmụ ihe tọwara ha ụtọ, anyị na-ahapụkwa ha ka ha kwuo obi ha. Ọ dịghịrị anyị mfe ịnụ ka ha na-ekwu mgbe ụfọdụ na e nwere ihe Baịbụl kwuru ha na-ekwetaghị. Ma, ọ na-eme ka anyị mata ihe dị́ ha n’obi. Mgbe anyị na ha kwurịtachara ihe Baịbụl kwuru banyere ya, ha na-ekweta ihe Jehova kwuru.

IHE NDỊ ỌZỌ MERENỤ

Afọ ndị anyị ji zụọ ụmụ anyị gbara ọsọ otú anyị na-atụghị anya ya. Anyị nwara ike anyị ịzụ ha ka ha hụ Jehova n’anya. Ihe nyeere anyị aka bụ otú nzukọ Jehova si na-eduzi anyị. Obi tọgburu anyị atọgbu na ha malitere ịsụ ụzọ mgbe ha gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ha mụrụ ọrụ iji nweta ego ha ga-eji na-egbo mkpa ha. Ha na ụmụnna nwaanyị abụọ ndị ọzọ kwagara n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu na Klivland, dị́ na Tenesii. Agụụ ha gụsiri anyị ike, ma obi dị anyị ụtọ na ha ji oge ha niile na-ejere Jehova ozi. Mụ na nwunye m malitere ịsụ ụzọ ọzọ, nke mere ka anyị nwee ihe ùgwù ndị ọzọ mere anyị obi ụtọ. Nwunye m so m n’oge ndị m gara rụchitere onye nlekọta sekit ọrụ nakwa mgbe m rụrụ ọrụ ná mgbakọ distrikti.

Tupu ụmụ anyị akwaga Tenesii, ha gara Lọndọn, dị́ n’Ịngland, gaakwa hụ alaka ụlọ ọrụ anyị dị́ n’ebe ahụ. N’ebe ahụ ka Stephany hụrụ Paul Norton, bụ́ onye na-eje ozi na Betel. Stephany dị afọ iri na itoolu n’oge ahụ. Mgbe ha gara ebe ahụ ọzọ, Kimberly hụrụ Brian Llewellyn, onye ya na Paul rụkọrọ ọrụ. Paul na Stephany lụrụ, ma ọ bụ mgbe Stephany dị afọ iri abụọ na atọ. N’afọ ọzọ ya, Brian na Kimberly lụrụ mgbe Brian dị afọ iri abụọ na ise. Ha cheere ruo mgbe ha ruru afọ iri abụọ na atọ. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na onye ọ bụla n’ime ha lụtara ezigbo di.

Ebe anyị na Paul, Stephany, Kimberly, na Brian nọ n’alaka ụlọ ọrụ dị́ na Malawi. Ọ bụ n’afọ 2002

Ụmụ anyị gwara anyị na ọ bụ àgwà ọma anyị nakwa nke ndị nne na nna ochie ha nyeere ha aka ime ihe Jizọs kwuru, nke bụ́ ‘ibu ụzọ na-achọ alaeze ahụ,’ ma mgbe ihe siiri ha ezigbo ike. (Mat. 6:33) N’Eprel afọ 1998, a kpọrọ Paul na Stephany ka ha soro na klas nke otu narị na ise n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Mgbe ha gụchara, e zigara ha Malawi, dị́ n’Afrịka. N’otu oge ahụ, a kpọrọ Brian na Kimberly ka ha bịa jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị́ na Lọndọn. E mechakwara ziga ha n’alaka ụlọ ọrụ dị́ na Malawi. Obi tọgburu anyị atọgbu n’ihi na ọ bụ ihe kacha mma ndị na-eto eto kwesịrị iji ndụ ha mee.

ÒKÙ ỌZỌ A KPỌRỌ ANYỊ MERE ANYỊ OBI ỤTỌ

Na Jenụwarị afọ 2001, Nwanna Marais kpọrọ m na fon otú ahụ m kọrọ ná mmalite. Ọ bụ ya na-elekọta Ngalaba Na-enyere Ndị Nsụgharị Aka. Ọ gwara  m na ụmụnna nọ́ na ngalaba ahụ na-ahazi ihe ọmụmụ ga-enyere ndị nsụgharị aka n’ụwa niile ịna-aghọta Bekee. N’agbanyeghị na m dị afọ iri isii na anọ n’oge ahụ, ha chọrọ ịzụ m ka m soro ná ndị ga-akụzi ihe n’ihe ọmụmụ ahụ. Mụ na nwunye m kpere ekpere banyere ya, gwakwa mama ya na mama m ka ha tụọrọ anyị aro. Ha chọrọ ka anyị gaa n’agbanyeghị na ha emeela agadi, anyị agaghịkwa anọ na-enyere ha aka. M kpọghachiri ma gwa ngalaba ahụ na obi ga-adị anyị ụtọ iwepụta onwe anyị ịrụ ọrụ a magburu onwe ya.

E mechara chọpụta na mama m na-arịa kansa. M gwara ya na anyị ga-anọ ma na-enyere Linda nwanne m nwaanyị aka ịna-elekọta ya. Mama m sịrị: “Unu emela otú ahụ. Obi ga-ajọkwu m njọ ma ọ bụrụ na unu agaghị.” Linda kwukwara otu ihe ahụ. Obi dị anyị ụtọ maka otú ha si kwado anyị na otú ụmụnna bí n’ebe ahụ si nye aka. Mgbe anyị garuru Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị́ na Patasịn, Linda kpọrọ anyị n’echi ya, gwa anyị na mama anyị anwụọla. Anyị nọsiri ike n’ọrụ anyị otú ahụ ọ gaara agba anyị ume ka anyị mee ma a sị na ọ nọ ya.

Obi tọgburu anyị atọgbu mgbe a gwara anyị na ebe mbụ anyị ga-eje ozi bụ n’alaka ụlọ ọrụ dị́ na Malawi, bụ́ ebe ụmụ anyị abụọ na di ha na-eje ozi. Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ na anyị bịakọtakwara ọnụ. Ebe ọzọ anyị kụziri ihe bụ na Zimbabwe, mechaakwa kụzie na Zambia. Mgbe anyị kụziri ihe afọ atọ na ọnwa isii, a gwara anyị ka anyị laghachi Malawi gaa dee banyere ụmụnna anyị ndị tara ahụhụ maka na ha ekweghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. *

Ebe anyị na ụmụ ụmụ anyị nọ n’ozi ọma

N’afọ 2005, obi adịghịkwa anyị mma na anyị na-ahapụ Afrịka. Anyị laghachiri Basọlt, dị́ na Kọlọrado, bụ́ ebe anyị ka na-asụ ụzọ ruo ugbu a. N’afọ 2006, Brian na Kimberly kwafetara n’akụkụ ụlọ anyị ka ha zụọ Mackenzie na Elizabeth, bụ́ ụmụ nwaanyị abụọ ha mụtara. Paul na Stephany ka nọkwa na Malawi. Paul so na Kọmitii Alaka ná mba ahụ. Ugbu a ọ fọrọ obere ka m ruo afọ iri asatọ, obi na-adị m ezigbo ụtọ ma m hụ ka ụmụnna nwoke ndị na-akatabeghị ahụ́ mụ na ha rụkọrọ ọrụ ọtụtụ afọ na-arụ ọrụ ndị m na-arụbu. Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ n’ihi na anyị gbara mbọ ṅomie ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, ya abaakwara ụmụ anyị na ụmụ ụmụ anyị uru.

^ para. 5 Gụọ Ụlọ Nche Bekee, May 1, 1956, peeji nke 269 ruo 272, nakwa March 15, 1971, peeji nke 186 ruo 190, ka ị hụ ebe a kọrọ otú ndị ezinụlọ Steele si jee ozi ala ọzọ.

^ para. 30 Dị ka ihe atụ, gụọ akụkọ ndụ Nwanna Trophim Nsomba Ụlọ Nche Eprel 15, 2015, peeji nke 14-18.