Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2016

Mee Ka Okwukwe I Nwere n’Ihe Ị Na-ele Anya Ya Sie Ike

Mee Ka Okwukwe I Nwere n’Ihe Ị Na-ele Anya Ya Sie Ike

“Okwukwe bụ atụmanya e ji n’aka na ihe ndị a na-ele anya ha ga-emezu.”—HIB. 11:1.

ABỤ: 81, 134

1, 2. (a) Olee otú olileanya magburu onwe ya ezigbo Ndị Kraịst nwere si dị iche n’olileanya ndị mmadụ na-enwe n’ụwa Setan? (b) Olee ajụjụ ndị dị mkpa anyị ga-aza?

EZIGBO Ndị Kraịst nwere olileanya magburu onwe ya. Ma ànyị bụ ndị e tere mmanụ ma ànyị so ‘n’atụrụ ọzọ,’ anyị niile na-atụ anya ịhụ mgbe ihe Chineke bu n’obi kee ụwa ga-emezu nakwa mgbe a ga-edo aha Jehova nsọ. (Jọn 10:16; Mat. 6:9, 10) Ọ bụ olileanya kacha mma mmadụ ọ bụla nwere ike inwe. Ọ na-agụsi anyị agụụ ike inweta ndụ ebighị ebi ahụ Chineke kwere anyị ná nkwa, ma ọ̀ bụ ‘n’eluigwe ọhụrụ’ ya ma ọ̀ bụ ‘n’ụwa ọhụrụ’ ya. (2 Pita 3:13) Ka ọ dị ugbu a, anyị na-atụ anya ịhụ otú Jehova ga-esi na-eduzi ndị ya, na-akwadokwa ha n’oge ikpeazụ a.

2 Ọtụtụ ndị nwekwara ihe ha na-ele anya ya n’ụwa Setan, ma o nwere ike ịna-eme ha obi abụọ ma hà ga-emecha nweta ya. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ nde ndị na-agba chaa chaa nwere ike ibu n’obi na ha ga-erite ego, ma obi anaghị esi ha ike na ọ ga-eru ha aka. Ma, ezigbo okwukwe bụ ‘atụmanya Ndị Kraịst ji n’aka’ na ọ ga-emezurịrị. (Hib. 11:1) I nwere ike ịna-eche, sị, ‘Olee otú obi ga-esi sikwuo m ike na ihe m na-atụ anya ya ga-emerịrị? Olee uru inwe okwukwe siri ike n’ihe ndị m na-ele anya ha ga-abara m?’

3. Olee ihe mere ezi Ndị Kraịst ji nwee okwukwe?

 3 Ụmụ mmadụ na-ezughị okè anaghị ebu okwukwe apụta ụwa; ha anaghịkwanụ anọkata nwee ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe okwukwe, anyị kwesịrị ikwe ka mmụọ nsọ Chineke na-eduzi obi anyị. (Gal. 5:22) Baịbụl ekwughị na Jehova nwere okwukwe ma ọ bụ na o kwesịrị inwe ya. Ebe Jehova bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, marakwa ihe karịa onye ọ bụla, o nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara imezu ihe o kwere ná nkwa. N’ihi otú obi si sie Nna anyị nke eluigwe ike na ihe ọma niile o kwere ná nkwa ga-emezu, o weere ha ka ihe mezurulanụ. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Ha emezuwo!” (Gụọ Mkpughe 21:3-6.) Ihe mere Ndị Kraịst ji nwee okwukwe bụ na Jehova bụ ‘Chineke kwesịrị ntụkwasị obi.’ Ọ na-emezu nkwa ọ bụla o kwere.—Diut. 7:9.

IHE ANYỊ GA-AMỤTA N’AKA NDỊ NWERE OKWUKWE N’OGE OCHIE

4. Olee olileanya ndị nwoke na ndị nwaanyị fere Jehova tupu Jizọs abịa n’ụwa nwere?

4 Ndị Hibru isi 11, e dere aha mmadụ iri na isii nwere okwukwe, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị. Pọl kwuru gbasara ha na ọtụtụ ndị ọzọ “a gbara àmà banyere ha site n’okwukwe ha.” (Hib. 11:39) Obi siri ha niile ezigbo ike na Chineke ga-ezite “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa, onye ga-ewepụ nsogbu nnupụisi Setan kpatara, mezuokwa ihe Jehova bu n’obi kee ụwa. (Jen. 3:15) Ndị ahụ niile kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ tupu Jizọs Kraịst, bụ́ “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa, emee ka ndị mmadụ nwewe olileanya ịga eluigwe. (Gal. 3:16) Ma, ebe ọ bụ na nkwa Jehova kwere ga-emezurịrị, a ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha nwee ike ịbụ ndị zuru okè mgbe ụwa ga-abụ paradaịs.—Ọma 37:11; Aịza. 26:19; Hos. 13:14.

5, 6. Gịnị ka Ebreham na ndị ezinụlọ ya tụsiri anya ya ike, oleekwa otú ha si mee ka okwukwe ha sie ike? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

5 Ndị Hibru 11:13 kwuru banyere ụfọdụ n’ime ndị ahụ fere Chineke tupu oge Ndị Kraịst, sị: “Ndị a niile nwụrụ n’okwukwe, ọ bụ ezie na ha enwetaghị mmezu nke nkwa ndị ahụ, ma ha hụrụ ha n’ebe dị anya ma nabata ha.” Otu n’ime ha bụ Ebreham. Ò ji obi ụtọ na-atụ anya mgbe “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa ga na-achị? Jizọs zara ajụjụ a hoo haa mgbe ọ gwara ndị na-emegide ya, sị: “Ebreham nna unu ji ọṅụ dị ukwuu tụọ anya ịhụ ụbọchị m, ọ hụkwara ya wee ṅụrịa ọṅụ.” (Jọn 8:56) Otú ahụ ka Sera, Aịzik, Jekọb na ọtụtụ ndị ọzọ mere. Ha nọ na-atụsi anya ike ịhụ ‘obodo ahụ Chineke wuru ma mee,’ ya bụ, Alaeze ahụ ga-abịa n’ọdịnihu.—Hib. 11:8-11.

6 Olee otú Ebreham na ndị ezinụlọ ya si mee ka okwukwe ha sie ike? O nwere ike ịbụ na otú ha si mụta gbasara Chineke bụ ige ndị agadi jí obi ha niile fee Chineke ntị, ma ọ bụ na Chineke gwara ha okwu, ma ọ bụkwanụ na ha gụrụ ihe ndị e dere n’oge ochie. Nke ka mkpa bụ na ha echefughị ihe ha mụtara, kama ha ji nkwa Chineke na ihe ọ chọrọ ka ha na-eme kpọrọ ihe, na-echebakwara ya echiche. Ha niile dị njikere ịta ahụhụ iji rubere Chineke isi n’ihi na obi siri ha ezigbo ike na ihe ha na-ele anya ya ga-emezu.

7. Gịnị na gịnị ka Jehova nyere anyị iji mee ka okwukwe anyị na-esi ike, gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji ihe ndị ahụ na-eme?

7 Jehova nyere anyị Okwu ya bụ́ Baịbụl iji mee ka okwukwe anyị na-esi ike. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ‘ịna-enwe obi ụtọ,’ ‘ihe ana-agakwara anyị nke ọma,’ anyị ga na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị. (Ọma 1:1-3; gụọ Ọrụ Ndịozi 17:11.) Anyị kwesịkwara ịna-echebara nkwa ndị Chineke kwere  echiche ma na-erubere iwu ya isi otú ahụ ndị fere ya tupu oge Ndị Kraịst mere. Jehova si n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” ‘na-enye anyị nri n’oge kwesịrị ekwesị.’ (Mat. 24:45) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ejiri ihe Jehova si n’aka ha na-akụziri anyị kpọrọ ihe, anyị ga-eme ka ndị nwere okwukwe n’oge ochie, ndị obi siri ezigbo ike na Alaeze ahụ ha na-ele anya ya ga-eru ha aka.

8. Olee otú ekpere ga-esi mee ka okwukwe anyị sie ike?

8 Ekpere bụ ihe ọzọ mere ka okwukwe ndị ahụ fere Chineke tupu oge Ndị Kraịst sie ike. Okwukwe ha sikwuru ike mgbe ha hụrụ otú Chineke si zaa ekpere ha. (Nehe. 1:4, 11; Ọma 34:4, 15, 17; Dan. 9:19-21) Anyịnwa kwesịrị ịna-akọrọ Jehova ihe ọ bụla na-echu anyị ụra, n’ihi na anyị ma na ọ ga-anụ ya, meekwa ka anyị jiri ọṅụ na-atachi obi. Ọ zaa ekpere anyị, okwukwe anyị ga-esikwu ike. (Gụọ 1 Jọn 5:14, 15.) Ebe okwukwe so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, anyị kwesịrị ‘ịna-arịọ’ Chineke ka o nye anyị mmụọ nsọ otú ahụ Jizọs gwara anyị ka anyị na-eme.—Luk 11:9, 13.

9. E wezụga ikpe ekpere maka onwe anyị, olee ndị ọzọ anyị kwesịrị ịna-echeta n’ekpere?

9 Ma, anyị kpewe ekpere, anyị ekwesịghị ịna-agwa Chineke naanị ihe ọ ga-emere anyị. Anyị kwesịkwara ịna-ekele ya ma na-eto ya kwa ụbọchị n’ihi na ihe ‘ndị dị ebube’ ọ na-emere anyị “dị ọtụtụ karịa otú” anyị ga-akọli. (Ọma 40:5) Ekpere anyị kwesịkwara igosi na anyị ‘na-echeta ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ dị ka à ga-asị na’ a tụrụ anyị na ha mkpọrọ. Anyị kwesịrị ịna-echeta ụmụnna anyị nọ́ n’ụwa niile n’ekpere, karịchaa “ndị na-edu ndú n’etiti [anyị].” Anyị hụ otú Jehova si zaa ekpere anyị, okwukwe anyị ga-esikwu ike, anyị na ya adịkwuo ná mma.—Hib. 13:3, 7.

HA EKWEGHỊ EMEBI IWU CHINEKE

10. Olee ụfọdụ ndị ohu Chineke na-ekweghị emebi iwu Chineke, gịnịkwa mere ha ji nwee ike ime otú ahụ?

10 Ndị Hibru isi 11, Pọl onyeozi kọrọ banyere ọnwụnwa ndị bịaara ọtụtụ ndị ohu Chineke a na-akpọghị aha ha. Dị ka ihe atụ, o kwuru banyere ụmụ nwaanyị ndị nwere okwukwe, ndị ụmụ ha nwụrụ, ma e mechaa kpọlite ha n’ọnwụ. O kwukwara banyere ndị ọzọ ‘na-ekweghị ka e jiri ihe mgbapụta ọ bụla tọhapụ ha, ka ha wee nweta mbilite n’ọnwụ ka mma.’ (Hib. 11:35) Ọ bụ eziokwu na anyị amaghị kpọmkwem ndị Pọl bu n’obi, e ji nkume tụgbuo ndị dị ka Nebọt na Zekaraya n’ihi na ha rubeere Chineke isi. (1 Eze 21:3, 15; 2 Ihe 24:20, 21) A gaara ‘atọhapụ’ Daniel na ndị enyi ya ma a sị na ha mebiri iwu Chineke. Kama ime otú ahụ, ha nwere okwukwe na Chineke ga-eme ka ha tachie obi. Ọ bụ ya mere o ji “mechie ọnụ ọdụm,” meekwa ka ‘ọkụ ghara ime ha ihe ọ bụla.’—Hib. 11:33, 34; Dan. 3:16-18, 20, 28; 6:13, 16, 21-23.

11. Olee ọnwụnwa ndị bịaara ụfọdụ ndị amụma, ha atachie obi n’ihi okwukwe ha?

11 Mịkaya na Jeremaya so n’ọtụtụ ndị amụma a kwara emo ma ọ bụ tụọ mkpọrọ n’ihi na ha nwere okwukwe. Ma Ịlaịja ma ụfọdụ ndị amụma ndị ọzọ ‘wagharịrị n’ọzara na n’ugwu na n’ọgba nakwa n’ọnụ ndị dị n’ala.’ Ha niile tachiri obi n’ihi na obi siri ha ezigbo ike ‘na ihe ndị ha na-ele anya ha ga-emezu.’—Hib. 11:1, 36-38; 1 Eze 18:13; 22:24-27; Jere. 20:1, 2; 28:10, 11; 32:2.

12. Olee onye kacha tachie obi mgbe ọnwụnwa bịaara ya, gịnịkwa nyeere ya aka ime otú ahụ?

12 Mgbe Pọl kwuchara banyere ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nwere okwukwe, o kwuru banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ́ onye kacha tachie obi. Ndị Hibru 12:2 kwuru, sị: “N’ihi ọṅụ e debere  n’ihu ya, o diri osisi ịta ahụhụ, leghara ihere anya, ọ nọdụwokwa ala n’aka nri nke ocheeze Chineke.” N’eziokwu, anyị kwesịrị ‘ichesi echiche ike banyere’ okwukwe Jizọs nwere mgbe ọnwụnwa kacha taa akpụ bịaara ya. (Gụọ Ndị Hibru 12:3.) Ndị Kraịst oge mbụ e gburu n’ihi okwukwe ha mere ka Jizọs. Dị ka ihe atụ, Antipas, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, ekweghị emebi iwu Chineke. (Mkpu. 2:13) Ụgwọ Chineke ga-akwụ ha bụ na ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha gaa eluigwe, nke karịrị ‘mbilite n’ọnwụ ahụ ka mma’ ndị oge ochie nwere okwukwe nọ na-atụ anya ya. (Hib. 11:35) Obere oge Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914, a kpọlitere ndị ahụ niile e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi, ha agaa eluigwe, bụrụ mmụọ, ka ha soro Jizọs chịa ụmụ mmadụ.—Mkpu. 20:4.

NDỊ NWERE OKWUKWE N’OGE ANYỊ A

13, 14. Olee ọnwụnwa ndị bịaara Nwanna Rudolf Graichen, oleekwa ihe nyeere ya aka ịtachi obi?

13 Ọtụtụ nde ndị ohu Chineke n’oge anyị a na-eme otú ahụ Jizọs mere. Ha na-echebara nkwa Chineke kwere echiche. Ha anaghị ekwe ka ọnwụnwa mee ka okwukwe ha nyụọ ka ọkụ. Chegodị banyere Nwanna Rudolf Graichen, onye a mụrụ na Jamanị n’afọ 1925. O chetara na e sere otú paradaịs ga-adị, kowechaa ya n’ahụ́ ụlọ ha.  O dere, sị: “N’otu n’ime ha, e sere ebe anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ nọ, ebe nwa ewu na agụ owuru nọ, na ebe nwa ehi na ọdụm nọ. Ha niile anọrọ n’udo, nwatakịrị ana-edu ha. . . . Anaghị m echefu ihe ndị ahụ e sere echefu.” (Aịza. 11:6-9) Ndị uwe ojii ọchịchị Nazi mechara taa ya ahụhụ ọtụtụ afọ. Ndị uwe ojii nke ndị ọchịchị aka ike e nweburu na Jamanị nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ mekwara ya otu ihe ahụ. Ma, okwukwe o nwere na paradaịs ga-adị n’ụwa ka siri ezigbo ike.

14 Ọnwụnwa ndị ọzọ bịaara Nwanna Rudolf. Otu ọrịa ọjọọ gburu mama ya n’ụlọ mkpọrọ dị́ na Ravensbruk. Rudolf hụkwara ka okwukwe papa ya ji nwayọọ nwayọọ na-anyụ ka ọkụ ruo na nke ịbịanye aka n’akwụkwọ kwuru na ya abụghịzi Onyeàmà Jehova. Mgbe a kpọpụtara Rudolf n’ụlọ mkpọrọ, ọ ghọrọ onye nlekọta sekit, e mechaa kpọọ ya ka ọ gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied. E zigara ya Chili ka ọ bụrụ onye ozi ala ọzọ. O mechakwara bụrụ onye nlekọta sekit n’ebe ahụ. Ma, e nwere ọnwụnwa ndị ọzọ bịaara ya. Ọ lụrụ onye ozi ala ọzọ ibe ya aha ya bụ Patsy. Mgbe otu afọ gara, nwa ha nwaanyị ka dị́ obere nwụrụ. Ka oge na-aga, ezigbo nwunye ya dị́ naanị afọ iri anọ na atọ nwụrụ. Rudolf tachiri obi n’ọnwụnwa ahụ niile. N’agbanyeghị nká na ọrịa, ọ ka bụkwa ọsụ ụzọ oge niile na okenye n’ọgbakọ mgbe akụkọ ndụ ya gbara n’Ụlọ Nche August 1, 1997, peeji nke 20 ruo 25. [1]

15. Olee ụfọdụ ụmụnna anyị ndị ji ọṅụ na-atachi obi n’agbanyeghị na a na-echi ha ọnụ n’ala?

15 Ndịàmà Jehova ka na-aṅụrị ọṅụ n’olileanya ha nwere n’agbanyeghị na a na-emesi ha ezigbo ike. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị nọ n’ụlọ mkpọrọ n’Eritria, Sịngapọ, na Saụt Koria. Ọtụtụ mgbe, ihe mere e ji tụọ ha mkpọrọ bụ na ha mere ihe Jizọs kwuru. Ha ekweghị eburu mma agha. (Mat. 26:52) Ụfọdụ n’ime ụmụnna ndị ahụ bụ Isaac, Negede, na Paulos. Ha anọọla n’ụlọ mkpọrọ n’Eritria ihe karịrị iri afọ abụọ. A na-echi ha ọnụ n’ala. Mkpọrọ a tụrụ ha emeela ka ha ghara ịlụ nwaanyị ma ọ bụ lekọta nne ha na nna ha merela agadi. N’agbanyeghị ihe a niile, ha na-erubere Jehova isi, okwukwe ha ka sikwara ike. Ị ga-ahụ foto ha n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org. Ha na-amụmụ ọnụ ọchị n’agbanyeghị ahụhụ ha na-ata. Ndị na-eche ha nche na-akwanyeziri ha ùgwù.

Ị̀ na-amụta ihe n’aka ụmụnna ndị okwukwe ha siri ike n’ọgbakọ unu? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na 16)

16. Gịnị ka okwukwe siri ike ga-enyere gị aka ime?

16 E nwere ọtụtụ ndị Jehova a na-anaghị echi ọnụ n’ala otú ahụ. Ọnwụnwa ndị na-abịara ha dị iche. Ọtụtụ n’ime ha na-ata ahụhụ n’ihi ịda ogbenye, agha, ma ọ bụ ọdachi na-emere onwe ya. E nwekwara ndị merela ihe ahụ Mozis, Aịzik, na Ebreham mere. Ha hapụrụ ikpori ndụ na ịbụ onye a ma ama n’ụwa n’ihi ijere Jehova ozi. Ha na-agbasi mbọ ike ka ha ghara ịchụrụ ihe nke ụwa gawa. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha hụrụ Jehova n’anya, nweekwa okwukwe siri ike na ọ ga-emezu nkwa o kwere iwepụ mmegbu niile ma mee ka ndị ji obi ha niile na-efe ya nweta ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ, bụ́ ebe ndị ezi omume ga-ebi.—Gụọ Abụ Ọma 37:5, 7, 9, 29.

17. Gịnị ka i kpebisiri ike ime, oleekwa ihe a ga-akọwa n’isiokwu na-esonụ?

17 N’isiokwu a, anyị ahụla otú ịtụgharị uche ná nkwa Chineke kwere na ikpe ekpere mgbe niile ga-esi mee ka okwukwe anyị na-esi ike. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-enwe ike ịtachi obi mgbe ọnwụnwa bịaara anyị, obi esie anyị ike na ‘ihe ndị anyị na-ele anya ha ga-emezu.’ Ma, isiokwu na-esonụ ga-akọwakwu ihe inwe okwukwe pụtara.

^ [1] (paragraf nke 14) Gụọkwa akụkọ ndụ Nwanna Andrej Hanák, bụ́ onye Slovakịa, n’isiokwu bụ́ “N’Agbanyeghị Ọnwụnwa, Olileanya M Anyụghị Ka Ọkụ,” nke gbara na Teta! Bekee nke April 22, 2002.