Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌKTOBA 2016

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

 Ànyị kwesịrị ikweta na n’oge ochie, mmadụ nwere ike ịga kụọ ata n’ubi onye nwe ya kụrụ ọka?

Akwụkwọ a a kpọrọ Digest, nke Eze Ukwu Jọstịnian dere n’afọ 1468, bụ otu n’ime ọtụtụ akwụkwọ ndị kọrọ gbasara ikpe ndị e kpere n’oge ochie

NA MATIU 13:24-26, Jizọs sịrị: “Alaeze eluigwe dị ka nwoke ghara ezi mkpụrụ n’ubi ya. Mgbe ndị mmadụ nọ na-ehi ụra, onye iro ya bịara kụọ ata n’etiti ọka wit ahụ, ma pụọ. Mgbe akwụkwọ ya pulitere wee mịa mkpụrụ, ata ndị ahụ pulitekwara.” Ọtụtụ ndị na-ede akwụkwọ ekwuola na ha ekwetaghị na ụdị ihe ahụ nwere ike ime eme. Ma, ihe ndị e dere n’oge ochie gbasara iwu ndị Rom gosiri na ụdị ihe ahụ na-eme eme.

Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru, sị: “N’iwu ndị Rom, ịkụ ata n’ubi mmadụ iji mesie onye nwe ya ike . . . bụ ịda iwu. Iwu ahụ ha mere gosiri na ndị mmadụ na-emekarị ụdị ihe ahụ.” Otu ọkàiwu aha ya bụ Alastair Kerr kwuru na n’afọ 533, eze ukwu ndị Rom aha ya bụ Jọstịnian dere akwụkwọ ọ kpọrọ Digest. Akwụkwọ ahụ kọrọ ihe ụfọdụ gbasara iwu ndị Rom, na ihe ndị ọkàiwu kwuru malite n’ihe dị ka afọ 100 ruo 250 nke Oge Ndị Kraịst. Akwụkwọ ahụ kwuru na otu ọkaìwu aha ya bụ Ọlpian kọrọ gbasara ikpe otu nwoke aha ya bụ Selsọs kpere n’ihe dị ka narị afọ abụọ nke Oge Ndị Kraịst. Mmadụ gara kụọ ata n’ubi onye ọzọ, ya emee ka ọka onye ahụ kụrụ n’ubi ya laa n’iyi. Akwụkwọ ahụ kwuru banyere ikike iwu ndị Rom nyere onye nwe ubi, nke ga-eme ka onye ahụ dara iwu kwụọ ya ụgwọ ihe o mebiri n’ubi ya.

A na-arụ ụdị arụrụala ahụ n’ebe ndị Rom chịrị n’oge ochie, nke gosiri na ihe ahụ Jizọs ji mee ihe atụ bụ ihe nwere ike ime eme.

N’oge ndịozi Jizọs, olee otú ndị Rom hapụruru ndị isi ndị Juu ka ha na-ekpebi ihe ndị a na-eme na Judia?

N’OGE ahụ, ọ bụ ndị Rom na-achị Judia. A na-enwe gọvanọ na-anọchite anya ha. Gọvanọ ahụ na-enwe ìgwè ndị agha nọ́ n’okpuru ya. Ihe na-abụ mkpa ya bụ ịnatara ndị Rom ụtụ isi na ime ka udo dị, ka a gharakwa inwe ọgba aghara. Ndị Rom na-agbakwa mbọ ka ndị mmadụ ghara ịda iwu obodo ha. E nwee onye kpatara ọgba aghara, ha na-ata ya ahụhụ. Ma, ọ bụrụ n’ihe ndị ọzọ, ndị Rom na-ahapụ ndị isi obodo nke ọ bụla ha na-achị ka ha kpebie ihe ndị a na-eme n’obodo ha.

Ebe ụlọikpe Sanhedrin na-ekpe ikpe

Ọ bụ ụlọikpe Sanhedrin bụ ụlọikpe kacha elu ndị Juu nwere. Ọ bụkwa ha na-ekpebi ihe ọ bụla gbasara iwu ndị Juu. E nwere ụlọikpe ndị nọ n’okpuru ha n’ebe dị iche iche na Judia. Ọ dị ka ọ̀ bụ ụlọikpe ndị ahụ na-eleba anya n’ọtụtụ ikpe gbasara ịda iwu ndị Juu nakwa mpụ ọ bụla e mere n’obodo ha. Ndị ọchịchị Rom anaghị etinye anya n’ụdị ihe ahụ. Ma, otu n’ime ihe ndị Rom na-ekweghị ka ụlọikpe ndị Juu na-ekpebi bụ ihe gbasara igbu onye omekome. Ọ bụ ndị Rom na-ekpekarị ụdị ikpe ahụ. Mgbe a na-emeghị otú ahụ bụ mgbe ndị òtù Sanhedrin kpere Stivin ikpe, mee ka e jiri nkume tụgbuo ya.—Ọrụ 6:8-15; 7:54-60.

N’ihi ya, ụlọikpe Sanhedrin ndị Juu nwere ikike dị́ ukwuu. Ma, otu ọkà mmụta aha ya bụ Emil Schürer kwuru, sị: “Iwu kacha sie ike ndị ọchịchị Rom nyere bụ na mgbe ọ bụla ha chọrọ, ha nwere ike iji aka ha leba anya n’okwu ụfọdụ, dịkwa ka ha na-eme ma ọ dị́ ha ka è nupụrụla ọchịchị ha isi.” Dị ka ihe atụ, ọ bụ ihe ha mere mgbe Klọdiọs Laịsias bụ ọchịagha, ya akpọchie Pọl onyeozi, bụ́ nwa amaala Rom.—Ọrụ 23:26-30.