Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2016

Obi Dị Anyị Ụtọ na Chineke Na-egosi Anyị Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ

Obi Dị Anyị Ụtọ na Chineke Na-egosi Anyị Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ

“Anyị niile nwetara . . . obiọma na-erughịrị mmadụ n’elu obiọma na-erughịrị mmadụ.”—JỌN 1:16.

ABỤ: 95, 13

1, 2. (a) Kọwaa ilu Jizọs tụrụ banyere otu nwoke nwere ubi vaịn. (b) Olee otú akụkọ ahụ si gosi otú e si emesapụ aka na otú e si egosi ndị ọzọ obiọma na-erughịrị ha?

OTU nwoke pụrụ n’isi ụtụtụ ịga goo ndị ga-arụrụ ya ọrụ n’ubi vaịn ya. Ya na ndị ọrụ ọ hụrụ kwekọrịtara ego ole ọ ga-akwụ ha, ha arụwa ọrụ. Ma, ọ chọpụtara na ọ chọkwuru ndị ọrụ, ya agaghachị n’otu ebe ahụ ugboro anọ ọzọ gokwuo ndị ọrụ. Ma, ọ gwara ha na ọ ga-akwụ ha ihe kwesịrị ekwesị n’agbanyeghị na ha niile amaliteghị ọrụ otu oge. Mgbe ha rụchara ọrụ ná mgbede, ọ kpọkọtara ha niile kwụọ ha otu ihe ahụ, ma ndị rụrụ ọrụ ọtụtụ awa ma ndị rụrụ naanị otu awa. Mgbe ndị nke bu ụzọ malite ọrụ hụrụ ego ole ọ kwụrụ ha, ha were iwe. Ma nwoke ahụ sịrị ha: ‘Ọ́ bụghị ihe anyị kwekọrịtara ka m kwụrụ unu? Ọ̀ bụ na enweghị m ikike ịkwụ ndị ọrụ m niile ego ole m chọrọ ịkwụ ha? Ka ùnu na-emere m anyaụfụ maka na m bụ ezi mmadụ?’—Mat. 20:1-15.

2 Ilu a Jizọs tụrụ na-akụziri anyị otu ihe dị́ mkpa banyere “obiọma na-erughịrị mmadụ” Jehova na-egosi anyị. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 6:1.) Ụfọdụ nwere ike iche na e kwesịghị ịkwụ ndị ahụ rụrụ ọrụ naanị otu awa ihe a kwụrụ ndị rụrụ  ọtụtụ awa. Ma nwoke ahụ gosiri ha obiọma pụrụ iche. Otu ọkà mmụta kwuru banyere “obiọma na-erughịrị mmadu,” nke a sụgharịrị “amara” n’ọtụtụ nsụgharị Baịbụl. Ọ sịrị: “Ihe okwu ahụ pụtara bụ onyinye e nyere mmadụ n’efu na nke na-erughịrị mmadụ, ihe e nyere mmadụ nke na-abụghị ihe ọ rụtara na ihe e kwesịrị ịkwụ ya.”

ONYINYE JEHOVA NYERE ANYỊ

3, 4. Gịnị mere Jehova ji gosi ụmụ mmadụ obiọma ya na-erughịrị ha, oleekwa otú o si gosi ha ya?

3 Baịbụl kwuru na obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke na-egosi anyị bụ onyinye o “nyere n’efu.” (Efe. 3:7) Gịnị mere Jehova ji nye anyị onyinye a, oleekwa otú o si nye anyị ya? A sị na anyị na-emeta ihe niile dị́ Jehova mma n’emejọghị ihe, ọ gaara abụ na anyị rụtara obiọma ya n’ọrụ. Ma, anyị anaghị eme otú ahụ. Ọ bụ ihe mere Eze Sọlọmọn ji dee, sị: “E nweghị onye ezi omume n’ụwa nke na-eme naanị ezi ihe, nke na-adịghịkwa emehie.” (Ekli. 7:20) Pọl onyeozi kwukwara, sị: “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke” nakwa na ‘ụgwọ ọrụ mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.’ (Rom 3:23; 6:23a) Ọ bụ ihe anyị kwesịrị inweta.

4 Ma, Jehova gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya. O gosiri anyị obiọma ya na-enweghị atụ, nke na-erughịrị mmadụ. O zitere “Ọkpara ọ mụrụ naanị ya” ka ọ bịa nwụọ maka anyị. Ọ bụ ya bụ onyinye kachanụ o nyere anyị. (Jọn 3:16) N’ihi ya, Pọl kwuru na ‘e kpuwere Jizọs ebube na nsọpụrụ dị ka okpueze n’ihi na ọ nwụwo anwụ, ka o wee site n’obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ detụ ọnwụ ire maka mmadụ niile.’ (Hib. 2:9) N’eziokwu, “onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.”—Rom 6:23b.

5, 6. Olee ihe ga-eme ma (a) mmehie na-achị anyị? (b) obiọma na-erughịrị mmadụ na-achị anyị?

5 Gịnị mere anyị ji emehie, na-anwụkwa anwụ? Baịbụl kwuru banyere Adam, sị: “Ọnwụ si n’aka otu onye ahụ chịa” ụmụ Adam niile dị́ ka eze. (Rom 5:12, 14, 17) Ma, obi dị anyị ụtọ na anyị nwere ike ikpebi na mmehie agaghịzi na-achị anyị. Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’àjà ahụ Jizọs chụrụ, ọ pụtara na anyị chọrọ ka Jehova jiri obiọma ya na-erughịrị mmadụ na-achị anyị. N’ihi gịnị? Baịbụl kwuru, sị: “N’ebe mmehie dị ọtụtụ, obiọma na-erughịrị mmadụ dị ọtụtụ ọbụna karị. Ka gịnị wee mee? Ka obiọma na-erughịrị mmadụ wee chịa dị ka eze site n’ezi omume nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi site na Jizọs Kraịst Onyenwe anyị, dị nnọọ ka mmehie na ọnwụ chịrị dị ka eze.”—Rom 5:20, 21.

6 N’agbanyeghị na anyị ka bụ ndị mmehie, anyị ekwesịghị ikwe ka mmehie na-achị anyị. Anyị mee mmehie, anyị na-arịọ Jehova ka ọ gbaghara anyị. Pọl dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị, sị: “Mmehie agaghị abụ nna unu ukwu, ebe unu maara na unu anọghị n’okpuru iwu kama n’okpuru obiọma na-erughịrị mmadụ.” (Rom 6:14) N’ihi ya, ọ bụ obiọma na-erughịrị mmadụ na-achị anyị. Olee uru ọ baara anyị? Pọl kwuru, sị: “Obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ . . . na-akụziri anyị ka anyị jụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa, ka anyị na-ebikwa ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke n’ime usoro ihe dị ugbu a.”—Taị. 2:11, 12.

OBIỌMA NA-ERUGHỊRỊ MMADỤ “NKE A NA-EGOSI N’ỤZỌ DỊ ICHE ICHE”

7, 8. Mgbe Baịbụl kwuru na Jehova na-esi “n’ụzọ dị́ iche iche” egosi obiọma ya na-erughịrị mmadụ, gịnị ka ọ pụtara? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

7 Pita onyeozi dere, sị: “Dị ka onye ọ bụla natara onyinye, jirinụ ya na-ejere  ibe unu ozi dị ka ezi ndị nlekọta ụlọ n’ihe banyere obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ, nke a na-egosi n’ụzọ dị iche iche.” (1 Pita 4:10) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Ọ pụtara na n’agbanyeghị ụdị ọnwụnwa bịaara anyị, Jehova ga-enyere anyị aka idi ya. (1 Pita 1:6) Ọ ga-egosi anyị ụdị obiọma ya nke ga-eme ka anyị die ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị.

8 N’eziokwu, Jehova na-esi n’ụzọ dị́ iche iche egosi anyị obiọma ya na-erughịrị mmadụ. Jọn onyeozi dere, sị: “Anyị niile nwetara ihe n’ihe o nwejuru enweju, ya bụ, obiọma na-erughịrị mmadụ n’elu obiọma na-erughịrị mmadụ.” (Jọn 1:16) Anyị na-erite ọtụtụ uru n’ụzọ dị́ iche iche Jehova si egosi anyị obiọma. Olee ụfọdụ n’ime ha?

9. Gịnị ka Jehova na-emere anyị n’ihi obiọma ya na-erughịrị mmadụ, oleekwa otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ya?

9 Ọ na-agbaghara mmehie anyị. N’ihi obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ, ọ na-agbaghara anyị mmehie anyị ma ọ bụrụhaala na anyị echegharịa, na-agbasikwa mbọ ike ka anyị ghara ime ihe ọjọọ. (Gụọ 1 Jọn 1:8, 9.) Obiọma Chineke kwesịrị ime ka anyị na-ekele ya ma na-eto ya. Pọl degaara Ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ akwụkwọ ozi, sị: “[Jehova] napụtara anyị n’ikike nke ọchịchịrị ma wega anyị n’alaeze nke Ọkpara nke ịhụnanya ya, onye e si n’aka ya jiri ihe mgbapụta tọhapụ anyị, ya bụ, mgbaghara nke mmehie anyị.” (Kọl. 1:13, 14) Anyị na-eritekwa ọtụtụ uru ndị ọzọ magburu onwe ha n’ihi na Jehova na-agbaghara anyị mmehie anyị.

10. Olee uru obiọma Chineke na-erughịrị mmadụ na-abara anyị?

10 Anyị na Chineke nwere ike ịdị ná mma. Anyị niile ezughị okè. N’ihi ya, anyị bụbu ndị iro Chineke malite mgbe a mụrụ anyị. Ma, Pọl kwuru, sị: “Mgbe anyị bụ ndị iro, e mere ka anyị na Chineke dị ná mma site n’ọnwụ Ọkpara ya.” (Rom 5:10) N’ihi ọnwụ Jizọs, anyị na Jehova nweziri ike ịdị ná mma. Pọl kọwara ihe a na otú o si gbasa obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ mgbe ọ gwara ụmụnna ya e tere mmanụ, sị: “Ebe a kpọworo anyị ndị ezi omume n’ihi okwukwe, ka anyị na Chineke dịrị n’udo site n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, onye anyị sikwa n’aka ya bata n’obiọma a na-erughịrị mmadụ, nke anyị guzo na ya ugbu a site n’okwukwe.” (Rom 5:1, 2) Ọ bụ ihe ọma Jehova meere anyị.

Ụzọ dị́ iche iche Chineke si gosi anyị obiọma ya na-erughịrị mmadụ: O mere ka anyị nụ ozi ọma Alaeze ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. Olee otú ndị e tere mmanụ si eme ka ndị só ‘n’atụrụ ọzọ’ bụrụ ndị ezi omume?

11 Anyị nwere ike ịbụ ndị ezi omume n’anya Chineke. Anyị niile bụ ndị ajọ omume malite mgbe a mụrụ anyị. Ma, Daniel onye amụma kwuru na n’oge ikpeazụ, “ndị nwere nghọta,” bụ́ ndị e tere mmanụ, ga “na-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ bụrụ ndị ezi omume.” (Gụọ Daniel 12:3.) Ha ji ozi ọma ha na-ekwusa na eziokwu ha na-akụzi eme ka ọtụtụ nde ndị só ‘n’atụrụ ọzọ’ bụrụ ndị ezi omume n’anya Jehova. (Jọn 10:16) Ma, ọ bụ naanị obiọma na-erughịrị mmadụ Jehova na-egosi anyị mere o ji kwe omume. Pọl kwuru, sị: “A na-akpọkwa ha ndị ezi omume, nke bụ́ onyinye e nyere n’efu, site n’obiọma [Chineke] na-erughịrị mmadụ site ná ntọhapụ nke si n’ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ.”—Rom 3:23, 24.

Anyị nwere ike ikpe ekpere gwa Chineke obi anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12. Olee otú ekpere si gbasa obiọma Chineke na-erughịrị mmadụ?

12 Anyị na-ekpe ekpere gwa Chineke obi anyị. Ọ bụ obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ mere ka anyị nwee ike ịna-ekpe ekpere. Pọl kpọrọ ocheeze Jehova “ocheeze nke obiọma na-erughịrị mmadụ,” gwakwa anyị “ka anyị jiri nkwuwa okwu” bịaruo ya nso. (Hib. 4:16a) Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù na anyị na-esi n’aka Jizọs ekpe  ekpere mgbe ọ bụla. Anyị ‘si n’aka ya nwee nkwuwa okwu a ma jiri obi ike na-abịaru Chineke nso site n’okwukwe anyị nwere n’ebe ọ nọ.’ (Efe. 3:12) Ikpere ekpere mgbe ọ bụla bụ ihe magburu onwe ya na-egosi obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ.

Ọ na-enyere anyị aka n’oge kwesịrị ekwesị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. Olee otú obiọma na-erughịrị mmadụ nwere ike isi mee ka anyị ‘nweta enyemaka n’oge kwesịrị ekwesị’?

13 Anyị na-enweta enyemaka n’oge kwesịrị ekwesị. Pọl gwara anyị ka anyị kpeere Jehova ekpere mgbe ọ bụla anyị chọrọ, ‘ka e wee meere anyị ebere, anyị enwetakwa obiọma na-erughịrị mmadụ n’oge kwesịrị ekwesị mgbe enyemaka dị anyị mkpa.’ (Hib. 4:16b) Mgbe ọ bụla nsogbu ma ọ bụ ọnwụnwa bịaara anyị, anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka. Ọ na-aza ekpere anyị n’agbanyeghị na iwu ejighị ya ime otú ahụ, “ka anyị nwee obi ike wee sị: ‘Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?’”—Hib. 13:6.

14. Olee uru ọzọ obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ na-abara anyị?

14 Jehova na-akasi anyị obi. Otu n’ime ezigbo uru anyị na-erite bụ na, e nwee ihe na-enye anyị nsogbu n’obi, Jehova na-akasi anyị obi n’ihi obiọma ya na-erughịrị mmadụ. (Ọma 51:17) Mgbe a na-akpagbu Ndị Kraịst nọ́ na Tesalonaịka, Pọl degaara ha akwụkwọ ozi, sị: “Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na Chineke bụ́ Nna anyị, onye hụrụ anyị n’anya ma nye nkasi obi ebighị ebi na ezi olileanya site n’obiọma na-erughịrị mmadụ, kasiekwa unu obi ma mee ka unu guzosie ike.” (2 Tesa. 2:16, 17) Obi na-eru anyị ala n’ihi na anyị ma na Jehova hụrụ anyị n’anya ma na-elekọta anyị.

15. Olee olileanya anyị nwere n’ihi obiọma Chineke na-erughịrị mmadụ?

15 Anyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ebe anyị bụ ndị mmehie, anyị agaraghị enwe olileanya. (Gụọ Abụ Ọma 49:7, 8.) Ma, Jehova mere ka anyị  nwee olileanya magburu onwe ya. Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa, sị: “Nke a bụ uche Nna m, na onye ọ bụla nke na-ahụ Ọkpara ahụ ma nwee okwukwe na ya ga-enwe ndụ ebighị ebi, m ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 6:40) N’eziokwu, olileanya ịdị ndụ ebighị ebi bụ onyinye Chineke nyere anyị, bụrụkwa otú o si gosi anyị obiọma ya na-erughịrị mmadụ. Obi dị Pọl ụtọ maka ya. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “E mewo ka obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ, nke na-enye ụdị mmadụ niile nzọpụta, pụta ìhè.”—Taị. 2:11.

EJILA OBIỌMA CHINEKE NA-ERUGHỊRỊ MMADỤ GWUO EGWU

16. Olee otú ụfọdụ Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs si jiri obiọma Chineke na-erughịrị mmadụ gwuo egwu?

16 Ọ bụ eziokwu na obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ na-abara anyị ọtụtụ uru, ma anyị ekwesịghị iche na ihe ọ bụla mmadụ mere ga-adị Jehova mma. Ụfọdụ Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs chere na ha nwere ike ịna-eme omume rụrụ arụ n’ihi “obiọma Chineke . . . nke na-erughịrị mmadụ.” (Jud 4) Ọ ga-abụ na Ndị Kraịst ndị ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi chere na ha nwere ike ịna-eme mmehie, Jehova ana-agbaghara ha. Nke kadị njọ bụ na ha nọ na-agbalị ịrata ụmụnna ndị ọzọ ka ha soro ha mewe ihe ọjọọ ha na-eme. Onye na-eme otú ahụ n’oge anyị a ‘elelịala mmụọ nke obiọma na-erughịrị mmadụ.’—Hib. 10:29.

17. Olee ndụmọdụ gbara ọkpụrụkpụ Pita nyere Ndị Kraịst?

17 N’oge anyị a, Setan eduhiela ụfọdụ Ndị Kraịst ha echewe na ha nwere ike ịna-eme mmehie, Chineke ana-agbaghara ha n’eleghị anya n’azụ. Ọ bụ eziokwu na Jehova na-agbaghara ndị mmehie ma ha chegharịa, ọ chọrọ ka anyị na-alụso ọchịchọ mmehie anyị ọgụ. O nyere Pita ike mmụọ nsọ, ya edee, sị: “Ya mere, ndị m hụrụ n’anya, ebe unu bu ụzọ mara ihe ndị a, kpacharanụ anya ka a ghara idufu unu na ha site ná njehie nke ndị na-eleda iwu anya, unu ewee kwụsị iguzosi ike. Ee e, kama na-etonụ eto n’obiọma na-erughịrị mmadụ nakwa n’ihe ọmụma banyere Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst.”—2 Pita 3:17, 18.

E NWERE ỌRỤ YA NA OBIỌMA NA-ERUGHỊRỊ MMADỤ SO

18. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme n’ihi obiọma na-erughịrị mmadụ Jehova gosiri anyị?

18 Obi dị anyị ụtọ na Jehova na-egosi anyị obiọma ya na-erughịrị mmadụ. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji onyinye ndị o nyere anyị na-asọpụrụ ya, na-emekwa ihe ga-abara ndị mmadụ ibe anyị uru. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Pọl gwara anyị, sị: “Ya mere, ebe anyị nwere onyinye dị iche iche dị ka obiọma na-erughịrị mmadụ nke e nyere anyị si dị, . . . ọ bụrụ ozi ka anyị na-eje, ka anyị nọgide n’ije ozi a; ọ bụrụ onye na-ezi ihe, ya nọgide n’izi ihe ya; ọ bụrụ onye na-enye ndụmọdụ, ya nọgide na ndụmọdụ ọ na-enye; . . . onye na-eme ebere, ya jiri mgbasapụ ihu na-eme ya.” (Rom 12:6-8) Obiọma na-erughịrị mmadụ Jehova gosiri anyị kwesịrị ime ka anyị na-agachi ozi ọma anya, na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl, na-agba ụmụnna anyị ume, na-agbagharakwa ha ma ha mee ihe were anyị iwe.

19. Olee ọrụ Chineke nyere anyị a ga-akọwa n’isiokwu na-esonụ?

19 Ebe ọ bụ na obi dị anyị ụtọ maka ihụnanya Chineke gosiri anyị, anyị kwesịrị ime ihe niile anyị nwere ike ime iji ‘gbasie àmà ike banyere ozi ọma nke obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.’ (Ọrụ 20:24) N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-akọwa ọrụ ahụ nke ọma.