Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2016

Na-ekwusa Ozi Ọma Gbasara Obiọma Chineke nke Na-erughịrị Mmadụ

Na-ekwusa Ozi Ọma Gbasara Obiọma Chineke nke Na-erughịrị Mmadụ

‘Na-agbasi àmà ike banyere ozi ọma nke obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.’—ỌRỤ 20:24.

ABỤ: 101, 84

1, 2. Olee otú Pọl onyeozi si gosi na obi dị ya ụtọ maka obiọma Chineke na-erughịrị mmadụ?

PỌL onyeozi kwuru hoo haa banyere Chineke, sị: “Obiọma ya na-erughịrị mmadụ nke dịkwa n’ebe m nọ aghọghị ihe efu.” (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:9, 10.) N’ihi otú Pọl si kpagbuo Ndị Kraịst, ọ ma nke ọma na Chineke ejighị ya ụgwọ imere ya ebere, na ya erughịkwa eru ka o meere ya ebere.

2 Mgbe ọ fọrọ obere ka Pọl nwụọ, o degaara Timoti, bụ́ onye ọrụ ibe ya, akwụkwọ ozi, sị: “Ana m ekele Kraịst Jizọs Onyenwe anyị, onye nyere m ike, n’ihi na ọ gụrụ m n’onye kwesịrị ntụkwasị obi site n’ikenye m ozi.” (1 Tim. 1:12-14) Gịnị bụ ozi ahụ? Pọl gwara ndị okenye nọ́ n’ọgbakọ Efesọs ihe só n’ozi ahụ. Ọ sịrị ha: “Ọ dịghị ihe m ji mkpụrụ obi m kpọrọ, ma ọ bụrụhaala na m ga-agbacha ọsọ m ma jezuo ozi ahụ m natara n’aka Onyenwe anyị Jizọs, ya bụ, ịgbasi àmà ike banyere ozi ọma nke  obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.”Ọrụ 20:24.

3. Olee ozi pụrụ iche a gwara Pọl ka o kwusaa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 Olee “ozi ọma” Pọl kwusara, nke gosiri na Jehova na-emere ụmụ mmadụ obiọma na-erughịrị ha? Ọ gwara Ndị Kraịst nọ́ n’Efesọs, sị: “Unu anụwo banyere ọrụ nlekọta nke obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ, nke e nyere m n’ihi unu.” (Efe. 3:1, 2) Jizọs gwara Pọl ka o kwusaara ndị na-abụghị ndị Juu ozi ọma na ha nwere ike iso ná ndị Chineke ga-ahọrọ ka ha na Kraịst chịa n’Alaeze Mesaya. (Gụọ Ndị Efesọs 3:5-8.) Pọl ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma, gosi Ndị Kraịst n’oge anyị a ihe ha kwesịrị ime. O si otú ahụ gosi na obiọma na-erughịrị mmadụ Chineke gosiri ya abụghị “ihe efu.”

GỊNỊ KA I KWESỊRỊ IME N’IHI OBIỌMA NA-ERUGHỊRỊ MMADỤ CHINEKE NA-EGOSI ANYỊ?

4, 5. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ‘ozi ọma alaeze’ Chineke bụkwa ozi ọma nke “obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ”?

4 N’oge ọgwụgwụ a, Jehova enyela ndị ya ọrụ ‘ikwusa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.’ (Mat. 24:14) Ozi ọma anyị na-ekwusa bụkwa “ozi ọma nke obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe ọma niile anyị na-atụ anya ha n’Alaeze Chineke ga-eru anyị aka n’ihi obiọma Jehova si n’aka Kraịst na-egosi anyị. (Efe. 1:3) Pọl ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma iji gosi na obi dị ya ụtọ maka obiọma na-erughịrị mmadụ Jehova gosiri ya. Ànyị na-eme otú ahụ Pọl mere?—Gụọ Ndị Rom 1:14-16.

5 N’isiokwu bú nke a ụzọ, anyị mụtara ụzọ dị́ iche iche anyị bụ́ ndị mmehie si erite uru n’obiọma na-erughịrị mmadụ Jehova na-egosi anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka anyị na-akụziri ndị ọzọ otú Jehova si egosi ịhụnanya ya nakwa otú ha nwere ike isi rite uru na ya. Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka iji obiọma Chineke na-erughịrị mmadụ kpọrọ ihe?

NA-EKWUSA OZI ỌMA BANYERE ÀJÀ JIZỌS CHỤRỤ

6, 7. Mgbe anyị na-akọwara ndị mmadụ ihe mgbapụta ahụ, olee otú anyị si ekwusa ozi ọma banyere obiọma Chineke na-erughịrị mmadụ?

6 N’ụwa a ndị mmadụ na-eme ihe sọrọ ha, a naghịzi ewere mmehie ka ihe ọjọọ. Ọ bụ ya mere na ọtụtụ ndị amaghị na e kwesịrị ịgbapụta ha. Ma, ọtụtụ ndị na-achọpụtakwu na mmadụ ibi ndụ otú o si masị ya anaghị eme ka onye ahụ nwee obi ụtọ. Mgbe ọtụtụ ndị na-aghọta ihe mmehie bụ, ihe ọ na-eme anyị, na ihe anyị kwesịrị ime ka a gbapụta anyị ná mmehie bụ ma ha na Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl. Obi na-adị ndị jí obi ha niile na-achọ eziokwu ụtọ ịmụta na ọ bụ ịhụnanya Jehova na obiọma ya na-erughịrị mmadụ mere ka o zite Ọkpara ya n’ụwa ka ọ napụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ.—1 Jọn 4:9, 10.

7 Pọl dere banyere Ọkpara Chineke, sị: “E si n’aka ya jiri ihe mgbapụta tọhapụ anyị, site n’ọbara nke onye ahụ, ee, mgbaghara nke njehie anyị, dị ka obiọma [Jehova] dị ukwuu nke na-erughịrị mmadụ si dị.” (Efe. 1:7) Àjà ahụ Kraịst ji ndụ ya chụọ bụ ihe kacha gosi na Chineke hụrụ anyị n’anya nakwa na obiọma ya na-erughịrị mmadụ enweghị atụ. Obi dị anyị ezigbo ụtọ ịmụta na anyị nwee okwukwe n’ọbara Jizọs ji chụọ àjà, Chineke ga-agbaghara anyị, sachaakwa akọnuche anyị. (Hib. 9:14) Ọ bụ ozi ọma anyị kwesịrị ịna-ezi ndị ọzọ.

 NYERE NDỊ MMADỤ AKA KA HA NA CHINEKE DỊ́ NÁ MMA

8. Gịnị mere o ji dị́ mkpa ka e mee ka ụmụ mmadụ bụ́ ndị mmehie na Chineke dị́ ná mma?

8 Ọrụ anyị bụ ime ka ndị mmadụ mata na ha na Onye kere ha nwere ike ịdị ná mma. Ọ bụrụ na ha enweghị okwukwe n’àjà ahụ Jizọs chụrụ, Chineke na-ewere ha ka ndị iro ya. Jọn onyeozi dere, sị: “Onye nwere okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; onye na-enupụrụ Ọkpara ahụ isi agaghị ahụ ndụ, kama ọnụma Chineke na-adịgide n’ahụ́ ya.” (Jọn 3:36) Obi dị anyị ụtọ na àjà ahụ Kraịst chụrụ na-eme ka anyị na Chineke nwee ike ịdị ná mma. Pọl kwuru, sị: “Unu ndị e kewapụrụ ekewapụ n’oge gara aga, ndị bụkwa ndị iro n’ihi na uche unu dị n’ọrụ ọjọọ, ọ bụ unu ka o mere ugbu a ka unu na ya dị ná mma site n’anụ ahụ́ nke onye ahụ, site n’ọnwụ ya.”—Kọl. 1:21, 22.

9, 10. (a) Olee ọrụ Kraịst nyere ụmụnna ya e tere mmanụ? (b) Olee otú ndị só ‘n’atụrụ ọzọ’ si enyere ụmụnna ha e tere mmanụ aka?

9 Kraịst enyela ụmụnna ya e tere mmanụ nọ́ n’ụwa ihe Pọl kpọrọ “ozi nke ime ka a dị ná mma.” Pọl degaara Ndị Kraịst e tere mmanụ akwụkwọ ozi ma kọwaa, sị: “Ihe niile si n’aka Chineke, bụ́ onye mere ka anyị na ya dị ná mma site n’aka Kraịst, nyekwa anyị ozi nke ime ka a dị ná mma, ya bụ, na Chineke si n’aka Kraịst na-eme ka ya na ụwa dị ná mma, n’agụrụghị ha njehie ha, o nyefekwara n’aka anyị okwu nke ime ka a dị ná mma. Ya mere, anyị bụ ndị nnọchiteanya nọ n’ọnọdụ Kraịst, dị ka à ga-asị na Chineke na-arịọsi arịrịọ ike site n’ọnụ anyị. Dị ka ndị nọ n’ọnọdụ Kraịst, anyị na-arịọ, sị: ‘Meenụ ka unu na Chineke dị ná mma.’”—2 Kọr. 5:18-20.

10 Ndị só ‘n’atụrụ ọzọ’ ghọtara na inyere ụmụnna ha e tere mmanụ aka n’ikwusa ozi ọma bụ ihe ùgwù. (Jọn 10:16) Ebe ha na-ejere Kraịst ozi, ọ bụ ha na-arụ ọrụ kachanụ n’ịkụziri ndị mmadụ eziokwu Baịbụl na inyere ha aka ka ha na Jehova dị́ ná mma. Ihe a so n’ihe dị́ mkpa a na-arụ n’ịgba àmà nke ọma banyere ozi ọma nke obiọma Chineke na-erughịrị mmadụ.

NA-EZI NDỊ MMADỤ OZI ỌMA NA CHINEKE NA-ANỤ EKPERE

11, 12. Gịnị mere ndị mmadụ ịmụta na ha nwere ike ikpere Jehova ekpere ji bụrụ ozi ọma?

11 Ọtụtụ ndị na-ekpe ekpere n’ihi na ọ na-eme ka obi dị́ ha mma, ma ha ekwetaghị na Chineke na-anụ ekpere ha. Ha kwesịrị ịmata na Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.” Ọbụ abụ bụ́ Devid dere, sị: “Gị Onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka anụ ahụ́ niile bụ́ mmadụ ga-abịakwute. Njehie m dị ọtụtụ nke na agaghị m ebuli ya.”—Ọma 65:2, 3.

12 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu arịọ ihe ọ bụla n’aha m, m ga-eme ya.” (Jọn 14:14) O doro anya na “ihe ọ bụla” e kwuru ebe a pụtara ihe ọ bụla bụ́ uche Jehova. Jọn gwara anyị, sị: “Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ bụ na ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) Ọ na-eme anyị obi ụtọ ịkụziri ndị mmadụ na ekpere abụghị naanị ihe na-eme ka obi dị́ mmadụ mma, kama na ọ bụ otú anyị si abịaru ‘ocheeze nke obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ nso.’ (Hib. 4:16) Mgbe anyị na-akụziri ndị mmadụ otú e kwesịrị isi kpee ekpere, Onye e kwesịrị ikpere ya, na ihe ndị anyị kwesịrị ikpe n’ekpere, anyị na-enyere ha aka ịbụ ndị enyi  Jehova, ya ana-akasi ha obi mgbe nsogbu bịaara ha.—Ọma 4:1; 145:18.

OTÚ CHINEKE GA-ESI GOSI OBIỌMA YA NA-ERUGHỊRỊ MMADỤ N’ỤWA ỌHỤRỤ

13, 14. (a) Olee ihe ùgwù ndị magburu onwe ha ndị e tere mmanụ ga-enwe n’ọdịnihu? (b) Olee ọrụ dị́ ebube ndị e tere mmanụ ga-arụrụ ndị mmadụ?

13 N’ụwa ọhụrụ, Jehova ga-egosikwu ndị mmadụ obiọma ya na-erughịrị ha. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ọ ga-eme ka otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ ahụ ha na Kraịst ga-achị n’eluigwe nwee ihe ùgwù magburu onwe ya. Pọl kọwara ihe ùgwù ahụ mgbe o dere, sị: “Chineke, onye ebere ya dị ukwuu, n’ihi oké ịhụnanya ya nke o nwere n’ebe anyị nọ, mere ka anyị na Kraịst dịkọọ ndụ, ọbụna mgbe anyị nwụrụ anwụ ná njehie—e sitewo n’obiọma na-erughịrị mmadụ zọpụta unu—ọ kpọlitekọkwara anyị na ya ma nyekọọ anyị na ya oche n’ebe ndị dị n’eluigwe n’ihi na anyị na Kraịst Jizọs dị n’otu, ka e wee gosipụta, n’ime usoro ihe ndị na-abịanụ, oké obiọma ya nke na-erughịrị mmadụ site n’amara ya n’ebe anyị nọ n’ịdị n’otu nke anyị na Kraịst Jizọs.”—Efe. 2:4-7.

14 O siri ike ichetụdị n’echiche ihe dị́ egwu Jehova ga-emere Ndị Kraịst e tere mmanụ mgbe ha ga-anọ n’ocheeze soro Kraịst na-achị n’eluigwe. (Luk 22:28-30; Fil. 3:20, 21; 1 Jọn 3:2) Ọ bụ ha ka Jehova ga-egosi “oké obiọma ya nke na-erughịrị mmadụ.” Ha ga-abụ “Jeruselem ọhụrụ,” bụ́ nwaanyị Kraịst na-alụ ọhụrụ. (Mkpu. 3:12; 17:14; 21:2, 9, 10) Ha ga-eso Jizọs ‘gwọọ mba niile.’ Ha ga-enyere ndị mmadụ aka ka ha gharazie ịbụ ndị ohu mmehie na ọnwụ, nyekwara ha aka ka ha zuo okè.—Gụọ Mkpughe 22:1, 2, 17.

15, 16. N’ọdịnihu, olee otú Jehova ga-esi gosi ndị só ‘n’atụrụ ọzọ’ obiọma na-erughịrị mmadụ?

15 Ndị Efesọs 2:7 kwuru na ‘n’usoro ihe na-abịanụ,’ Chineke ga-egosi ndị mmadụ obiọma ya na-erughịrị ha. O doro anya na n’oge ahụ, onye ọ bụla nọ́ n’ụwa ga-erite uru ‘n’oké obiọma Jehova nke na-erughịrị mmadụ.’ (Luk 18:29, 30) Otu n’ime ụzọ kachanụ Jehova ga-esi gosi ndị mmadụ obiọma ya na-erughịrị ha bụ na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ha esi n’ili pụta. (Job 14:13-15; Jọn 5:28, 29) Ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị fere Jehova n’oge ochie tupu Jizọs ejiri ndụ ya chụọ àjà nakwa ndị só ‘n’atụrụ ọzọ,’ bụ́ ndị fere Jehova ruo mgbe ha nwụrụ n’oge ikpeazụ a. Ha ga-ebilite ka ha soro fewekwa Jehova.

16 A ga-akpọlitekwa ọtụtụ nde ndị nwụrụ n’amaghị onye Chineke bụ. A ga-enye ha ohere ịmụ banyere Jehova ma na-erubere ọchịchị ya isi. Jọn dere, sị: “M wee hụ ndị nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo n’ihu ocheeze ahụ, e meghekwara akwụkwọ mpịakọta dị iche iche. Ma e meghere akwụkwọ mpịakọta ọzọ; ọ bụ akwụkwọ mpịakọta nke ndụ. E kpekwara ndị nwụrụ anwụ ikpe site n’ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ, dị ka omume ha si dị. Oké osimiri hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na Hedis hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha, e kpekwara ha ikpe n’otu n’otu dị ka omume ha si dị.” (Mkpu. 20:12, 13) N’eziokwu, Chineke ga-achọ ka ndị a kpọlitere n’ọnwụ mụta otú ha ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru. A ga-enwekwa “akwụkwọ mpịakọta” a ga-ede ntụziaka ọhụrụ ndị ọ ga-achọ ka ndị bí n’ụwa ọhụrụ na-erubere isi. Ntụziaka ndị ahụ bụ ihe ọzọ ga-egosi obiọma Jehova nke na-erughịrị mmadụ.

 NA-EKWUSA OZI ỌMA

17. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma?

17 Ọ dị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ka anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ihi na ọgwụgwụ ụwa a adịla nso. (Mak 13:10) O doro anya na ozi ọma anyị na-ekwusa na-eme ka a mata obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ. Anyị kwesịrị iburu ya n’obi mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma. Ihe mere anyị ji ekwusa ya bụ ka anyị sọpụrụ Jehova. Otú anyị ga-esi na-eme ya bụ ime ka ndị mmadụ mata na ihe ọma niile Jehova kwere nkwa imere anyị n’ụwa ọhụrụ na-egosi na obiọma ya enweghị atụ.

Jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi iji gosi na ị bụ ‘onye na-elekọta ụlọ n’ihe banyere obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.’—1 Pita 4:10 (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17 ruo na nke 19)

18, 19. Olee otú anyị si eme ka a mata obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ?

18 Mgbe anyị na-ezi ndị ọzọ ozi ọma, anyị nwere ike ịkọwara ha na Alaeze Kraịst chịwa, ụmụ mmadụ ga-erite uru niile ha kwesịrị irite n’ihe mgbapụta ahụ ma jiri nwayọọ nwayọọ zuo okè. Baịbụl sịrị: “A ga-emekwa ka ihe e kere eke nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Rom 8:21) Ọ bụ naanị obiọma pụrụ iche Jehova na-egosi anyị ga-eme ka ihe a kwe omume.

19 Anyị nwere ihe ùgwù ịgwa ndị ọzọ banyere nkwa ahụ na-eme obi ụtọ Chineke kwere ná Mkpughe 21:4, 5, sị: “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.” Jehova, bụ́ onye nọ́ n’ocheeze ahụ, wee sị: “Lee! Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.” Ọ sịkwara: “Dee ha ede, n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.” Ọ bụrụ na anyi ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ndị ọzọ ozi ọma, anyị na-eme ka a mata obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ.