Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2016

Eric na Amy

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Gana

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Gana

Ị̀ MA nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị kwagara mba ọzọ, bụ́ ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma? Anyị na-ekwukarị na ụmụnna ndị ahụ na-eje ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ị̀ jụtụla onwe gị, sị: ‘Gịnị mere ha ji gawa ije ozi ná mba ọzọ? Olee otú ha si kwadebe maka ụdị ozi a? M̀ ga-emeli ya?’ Otu n’ime ụzọ dị́ mma anyị ga-esi mata azịza ajụjụ ndị a bụ ịjụ ụmụnna ndị ahụ ajụjụ. Ka anyị jụọnụ ha.

GỊNỊ MERE HA JI EME YA?

Gịnị mere i ji malite iche banyere ịkwaga ebe e nwere mkpa ka ukwuu ná mba ọzọ? E nwere otu nwanna nwaanyị sí Amerịka aha ya bụ Amy. Ọ dị ihe dị́ ka afọ iri atọ na ise ugbu a. O kwuru, sị: “Ruo ọtụtụ afọ, m nọ na-eche banyere ịga jewe ozi ná mba ọzọ. Ma, o yiri m ihe m na-agaghị emeli.” Gịnị mere o ji kwụsị iche otú ahụ? Ọ sịrị: “N’afọ 2004, otu nwanna na nwunye ya na-eje ozi na Beliiz gwara m ka m bịa leta ha ma soro ha sụọ ụzọ otu ọnwa. M gara, ya atọọ m ka mmanụ aṅụ. Mgbe otu afọ gara, m kwagara Gana ma sụwa ụzọ n’ebe ahụ.”

Aaron na Stephanie

E nwere nwanna nwaanyị ọzọ síkwa Amerịka aha ya bụ Stephanie. Ọ dị ihe dị́ ka afọ iri abụọ na asatọ ugbu a. N’afọ ole na ole gara aga, o chebaara onwe ya echiche ma sị: ‘Ahụ́ siri m ike. E nweghịkwa onye m na-akpa afọ ya. N’eziokwu, m nwere ike ijekwuru Jehova ozi karịa otú m na-eme ugbu a.’ Eziokwu ahụ ọ gwara onwe ya mere ka ọ kwaga Gana ka o jekwuoro Jehova ozi. Otu nwanna aha ya bụ Filip na nwunye ya bụ́ Ida bụ ndị ọsụ ụzọ sí Denmak. Ha akatatụla ahụ́. Ọ nọ na-agụ ha agụụ ịkwaga ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ha chọrọ ụzọ ndị ha ga-esi mee ihe ahụ na-agụ ha. Filip sịrị: “Mgbe ohere ya pụtara, ọ dị ka Jehova ọ̀ sịrị anyị: ‘Gawanụ.’” N’afọ 2008, ha kwagara Gana, jee ozi ihe karịrị afọ atọ.

Brook na Hans

 Nwanna ọzọ aha ya bụ Hans na nwunye ya bụ́ Brook bụ ndị ọsụ ụzọ sí Amerịka. Ha dị afọ iri atọ na ụma. Mgbe ajọ ifufe kpara mkpamkpa n’afọ 2005, ha so nyere ndị ọdachi ahụ dakwasịrị aka. Ha mechara dejupụta akwụkwọ maka ịga na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ ná mba ọzọ. Ma, a kpọghị ha. Hans kwuru, sị: “N’oge ahụ, anyị gere otu okwu ná mgbakọ distrikti, bụ́ ebe e kwuru na Eze Devid ghọtara na Chineke ekweghị ka ọ bụrụ ya ga-arụrụ ya ụlọ nsọ. N’ihi ya, ọ gbanwere ihe ọ chọrọ ime. Ihe ahụ e kwuru nyeere anyị aka ịghọta na o nweghị ihe o mere ma anyị gbanwee ihe anyị bu n’obi ime n’ozi Chineke.” (1 Ihe 17:1-4, 11, 12; 22:5-11) Brook sịrị: “Jehova chọrọ ka anyị kụọ aka n’ọnụ ụzọ ọzọ.”

Mgbe ndị enyi ha na-eje ozi ná mba ọzọ kọọrọ ha ihe ndị na-atọ ụtọ mere n’ebe ha na-eje ozi, o mere ka Hans na Brook kpebie ịga mba ọzọ sụwa ụzọ. N’afọ 2012, ha gara Gana, jee ozi ọnwa anọ ma nyere ọgbakọ na-eji asụsụ ndị ogbi amụ ihe aka. N’agbanyeghị na ha mechara laghachi Amerịka, ozi ahụ ha jere na Gana mere ka ha kpebisikwuo ike ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. Kemgbe ahụ, ha esorola rụọ alaka ụlọ ọrụ dị́ na Maịkronishia.

IHE NDỊ HA MERE KA HA NWEE IKE ỊGA EBE E NWERE MKPA KA UKWUU

Olee otú i si kwadebe maka ịga ebe e nwere mkpa ka ukwuu? Stephanie kwuru, sị: “M chọtara isiokwu Ụlọ Nche ndị kwuru gbasara ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. * M gwara ndị okenye ọgbakọ, gwakwa onye nlekọta sekit na nwunye ya na m chọrọ ịga jewe ozi ná mba ọzọ. Nke kacha mkpa bụ na m gwara ya Jehova ugboro ugboro n’ekpere.” Ihe ọzọ bụ na Stephanie anaghị emefusị ego. N’ihi ya, o dokọtara ego ọ ga-eji na-egbo mkpa ya ma ọ kwaga mba ọzọ.

Hans sịrị: “Anyị kpere ekpere ka Jehova duzie anyị n’ihi na anyị chọrọ ịga ebe ọ bụla ọ chọrọ ka anyị gaa.  Anyị kwukwara n’ekpere ahụ ụbọchị anyị bu n’obi ime ihe ahụ anyị chọrọ ime.” Ha degaara alaka ụlọ ọrụ anyị anọ akwụkwọ ozi. Mgbe alaka ụlọ ọrụ anyị dị́ na Gana gwara ha bịa Gana, ha gara ebe ahụ, buru n’obi ịnọ naanị ọnwa abụọ. Hans sịrị: “Otú iso ọgbakọ dị́ n’ebe ahụ jee ozi si tọọ anyị ụtọ mere ka anyị nọfee ọnwa abụọ ahụ anyị chọrọ ịnọ.”

Adria na George

George na Adria bụ di na nwunye sí Kanada. Ha dị ihe dị́ ka afọ iri atọ na asatọ. Ha echefughị na ihe Jehova na-agọzi bụ ihe ọma mmadụ maliterela ime, ọ bụghị naanị ihe ọma onye ahụ bu n’obi. N’ihi ya, ha gbara ezigbo mbọ ime ihe ha kpebiri ime. Ha kpọrọ otu nwanna nwaanyị na-eje ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu na Gana n’ekwentị, jụọ ya ọtụtụ ajụjụ. Ha degakwaara alaka ụlọ ọrụ anyị dị́ na Kanada nakwa na Gana akwụkwọ ozi. Adria kwuru, sị: “Anyị gbakwara mbọ karịa otú anyị na-emebu ịkwụsịlata ihe ndị na-eri anyị oge.” Ihe ndị ahụ ha mere nyeere ha aka ịkwaga Gana n’afọ 2004.

OTÚ HA SI MERIE NSOGBU NDỊ HA NWERE

Olee nsogbu ndị i nwere ebe ahụ, oleekwa otú i si merie ha? Nsogbu Amy nwere ná mmalite bụ na agụụ ịhụ ndị ezinụlọ ha na-agụsi ya ike. Ọ sịrị: “Otú e si eme ihe niile ebe ahụ dị iche n’ihe ndị maara m ahụ́.” Gịnị nyeere ya aka? Ọ sịrị: “Otú ndị ezinụlọ anyị si na-akpọ m ma na-agwa m na obi dị ha ụtọ maka ozi m na-eje nyeere m aka ịna-echeta ihe mere m ji kpebie ịkwaga mba ọzọ. Mụ na ndị ezinụlọ anyị mechara malite ịna-esi n’Ịntanet akparịta ụka ma na-ahụ ibe anyị. N’ihi ya, ọ dịghịzi m ka hà nọ n’ebe dị́ ezigbo anya.” Amy kwuru na  imeta otu nwanna nwaanyị bí ebe ahụ enyi nyeere ya  aka ịghọta otú e si eme ihe ụfọdụ. Ọ sịrị: “M na-agakwuru enyi m ahụ mgbe ọ bụla m na-aghọtaghị ihe mere ndị mmadụ ji mee ihe ụfọdụ. O nyeere m aka ịmata ihe m kwesịrị ime na ihe m na-ekwesịghị ime, nke mere ka m nwee ike iji ọṅụ na-eje ozi m.”

George na Adria kwuru na mgbe ha gara Gana ọhụrụ, ọ dị ha ka hà bizi n’oge ochie. Adria sịrị: “Kama iji ígwè e ji asa ákwà na-asa ákwà, anyị na-eji bọket. Ọ na-adịzi ka awa ole isi nri na-ewe anyị ò ji okpukpu iri karịa awa ole ọ na-ewebu anyị. Ma mgbe obere oge gachara, ihe ndị ahụ yiri ka hà bụ nsogbu siri ike ghọziri ihe ọhụrụ anyị na-amụta.” Brook sịrị: “N’agbanyeghị nsogbu anyị bụ́ ndị ọsụ ụzọ na-enwe, anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ. Anyị cheta ihe niile na-agba ume merela n’ozi anyị, obi na-atọgbu anyị atọgbu.”

OZI ANYỊ NA-EME ANYỊ OBI ỤTỌ

Gịnị mere i ji agba ndị ọzọ ume ka ha jee ụdị ozi a? Stephanie sịrị: “Ọ na-eme ezigbo obi ụtọ ikwusa ozi ọma n’ebe ị ga-ahụ ndị nwere mmasị ịmụta eziokwu Baịbụl nke na ha na-achọ ka ị na-amụrụ ha ihe kwa ụbọchị. Ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu so n’ihe kacha mma m kpebitụrụla ime.” N’afọ 2014, Stephanie na Aaron lụrụ. Ha na-eje ozi ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị́ na Gana.

Nwanna nwaanyị ọzọ bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Christine bụ onye Jamanị. Ọ dị ihe dị́ ka afọ iri atọ na atọ. O kwuru, sị: “Ọ na-atọ ka mmanụ aṅụ.” Christine jere ozi na Bolivia tupu ya akwaga Gana. Ọ sịkwara: “Ebe ọ bụ na anọghị m ndị ezinụlọ anyị nso, m na-arịọ Jehova mgbe niile ka o nyere m aka. O nwetụbeghị mgbe mụ na ya dị ná mma otú anyị dị ugbu a. M na-ahụkwa na otú ọgbakọ Ndị Kraịst si dị́ n’otu enweghị atụ. Ozi m emeela ka ndụ m baa ezigbo uru.” N’oge na-adịbeghị anya, Christine na Gideon lụrụ. Ha abụọ ka na-eje ozi na Gana.

Christine na Gideon

Filip na Ida kwuru otú ha si mee ka ndị ha na-amụrụ Baịbụl na-eme nke ọma. Ha sịrị: “Anyị na-amụburu mmadụ iri na ise ma ọ bụ karịa ihe. Ma anyị mechara mụwara naanị mmadụ iri ihe ka anyị nwee ike ịna-akụziri ha ihe nke ọma.” Ọ̀ baara ndị ha mụụrụ ihe uru? Filip sịrị: “E nwere otu nwa okorobịa m mụụrụ ihe. Aha ya bụ Michael. Anyị ji otu ọnwa mụchaa akwụkwọ Bible Na-akụzi n’ihi na ọ dị njikere ịna-amụ ihe kwa ụbọchị, ọ na-akwadebekwa nke ọma. O mechara bụrụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. Ụbọchị mbụ ọ gara ozi ọma, ọ jụrụ m, sị: ‘Ì nwere ike inyere m aka mụọrọ ndị m na-amụrụ Baịbụl ihe?’ Ihe ahụ o kwuru juru m anya, mụ elee ya anya. Ọ gwara m na ya maliteere mmadụ atọ ọmụmụ Baịbụl, na ya chọkwara ka e nyere ya aka mụọrọ ha ihe.” Otú e si na-achọkwu ndị ga na-amụrụ ndị mmadụ ihe emeela ka onye a na-amụrụ ihe na-amụziri ndị ọzọ ihe.

Ida na Filip

Nwanna nwaanyị ahụ aha ya bụ Amy kọrọ otú o si mata ozugbo na a chọkwuru ndị ọrụ na Gana. Ọ sịrị: “Obere oge m bịarutere Gana, anyị gara ozi ọma n’otu obere obodo, gbaakwa mbọ ka anyị chọta ndị ogbi. Ọ bụghị naanị otu onye ogbi ka anyị hụrụ, kama anyị hụrụ ndị ogbi asatọ naanị n’otu obodo ahụ.” Ka ọ dị ugbu a, Amy na Eric alụọla. Ha abụọ bụkwa ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ha nọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ ndị ogbi amụ ihe ka ha nwee ike iso na-enyere ihe karịrị narị ndị nkwusa atọ bụ́ ndị ogbi nakwa ọtụtụ ndị ọzọ nwere mmasị ná mba ahụ aka. Ije ozi na Gana enyerela George na Adria aka ịghọta ihe mmadụ ga-eme iji bụrụ onye ozi ala ọzọ. N’ihi ya, obi bụ ha sọ aṅụrị mgbe a kpọrọ ha ka ha soro na klas nke otu narị na iri abụọ na isii n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Taa, ha bụ ndị ozi ala ọzọ na Mozambik.

Ọ BỤ ỊHỤNANYA MERE HA JI WEPỤTA ONWE HA

Obi na-adị anyị ụtọ ịhụ ka ọtụtụ ụmụnna sí mba ọzọ so ụmụ amaala obodo ebe ha gara na-arụsi ọrụ ike n’ikwusa ozi ọma. (Jọn 4:35) N’izu ọ bụla n’afọ, a na-eme ihe dị́ ka otu narị mmadụ na iri abụọ baptizim na Gana. N’ụwa niile, ọtụtụ puku ndị nkwusa ‘na-eji obi ha ewepụta onwe ha’ otú ahụ mmadụ iri na asaa gara ebe e nwere mkpa ka ukwuu na Gana mere. Ihe mere ha ji eme ya bụ na ha hụrụ Jehova n’anya. Ha na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. O doro anya na otú a ha si ewepụta onwe ha na-eme ka obi Jehova ṅụrịa.—Ọma 110:3; Ilu 27:11.

^ para. 9 Dị ka ihe atụ, gụọ isiokwu bụ́ “Ì Nwere Ike Ije Ozi n’Ebe E Nwere Mkpa Ka Ukwuu?” na “Ì Nwere Ike Ịgafeta Masedonia?” Ha gbara n’Ụlọ Nche April 15 na December 15, 2009.