Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2016

Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị ‘Ịna-eche Nche’?

Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị ‘Ịna-eche Nche’?

“Unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.”—MAT. 24:42.

ABỤ: 136, 129

1. Nye ihe atụ gosiri ihe mere o ji dị́ mkpa ka anyị mara ihe na-akụ na ihe na-eme n’ebe anyị nọ. (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

MGBAKỌ chọwa ịmalite, onyeisi oche na-aga n’elu ebe ikpo okwu nabata mmadụ niile, kwuokwa na abụ agawala ibido. Ndị bịara mgbakọ na-amata ozugbo na oge eruola ka ha gaa nọrọ ọdụ. Ha na-adị njikere igere ọmarịcha abụ a ga-akpọnye, na-atụkwa anya ịnụ okwu ndị a ga-ekwu. Ọ bụrụkwanụ na uche ụfọdụ ndị adịghị n’ihe onyeisi oche kwuru, ha ana-agagharị ma ọ bụ ha na ndị enyi ha ana-akparịta ụka n’amaghị na mgbakọ ebidowala? O doro anya na uche ha adịghị n’ihe na-akụ, na onyeisi oche agaala n’elu ebe ikpo okwu, na a kpọnyela abụ nakwa na ndị mmadụ anọrọla ọdụ. Ihe a a kọrọ na-egosi ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị aghọtaghị na oge na-akụzi kwarapụ kwarapụ ma ọ bụ ghara ịmata ihe ndị na-eme n’oge anyị a. Ọ na-akụziri anyị ezigbo ihe n’ihi na n’oge na-adịghị anya, e nwere oké ihe ga-emenụ. Anyị kwesịkwara ịmụrụ anya maka ya. Gịnị ka ọ bụ?

2. Gịnị mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘na-eche nche’?

2 Mgbe Jizọs Kraịst na-ekwu banyere “ọgwụgwụ usoro ihe a,” ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “Na-elenụ anya, mụrụnụ  anya, n’ihi na unu amaghị mgbe oge ahụ a kara aka bụ.” Mgbe o kwuchara ya, ọ dụrụ ha ọdụ ugboro ugboro, sị: “Na-echenụ nche.” (Mat. 24:3; gụọ Mak 13:32-37.) Otú Matiu si dee ihe ahụ Jizọs kwuru gosikwara na Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa. . . . Dịrịnụ njikere, n’ihi na ọ bụ n’oge awa unu na-echeghị na ọ ga-abụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” Ọ sịkwara: “Ya mere, na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọ ga-abụ.”—Mat. 24:42-44; 25:13.

3. Gịnị mere anyị ji ege ntị n’ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya?

3 Ndịàmà Jehova anaghị eji ihe ahụ Jizọs kwuru egwu egwu. Anyị ma na ‘oge ikpeazụ’ a agwụla agwụ nakwa na “oké mkpagbu” ahụ ga-amalite n’oge na-adịghị anya. (Dan. 12:4; Mat. 24:21) Anyị na-ahụ agha, omume rụrụ arụ, mmebi iwu, okpukpe ụgha, ụkọ nri, ọrịa na-efe efe, na ala ọma jijiji n’ebe dị́ iche iche n’ụwa. Anyị ma na ndị Jehova n’ụwa niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke otú a na-ekwusatụbeghị ya. (Mat. 24:7, 11, 12, 14; Luk 21:11) Anyị na-atụsi anya ike ịhụ uru ọbịbịa Onyenwe anyị ga-abara anyị nakwa otú ọ ga-esi mezuo nzube Chineke.—Mak 13:26, 27.

OGE NA-AKỤZI KWARAPỤ KWARAPỤ

4. (a) Gịnị mere anyị ga-eji kweta na Jizọs amatala ụbọchị a ga-alụ agha Amagedọn? (b) N’agbanyeghị na anyị amaghị mgbe oké mkpagbu ahụ ga-amalite, olee ihe obi kwesịrị isi anyị ike banyere ya?

4 Anyị gaa mgbakọ, anyị na-ama mgbe ihe omume ga-amalite. Ma, ihe ọ sọkwara anyị mee, anyị agaghị ekwuli afọ oké mkpagbu ahụ ga-amalite, ma ya fọkwa ikwu ụbọchị na oge awa ọ ga-abụ. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ sịrị: “Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ na oge awa ahụ, ndị mmụọ ozi nke eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama ọ bụ naanị Nna m maara.” (Mat. 24:36) Ma Chineke enyela Jizọs ikike n’eluigwe ka o duru ndị mmụọ ozi ya bịa lụọ agha Amagedọn. (Mkpu. 19:11-16) N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ugbu a, ọ matala mgbe a ga-alụ agha ahụ. Ma, anyị amaghị. Ọ bụ ya mere o ji dị́ ezigbo mkpa ka anyị na-eche nche ruo mgbe oké mkpagbu ahụ ga-amalite. Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe ihe ahụ ga-eme agbatụbeghị Jehova gharịị. O kpebiela mgbe ọ ga-ebibi ụwa ochie a. Ụbọchị ọ bụla gaferenụ na-eme ka oge ahụ dịkwuo nso. “Ọ gaghị anọ ọdụ.” (Gụọ Habakọk 2:1-3.) Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na ihe a bụ eziokwu?

5. Nye ihe atụ gosiri na amụma ọ bụla Jehova buru na-emezu mgbe oge ya ruru.

5 Amụma ọ bụla Jehova buru na-emezu mgbe oge ya ruru. Chegodị banyere ụbọchị ọ napụtara ndị Izrel n’Ijipt. Ụbọchị ahụ bụ abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst. Mozis mechara dee banyere ụbọchị ahụ, sị: “O wee ruo mgbe narị afọ anọ na iri atọ ahụ gwụchara, o ruru n’ụbọchị a kpọmkwem, na ụsụụ niile nke Jehova si n’ala Ijipt pụọ.” (Ọpụ. 12:40-42) “Narị afọ anọ na iri atọ ahụ” malitere mgbe ọgbụgba ndụ ahụ Jehova na Ebreham gbara malitere ịdị irè n’afọ 1943 Tupu Oge Ndị Kraịst. (Gal. 3:17, 18) Mgbe obere oge gara, Jehova sịrị Ebreham: “Ka o doo gị anya na mkpụrụ gị ga-abụ ndị mbịarambịa n’ala na-abụghị nke ha, ha ga-agbakwara ha ohu, ndị a ga-emekpakwa ha ahụ́ ruo narị afọ anọ.” (Jen. 15:13; Ọrụ 7:6) O doro anya na “narị afọ anọ” ahụ  e mekpara ha ahụ́ malitere n’afọ 1913 Tupu Oge Ndị Kraịst, mgbe a kwụsịrị Aịzik ara, Ishmel ana-akwa ya emo. Narị afọ anọ ahụ gwụrụ mgbe ndị Izrel si n’Ijipt pụọ n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst. (Jen. 21:8-10; Gal. 4:22-29) Jehova kpebiri mgbe ọ ga-anapụta ndị ya narị afọ anọ tupu ya emee ya.

6. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova ga-echebe ndị ya?

6 Jọshụa so ná ndị Izrel Chineke napụtara n’Ijipt. Mgbe ọtụtụ afọ gara, o chetaara ndị Izrel niile, sị: “Unu jikwa obi unu dum na mkpụrụ obi unu dum mara nke ọma na ọ dịghị otu ihe n’ime ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu nke na-emezughị. Ha niile emezuworo unu. Ọ dịghị otu ihe n’ime ha nke na-emezughị.” (Jọsh. 23:2, 14) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa ahụ o kwere na ya ga-anapụta anyi n’oké mkpagbu. Ma anyị kwesịrị ịna-eche nche ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke chebe anyị mgbe ọ ga-ebibi ụwa ochie a.

NA-ECHE NCHE KA CHINEKE CHEBE GỊ

7, 8. (a) Olee ihe bụ́ ọrụ ndị nche n’oge ochie, gịnịkwa ka ọ na-akụziri anyị? (b) Nye ihe atụ na-egosi ihe nwere ike ime ma ụra buru ndị nche.

7 Ihe ndị mere n’oge ochie na-akụziri anyị ihe mere o ji dị́ mkpa ka anyị na-eche nche. N’oge ahụ, e ji mgbidi dị́ elu gbaa Jeruselem na ọtụtụ obodo ndị ọzọ gburugburu ka ndị iro ghara ịbata. Ndị nche na-anọkwa na ya ahụ ihe na-eme gburugburu obodo ha. Ndị nche ndị ọzọ na-anọkwa n’ọnụ ụzọ ámá obodo. Ha na-eche nche ma n’ehihie ma n’abalị. Ọ bụ ha na-agwa ndị obodo ma e nwee ihe ọjọọ chọrọ ime. (Aịza. 62:6) Ha ma na ọ dị ezigbo mkpa ka ha mụrụ anya ma na-ahụ ihe na-emenụ. Ma ọ́ bụghị ya, ọtụtụ ndị nwere ike ịnwụ.—Ezik. 33:6.

8 Josifọs, bụ́ onye dere banyere ihe mere ndị Juu, kwuru na ndị agha Rom batara na Jeruselem n’afọ 70 Oge Ndị Kraịst, rute n’ebe a na-akpọ Ụlọ Elu Antonia, nke dị́ n’akụkụ mgbidi Jeruselem. Ihe mere ha ji bata bụ na ụra buuru ndị na-eche obodo ahụ nche. Ndị agha Rom si ebe ahụ bata n’ụlọ nsọ, gbaa ya ọkụ. Ọ bụ ya bụ ihe ikpeazụ merenụ ná mkpagbu kachanụ ndị Juu nwetụrụla.

9. Gịnị ka ọtụtụ ndị taa na-amaghị banyere ya?

9 Taa, ọtụtụ mba nwere ndị na-eche nche n’ókè ha na mba ndị ọzọ, nweekwa onyokomita ndị bụ́ ọkpọka. Ha na-eche nche ka a ghara inwe onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla nwere ike ịkpatara obodo ha nsogbu. Ma, naanị ihe ndị nche ahụ na-ahụ bụ nsogbu ndị ọchịchị ma ọ bụ ndị mmadụ nwere ike ịkpata. Ha amaghị gbasara Alaeze Chineke dị́ n’aka Jizọs Kraịst nakwa ikpe ọ ga-ekpe mba niile n’oge na-adịghị anya. (Aịza. 9:6, 7; 56:10; Dan. 2:44) Ma, ọ bụrụ na anyị amụrụ anya, na-echekwa nche, anyị ga-adị njikere mgbe ọ bụla ụbọchị ikpe ahụ ga-abịa.—Ọma 130:6.

EKWELA KA IHE Ọ BỤLA MEGHARỊA GỊ ANYA

10, 11. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ịkpachara anya maka ya? N’ihi gịnị? (b) Gịnị mere i ji kweta na Ekwensu emeela ka ndị mmadụ na-eleghara amụma Baịbụl anya?

10 Chegodị banyere onye nche mụrụ anya abalị. Ụra nwere ike ịtụsiwe ya ike ma chi bọwa, nke ga-eme ka o siere ya ezigbo ike ịna-eche nche n’ihi na ike gwụchara ya. Ụdị ihe ahụ nwere ike ime anyị. Ka ọgwụgwụ ụwa ochie a na-erukwu nso, o nwere ike isikwuru anyị ike ịmụrụ anya. Ọ ga-ajọgbu udele ná njọ  ma anyị kwụsị ịna-eche nche. Ka anyị leba anya n’ihe atọ nwere ike ime ka anyị ghara ịmụrụ anya, na-echekwa nche.

11 Ekwensu na-eduhie ndị mmadụ. Obere oge tupu Jizọs anwụọ, ọ dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ugboro atọ banyere “onye na-achị ụwa a.” (Jọn 12:31; 14:30; 16:11) Jizọs ma na Ekwensu ga na-eduhie ndị mmadụ ka ha ghara ịma na oge eruwela ka amụma ndị Chineke buru banyere ọdịnihu mezuo. (Zef. 1:14) Setan na-eji okpukpe ụgha niile dị́ n’ụwa emegharị ndị mmadụ anya. Gịnị ka ị na-achọpụta ma gị na ndị ọzọ na-akparịta ụka? Ọ̀ bụ na Ekwensu emebeghị “ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì” ka ha ghara ịma na Chineke ga-ebibi ụwa ochie a nakwa na Kraịst na-achị ugbu a n’Alaeze Chineke? (2 Kọr. 4:3-6) Ị gaa ozi ọma, ọ̀ kwa ị na-anụkarị ka ndị mmadụ na-asị gị, “Achọghị m ịnụ”? Anyị chọwa ịgwa ha ihe ga-eme ụwa a n’oge na-adịghị anya, ọtụtụ n’ime ha na-eme ka ọ̀ gbasaghị ha.

12. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ikwe ka Ekwensu ghọgbuo anyị?

12 N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị enweghị mmasị n’amụma ndị e buru na Baịbụl, anyị ekwesịghị ikwe ka ha mee ka anyị daa mbà. Anyị ma na anyị kwesịrị ịna-eche nche. Pọl degaara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ ozi, sị: “Unu maara nke ọma na ụbọchị Jehova na-abịa kpọmkwem dị ka onye ohi si abịa n’abalị.” (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:1-6.) Jizọs dụrụ anyị ọdụ, sị: “Dịrịnụ njikere, n’ihi na n’oge awa nke unu na-echeghị na ọ pụrụ ịbụ ka Nwa nke mmadụ na-abịa.” (Luk 12:39, 40) N’oge na-adịghị anya, Setan ga-aghọgbu ndị mmadụ ka ha chee na e nweela “udo na obi iru ala” n’ụwa. Ọ ga-eme ka ha chewe na ihe adịla mma. Anyịnwa kwanụ? Ụbọchị ikpe ahụ agaghị ‘abịakwasị anyị na mberede dị ka chi ọbụbọ si abịakwasị ndị ohi’ ma ọ bụrụhaala na ‘anyị amụrụ anya ma nwee uche ziri ezi.’ N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị ma na-atụgharị uche n’ihe Jehova si na ya na-agwa anyị.

13. Olee otú mmụọ nke ụwa si eme ka ndị mmadụ ghara ịna-eche nche, oleekwa ihe anyị ga-eme ka ọ ghara ime anyị?

13 Mmụọ nke ụwa na-eme ka ndị mmadụ ghara ịna-eche nche. Ihe nke ụwa eriela ọtụtụ ndị isi taa, mee ka ha chee  na ọ dịghị ha mkpa ịmara Chineke. (Mat. 5:3) Ha na-eji oge ha niile achụ ihe onwunwe, nke na-eme ka ha na-enwe “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya.” (1 Jọn 2:16) Fim na ihe ndị ọzọ e ji atụrụ ndụ emeekwala ka ‘ịhụ ihe ụtọ n’anya’ na-egbu ndị mmadụ ka mmanya. Ọ na-akakwa njọ kwa afọ. (2 Tim. 3:4) Ọ bụ ya mere Pọl ji gwa Ndị Kraịst ka ha ghara ‘ibu uzọ na-eme atụmatụ maka ihe anụ ahụ́ na-achọ,’ nke na-eme ka mmadụ ghara ịna-eche nche.—Rom 13:11-14.

14. Olee aka ná ntị Jizọs dọrọ anyị na Luk 21:34, 35?

14 Anyị chọrọ ka mmụọ nsọ Chineke na-eduzi anyị, ọ bụghị mmụọ nke ụwa. Jehova na-eji mmụọ nsọ ya eme ka anyị ghọta ihe ndị ga-eme n’oge na-adịghị anya. [1] (1 Kọr. 2:12) Ma anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ihi na obere ihe ndị a na-eme ná ndụ nwere ike ime ka anyị gharazie ịna-eche nche. (Gụọ Luk 21:34, 35.) Ndị ọzọ nwere ike ịna-akwa anyị emo maka na anyị na-eche nche, ma o kwesịghị ime ka anyị chewe na ọgwụgwụ ụwa a ka ga-egbu oge. (2 Pita 3:3-7) Kama, anyị kwesịrị ịna-agachi ọmụmụ ihe anya, bụ́ ebe e nwere mmụọ nsọ Chineke.

Ị̀ na-eme ihe niile i nwere ike ime ka ị mụrụ anya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 ruo na nke 16)

15. Gịnị mere Pita, Jems, na Jọn? Oleekwa otú ụdị ihe ahụ nwere ike isi mee anyị?

15 Ezughị okè nwere ike ime ka o siere anyị ike ịna-eche nche. Jizọs ma na ezughị okè nwere ike ime ka ụmụ mmadụ mee ihe na-adịghị mma. Chegodị ihe mere n’abalị bọtara ụbọchị e gburu ya. N’agbanyeghị na Jizọs zuru okè, ọ ma na ya kwesịrị ịrịọ Nna ya ka o nyere ya aka irubere ya isi. Ọ gwara Pita, Jems, na Jọn ka ha ‘na-eche nche,’ yanwa agaa kpewe ekpere. Ma, ha aghọtaghị ihe mere o ji dị́ ezigbo mkpa ka ha na-eche nche. Ike gwụrụ ha, ụra eburu ha. N’agbanyeghị na ike gwụkwara Jizọs, ọ nọ na-eche nche, na-ekpesikwa ekpere ike ka Nna ya nyere ya aka. Ọ bụkwa ihe ndịozi ya kwesịrị iso ya na-eme.—Mak 14:32-41.

16. Olee otú Jizọs kwuru na Luk 21:36 anyị ga-esi ‘mụrụ anya’?

16 ‘Ịmụrụ anya’ apụtaghị naanị ibu n’obi na anyị agaghị ehi ụra. Ụbọchị ole na ole tupu ihe ahụ mere n’ogige Getsemeni emee, Jizọs gwara ndịozi ya ndị ahụ ka ha na-arịọsi Jehova arịrịọ ike. (Gụọ Luk 21:36.) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-eche nche, anyị kwesịrị ịmụrụ anya ma na-ekpe ekpere.—1 Pita 4:7.

NA-ECHE NCHE MGBE NIILE

17. Olee otú anyị ga-esi mata ma ànyị adịla njikere maka ihe ga-eme n’oge na-adịghị anya?

17 Ebe Jizọs kwuru na ọgwụgwụ ga-abịa ‘n’oge awa anyị na-echeghị na ọ ga-abụ,’ ugbu a abụghị oge anyị kwesịrị ihiwe ụra, chụwa ihe na-enweghị isi na ọdụ juru n’ụwa Setan a, bụ́kwanụ ihe ndị na-agụ anụ ahụ́ anyị. (Mat. 24:44) Chineke na Kraịst si na Baịbụl na-agwa anyị ihe ha ga-emere anyị n’oge na-adịghị anya nakwa otú anyị ga-esi na-eche nche. Anyị kwesịrị ịna-agba mbọ ka okwukwe anyị sie ike, ka anyị na Jehova dịrị ná mma, anyị eburukwa ụzọ na-achọ Alaeze ya. Anyị kwesịrị ịmata na oge na-akụzi kwarapụ kwarapụ, ka anyị nwee ike ịdị njikere maka ihe ga-eme n’oge na-adịghị anya. (Mkpu. 22:20) Ọ bụ ihe ga-eme ka anyị dị ndụ.

^ [1] (paragraf nke 14) Gụọ isi nke 21 n’akwụkwọ bụ́ Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!