Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2016

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ezikiel isi 37 kwuru na e jikọtara osisi abụọ ka ha bụrụ otu osisi. Gịnị ka ọ pụtara?

Jehova si n’ọnụ Ezikiel buo amụma na ndị ya ga-alaghachite n’Ala Nkwa nakwa na ha ga-abụ otu mba otú ha bụbu. O bukwara amụma na ndị na-efe Chineke n’oge ikpeazụ a ga-adị n’otu ma bụrụ otu ndị.

Jehova gwara onye amụma ya bụ́ Ezikiel ka o dee ihe n’osisi abụọ. Ihe ọ ga-ede n’otu osisi bụ, “Nke Juda na ụmụ Izrel bụ́ ndị òtù ya,” deekwa na nke ọzọ, “Nke Josef, ya bụ, osisi Ifrem, na ụlọ Izrel dum bụ́ ndị òtù ya.” Osisi abụọ ahụ ga-aghọ “otu osisi” Ezikiel ji n’aka.—Ezik. 37:15-17.

 Gịnị ka “Ifrem” nọchiri anya ya? Ọ bụ Ifrem bụ ebo a kacha mara n’alaeze ebo iri nke Izrel. Jeroboam, bụ́ eze mbụ chịrị alaeze ahụ, si n’ebo ahụ. (Diut. 33:13, 17; 1 Eze 11:26) Ebo ahụ si n’agbụrụ Ifrem nwa Josef. (Ọnụ Ọgụ. 1:32, 33) Otú Jekọb si gọzie nwa ya bụ́ Josef pụrụ iche. N’ihi ya, ọ dabara adaba na a kpọrọ osisi nọchiri anya alaeze ebo iri ahụ “osisi Ifrem.” Mgbe Ezikiel dere amụma banyere osisi abụọ ahụ, ndị Asiria adọrọla alaeze Izrel ahụ dị́ n’ebe ugwu n’agha kemgbe afọ 740 Tupu Oge Ndị Kraịst. (2 Eze 17:6) N’ihi ya, n’oge ahụ, ọtụtụ ndị Izrel bi n’ebe dị́ iche iche n’Alaeze Ukwu Babịlọn, bụ́ ndị meriri Alaeze Ukwu Asiria.

N’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst, a dọọrọ ebo abụọ dị́ n’ebe ndịda nakwa ndị ọ bụla fọrọnụ n’alaeze ebe ugwu n’agha laa Babịlọn. Ọ bụ ndị eze sí n’agbụrụ Juda nọ na-achị ebo abụọ ahụ. Ndị nchụàjà bikwa na Juda n’oge ahụ n’ihi na ha na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ dị́ na Jeruselem. (2 Ihe 11:13, 14; 34:30) N’ihi ya, ọ dabara adaba na ọ bụ osisi bụ́ “nke Juda” nọchiri anya alaeze ahụ dị́ n’ebe ndịda.

Olee mgbe e jikọtara osisi abụọ ahụ e ji mee ihe atụ? Ọ bụ mgbe ndị Izrel laghachiri Jeruselem ka ha rụghachi ụlọ nsọ Chineke n’afọ 537 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ndị sí n’alaeze ebo abụọ ahụ na alaeze ebo iri ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha laghachi Jeruselem. N’oge ahụ, e keghịzi ụmụ Izrel ụzọ abụọ. (Ezik. 37:21, 22) Ndị Izrel malitekwara ifekọ Jehova ọnụ. Aizaya na Jeremaya buru amụma na ha ga-adị n’otu otú ahụ.—Aịza. 11:12, 13; Jere. 31:1, 6, 31.

Olee eziokwu dị́ mkpa gbasara ofufe dị́ ọcha amụma a na-eme ka anyị ghọta? Ọ na-eme ka anyị ghọta na Jehova ga-eme ka ndị na-efe ya dịrị ‘n’otu.’ (Ezik. 37:18, 19) Jehova ò meela ka ndị na-efe ya dịrị n’otu n’oge anyị a? Ee. Amụma ahụ malitere imezu n’afọ 1919, mgbe e ji nwayọọ nwayọọ hazigharịa ndị Chineke, meekwa ka ha dịghachi n’otu. Mbọ Setan gbara ka ha ghara ịdị n’otu kụrụ afọ n’ala.

N’oge ahụ, ọtụtụ n’ime ndị ahụ dịghachiri n’otu nwere olileanya iso Jizọs bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. (Mkpu. 20:6) Ha yiri osisi ahụ bụ́ nke Juda. Ma, ka oge na-aga, ọtụtụ n’ime ndị nwere olileanya ibi n’ụwa malitere isonyere ndị ahụ e tere mmanụ. (Zek. 8:23) Ha yiri osisi ahụ bụ́ nke Josef. Olileanya ha abụghị iso Kraịst chịa.

Ìgwè abụọ ahụ na-efekọ Jehova ọnụ n’oge anyị a, nweekwa otu Eze, bụ́ Jizọs Kraịst. Ọ bụ ya ka Jehova kpọrọ “ohu m Devid” n’amụma ahụ Ezikiel buru. (Ezik. 37:24, 25) Jizọs kpere ekpere ka ndị na-eso ụzọ ya ‘bụrụ otu otú ahụ ya na Nna ya dị n’otu.’ * (Jọn 17:20, 21) Jizọs kwukwara na ìgwè atụrụ nta ya, bụ́ ndị e tere mmanụ, na “atụrụ ọzọ” ya ga-aghọ “otu ìgwè atụrụ.” Ha niile ga-enwekwa “otu onye ọzụzụ atụrụ.” (Jọn 10:16) Ndị ohu Chineke niile n’oge a dị n’otu otú ahụ Jizọs kwuru, ma hà nwere olileanya ibi n’eluigwe ma ọ bụ ibi n’ụwa.

^ para. 6 Mgbe Jizọs kwuru banyere ihe ịrịba ama a ga-eji mata oge ikpeazụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ihe atụ. Anyị kwesịrị icheta na o bu ụzọ kwuo banyere “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” bụ́ mmadụ ole na ole n’ime ụmụnna ya e tere mmanụ ga na-eduzi ndị Chineke. (Mat. 24:45-47) Ihe atụ ọzọ o nyere ha gbasara ndị niile nwere olileanya ịga eluigwe. (Mat. 25:1-30) N’ikpeazụ, Jizọs kwuru banyere ndị nwere olileanya ibi n’ụwa, ndị ga na-enyere ụmụnna ya aka. (Mat. 25:31-46) N’oge anyị a kwa, amụma ahụ Ezikiel buru bu ụzọ mezuo n’ebe ndị nwere olileanya ịga eluigwe nọ. N’agbanyeghị na alaeze ebo iri ahụ anaghị anọchikarị anya ndị nwere olileanya ibi n’ụwa, otú ahụ ha na alaeze ebo abụọ ahụ si dị́ n’otu na-echetara anyị na ndị nwere olileanya ibi n’ụwa na ndị nwere olileanya ibi n’eluigwe dị n’otu ugbu a.