Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2016

“Atụla Egwu. Mụ Onwe M Ga-enyere Gị Aka”

“Atụla Egwu. Mụ Onwe M Ga-enyere Gị Aka”

KA E were ya na e nwere ebe i ji ụkwụ na-aga n’abalị. Na mberede, gị achọpụta na e nwere onye na-eso gị n’azụ. Ị kwụsị, ya akwụsị. Ị gasiwe ike, ya agasiwe ike. Gị agbapụ ọsọ, gbaga n’ụlọ enyi gị dị́ nso. Ozugbo i rutere, enyi gị emepeere gị ụzọ, gị agbabata, ahụ́ eruo gị ala.

O nwere ike ịbụ na ụdị ihe ahụ emetụbeghị gị. Ma, ụdị nsogbu ndị ọzọ nwere ike ịna-ekowe gị obi n’elu. Dị ka ihe atụ, è nwere àgwà na-adịghị mma ị na-agba mbọ ka ị kwụsị ịkpa, ma gị aka na-akpa ya? Ị̀ na-achọ ọrụ kemgbe, ma o nwebeghị nke i nwetara n’agbanyeghị mbọ niile ị na-agba? Ụjọ ịka nká na ọrịa ya na ya na-eso ọ̀ na-atụ gị? Ka è nwere ihe ọzọ na-enye gị nsogbu n’obi?

Nsogbu ọ sọkwara ya bụrụ, obi ọ́ gaghị adị gị ụtọ ma e nwee onye ị na-akọrọ nsogbu gị nakwa onye nwere ike inyere gị aka mgbe ọ bụla ị chọrọ? Ì nwere ụdị ezigbo enyi ahụ? Eheenụ. Jehova bụ ụdị enyi ahụ, otú ahụ ọ bụ enyi Ebreham dị́ ka e kwuru n’Aịzaya 41:8-13. N’amaokwu nke 10 na nke 13, Jehova kwere ndị ohu ya nkwa, sị: “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka. M ga-eji aka nri m nke ezi omume jidesie gị ike. N’ihi na mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’”

‘M GA-EJIDESI GỊ IKE’

Ọ̀ bụ na ihe a Jehova kwuru anaghị eme ka obi sie gị ike? Chegodị banyere nkwa a Jehova kwere anyị. Ihe amaokwu ahụ na-ekwu abụghị na gị na Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ, ya ejide gị aka, ọ bụ eziokwu na o nweghị onye ụdị ihe ahụ na-agaghị amasị. A sị na gị na ya na-aga ụkwụ na ụkwụ, ọ ga-eji aka nri ya jide gị n’aka ekpe. Kama ime otú ahụ, Jehova matịrị ‘aka nri ya nke ezi omume,’ jide “gị n’aka nri,” ka à ga-asị na ọ na-adọpụta gị n’ezigbo nsogbu. Ka ọ na-adọpụta gị, ya ana-emesi gị obi ike, sị: “Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.”

Ì weere Jehova ka Nna gị na Enyi gị hụrụ gị n’anya, onye ga-agbatara gị ọsọ enyemaka ma ọ gbajuo dọrọ? Ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi. Ọ na-echere gị echiche ọma, kpebisiekwa ike inyere gị aka. Ihe siere gị ike, Jehova chọrọ ka obi ruo gị ala n’ihi na ọ hụrụ gị n’anya nke ukwuu. Ọ “dị njikere inyere anyị aka n’oge nsogbu.”—Ọma 46:1.

Ọ BỤRỤ NA OBI NA-AMA ANYỊ IKPE N’IHI IHE ANYỊ MEJỌRỌ N’OGE GARA AGA

Ụfọdụ ndị na-echegbu onwe ha banyere ihe ọjọọ ha mere n’oge gara aga, na-eche ma Chineke  ọ̀ gbagharala ha. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, cheta Job, bụ́ onye ezi omume. O kwuru banyere ‘ihe o metara n’oge okorobịa.’ (Job 13:26) E nwere mgbe ọ dị ọbụ abụ bụ́ Devid otú ahụ, ya arịọ Jehova, sị: “Echetala mmehie m mere n’oge m bụ nwata nakwa nnupụisi m.” (Ọma 25:7) N’ihi ezughị okè, anyị niile ‘emehiewo, anyị adịghịkwa eru ebube Chineke.’—Rom 3:23.

Ọ bụ ndị Chineke n’oge ochie bụ ndị mbụ a gwara ihe ahụ e kwuru n’Aịzaya isi 41. Otú ha meruru mmehie mere ka Jehova kpebie ka a dọrọ ha n’agha laa Babịlọn ka ọ taa ha ahụhụ. (Aịza. 39:6, 7) Ma, Chineke kwere nkwa na ya ga-anapụta ndị chegharịrị ma lọghachikwute ya. (Aịza. 41:8, 9; 49:8) Otú ahụkwa ka Jehova na-emere ndị jí obi ha niile lọghachikwute ya ebere.—Ọma 51:1.

Chegodị banyere otu nwanna aha ya bụ Tasie. * Ọ nọ na-agbalị ịkwụsị ile ndị gba ọtọ na iji aka ya na-egbo onwe ya agụụ mmekọahụ. Ma, e nwere mgbe ụfọdụ o mekwara ihe ndị ahụ. Olee otú obi dị ya mgbe ahụ? Ọ sịrị: “Ọ dị m ka o nweghị ihe m dị mma ya. Ma, mgbe ọ bụla m kpere ekpere rịọ Jehova ka ọ gbaghara m, ọ na-enyere m aka ná nsogbu ahụ m nọ na ya.” Olee otú Jehova si nyere ya aka? Ndị okenye nọ́ n’ọgbakọ ha gwara ya ka ọ kpọọ ha mgbe ọ bụla o mere omume ahụ. Ọ sịrị: “Ịkpọ ha adịghịrị m mfe. Ma, mgbe ọ bụla m kpọrọ ha, ha na-agba m ume.” Ndị okenye gwara onye nlekọta sekit, ya agaara Tasie nleta ọzụzụ atụrụ. Onye nlekọta sekit sịrị ya: “Abịaghị m maka na ọ dabara na m ga-abịa. Ọ bụ ndị okenye chọrọ ka m bịa leta gị. Ha họọrọ gị ka m bịa leta gị.” Tasie kwuru, sị: “Ọ bụ m mere ihe ọjọọ. Ma, Jehova si n’aka ndị okenye nyere m aka.” Tasie mewere nke ọma n’ọgbakọ ma ghọọ ọsụ ụzọ oge niile. Ọ na-eje ozi ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ anyị. Chineke ga-enyekwara gị aka ná nsogbu ị nọ na ya otú ahụ o nyeere nwanna a.

Ọ BỤRỤ NA ANYỊ NA-ECHEGBU ONWE ANYỊ BANYERE ỌRỤ

Ọtụtụ ndị na-achị obi n’aka maka na ha enweghị ọrụ. A na-achụ ụfọdụ ndị n’ọrụ, ya esiere ha ike ịchọta ọrụ ọzọ. Chegodị otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na ị gaala ugboro ugboro ka e wee gị n’ọrụ, ma o nweghị isi. Ụdị ihe ahụ na-eme ka a gharazie ịna-akwanyere ụfọdụ ndị ùgwù. Olee otú Jehova nwere ike isi nyere gị aka? O nwere ike ịbụ na ọ gaghị eme ka ị chọta ụdị ọrụ kacha mma ozugbo. Ma, o nwere ike inyere gị aka icheta ihe Eze Devid chọpụtara. Ọ sịrị: “Ọ dị mgbe m bụ nwata, emewokwa m agadi, ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume kpamkpam, ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.” (Ọma 37:25) O doro anya na Jehova ji gị kpọrọ ihe, ọ ga-ejikwa ‘aka nri ya nke ezi omume’ nyere gị aka ịna-akpata ihe ị ga-eji na-egbo mkpa gị ma na-ejere ya ozi.

Olee otú Jehova nwere ike isi nyere gị aka ma ọ bụrụ na a chụrụ gị n’ọrụ?

Otu nwanna nwaanyị bí na Kolombia aha ya bụ Sara hụrụ otú Jehova si nyere ya aka. Ọ nọ na-arụ ọrụ a na-akwụ ya ezigbo ụgwọ n’otu ụlọ ọrụ a ma ama, ma ọrụ ahụ anaghị enye ya ohere. Ma,  ọ chọrọ ijekwuru Jehova ozi. N’ihi ya, ọ gbara arụkwaghịm, malite ịsụ ụzọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na inweta ọrụ ọ ga na-arụ naanị ụbọchị ụfọdụ adịghịrị ya mfe. Ọ bụ ya mere o ji mepee obere ebe a na-ere aịs krim. Ma, ego ya ji nwayọọ nwayọọ gbarie, ya akwachie. Ọ sịrị: “Afọ atọ chara acha gara. Ma, Jehova nyeere m aka idi ya.” Ọ chọpụtara ihe ndị dị́ ya mkpa n’eziokwu, matakwa otú ọ ga-esi kwụsị ịna-echegbu onwe ya banyere echi. (Mat. 6:33, 34) Onye ọ na-arụburu ọrụ mechara kpọọ ya, gwa ya ka ọ bịakwa rụwara ya ihe ọ na-arụburu ya. Ọ gwara onye ahụ na ya ga-ekweta ịna-arụ ọrụ naanị ụbọchị ụfọdụ nakwa ma ọ bụrụ na ọ ga-enye ya oge ọ ga-eji na-aga ozi ọma na ọmụmụ ihe. N’agbanyeghị na ego ọ na-enweta ugbu a erughị ka nke ọ na-enwetabu, ọrụ ya na-enye ya ohere ịna-asụ ụzọ. O kwuru na n’oge ahụ niile, obi siri ya ike na Jehova na-enyere ya aka.

Ọ BỤRỤ NA ANYỊ NA-ECHEGBU ONWE ANYỊ BANYERE ỊKA NKÁ

Nká bụ ihe ọzọ na-eme ka ndị mmadụ chịrị obi n’aka. Ọ na-abụ ọtụtụ ndị ruo mgbe ha kwesịrị ịla ezumike nká, ha ana-eche ma hà ga-enwe ego ga-ezuru ha ịna-elekọta onwe ha. Ha na-echekwa maka ọrịa ndị ha nwere ike ịrịa ma ha na-akakwu nká. O nwere ike ịbụ Devid rịọrọ Jehova, sị: “Ajụla m mgbe m mere agadi; mgbe ike na-adịkwaghị m, ahapụla m.”—Ọma 71:9, 18.

Oleezi otú ndị ohu Jehova ga-esi nwee obi ike na Jehova ga-elekọta ha n’ọdịnihu? Ha kwesịrị ịna-agba mbọ ka okwukwe ha sie ike ma tụkwasị Chineke obi na ọ ga na-enye ha ihe niile dị́ ha mkpa. Ma, ọ bụrụ na ha na-ebibu ndụ okomoko, o nwere ike ịdị mkpa ka ha kwụsị ịna-ebi ụdị ndụ ahụ, gbaakwa mbọ ka obere ihe ha nwere ju ha afọ. Ha nwere ike ịchọpụta na iri “nri e ji naanị akwụkwọ nri sie” ga na-atọ ha ụtọ, na-eme ka ahụ́ na-adị ha mma karịa iri “ehi mara abụba.” (Ilu 15:17) Ọ bụrụ na ihe kacha gị mkpa bụ ime ihe ga-adị Jehova mma, ọ ga na-egboro gị mkpa ọ bụrụgodị na ị kaala nká.

José na Rose na Tony na Wendy

Chegodị banyere otu nwanna aha ya bụ José na nwunye ya bụ́ Rose. Ha ejeerela Jehova ozi oge niile ruo ihe karịrị iri afọ isii na ise. Ruo ọtụtụ afọ, ha nọ na-elekọta papa Rose ma n’ehihie ma n’abalị. A wakwara José ahụ́ maka kansa, na-enyekwa ya ụdị ọgwụ siri ike e ji agwọ ọrịa ahụ. Jehova ọ̀ matịrị aka nri ya nyere nwanna a na nwunye ya aka? À na-ajụkwa ajụ? Ma olee otú o si mee ya? O si n’aka otu nwanna aha ya bụ Tony na nwunye ya bụ́ Wendy. Ha na ha nọ n’otu ọgbakọ. Ha nyere José na nwunye ya ebe ha ga-ebi. Tony na Wendy bu n’obi inye ndị ọsụ ụzọ oge niile ụlọ ahụ n’anaghị ha shịshị. Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, Tony na-esi na windo ụlọ akwụkwọ ha ahụ ka José na Rose na-aga ozi ọma mgbe niile. Ọ hụrụ ha n’anya maka otú ha si anụ ọkụ n’obi, o nweghịkwa mgbe o chefuru ihe ha mere. Ebe ọ bụ na nwanna ahụ na nwunye ya merela agadi ejirila ndụ ha niile jeere Jehova ozi, Tony na Wendy kpebiri inye ha ụlọ. Kemgbe afọ iri na ise, ha na-enyere José na Rose aka, bụ́ ndị dị́ ihe dị́ ka iri afọ asatọ na ise ugbu a. Nwanna a na nwunye ya ghọtara na aka Tony na Wendy na-enyere ha bụ onyinye sí n’aka Jehova.

Jehova kwere gị nkwa, sị: “Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.” Ọ chọrọ iji ‘aka nri ya nke ezi omume’ jide gị. Ị̀ ga-ekwenụ wepụta aka gị?

^ para. 11 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.