Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! Nke 1 n'Afọ 2016

 IHE BAỊBỤL KWURU

Mkpụrụ Obi

Mkpụrụ Obi

Okpukpe dị iche iche nwere ihe ndị ha na-akụzi gbasara mkpụrụ obi na ihe na-eme mmadụ mgbe ọ nwụrụ. Ma Baịbụl ga-enyere anyị aka ịmata nke bụ́ eziokwu.

Mkpụrụ obi ọ̀ na-anwụ anwụ?

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ọtụtụ ndị taa na-ekwu na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ụfọdụ ndị na-ekwukwa na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ya alọ ụwa. Ọ bụrụkwa na ọ nwụọ n’ụwa ahụ ọ lọrọ, ya alọkwa ọzọ. E nwekwara ndị na-ekwu na mmadụ nwụọ, mkpụrụ obi ya agawa eluigwe ma ọ bụ ọkụ mmụọ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru ihe ndị gosiri na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. N’akwụkwọ Ezikiel, Chineke kwuru na mkpụrụ obi na-eme mmehie ga-anwụ. N’ebe ọzọ na Baịbụl, a kpọrọ onye nwụrụ anwụ ‘mkpụrụ obi nwụrụ anwụ.’ (Levitikọs 21:11) Ihe a niile Baịbụl kwuru gosiri na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ.

“Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emehie, ọ bụ ya ga-anwụ.”Ezikiel 18:20.

Mkpụrụ obi ọ̀ bụ ihe dị n’ime mmadụ?

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ mkpụrụ obi na-eme ka mmadụ dịrị ndụ nakwa na ọ na-esi n’ahụ́ mmadụ apụ ma onye ahụ nwụọ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Jenesis isi iri anọ na isii, amaokwu nke iri na asatọ kpọrọ ụmụ otu nwaanyị mụrụ “mkpụrụ obi.” Na Baịbụl, okwu Hibru e si sụgharịta okwu ahụ bụ́ mkpụrụ obi nwere ike ịpụta onye na-eku ume. Baịbụl kpọrọ ụmụ anụmanụ mkpụrụ obi, kwuokwa na agụụ na-agụ mkpụrụ obi. (Diuterọnọmi 12:20) A sị na mkpụrụ obi abụghị mmadụ n’onwe ya, Baịbụl ọ̀ gaara ekwu na ọ na-eku ume ma ọ̀ bụ na-eri nri? Baịbụl na-ejikarị okwu ahụ bụ́ mkpụrụ obi akọwa onye dị ndụ.

‘Ọ mụrụ mkpụrụ obi iri na isii.’Jenesis 46:18.

 Gịnị na-eme mkpụrụ obi ma ọ nwụọ?

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na “ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol,” ya bụ n’ili. Ihe a o kwuru pụtara na onye nwụrụ anwụ anwụọla. (Ekliziastis 9:10) Mmadụ nwụọ, ọ “laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ, echiche ya na-ala n’iyi.” (Abụ Ọma 146:4) Onye nwụrụ anwụ anaghị emegharị ahụ́. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji jiri onye nwụrụ anwụ tụnyere onye nọ n’ụra.—Matiu 9:24.

GỊNỊ MERE O JI GBASA ANYỊ?

Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ndị nke ya nwere ike ịna-ajụ, sị: Ebee ka ọ nọ? Gịnị na-eme ya ugbu a? Ọ̀ na-ata ahụhụ? Ebe ọ bụ na Baịbụl ekwuola na onye nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, obi kwesịrị isi anyị ike na onye nke anyị nwụrụ anwụ anaghị ata ahụhụ ọ bụla. Ihe kwesịrị ịkacha na-eme anyị obi ụtọ bụ na Jehova kwere anyị nkwa na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọdịnihu.—Aịzaya 26:19.

“Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.”Ekliziastis 9:5.

GỤKWUO GBASARA YA

Ụgha nke Atọ: Obi Fere Chineke Azụ

Ọtụtụ ndị kweere na Chineke na-ata ndị mmehie ahụhụ ebighị ebi. Chineke ọ̀ na-eme ihe na-adịghị mma? Gịnị na-eme ndị mmadụ ma ha nwụọ?

Gịnị Bụ Mbilite n’Ọnwụ?

O nwere ike ịtụ gị n’anya ma ị nụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ọdịnihu.