Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! Nke 1 n'Afọ 2016

 ISIOKWU TETA! A

Ịga Chọọchị Ọ̀ Ka Na-amasị Ndị Mmadụ?

Ịga Chọọchị Ọ̀ Ka Na-amasị Ndị Mmadụ?

Otu nwoke onye Tọki aha ya bụ Gaffar kwuru na o siiri ya ike ịhụ Chineke n’anya n’ihi na okpukpe ya na-akụziri ha na Chineke na-ata ndị mmehie ahụhụ. Nwunye ya bụ́ Hediye malitere inwe obi abụọ n’okpukpe nke yanwa mgbe ọ dị naanị afọ itoolu. O kwuru na a kụziiri ha na ihe ọ bụla mere ná ndụ mmadụ bụ akara aka ya. O kwukwara na ọ na-abụ ya cheta ihe a a kụziiri ha, chetakwa na ya enweghị nne na nna, ya ana-ajụ onwe ya ihe ya mere ụwa ya ji dị otú a. Ọ sịrị na ihe a niile mere ka ya ghara ịna-arahụ ụra. Ọ sịkwara na ya ejighịzi obi ya na-ekpe okpukpe ahụ mgbe ya ruru afọ iri na ise.

ỊGA chọọchị ọ̀ gwụla gị ike? Ọ bụrụ na ọ gwụla gị ike, ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. N’ọtụtụ ebe, e nwere ọtụtụ ndị na-ekwu na o nweghị chọọchị ha na-aga. Ihe dịrị otú a na-aga, oge na-abịa mgbe chọọchị dị iche iche ga-atọgbọrọ chakoo. Ka anyị tụlee ihe a chọpụtara n’ebe ụfọdụ.

 Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Ji Akwụsị Ịga Chọọchị?

O nwere ọtụtụ ihe mere ike ịga chọọchị ji agwụ ndị mmadụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ otú chọọchị dị iche iche si akwado ịlụ agha, iko ndị ụkọchukwu na-akwa, nakwa ihe ndị ọzọ na-emecha jiri nwayọọ nwayọọ kwụsị ọtụtụ ndị ịga chọọchị. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bụ:

  • Ịba ọgaranya: Otu akwụkwọ kwuru na ọ na-abụ nnukwu ego malite ịbata ndị mmadụ n’aka, ha akwụsị iji ịga chọọchị kpọrọ ihe. Ihe a akwụkwọ a kwuru na-eme n’ebe dị iche iche n’ihi na ọtụtụ ndị abaala ọgaranya. Otú a ndị mmadụ si nwee ego dabakwara n’ihe otu ọkachamara kwuru. O kwuru na ụfọdụ ndị nwere akụnụba na ihe ndị e ji ebi ndụ karịa eze ọ bụla dịrị ndụ n’ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga.

    IHE BAỊBỤL KWURU: Baịbụl kwuru na “n’oge ikpeazụ,” ndị mmadụ ga-ahụ ma ego ma ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke na mmadụ ibe ha n’anya. (2 Timoti 3:1-5) Otu onye so dee Baịbụl ma na ihe onwunwe nwere ike itinye mmadụ na nsogbu. Ọ bụ ya mere o ji rịọ Jehova, sị: ‘Enyekwala m akụnụba. Ka afọ ghara iju m, m wee gọnahụ gị.’—Ilu 30:8, 9.

  • Omenala chọọchị na àgwà ndị chọọchị: Ọtụtụ ndị na-ele ịga chọọchị anya ka ihe na-abaghịzi uru, nke ka nke, ndị na-eto eto. E nwekwara ndị ịga chọọchị gwụrụla ike n’ihi àgwà ọjọọ ndị chọọchị na-akpa. Ọ bụ ya mere otu nwoke ji kwuo na ndị mmadụ anaghịzi ele chọọchị anya ka ebe e si amụta ezigbo àgwà n’ihi otú ndị chọọchị si akpa àgwà kemgbe ọtụtụ afọ.

    IHE BAỊBỤL KWURU: Jizọs kwuru gbasara ndị na-ezi ozizi ụgha, sị: “Unu ga-amata ha site ná mkpụrụ ha. . . . Osisi ọma ọ bụla na-amị ezi mkpụrụ, ma osisi ọ bụla rere ure na-amị mkpụrụ na-abaghị uru.” (Matiu 7:15-18) Ụfọdụ n’ime “mkpụrụ na-abaghị uru” ndị chọọchị na-amị bụ itinye aka n’ọchịchị nakwa ịnabata ndị òtù ha na-eme ihe Chineke kpọrọ asị. Ha anaghị ele nwoke na nwoke inwe mmekọahụ ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ anya ka ihe ọjọọ. (Jọn 15:19; Ndị Rom 1:25-27) Mkpụrụ ọzọ na-abaghị uru ha na-amị bụ izi ozizi ụgha na iji omenala chọọchị edochi ihe Baịbụl kwuru. (Matiu 15:3, 9) Jizọs chọrọ ka a na-akụziri ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl. (Jọn 21:17) Ma, o nweghị onye na-akụziri ha ya na chọọchị dị iche iche.

  •   Okwu ego a na-ekwukarị na chọọchị: Otu ụlọ ọrụ na-eme nchọpụta kwuru na ọtụtụ ndị na-ekwu na ihe na-abụkarị mkpa ndị isi ụka dị iche iche bụ ego. Ọtụtụ ndị isi ụka abaala ọgaranya ma na-ebi ndụ ndị oké ozu ebe ihe na-esiri ndị chọọchị ha ike. Dị ka ihe atụ, n’otu obodo dị na Jamanị, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịkpata ihe ha na-eri, ma bishọp ha na-ebi ndụ ndị oké ozu. Otú bishọp a si ebi ndụ adịghị ọtụtụ ndị Katọlik nọ ebe ahụ mma n’obi. Otu akwụkwọ akụkọ kwukwara na obi adịghị ndị mmadụ mma na Naịjirịa n’ihi na ihe na-esiri ọtụtụ n’ime ha ike ebe ndị pastọ na-ebi ndụ ndị oké ozu.

    IHE BAỊBỤL KWURU: Pọl kwuru na Baịbụl, sị: “Anyị abụghị ndị na-ere okwu Chineke ere.” (2 Ndị Kọrịnt 2:17) N’agbanyeghị na Pọl bụ onyeozi Chineke a ma ama n’oge ochie, o nwere ọrụ ọ na-arụ o ji akpa afọ ya ka o wee ghara ịbụrụ ndị ọzọ ibu. (Ọrụ Ndịozi 20:34) Pọl si otú ahụ gosi na ya na-erube isi n’iwu Jizọs nyere nke bụ́: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.”—Matiu 10:7, 8.

Ndịàmà Jehova na-erubekwa isi n’ihe ahụ Jizọs kwuru. N’ihi ya, ha anaghị ere akwụkwọ ha ere, ha anaghịkwa ana ndị mmadụ ego maka ịkụziri ha Baịbụl, nke ha ji ana ha ụtụ ma ha bịa ọmụmụ ihe ha. Kama, ọ bụ onyinye ndị mmadụ ji obi ha na-enye ka ha ji eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke.—Matiu 6:2, 3.

Amụma Baịbụl Buru Gbasara Ndị Mmadụ Ịkwụsị Ịga Chọọchị

N’ime afọ ole na ole gara aga, o nweghị onye ga-ekweta na o nwere mgbe ọtụtụ ndị na-agaghịzi enwe mmasị n’ịga chọọchị. Ma, Chineke ma na ọ ga-adị otú ahụ, ọ dịlarị anya o kwuru gbasara ya na Baịbụl. Ọ kpọrọ okpukpe ụgha niile “Babịlọn Ukwu ahụ.” O jikwa ha tụnyere nwaanyị akwụna.—Mkpughe 17:1, 5.

Ihe atụ ahụ dabara adaba n’ihi na chọọchị dị iche iche na-ekwu na ha na-efe Chineke, ma ha na ndị ọchịchị na-akpachi anya iji nweta ike na akụnụba n’aka ha. Ọ bụ ya mere Mkpughe 18:9 ji kwuo na Babịlọn Ukwu ahụ na ‘ndị eze ụwa kwara iko.’ Aha a Baịbụl kpọrọ ha kwesịrị ha n’ihi na ha na-akpa àgwà ka ndị Babịlọn oge ochie, na-ezikwa ụdị ozizi e ziri n’obodo ahụ. E ji ozizi ụgha na nkwenkwe ụgha mara Babịlọn oge ochie. Ọ bụkwa ụdị ozizi ndị ahụ ka a na-ezi na chọọchị dị iche iche taa. Ụfọdụ n’ime ha bụ ozizi Atọ n’Ime Otu nakwa na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ha na-emekwa anwansi ka ndị Babịlọn oge ochie. *Aịzaya 47:1, 8-11.

Babịlọn bụ obodo siri ike. Ma, ọ dara mgbe Saịrọs na ndị agha ya mere ka mmiri gbara ya gburugburu nke sí n’osimiri Yufretis taa, mezie ka ọ dịrị ha mfe ịbanye n’obodo ahụ bibie ya. (Jeremaya 50:1, 2, 38) N’eziokwu, e bibiri Babịlọn n’otu abalị.—Daniel 5:7, 28, 30.

Babịlọn Ukwu ahụ nọkwa “n’elu ọtụtụ mmiri.” Baịbụl kwuru na mmiri ahụ pụtara “ndị dị iche iche na ìgwè mmadụ” ndị na-akwado  okpukpe ụgha. (Mkpughe 17:1, 15) Baịbụl kwuru na mmiri ihe atụ ahụ ga-ata. Ihe a o kwuru pụtara na Babịlọn nke oge a ga-adakwa n’otu ntabi anya. (Mkpughe 16:12; 18:8) Olee ndị ga-akwatu ya? Ọ bụ ndị ọchịchị ahụ ya na ha na-akpa. Ha ga-emecha kpọ ya asị. Ha ga-ebibi ya ma laa ya n’iyi dị ka à ga-asị na ha riri anụ ya.—Mkpughe 17:16, 17. *

Mmiri gbara Babịlọn oge ochie gburugburu talatara. Ọ bụkwa otú ahụ ka ndị mmadụ si esi na chọọchị apụta

“Sinụ n’Ime Ya Pụta”

Ebe ọ bụ na a ga-ebibi Babịlọn Ukwu ahụ n’oge na-adịghị anya, Chineke na-agwa anyị, sị: “Ndị nke m sinụ n’ime ya pụta, ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya kere òkè ná mmehie ya, ma ọ bụrụkwa na unu achọghị ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya.” (Mkpughe 18:4) Ị̀ chọpụtara na Chineke sịrị “ma ọ bụrụ”? Ndị Chineke na-agwa okwu a bụ ndị dị ka Gaffar na Hediye anyị kwuru gbasara ha ná mmalite, ndị ozizi ụgha a na-ezi na chọọchị dị iche iche na-enye nsogbu n’obi, ha achọọkwa ka ha na Chineke dị ná mma.

Tupu Gaffar amalite ịmụ Baịbụl, o chere na ihe mere mmadụ ga-eji na-erubere Chineke isi bụ ka ọ ghara ịta ya ahụhụ. Ma, mgbe ọ mụwara Baịbụl, o kwuziri, sị: “Obi eruola m ala ugbu a m ghọtara na Jehova hụrụ anyị n’anya ma chọọ ka anyị na-erubere ya isi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya.” (1 Jọn 4:8; 5:3) Obi rukwara Hediye ala mgbe ọ matara na ọ bụghị Chineke gburu papa ya na mama ya. Otu n’ime ihe ndị na-akasi ya obi bụ ihe e kwuru na Jems 1:13. Ebe ahụ kwuru na Chineke anaghị eji ihe ọjọọ anwa ndị mmadụ. Hediye na Gaffar esila n’okpukpe ụgha pụọ ma malite ife Chineke otú ọ chọrọ.—Jọn 17:17.

E bibiwe Babịlọn Ukwu ahụ, o nweghị ọkọ ga-akọ ndị niile rubeere Chineke isi wee si na ya pụta ma fewe Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:23) Obi siri ha ike na n’oge na-adịghị anya, “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.”—Aịzaya 11:9.

N’eziokwu, Chineke ga-ebibi ndị niile na-anaghị efe ya n’ihi na ọ bụ “onye na-apụghị ịgha ụgha.” (Taịtọs 1:2) Ma, ndị na-efe ya otú ọ chọrọ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

^ para. 16 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru gbasara Babịlọn Ukwu ahụ, ihe na-eme ndị mmadụ ma ha nwụọ, otú Chineke dị, nakwa ihe Baịbụl kwuru gbasara ime anwansi, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Akwụkwọ a dịkwa na www.jw.org/ig.

^ para. 18 Gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Baịbụl Kwuru—Ọgwụgwụ Ụwa,” nke dị na Teta! a.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Okpukpe?

Baịbụl kọwara ihe mere okpukpe ji ju ebe niile.

È Nwere Okpukpe nke Bụ́ Ezigbo Okpukpe?

Ò nweela mgbe chọọchị mere ihe na-adịghị gị mma? Ọ bụrụ otú ahụ, o nwere ike isiri gị ike ikweta na e nwere okpukpe nke bụ́ ezigbo ya. Olee otú ịmụ Baịbụl nwere ike isi nyere gị aka?