Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! NỌVEMBA 2015

Otú Ị Ga-esi Nyere Onye nke Gị Na-arịa Ọrịa Aka

Otú Ị Ga-esi Nyere Onye nke Gị Na-arịa Ọrịa Aka

Otu nwaanyị aha ya bụ Maribel kwuru na mgbe papa ya chọrọ isi n’ụlọ ọgwụ lawa, ha gakwuuru dọkịta ka ọ gwa ha ihe a chọpụtara n’ọbara papa ha. Dọkịta ahụ gwara ha na o nweghị ọrịa a chọpụtara. Ma, o mechara leruo anya n’ebe e dere ihe a chọpụtara ma hụ na ọbara papa ha adịchaghị otú o kwesịrị ịdị. Ọ rịọrọ ha mgbaghara ma kpọọ dọkịta ga-eleba ya anya. Maribel kwuru na ahụ́ papa ya akatụwala mma nakwa na a garaghị achọpụta ihe ahụ ma a sị na ha ajụwaghị dọkịta ahụ.

Mmadụ ịna-aga ahụ dọkịta mgbe niile ma ọ bụkwanụ ịnọ n’ụlọ ọgwụ ọtụtụ ụbọchị adịghị mfe. Ma, ihe a Maribel kwuru n’elu gosiri na enyi mmadụ ma ọ bụ onye ikwu ya ịnọ ya nso mgbe ahụ́ na-adịghị ya bara ezigbo uru n’ihi na o nwere ike ịzọ ya. Olee otú ị ga-esi nyere onye nke gị ahụ́ na-adịghị aka?

Tupu unu agawa ịhụ dọkịta. Nyere onye ahụ aka dee ma otú ọrịa ahụ si eme ya ma ọgwụ ọ na-aṅụ. Deekwa ajụjụ unu ga-ajụ dọkịta. Ọ bụrụ na onye ọrịa ahụ bụ enyi gị, jụọ ya otú ọrịa ahụ si emebu ya. I nwekwara ike ịjụ ya ma ò nwere onye ezinụlọ ha rịatụrụla ụdị ọrịa ahụ. Echela na dọkịta kwesịrị ịma gbasara ihe ndị ahụ ma ọ bụkwanụ na ọ ga-ajụ unu ha.

Gee dọkịta ntị, jụọ ya ajụjụ ụfọdụ dị mkpa, deekwa ihe ụfọdụ ede

Mgbe unu na-ahụ dọkịta. Gị na onye ọrịa ahụ gee dọkịta ntị nke ọma ka unu ghọta ihe ọ na-ekwu. Jụọ ya ajụjụ ma o nwee ihe na-edochaghị gị anya, arụkwala ya ụka. Hapụkwa onye ahụ na-arịa ọrịa ka o jiri ọnụ ya jụọ ya ihe ụfọdụ. Gee ntị nke ọma, deekwa ihe ụfọdụ n’akwụkwọ. Jụọ dọkịta ahụ ka ọ gwa unu ụzọ ndị o nwere ike isi gwọọ ọrịa ahụ. Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịgwa onye ọrịa ahụ ka unu nụ ihe dọkịta ọzọ nwere ike ikwu gbasara ọrịa ahụ.

Lebanụ ihe dọkịta kwuru anya nakwa otú o kwuru ọ ga-esi ṅụọ ọgwụ ya

Mgbe unu hụchara dọkịta lọta. Gị na onye ọrịa ahụ kwurịta ihe unu jetere na nke dọkịta. Nyere ya aka inweta ọgwụ ndị a gwara ya ṅụwa. Hụkwa na ọ na-aṅụ ha otú e si gwa ya. Egbukwala oge ịgwa dọkịta ma e nwee nke nyewere ya nsogbu. Gwakwa onye ọrịa ahụ ka ọ ghara ịna-echegbu onwe ya. Gbaakwa ya ume ka ọ ghara ileghara ihe ọ bụla dọkịta gwara ya ga-enyere ya aka anya, dị ka ịga hụ dọkịta mgbe ọ chọrọ ka ọ bịa. Kọkwaara onye ahụ ihe ọ bụla ọzọ ị ma gbasara ọrịa ya ahụ.

 Mgbe Unu Nọ n’Ụlọ Ọgwụ

Hụ na e dejupụtara akwụkwọ ndị dị mkpa nke ọma

Anya ruo gị ala. Obi anaghị erucha onye ọrịa ala ma o rute n’ụlọ ọgwụ. Ma ọ bụrụ na ahụ́ eruo gị ala, i nwere ike ime ka ahụ́ ruo ma yanwa ma ndị ụlọ ọgwụ ala. Ọ ga-eme ka ha lebara ya anya nke ọma. Nyekwara onye ọrịa ahụ aka idejupụta akwụkwọ e ji anabata mmadụ n’ụlọ ọgwụ. Hapụkwa ya ka o jiri aka ya kpebie otú ọ chọrọ ka e si gwọọ ya. Ma, ọ bụrụ na ọrịa na-emesi ya ike nke na ọ gaghị ekwuli okwu, hụ na ndị ụlọ ọgwụ mere ihe o dere n’akwụkwọ gbasara otú e kwesịrị isi agwọ ya nakwa na ha mere ihe onye o dere n’akwụkwọ ga na-ekwuchitere ya ọnụ ya kwuru. *

Medaa obi gwa dọkịta ihe ị chọpụtara

Agbachila nkịtị. Gwa ndị ụlọ ọgwụ ihe ọ bụla ị chọrọ ịgwa ha. Ọ bụrụ na ị na-akwanyere ha ùgwù mgbe ị na-ekwu uche gị, ọ ga-eme ka ha lebara onye gị anya nke ọma. N’ọtụtụ ụlọ ọgwụ, ọ bụghị otu dọkịta na-agwọ onye ọrịa. Ọ ga-adị mma ma ị na-agwa dọkịta nke ọ bụla ihe ibe ya kwurula gbasara onye ọrịa ị na-elekọta. O nweekwa ihe ọhụrụ ị chọpụtara n’ahụ́ onye ahụ ị na-elekọta, mee ka ha mara.

Nyere onye nke gị aka n’egbochighị ndị ụlọ ọgwụ ịrụ ọrụ ha

Kwanyere ha ùgwù, na-ekelekwa ha. Ọrụ ndị ụlọ ọgwụ adịghị mfe. N’ihi ya, kpasoo ha àgwà otú ị ga-achọ ka a na-akpaso gị. (Matiu 7:12) Agwala ha okwu ka à ga-asị na ha amaghị ihe ha na-eme. Kama, na-agwa ha okwu otú ga-egosi na obi siri gị ike na ha ma ọrụ ha. Na-ajakwa ha mma maka mbọ ha na-agba. Ọ bụrụ na i mesoo ha otú a, ọ ga-eme ka ha mee ihe niile ha nwere ike ime iji gwọọ onye ahụ.

O nweghị onye na-anaghị arịa ọrịa. Ma ọ bụrụ na ị gbaa ezigbo mbọ, ị ga-enyeliri onye nke gị aka n’oge ọrịa ji ya aka.—Ilu 17:17.

^ para. 8 Ihe iwu otu obodo kwuru gbasara onye ọrịa ikpebi otú a ga-esi agwọ ya na-adị iche n’ihe iwu obodo ọzọ kwuru. Leruo akwụkwọ na-egosi otú onye ọrịa ahụ chọrọ ka e si gwọọ ya anya nke ọma ka i nwee ike ịmara ma ihe ndị e dere na ya ọ̀ dịkwa otú o kwesịrị ịdị.